Akwụkwọ Ozi Si n’Aka Òtù Na-achị Isi
Ka usoro ihe ọhụrụ na-abịaru nnọọ nso, anyị ekwesịtụghị igbu oge n’ichere Jehova. (Zef. 3:8) Daniel onye amụma kwuru na ‘Chineke dị Nke na-ekpughe ihe nzuzo nile, o mewokwa ka a mara ihe aghaghị ịdị n’ikpeazụ ụbọchị ndị a.’ (Dan. 2:28) Lee nnọọ ihe ùgwù ọ bụ ibi n’ọgwụgwụ nke oge ahụ a kara aka na ịghọta ihe nzuzo ndị dị nsọ Jehova na-eme ka anyị mata ugbu a!
Site n’aka “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche,” Jehova ejiwo nke nta nke nta mee ka a mara nzube ya ịchịkọta “oké ìgwè mmadụ” si mba nile bụ́ ndị na-efe ya ofufe “n’ụbọchị ikpeazụ” ndị a siri ike obibi. (Mat. 24:45; Mkpu. 7:9; 2 Tim. 3:1) Aịsaịa 2:2, 3 na-akọwa nchịkọta a na-aga n’ihu n’ụwa nile dị ka ihe ga-eme “n’ikpeazụ nke ụbọchị ndị a.” Kwa afọ, a na-achịkọta oké ìgwè mmadụ a n’agbanyeghị oké ọgba aghara na ihe ike ndị jupụtara n’ụwa a.
N’afọ 2004, e mere ka anyị matakwuo mkpa ọ dị irube isi n’okwu Jizọs bụ́: “Nọrọnụ na nche . . . Gosipụtanụ na unu bụ ndị dị njikere.” (Mat. 24:42, 44) N’ezie, ihe ndị na-eme n’ụwa nwere ihe dị ukwuu ha pụtara nye Ndị Kraịst, bụ́ ndị na-aghọta “ihe ịrịba ama nke oge ndị a” ma na-eme ihe banyere ya. (Mat. 16:1-3) N’imezu Okwu ya, Jehova ga-anọgide na-anọnyere ndị ya ọ haziri ịrụ ọrụ ya, n’agbanyeghị mmegide ọ bụla ha pụrụ iche ihu.
N’agbanyeghị mgbalị ụfọdụ ndị na-eme igbochi ma ọ bụ ịkwụsị ọrụ nkwusa Alaeze ahụ, ụmụnna anyị anọgidewo na-ekwusa eziokwu ahụ, na-ezukọtakwa ọnụ. (Ọrụ 5:19, 20; Hib. 10:24, 25) Na June 2004, na Russia, ụlọikpe mkpegharị ikpe dị na Moscow kwadoro mkpebi ụlọikpe ka ala mere, bụ́ nke kwuru ka a machibido ọrụ Ndịàmà Jehova iwu nakwa ka e mechie ụlọ ọrụ ha iwu kwadoro bụ́ nke dị n’obodo ahụ. Otú ọ dị, nke ahụ akụdaghị mmụọ ụmụnna anyị; ha maara ihe Chineke na-achọ n’aka ha, ma na-erubere ya isi dị ka Onye na-achị achị karịa mmadụ. (Ọrụ 5:29) Obi siri anyị ike na Jehova ga-eduzi ndị ohu ya n’agbanyeghị ikpe mkpegbu e kpere ha.
N’afọ ole na ole gara aga na Republic of Georgia, e mebiri ihe onwunwe nke ụmụnna anyị, ìgwè ndị na-eme ihe ike wakporo ha, e sukwara akwụkwọ ha ọkụ n’ihu ha. Ma ọ dịbeghị ihe agha ọ bụla a kpụrụ megide ha garala nke ọma. (Aịsa. 54:17) N’afọ ije ozi 2004, iwu mba Georgia kwadokwara ọrụ Ndịàmà Jehova ọzọ. E nwere mgbakọ dị iche iche n’enweghị nsogbu, bubatakwa akwụkwọ n’enweghị ihe mgbochi. E nwere ọnụ ọgụgụ ọhụrụ kasị elu ná ndị nkwusa nakwa ná ndị bịara Ememe Ncheta.
A tụwo ụmụnna mkpọrọ n’Armenia, Eritrea, Republic of Korea, Rwanda, na Turkmenistan, n’ihi okwukwe ha. Ọ bụ ezie na e mekpọrọ ha ọnụ, ha maara ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru mere e ji na-akpagbu ha. Nke a na-enyere ha aka iguzosi ike n’ezi ihe ka anya ha nọ n’ebe Jehova nọ ka ọ napụta ha.—1 Pita 1:6; 2 Pita 2:9.
Ka unu na-agụ isiokwu bụ́ “Highlights of the Past Year” (Ihe Ndị Dị Ịrịba Ama Mere n’Afọ Gara Aga) ma na-atụle “Akụkọ Ozi Ụwa Nile,” bụ́ ndị dị na 2005 Yearbook of Jehovah’s Witnesses, unu ga-aṅụrị ọṅụ n’ihi ịdị mma Jehova. (Ọma 31:19; 65:11) Anyị nwere olileanya na Yearbook a ga-agba unu ume ịnọgide na-eje ije n’ụzọ ga-atọ Chineke ụtọ.—1 Tesa. 4:1.
A nọgidewo na-eme mgbalị dị ukwuu iji mee ka ụdị mmadụ nile nụ eziokwu ahụ. Dị ka ihe atụ, e mepụtawo vidio, DVD, nakwa ihe ndị ọzọ n’asụsụ ndị ogbi, wepụtakwa akwụkwọ n’ụdị Braille, iji nyere ndị ogbi na ndị ìsì aka n’ụzọ ime mmụọ. Ọtụtụ ndị nkwusa Alaeze amụtawo asụsụ nke ndị si esi bịa biri n’ókèala ọgbakọ ha.
Ọzọkwa, e nweela ọtụtụ narị ìgwè nọpụrụ anọpụ n’ókèala ndị ọ na-esi ike iru na ha. Otu alaka ụlọ ọrụ nwere ihe karịrị ìgwè 300 nọpụrụ anọpụ, bụ́ ndị ihe karịrị ndị nkwusa 7,000 nọ na ha. Lee ka nke a si egosi na e nwere ohere dị ukwuu nke inwe ọgbakọ ndị ọhụrụ! Ọzọkwa, n’ime mmadụ 16,760,607 bịara Ememe Ncheta n’afọ ije ozi gara aga, ihe karịrị nde mmadụ iri n’ime ha abụghị Ndịàmà. Nke a na-egosi nnọọ na e nwere mkpụrụ ndị chara acha a ka ga-ewe n’ubi.
Anyị na-ekele Jehova maka ngọzi ọ na-agọzi anyị n’ụba nakwa ụzọ ịhụnanya o si na-elekọta anyị kwa ụbọchị. (Ilu 10:22; Mal. 3:10; 1 Pita 5:7) Ka anyị jikọrọ aka na-aga n’ihu “n’ikpeazụ nke ụbọchị ndị a,” obi siri anyị ike n’ebe Jehova nọ, anyị tụkwasịkwara ya obi. Ụdị nsogbu ọ sọkwara anyị nwee, ka anyị buru n’uche isiokwu anyị dịịrị afọ 2005: “Inyeaka m na-esi n’aka Jehova bịa.” (Ọma 121:2) Biko naranụ ịhụnanya anyị na ekpere anyị na-ekpe n’isi unu.
Ụmụnna unu,
Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova