Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g 10/10 p. 8-9
  • Gịnị Ka Ndịàmà Jehova Kweere?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Gịnị Ka Ndịàmà Jehova Kweere?
  • Teta!—2010
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Gịnị Ka Ndịàmà Jehova Kweere?
    Gịnị Ka Ndịàmà Jehova Kweere?
  • Gịnị Ka Ndịàmà Jehova Kweere?
    Ajụjụ Ndị Mmadụ Na-ajụkarị Gbasara Ndịàmà Jehova
  • Ole Ndị Ka Ha Bụ?
    Ndịàmà Jehova—Ole Ndị Ka Ha Bụ? Gịnị Ka Ha Kweere?
  • Ònye Bụ Chineke?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2010
g 10/10 p. 8-9

Gịnị Ka Ndịàmà Jehova Kweere?

Ihe Ndịàmà Jehova kweere abụghị ihe a na-ezo ezo, n’ihi na ha na-ebipụta ha n’akwụkwọ ha n’ọtụtụ narị asụsụ. N’okpuru ebe a, a kọwara ná mkpirikpi ụfọdụ ihe ndị bụ́ isi ha kweere.

1. Baịbụl Ndịàmà Jehova kweere na “Akwụkwọ Nsọ dum si n’ike mmụọ nsọ Chineke.” (2 Timoti 3:16) Jason D. BeDuhn, bụ́ osote prọfesọ, onye na-akụzi ihe banyere okpukpe, dere, sị: “[Ndịàmà Jehova si] na Baịbụl nweta ihe ndị ha kweere na ihe ndị ha na-eme, ha anaghị ekpebi ihe ha ga-ekwere tupu ha achọwa ihe Baịbụl kwuru banyere ya.” Ihe ndị ha kweere na-ehiwe isi na Baịbụl; ha anaghị agbagọ ihe Baịbụl kwuru ka ọ daba n’ihe ha kweere. Ma ha kweere na ọ bụghị ihe niile e dere na Baịbụl ka e kwesịrị ịghọta n’ụzọ nkịtị. Dị ka ihe atụ, ụbọchị asaa ahụ Baịbụl kwuru banyere ha n’akụkọ gbasara okike abụghị ụbọchị asaa nkịtị, kama ha bụ ogologo oge.—Jenesis 1:31; 2:4.

2. Onye Okike Chineke nyere onwe ya aha ahụ bụ́ Jehova (ma ọ bụ Yahweh, dị ka a kpọrọ ya na Baịbụl Nsọ Nhazi Katọlik nakwa dị ka ụfọdụ ndị ọkà mmụta nke oge a si akpọ ya). Aha a mere ka ọ dị iche na chi ụgha dị iche iche.a (Aịzaya 42:8) N’asụsụ mbụ e ji dee Baịbụl, aha Chineke pụtara otú ndị Hibru si ede ya ihe dị ka ugboro puku asaa. Mgbe Jizọs na-akụziri ndị na-eso ụzọ ya otú e si ekpe ekpere, o kwuru ihe gosiri na aha Chineke dị mkpa. Ọ sịrị: “Ka e doo aha gị nsọ.” (Matiu 6:9) Ebe ọ bụ Chineke kere anyị, ọ chọrọ ka ọ bụrụ naanị ya ka a ga-efe. Ọ bụ ya mere Ndịàmà Jehova anaghị eji ihe ọ bụla e sere ese ma ọ bụ ihe oyiyi ọ bụla efe Chineke.—1 Jọn 5:21.

3. Jizọs Kraịst Ọ bụ Onye Nzọpụta, “Ọkpara Chineke,” na “onye e bu ụzọ mụọ n’ime ihe niile e kere eke.” (Jọn 1:34; Ndị Kọlọsi 1:15; Ọrụ 5:31) Ebe ọ bụ na e kere Jizọs eke, o nweghị otú ọ ga-esi bụrụ na ya na Chineke so bụrụ Atọ n’Ime Otu. Jizọs sịrị: “Nna m ka m ukwuu.” (Jọn 14:28) Jizọs biri n’eluigwe tupu ya abịa n’ụwa, mgbe o jichakwara ndụ ya chụọ àjà, Chineke kpọlitere ya n’ọnwụ, ya alaghachi n’eluigwe. “Ọ dịghị onye na-abịakwute Nna [ya] ma ọ́ bụghị site na [ya].”—Jọn 14:6.

4. Alaeze Chineke Ọ bụ ọchịchị dị n’eluigwe nke Jizọs Kraịst bụ Eze ya, a ga-enwekwa “ndị e si n’ụwa zụta,” bụ́ ndị ha na ya ga-eso chịa. Ha dị otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ. (Mkpughe 5:9, 10; 14:1, 3, 4; Daniel 2:44; 7:13, 14) Ha ga-achị ụwa mgbe e kpochapụrụla ndị ọjọọ niile n’ụwa, ya afọdụzie ọtụtụ nde ndị na-atụ egwu Chineke.—Ilu 2:21, 22.

5. Ụwa Ekliziastis 1:4 sịrị: “Ụwa na-adịgide rue mgbe ebighị ebi.” (Bible Nsọ Ọhụụ) E bibichaa ndị ọjọọ n’ụwa, a ga-eme ka ụwa ghọọ paradaịs ebe ndị ezi omume ga-ebi ruo mgbe ebighị ebi. (Abụ Ọma 37:10, 11, 29) Mgbe ahụ ka a ga-aza ekpere ahụ Jizọs kụziri, nke bụ́, “Ka e mee uche Gị n’ụwa.”—Matiu 6:10, Baịbụl Nsọ Nhazi Katọlik.

6. Amụma Baịbụl ‘Chineke apụghị ịgha ụgha.’ (Taịtọs 1:2) N’ihi ya, ihe ọ bụla o kwuru ga-emerịrị, ma amụma ndị e buru na Baịbụl gbasara ọgwụgwụ ụwa ọjọọ a. (Aịzaya 55:11; Matiu 24:3-14) Olee ndị a na-agaghị ebibi mgbe a ga-ebibi ụwa ọjọọ a? 1 Jọn 2:17 kwuru, sị: “Onye na-eme uche Chineke ga-anọgide ruo mgbe ebighị ebi.”

7. Ndị Ọchịchị Jizọs sịrị: “Kwụọnụ Siza ihe Siza, ma kwụọnụ Chineke ihe Chineke.” (Mak 12:17) Ọ bụ nke a mere Ndịàmà Jehova ji erubere iwu obodo isi ma ọ bụrụhaala na o megideghị iwu Chineke.—Ọrụ 5:29; Ndị Rom 13:1-3.

8. Ikwusa Ozi Ọma Jizọs kwuru, sị: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze” n’elu ụwa dum tupu ọgwụgwụ ụwa ọjọọ a abịa. (Matiu 24:14) Ndịàmà Jehova weere na ọ bụ ihe ùgwù iso rụọ ọrụ a na-azọpụta ndụ. Ma, ọ bụ ndị mmadụ ga-ahọrọ ma hà ga-ege ntị ma ọ bụ na ha agaghị ege ntị. Baịbụl kwuru, sị: “Onye ọ bụla nke chọrọ, ya nara mmiri nke ndụ ahụ n’efu.”—Mkpughe 22:17.

9. Baptizim Naanị ndị Ndịàmà Jehova na-eme baptizim bụ ndị mụtarala ihe Baịbụl kwuru ma kpebie ịbụ Ndịàmà Jehova. (Ndị Hibru 12:1) A na-emezi ha baptizim n’ime mmiri iji gosi na ha enyefeela Chineke onwe ha ijere ya ozi.—Matiu 3:13, 16; 28:19.

10. Ndị isi chọọchị na ndị nkịtị Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Unu niile bụ ụmụnna.” (Matiu 23:8) Ndị Kraịst oge mbụ, ma ndị so dee Baịbụl, enweghị ndị isi chọọchị. Ndịàmà Jehova enweghịkwa ndị isi chọọchị.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Ọ bụghị Ndịàmà Jehova chepụtara aha ahụ bụ́ “Jehova.” Ọtụtụ narị afọ gara aga, e nwere ọtụtụ asụsụ ndị na-abụghị ndị e ji dee Baịbụl ndị sụpere aha Chineke ka ọ bụrụ “Jehova,” asụsụ Bekee na Jaman sokwa na ha. Ọ dị mwute na ụfọdụ ndị na-asụgharị Baịbụl ndị e nwere ugbu a ewepụla aha Chineke na Baịbụl ha ma were utu aha ndị dị ka “Chineke” na “Onyenwe anyị” dochie ya. Ihe a ha mere na-egosi na ha anaghị akwanyere Onye chepụtara ihe e dere na Baịbụl ùgwù.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 8]

“Nna m ka m ukwuu.”​—Jọn 14:28

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 9]

“A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze n’elu ụwa dum mmadụ bi ka ọ bụrụ àmà nye mba niile; mgbe ahụkwa ka ọgwụgwụ ga-abịa.”—Matiu 24:14

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya