IHE ỌMỤMỤ NKE 32
E Ji Nkwenye Kwuo Ya
MGBE mmadụ ji nkwenye na-ekwu okwu, ndị ọzọ na-ahụ na o kwenyesiri ike n’ihe ọ na-ekwu. Nkwenye dị otú ahụ pụtara ìhè n’ozi Pọl onyeozi. O degaara ndị ghọrọ ndị kwere ekwe na Tesalonaịka akwụwọ, sị: “Ozi ọma anyị na-ekwusa eruteghị n’etiti unu nanị n’okwu ọnụ, kamakwa . . . na nkwenye siri ike.” (1 Tesa. 1:5) Nkwenye ahụ pụtara ìhè ma n’otú o si kwuo okwu ma n’ụzọ o si bie ndụ. Nkwenye siri ike kwesịkwara ịpụta ìhè n’ụzọ anyị si eche eziokwu Bible n’ihu ndị mmadụ.
Mmadụ ikwupụta nkwenye ya na mmadụ ikwesi olu ike n’echiche ya, ma ọ bụ ịdị mpako, abụghị otu ihe. Kama nke ahụ, mgbe onye na-egosipụta nkwenye n’ihe na-ekwu banyere ihe ndị dị n’Okwu Chineke, ọ na-ekwu ya n’ụzọ na-egosipụta okwukwe siri ike.—Hib. 11:1.
Oge Ndị A Ga-egosipụta Nkwenye. Ọ dị mkpa iji nkwenye na-ekwu okwu mgbe ị nọ n’ozi ubi. Ọtụtụ mgbe, ndị mmadụ na-arịba otú i si ekwu okwu ama otú ha na-arịbakwa ozi gị ama. Ha na-achọpụta mmetụta gị n’ezie banyere ihe ị na-ekwu. Nkwenye gị pụrụ igosi, n’ụzọ dị ike karịa okwu ọnụ nanị, na i nwere ihe bara oké uru ị ga-eso ha kerịta.
Ọ dịkwa mkpa ikwupụta nkwenye gị mgbe ị na-agwa ndị kwere ekwe ibe gị okwu. Pita onyeozi dere akwụkwọ ozi ya mbụ sitere n’ike mmụọ nsọ “iji nye agbamume ma gbasie àmà ike na nke a bụ ezi obiọma na-erughịrị mmadụ nke Chineke.” N’ime akwụkwọ ozi a, ọ gbara ụmụnna ume, sị: “Guzosienụ ike.” (1 Pita 5:12) Mgbe ọ na-edegara ọgbakọ dị na Rom akwụkwọ, Pọl onyeozi gosipụtara nkwenye nke baara ha uru. O dere, sị: “Ekwetara m na ọnwụ ma ọ bụ ndụ ma ọ bụ ndị mmụọ ozi ma ọ bụ ọchịchị ma ọ bụ ihe ndị dị ugbu a ma ọ bụ ihe ndị gaje ịbịa ma ọ bụ ike ma ọ bụ ịdị elu ma ọ bụ ịdị omimi ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ e kere eke agaghị enwe ike ikewapụ anyị n’ịhụnanya Chineke nke dị n’ime Kraịst Jizọs Onyenwe anyị.” (Rom 8:38, 39) Pọl dekwara n’ụzọ na-eme ka e kweta n’ihe banyere mkpa ọ dị ime nkwusa gwa ndị ọzọ, ịnụ ọkụ n’obi ya n’ọrụ ahụ nyekwara ihe àmà doro anya na ya onwe ya kwenyere ná mkpa ọ dị. (Ọrụ 20:18-21; Rom 10:9, 13-15) E kwesịrị ịhụ nkwenye dị otú ahụ n’ebe ndị okenye bụ́ Ndị Kraịst taa nọ ka ha na-ezi ihe site n’Okwu Chineke.
N’oge a na-amụ ihe na n’oge ndị ọzọ, ọ dị mkpa ka ndị mụrụ ụmụ jiri nkwenye kwupụta ihe dị ha n’obi mgbe ha na ụmụ ha na-atụle ihe ime mmụọ. Nke a na-achọ ka ndị mụrụ ụmụ zụlite ịhụnanya maka Chineke na ụzọ ya n’ime obi nke ha. Mgbe ahụ ha ga-enwe ike iji nkwenye si n’obi gwa ụmụ ha okwu, ‘n’ihi na ọnụ na-ekwu okwu site n’ihe jupụtara n’obi.’ (Luk 6:45; Deut. 6:5-7) Inwe nkwenye dị otú ahụ ga-akpalikwa ndị mụrụ ụmụ isetịpụ ihe nlereanya nke ‘okwukwe ihu abụọ na-adịghị na ya.’—2 Tim. 1:5.
Ọ dị mkpa ka i jiri nkwenye kwupụta ihe i bu n’obi karịsịa mgbe a na-ele okwukwe gị ule. Nwa akwụkwọ ibe gị, onye nkụzi gị, ma ọ bụ onye ọrụ ibe gị pụrụ ikwupụta ihe ijuanya o nwere na ị dịghị esonye n’otu ememe. Azịza doro anya, nke e ji nlezianya chepụta pụrụ inyere ya aka ịkwanyere echiche gị dabeere na Bible ùgwù. Gịnị ma ọ bụrụ na mmadụ anwaa ịrabanye gị n’omume ọjọọ—akwụwaghị aka ọtọ, iji ọgwụ eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi, ma ọ bụ mmekọahụ rụrụ arụ? Ọ dị mkpa ime ka o doo anya na ị gaghị etinye aka ma ọlị n’ụdị omume ahụ nakwa na ọ dịghị nrụgide ọ bụla ga-eme ka ị gbanwee obi gị. Nke a na-achọ ka i jiri nkwenye siri ike kwuo okwu mgbe ị na-ajụ aro ahụ. Mgbe ọ na-eguzogide mgbalị nwunye Pọtifa na-eme ka o soro ya nwee mmekọahụ, Josef kwusiri ike, sị: “M̀ ga-esikwa aṅaa mee oké ihe ọjọọ nke a, mehie megide Chineke?” Mgbe ọ nọgidere na-eme ya, Josef si n’ụlọ ahụ gbapụ.—Jen. 39:9, 12.
Otú E Si Egosipụta Nkwenye. Okwu ndị i ji na-eme ihe pụrụ inye aka nke ukwuu n’igosipụta nkwenye gị. Ọtụtụ mgbe, tupu Jizọs ekwuo okwu dị mkpa, ọ na-ebu ụzọ ekwu, sị: “N’ezie, n’ezie, asị m gị.” (Jọn 3:3, 5, 11; 5:19, 24, 25) Nkwenye Pọl pụtara ìhè n’okwu ndị dị ka “ekwetara m,” “amaara m, a na-emekwa ka m kweta n’Onyenwe anyị Jizọs,” nakwa “eziokwu ka m na-ekwu, ọ bụghị ụgha ka m na-agha.” (Rom 8:38; 14:14; 1 Tim. 2:7) Banyere mmezu nke ihe o kwuru, mgbe ụfọdụ Jehova kpaliri ndị amụma ya ikwu okwu ndị dị ike dị ka, “Ọ ghaghị ịbịa.” (Hab. 2:3) Mgbe ị na-ezo aka n’amụma ndị a, ị pụrụ iji okwu yiri ha mee ihe. Ọ bụrụ na i nwee obi ike n’ebe Jehova nọ ọ bụghị n’onwe gị, ọ bụrụkwa na ị gwa ndị ọzọ okwu n’ụzọ nkwanye ùgwù, okwu ndị na-egosi ụdị nkwenye ahụ ga-egosi na i nwere okwukwe siri ike.
A pụkwara igosipụta nkwenye site n’ịdị mkpa nke ihe ị na-ekwu na otú i tinyeruru ume na ya. Ọdịdị ihu gị, mmegharị ahụ́ gị, na ahụ́ gị dum na-atụnyecha ụtụ na nke a, ọ bụ ezie na a pụrụ inwetụ ọdịiche site n’otu onye gaa n’ọzọ. Ọ bụrụgodị na ị bụ onye ihere ma ọ bụ na ị na-ekwu okwu nwayọọ nwayọọ, mgbe i kwenyere n’ụzọ zuru ezu na ihe ị na-ekwu bụ eziokwu nakwa na ọ dị mkpa ka ndị ọzọ nụ ya, nkwenye gị ga-apụta ìhè.
N’ezie, ihe ọ bụla anyị na-ekwu iji gosi nkwenye aghaghị ịbụ eziokwu. Ọ bụrụ na ndị mmadụ achọpụta na anyị na-eme nanị ka ihe anyị na-ekwu ò si anyị n’obi, o yikarịrị ka ha ga-ekwubi na ihe anyị na-ekwu enweghị isi. Ya mere, nke kasị mkpa, kwuo okwu otú i si ekwu okwu. Dabere n’ọnụ ọgụgụ ndị na-ege gị ntị, ọ pụrụ ịdị mkpa ka i welikwuo olu gị elu karịa otú ọ na-adị ma tinyekwuo ume. Ma nzube gị kwesịrị ịbụ iji obi eziokwu kwuo ihe dị gị n’obi n’ụzọ i si ekwu okwu.
Ihe Ndị Na-enye Aka Igosipụta Nkwenye. Ebe nkwenye gị na-agụnye ihe ị na-eche banyere okwu gị, ezi nkwadebe bụ isi ihe dị mkpa. Nanị isi n’otu akwụkwọ were ihe ọmụma gị ma kwupụtaghachi ya ezughị. Ọ dị gị mkpa ịghọta ya nke ọma na inwe ike ikwu ya n’okwu nke aka gị. Ị ghaghị ikwenye n’ụzọ zuru ezu na ọ bụ eziokwu nakwa na ihe ị na-ekwu baara ndị na-ege gị ntị uru. Nke a pụtara na mgbe ị na-akwadebe okwu gị, ị ga-eburu n’uche ọnọdụ ha nakwa ihe ndị ha nwere ike ịmaraworị banyere isiokwu ahụ ma ọ bụ ihe ha pụrụ ịdị na-eche banyere ya.
Ọ na-adịrị ndị ọzọ mfe karị ịchọpụta nkwenye anyị mgbe anyị na-ekwu okwu n’ụzọ na-aga were were. Ya mere, tinyere ịkwadebe ihe ọmụma dị mma, rụsie ọrụ ike n’otú ị ga-esi kwuo ya. Lebara akụkụ okwu gị ndị chọrọ ka i kwuo okwu n’ụzọ ga-egosi ịdị mkpa ka ukwuu anya karịsịa ka i wee nwee ike ikwu ha n’elegideghị anya n’ihe ndị i deturu. Chetakwa ikpe ekpere ka Jehova gọzie mgbalị gị. N’ụzọ dị otú a, ị ‘ga-enwe nkwuwa okwu site na Chineke anyị’ ikwu okwu n’ụzọ na-egosi nkwenye i nwere n’ịbụ eziokwu na ịdị mkpa nke ozi gị.—1 Tesa. 2:2.