Zụlite Ikike Gị Dị Ka Onye Ozizi
GỊNỊ bụ ihe mgbaru ọsọ gị dị ka onye ozizi? Ọ bụrụ na ọ dịbeghị anya ị ghọrọ onye nkwusa Alaeze, obi abụọ adịghị ya na i nwere ọchịchọ ịmụta otú e si eduzi ọmụmụ Bible ebe obibi, ebe Jizọs nyere ụmụazụ ya ọrụ ime ndị na-eso ụzọ. (Mat. 28:19, 20) Ọ bụrụ na i nweelarị ahụmahụ n’ọrụ a, ikekwe ihe mgbaru ọsọ gị bụ ịdịkwu irè n’iru n’obi ndị ị na-achọ inyere aka. Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna, o doro anya na ị ga-achọ ịbụ ụdị onye ozizi nke pụrụ ịkwali ụmụ ya ịrara ndụ ha nye Chineke. (3 Jọn 4) Ọ bụrụ na ị bụ okenye ma ọ bụ na ị na-agbalị iru eru ịbụ okenye, ikekwe ị chọrọ ịbụ onye ọkà okwu ihu ọha nke pụrụ ime ka ndị na-ege ya ntị ghọta Jehova na ụzọ ya n’ụzọ miri emi karị. Olee otú ị pụrụ isi ruo ihe mgbaru ọsọ ndị a?
Mụta ihe site n’aka Onye Ozizi Bụ́ Ọkà, bụ́ Jizọs Kraịst. (Luk 6:40) Ma Jizọs ọ̀ na-agwa ìgwè mmadụ okwu n’akụkụ ugwu ma ọ̀ bụ nanị mmadụ ole na ole ka ha na-aga ije n’ụzọ, ihe o kwuru na otú o si kwuo ya nwere mmetụta na-adịte aka. Jizọs kpaliri uche na obi ndị gere ya ntị, o nyekwara nkọwa dị irè nke ha pụrụ ịghọta. Ị̀ pụrụ ime ihe yiri ndị ahụ?
Dabere n’Ebe Jehova Nọ
Mmekọrịta chiri anya nke Jizọs na Nna ya nke eluigwe nwere nakwa mmụọ Chineke nke e ji gọzie ya mere ka ikike izi ihe ya ka mma. Ị̀ na-ekpegasiri Jehova ekpere ike ka i nwee ike iduzi ọmụmụ Bible ebe obibi n’ụzọ dị irè? Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna, ị na-ekpechi ekpere anya maka nduzi Chineke n’izi ụmụ gị ihe? Ị̀ na-eji obi gị dum ekpe ekpere mgbe ị na-akwadebe ikwu okwu ma ọ bụ iduzi nzukọ? Ịdabere na Jehova otú ahụ site n’ekpere ga-enyere gị aka ịghọ onye ozizi dị irè karị.
A na-esitekwa n’ịdabere n’Okwu ya, bụ́ Bible egosipụta ndabere n’ebe Jehova nọ. Mgbe ọ na-ekpe ekpere n’uhuruchi ikpeazụ ọ dịrị ndụ dị ka mmadụ zuru okè, Jizọs gwara Nna ya, sị; “Enyewo m ha okwu gị.” (Jọn 17:14) N’agbanyeghị na Jizọs nwere ahụmahụ dị ukwuu, ọ dịghị mgbe o kwuru okwu n’echiche nke onwe ya. O kwuru mgbe nile ihe Nna ya kụziiri ya, wee si otú ahụ na-ahapụrụ anyị ihe nlereanya anyị ga-agbaso. (Jọn 12:49, 50) Okwu Chineke, nke e chekwara n’ime Bible, nwere ikike inwe mmetụta n’ahụ́ ndị mmadụ—omume ha, ihe ha na-eche n’ime obi ha, na mmetụta ha. (Hib. 4:12) Ka ị na-enwekwu ihe ọmụma nke Okwu Chineke ma na-amụta iji ya na-eme ihe nke ọma n’ozi gị, ị ga na-azụlite ụdị ikike izi ihe ahụ nke na-adọta ndị mmadụ n’ebe Chineke nọ.—2 Tim. 3:16, 17.
Sọpụrụ Jehova
Ịbụ onye ozizi nke na-eṅomi Kraịst abụghị nanị okwu inwe ike ikwu okwu dị ụtọ. N’eziokwu, “okwu ọma” ndị Jizọs kwuru tụrụ ndị mmadụ n’anya. (Luk 4:22) Ma gịnị bụ ebumnobi Jizọs n’ikwu okwu nke ọma? Ọ bụ iji sọpụrụ Jehova, ọ bụghị iji dọrọ uche gaa n’ebe onwe ya nọ. (Jọn 7:16-18) Ọ gbakwara ụmụazụ ya ume, sị: “Kwenụ ka ìhè unu na-enwu n’ebe ndị mmadụ nọ, ka ha wee hụ ọrụ ọma unu wee nye Nna unu nọ n’eluigwe otuto.” (Mat. 5:16) Ndụmọdụ ahụ kwesịrị inwe mmetụta n’ụzọ anyị si ezi ihe. O kwesịrị ịbụ nzube anyị izere ihe ọ bụla nke ga-emebi ebumnobi ahụ. Ya mere mgbe anyị na-eme atụmatụ ihe anyị ga-ekwu ma ọ bụ otú anyị ga-esi kwuo ya, ọ ga-adị mma ma anyị jụọ onwe anyị sị, ‘Nke a ọ̀ ga-eme ka e nwekwuo ekele miri emi n’ebe Jehova nọ, ka ọ̀ ga-adọta mmasị n’ebe m nọ?’
Dị ka ihe atụ, a pụrụ iji ihe atụ na ihe nlereanya ndị mere eme n’ezie zie ihe n’ụzọ dị irè. Otú ọ dị, mgbe a kọwara ihe atụ dị ogologo ma ọ bụ kọọ ahụmahụ n’ụzọ sara mbara gabiga ókè, isi ihe mmụta dị na ya nwere ike ifu. N’otu aka ahụ, ịkọ akụkọ ndị bụ́ nanị iji mee ihe ọchị na-emebi nzube nke ozi anyị. Ya bụ na onye ozizi ahụ na-adọrọ uche aga n’ebe ya onwe ya nọ kama imezu ihe bụ́ n’ezie ihe mgbaru ọsọ nke mmụta ọchịchị Chineke.
‘Kpaa Ókè’
Ka mmadụ wee bụrụ onye na-eso ụzọ n’ezie, ọ ghaghị ịghọta ihe a na-ezi ya n’ụzọ doro anya. Ọ ghaghị ịnụ eziokwu ahụ ma hụ otú o si dị iche na nkwenkwe ndị ọzọ. Igosi ọdịiche dị n’ihe na-enye aka imezu nke a.
Ugboro ugboro, Jehova gbara ndị ya ume ka ha ‘kpaa ókè’ n’etiti ihe rụrụ arụ na ihe dị ọcha. (Lev. 10:9-11) Ọ sịrị na ndị ga-eje ozi ná nnukwu ụlọ nsọ ime mmụọ ya ga-ezi ndị mmadụ “ihe dị iche n’etiti ihe nsọ na ihe na-adịghị nsọ.” (Ezik. 44:23) Akwụkwọ Ilu jupụtara n’okwu ndị na-egosi ọdịiche dị n’etiti ezi omume na ajọ omume, n’etiti amamihe na nzuzu. A pụrụ igosi ọdịiche dị ọbụna n’etiti ihe ndị na-adịghị nnọọ iche n’ibe ha. Pọl onyeozi gosiri ọdịiche dị n’etiti onye ezi omume na ezi mmadụ, dị ka e dekọrọ ná Ndị Rom 5:7. N’akwụkwọ Ndị Hibru, o gosiri otú ije ozi Kraịst dị ka nnukwu onye nchụàjà siri ka nke Erọn mma. N’ezie, dị ka onye ọkà n’ịkụzi ihe na narị afọ nke 17 bụ́ John Amos Comenius si dee: “E nwekebeghị ihe ọzọ izi ihe pụtara ma ọ́ bụghị igosi otú ihe siri dị iche n’ebe ibe ha dị ná nzube, ọdịdị, na ná mmalite ha. . . . Ya mere, onye na-ewepụta ọdịiche dị n’ihe nke ọma na-ezi ihe nke ọma.”
Were dị ka ihe atụ, ịkụziri mmadụ banyere Alaeze Chineke. Ọ bụrụ na ọ ghọtaghị ihe Alaeze bụ, i nwere ike igosi ya otú ihe Bible na-ekwu si dị iche n’echiche bụ́ na Alaeze bụ nanị ọnọdụ dị n’obi mmadụ. Ma ọ bụ i nwere ike igosi ya otú Alaeze ahụ si dị iche n’ebe ọchịchị mmadụ dị. Otú ọ dị, nye ndị maara eziokwu ndị a bụ́ isi, i nwere ike inye ha nkọwa miri emi karị. I nwere ike igosi ha otú Alaeze Mezaịa si dị iche n’ọbụbụ Jehova bụ eze eluigwe na ala, bụ́ nke a kọwara n’Abụ Ọma 103:19, ma ọ bụ otú o si dị iche ‘n’alaeze Ọkpara nke ịhụnanya Chineke,’ bụ́ nke e hotara ná Ndị Kọlọsi 1:13, ma ọ bụ otú o si dị iche ná “nlekọta ihe,” nke e kwuru banyere ya ná Ndị Efesọs 1:10. Ikwu ọdịiche dịgasị n’ihe pụrụ inye aka mee ka ndị na-ege gị ntị ghọta ihe a dị mkpa Bible na-ezi nke ọma.
Jizọs ji ụzọ izi ihe a mee ihe ugboro ugboro. O gosiri ọdịiche dị n’otú ọtụtụ ndị si ghọta Iwu Mozis na ihe bụ́ nzube nke Iwu ahụ n’ezie. (Mat. 5:21-48) O gosiri otú ezi nsọpụrụ Chineke si dị iche n’omume ihu abụọ nke ndị Farisii. (Mat. 6:1-18) O gosiri ọdịiche dị na mmụọ nke ndị ‘mere ka ha bụ ndị nwe’ ndị ọzọ na mmụọ ịchụ onwe onye n’àjà nke ụmụazụ ya ga-egosi. (Mat. 20:25-28) N’oge ọzọ, nke e dekọrọ banyere ya na Matiu 21:28-32, Jizọs gwara ndị na-ege ya ntị ka ha hụ n’onwe ha ọdịiche dị n’etiti mmadụ ịbụ onye ezi omume n’anya onwe ya na ezi nchegharị. Nke ahụ na-eduga anyị n’akụkụ ọzọ bara uru nke izi ihe nke ọma.
Gbaa Ndị Na-ege Ntị Ume Iche Echiche
Na Matiu 21:28, anyị na-agụ na Jizọs malitere ojiji o ji otu ihe tụnyere ihe ọzọ site n’ịjụ, sị: “Gịnị ka unu chere?” Onye ozizi ruru eru adịghị akọwapụta nanị ihe ndị mere eme ma ọ bụ na-enye azịza. Kama nke ahụ, ọ na-agba ndị na-ege ya ntị ume ịzụlite ikike iche echiche. (Ilu 3:21; Rom 12:1) Ruo n’ókè ụfọdụ, a na-eme nke a site n’ịjụ ajụjụ. Dị ka ọ dị na Matiu 17:25, Jizọs jụrụ, sị: “Gịnị ka i chere, Saịmọn? Ọ̀ bụ n’aka ole ndị ka ndị eze nke ụwa na-anata ụtụ ahịa ma ọ bụ ụtụ isi? N’aka ụmụ ha ka ọ̀ bụ n’aka ndị bịara abịa?” Ajụjụ na-akpali iche echiche nke Jizọs jụrụ nyeere Pita aka iru ná nkwubi okwu ziri ezi n’onwe ya n’ihe banyere ịtụ ụtụ ụlọ nsọ. N’otu aka ahụ, mgbe ọ na-azaghachi onye jụrụ ya sị, “Ònye n’ezie bụ onye agbata obi m?” Jizọs gosiri ọdịiche dị n’ihe onye nchụàjà na onye Livaị mere na ihe onye Sameria mere. Mgbe ahụ ọ jụrụ ajụjụ a: “Ònye n’ime mmadụ atọ a yiri gị onye meworo onwe ya onye agbata obi nke nwoke ahụ dabara n’aka ndị na-apụnara mmadụ ihe?” (Luk 10:29-36) N’ebe a kwa, kama ichere onye na-ege ya ntị echiche, Jizọs mere ka ọ zaa ajụjụ ya onwe ya jụrụ.—Luk 7:41-43.
Gbalịa Iru n’Obi
Ndị ozizi, ndị ghọtara ihe Okwu Chineke na-ekwu na-achọpụta na ezi ofufe abụghị nanị okwu metụtara iburu eziokwu ụfọdụ n’isi ma na-agbaso ụkpụrụ ụfọdụ. Ọ na-adabere n’ezi mmekọrịta mmadụ na Jehova nwere nakwa iji ụzọ ya kpọrọ ihe. Obi na-ekere òkè n’ofufe dị otú ahụ. (Deut. 10:12, 13; Luk 10:25-27) N’ime Akwụkwọ Nsọ, okwu bụ́ “obi” na-ezokarị aka n’ihe dum mmadụ bụ n’ime, gụnyere ihe ndị dị ka ọchịchọ, ịhụnanya, mmetụta, na mkpali.
Jizọs maara na Chineke na-ele ihe dị n’obi ebe ụmụ mmadụ na-ele ọdịdị elu ahụ́. (1 Sam. 16:7) Ọ bụ ịhụnanya anyị nwere n’ebe Chineke nọ kwesịrị ịbụ ihe na-akwali ozi anyị na-ejere ya, ọ bụghị mgbalị anyị ime ihe na-amasị ụmụ mmadụ ibe anyị. (Mat. 6:5-8) N’aka nke ọzọ, ndị Farisii mere ọtụtụ ihe maka ngosi efu. Ha weere ya dị ka ihe dị oké mkpa idebe ụmụ irighiri ihe dị n’Iwu ahụ nakwa ịgbaso ụkpụrụ nduzi ndị ha ji aka ha mee. Ma ha egosipụtaghị ná ndụ ha àgwà ndị ga-eme ka e jikọta ha na Chineke ahụ ha sị na ha na-efe ofufe. (Mat. 9:13; Luk 11:42) Jizọs kụziri na ọ bụ ezie na irube isi n’ihe Chineke chọrọ dị mkpa, ọ bụ ihe dị n’obi na-ekpebi uru nrubeisi dị otú ahụ bara. (Mat. 15:7-9; Mak 7:20-23; Jọn 3:36) Izi ihe anyị ga-arụpụta ihe kasị mma ma ọ bụrụ na anyị na-eṅomi ihe nlereanya Jizọs. Ọ dị mkpa na anyị na-enyere ndị mmadụ aka ịmụta ihe Chineke chọrọ n’aka ha. Ma ọ dịkwa mkpa ka ha mata ma hụ Jehova n’anya dị ka onye, ka àgwà ha wee gosipụta otú ha si jiri iso ezi Chineke nwee ezi mmekọrịta kpọrọ ihe.
Otú ọ dị, iji rite uru n’izi ihe dị otú ahụ, ọ dị ndị mmadụ mkpa ime ihe banyere ihe dị n’obi nke ha. Jizọs gbara ndị mmadụ ume ịtụle ebumnobi ha na inyocha ihe ha na-eche. Mgbe ọ na-agbazi echiche na-ezighị ezi, ọ na-ajụ ndị na-ege ya ntị ihe mere ha ji chee, kwuo, ma ọ bụ mee ihe ụfọdụ. Ma, ka o wee ghara ịhapụ ya otú ahụ, Jizọs na-ejikọta ajụjụ ya na otu okwu, otu ihe atụ, ma ọ bụ otu ihe omume nke ga-agba ha ume ile ihe anya n’ụzọ ziri ezi. (Mak 2:8; 4:40; 8:17; Luk 6:41, 46) Anyị onwe anyị kwa pụrụ inyere ndị na-ege anyị ntị aka site n’ịtụ aro ka ha jụọ onwe ha ajụjụ ndị dị ka: ‘Gịnị mere isi otú a mee ihe ji masị m? Gịnị mere m ji na-emeghachi omume otú a banyere ọnọdụ a?’ Mgbe ahụ gwa ha ihe ga-akpali ha ile ihe anya n’ụzọ Jehova si ele ihe anya.
Gosi Otú A Pụrụ Isi Jiri Ya Mee Ihe
Ezi onye ozizi maara na “isi ihe ka amamihe bụ.” (Ilu 4:7) Amamihe bụ ikike iji ihe ọmụma mee ihe n’ụzọ gara nke ọma iji merie nsogbu, iji zere ihe ize ndụ, iji ruo ihe mgbaru ọsọ dị iche iche, iji nyere ndị ọzọ aka. Ọ bụ ọrụ dịịrị onye ozizi inyere ndị mmụta aka ịmụta ime nke ahụ ma ọ bụghị imere ha mkpebi. Mgbe ị na-atụle ụkpụrụ dị iche iche nke Bible, nyere onye ị na-amụrụ ihe aka iche echiche. I nwere ike ihota otu ọnọdụ a na-enwe ná ndụ a na-adị kwa ụbọchị ma jụọ onye mmụta ahụ otú ụkpụrụ Bible unu ka mụpụrụ ga-esi nyere ya aka ma ọ bụrụ na ọnọdụ ahụ echee ya ihu.—Hib. 5:14.
N’okwu ya na Pentikọst 33 O.A., Pita onyeozi gosiri ihe atụ nke igosi otú a pụrụ isi jiri ihe a na-ekwu mee ihe bụ́ nke nwere mmetụta ná ndụ ndị mmadụ. (Ọrụ 2:14-36) Mgbe ọ tụlesịrị akụkụ Akwụkwọ Nsọ atọ ìgwè mmadụ ahụ kwuru na ha kwenyere, Pita gosiri otú a ga-esi jiri ha mee ihe na-adabere n’ihe ndị merenụ bụ́ ndị ha nile ji anya ha hụ. N’ihi ya, ìgwè mmadụ ahụ hụrụ mkpa ọ dị ha ime ihe banyere ihe ha nụworo. Izi ihe gị ọ̀ na-enwe mmetụta yiri nke ahụ n’ahụ́ ndị mmadụ? Ị̀ na-eme ihe karịrị ikwughachi ihe ndị mere eme ma nyere ndị mmadụ aka ịghọta ihe mere ihe ji dị otú ha dị? Ị̀ na-agba ha ume ịtụle otú ihe ndị ha na-amụ kwesịrị isi metụta ndụ ha? E nwere ike ha agaghị eti sị, “Gịnị ka anyị ga-eme?” dị ka ìgwè mmadụ ahụ tiri na Pentikọst, ma, ọ bụrụ na ị kọwawo akụkụ Akwụkwọ Nsọ ahụ nke ọma, a ga-akpali ha iche echiche ime ihe kwesịrị ekwesị.—Ọrụ 2:37.
Mgbe unu na ụmụ unu na-agụ Bible, unu bụ́ ndị mụrụ ụmụ nwere ohere mara mma inye ha ọzụzụ iche echiche banyere otú ha ga-esi tinye ụkpụrụ dị iche iche nke Bible n’ọrụ n’ụzọ dị irè. (Efe. 6:4) Dị ka ihe atụ, unu nwere ike ịhọrọ amaokwu ole na ole n’ọgụgụ Bible e dokwara maka izu, tụlee ihe ha pụtara, mgbe ahụkwa jụọ ajụjụ ndị dị ka ndị a: ‘Olee otú nke a ga-esi nye anyị nduzi? Olee otú anyị ga-esi jiri amaokwu ndị a mee ihe n’ozi? Gịnị ka ha na-ekpughe banyere Jehova na ụzọ o si eme ihe, oleekwa otú nke ahụ si eme ka anyị nwee ekele n’ebe ọ nọ karị?’ Gbaanụ ezinụlọ unu ume ikwu okwu n’isi ihe ndị a mgbe a ga na-atụle isi ihe ndị sitere n’ọgụgụ Bible n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke. O yikarịrị ka ọ bụ n’amaokwu ndị ha chetara ka ha ga-ekwu okwu na ha.
Setịpụ Ezi Ihe Nlereanya
Ọ bụghị nanị site n’ihe ị na-ekwu ka i na-ezi ihe kamakwa ihe ị na-eme. Ihe ndị ị na-eme bụ ihe atụ a na-ahụ anya nke ụzọ isi tinye ihe ndị ị na-ekwu n’ọrụ. Nke a bụ ụzọ ụmụaka si amụta ihe. Mgbe ha na-eṅomi ndị mụrụ ha, ha na-egosi na ha chọrọ ịdị ka ndị mụrụ ha. Ha na-achọ ịmata otú ime ihe ndị mụrụ ha na-eme na-adị. N’otu aka ahụ, mgbe ndị ị na-ezi ihe ‘ghọrọ ndị na-eṅomi gị dị ka ị na-eṅomi Kraịst,’ ha na-amalite inweta ngọzi nke ịga ije n’ụzọ Jehova. (1 Kọr. 11:1) Otú Chineke si emeso ha na-eso n’ahụmahụ ndị ha nwere.
Nke a bụ ihe ncheta e kwesịrị ichebara echiche banyere mkpa ọ dị isetịpụ ezi ihe nlereanya. “Ụdị mmadụ [anyị bụ] n’àgwà dị nsọ na omume nke ịsọpụrụ Chineke” ga-enye aka dị ukwuu n’inye ndị anyị na-ezi ihe ihe àmà a na-ahụ anya nke ụzọ isi na-etinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ. (2 Pita 3:11) Ọ bụrụ na ị na-agba onye mmụta Bible ume ịdị na-agụchi Okwu Chineke anya, na-agụchi ya anya n’onwe gị. Ọ bụrụ na ị chọrọ ka ụmụ gị mụta ịdị na-erube isi n’ụkpụrụ Bible, jide n’aka na ha na-ahụ na omume gị kwekọrọ n’uche Chineke. Ọ bụrụ na ị na-ezi ọgbakọ ihe ka ha na-anụ ọkụ n’obi n’ozi, hụ na ị na-ekere òkè zuru ezu n’ọrụ ahụ. Mgbe ị na-eme ihe ị na-ezi, ị ga-aka nwee ike ịkpali ndị ọzọ ime ihe.—Rom 2:21-23.
Iji mee ka izi ihe gị ka mma, jụọ onwe gị, sị: ‘Mgbe m na-ezi ihe, àna m ezi ya n’ụzọ na-eme ka o nwee mmetụta n’àgwà, n’okwu, ma ọ bụ n’omume nke ndị na-anụ ya? Iji mee ka ihe doo anya, àna m eme ka otu echiche ma ọ bụ omume dị iche n’ebe ibe ya dị? Gịnị ka m na-eme iji nyere ndị m na-amụrụ ihe, ụmụ m, ma ọ bụ ndị na-ege m ntị ná nzukọ aka icheta ihe m na-ekwu? Ànà m egosi ndị na-ege m ntị n’ụzọ doro anya ụzọ isi tinye ihe ha na-amụta n’ọrụ? Hà pụrụ ịhụ ya n’ihe nlereanya m na-esetịpụ? Hà ghọtara otú mmeghachi omume ha n’ihe a na-atụle pụrụ isi metụta mmekọrịta ha na Jehova?’ (Ilu 9:10) Nọgide na-echebara ihe ndị a echiche ka ị na-achọ ịzụlite ikike gị dị ka onye ozizi. “Na-elezi onwe gị nakwa ozizi gị anya mgbe nile. Nọgide n’ihe ndị a, n’ihi na site n’ime nke a, ị ga-azọpụta ma gị onwe gị ma ndị na-ege gị ntị.”—1 Tim. 4:16.