Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g 4/10 p. 8-9
  • Ùnu Nwere Ike Idozi Nsogbu Unu?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ùnu Nwere Ike Idozi Nsogbu Unu?
  • Teta!—2010
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Ka Alụmdi na Nwunye Bụrụ Ihe Kwesịrị Nsọpụrụ”
    “Nọrọnụ n’Ịhụnanya Chineke”
  • Otú I Nwere Ike Isi Nwee Alụmdi na Nwunye Na-aga nke Ọma
    Teta!—2008
  • A Pụrụ Ịzọpụta Alụmdi na Nwunye Gị!
    Teta!—2001
  • Ọ Bụrụ na Alụmdi na Nwunye Na-achọ Itisa
    Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2010
g 4/10 p. 8-9

Ùnu Nwere Ike Idozi Nsogbu Unu?

Ndị nwe ụlọ ahụ kwetara na ụlọ ha na-achọ ịda, ha ekpebiekwala ịrụzi ya.

Ị̀ GA-ACHỌ ka gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị biwekwa nke ọma? Ya bụrụ na ị ga-achọ, olee ebe ị ga-ebido? Gbalịa mee ihe ndị a.

1 Kpebienụ ihe unu ga-eme.

Gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị kwekọrịta na unu ga-edozi nsogbu ọ bụla unu nwere. Detuonụ ihe unu kpebiri edetu. Obi gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị dịrị n’alụmdi na nwunye unu, ọ ga na-adị unu abụọ ọkụ n’obi idozi nsogbu ọ bụla unu nwere.—Ekliziastis 4:9, 10.

2 Chọpụtanụ ihe bụ́ nsogbu unu.

Gịnị seere unu okwu? Ná nkenke, dee ihe i chere unu na-anaghị emetecha ma ọ bụkwanụ ihe unu na-eme ị ga-achọ ka unu kwụsị ime. (Ndị Efesọs 4:22-24) O nwere ike nsogbu ị ga-achọpụta ga-adị iche na nke di gị ma ọ bụ nwunye gị ga-achọpụta.

3 Nweenụ ihe mgbaru ọsọ.

Olee otú ị ga-achọ ka alụmdi na nwunye unu dịrị n’ọnwa isii na-abịa abịa? Olee mgbanwe ndị ị ga-achọ ka unu mee? Detuo ihe ndị a ị chọrọ edetu. Mgbe ị ghọtara ihe ndị ọ dị mkpa ka unu dozie, ọ ga-adịrị gị mfe ime ihe ndị unu kpebiri.—1 Ndị Kọrịnt 9:26.

4 Meenụ ihe Baịbụl kwuru.

Ozugbo ị chọpụtara ihe bụ́ nsogbu unu, marakwa mgbanwe ndị ị ga-achọ ka unu mee, chọpụta ndụmọdụ Baịbụl ndị ga-enyere gị aka. Ndụmọdụ ya na-aba uru mgbe niile, ha na-enyekwara mmadụ aka. (Aịzaya 48:17; 2 Timoti 3:17) Dị ka ihe atụ, Baịbụl gbara gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị ume ka unu na-agbaghara ibe unu. Baịbụl kwudịrị na ‘ileghara mmejọ anya bụ ịma mma.’—Ilu 19:11; Ndị Efesọs 4:32.

O yigodị ka mgbalị gị arụpụtaghị ihe ọ bụla ná mmalite, ike agwụla gị! Otu akwụkwọ na-ekwu gbasara alụmdi na nwunye kwuru ezigbo ihe a chọpụtara n’otu nnyocha e mere. Ọ sịrị: “Ihe a chọpụtara tụrụ onye ọ bụla n’anya: E kee ndị di na nwunye na-enwe nsogbu ụzọ ise, ihe dị ka ụzọ anọ n’ime ha ndị na-agbasaghị n’oge ahụ ha nwere nsogbu chọpụtara na ka afọ ise gachara, alụmdi na nwunye ha bịara ka mma.” Di na nwunye ndị kwudịrị na ha anaghị enwe obi ụtọ mechara nwewe obi ụtọ.

Ụdị ihe a nwekwara ike ime na nke gị. Ndịàmà Jehova, bụ́ ndị na-ebi akwụkwọ a, achọpụtala na Baịbụl nwere ndụmọdụ ndị ga-abara di na nwunye uru. Dị ka ihe atụ, ọtụtụ di na nwunye na-aka enwe obi ụtọ ma ha na-egosi ibe ha obiọma, obi ọmịiko ma na-agbaghara ibe ha kpamkpam. Ndị nwunye achọpụtala uru ọ bara inwe “mmụọ dị jụụ, nke dịkwa nwayọọ,” ndị di ahụkwa na ọ na-abara ha ezigbo uru ma ọ bụrụ na ha anaghị eweso nwunye ha oké iwe.—1 Pita 3:4; Ndị Kọlọsi 3:19.

Ndụmọdụ ndị a si n’Akwụkwọ Nsọ na-aba nnọọ uru n’ihi na ọ bụ Jehova Chineke, onye e dere uche ya na Baịbụl, bidoro alụmdi na nwunye. Ọ́ gaghị adị mma ma ị gwa Ndịàmà Jehova ka ha kọwakwuoro gị otú Baịbụl ga-esi enyere gị aka n’alụmdi na nwunye gị?a

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Ndịàmà Jehova bipụtara akwụkwọ bụ́ Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ, nke dị peeji 192, ka o nyere ndị ezinụlọ dị iche iche aka. Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu ihe ị ga-eme, jiri otu n’ime adres dị na peeji nke ise na magazin a detara ndị bipụtara ya akwụkwọ ozi.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya