Ikwusa Ozi Ọma na Ịkụzi Ihe n’Ụwa NiileMaine, U.S.A.: Following Jesus’ example, our brothers are “fishers of men”
Maine, U.S.A.: Following Jesus’ example, our brothers are “fishers of men”
ỤWA NIILE
MBA 239
NDỊ NKWUSA 7,782,346
AWA OLE E JI KWUSAA OZI ỌMA 1,748,697,447
NDỊ A MỤỤRỤ BAỊBỤL 8,759,988
AFRỊKA
MBA 58
MMADỤ OLE BI NA HA 968,989,710
NDỊ NKWUSA OLE NỌ NA HA 1,312,429
MMADỤ OLE A MỤỤRỤ BAỊBỤL 2,999,639
O Teghịzi Ime
N’Adis Ababa, bụ́ isi obodo Itiopịa, e nwere otu nwaanyị aha ya bụ Saba. O nwere ụlọ ahịa. Otu ụbọchị, ụmụnna nwaanyị abụọ wetaara ya Teta! nke kọwara ihe gbasara ite ime. Saba nabatara ha. Anya mmiri juru ya n’anya mgbe ọ na-agwa ha na ya nọ na-eche otú ya ga-esi tee ime. Otú ihe ha nọ na-ekwu gbasara ite ime si metụ ha atọ n’ahụ́ mere ka ha malite ibe ákwá. N’ụbọchị ahụ, Saba kpebiri na ya agaghịzi ete ime ahụ. Ọ gwasiri di ya ike ihe mere ya ji gbanwee obi ya. Ka oge na-aga, ọ mụrụ ọmarịcha nwa nwaanyị. Saba malitekwara ịmụ Baịbụl. E mechara mee ya baptizim. Ọ bụ ọsụ ụzọ na-enwe obi ụtọ ugbu a. Di ya mụkwara Baịbụl ma ghọọ Onyeàmà Jehova. N’ọnwa anọ n’afọ 2012, e mekwara ụmụ ha abụọ ndị ọzọ baptizim.
‘Ànyị Nwere Ike Ịgwa Ya Okwu?’
Obodo Kaokoland nke dị na Namibia: Akwụkwọ ndị e sere ihe na ha na-amasị ndị ukwu na ndị nta. E nwere Gee Chineke Ntị Ka I Wee Dị Ndụ Ebighị Ebi ugbu a na narị asụsụ anọ na iri ise na abụọ
N’Itiopịa, otu onye nlekọta sekit na nwanna nwoke ọzọ nọ na-ekwusa ozi ọma n’ụlọ n’ụlọ. N’otu ụlọ, ha hụrụ otu nwata nwaanyị na-eje ozi. Ha ajụọ ya ma hà nwere ike ịgwa nna nwe ụlọ okwu. Ọ gwara ha na ọ gaghị ekwe omume. Ha ajụọ ya ma hà nwere ike inye ya akwụkwọ ọ ga-enye nwoke ahụ. Ọ gara jụọ nna ahụ nwe ụlọ, bịaghachi, gwa ha na nwoke ahụ sịrị na ya chọrọ ibu ụzọ hụ akwụkwọ ahụ.
N’ihi ya, ụmụnna ndị ahụ nyere ya magazin ka ọ gaa gosi nwoke ahụ. Mgbe nkeji ole na ole gachara, ọ bịaghachiri, gwa ha na nwoke ahụ kwetara ịgụ ya. Otu n’ime ụmụnna ndị ahụ asị ya: “Ọ bụrụ na ọ gaghị apụtali, ànyị nwere ike ịgakwuru ya, gwa ya okwu?” Nwata nwaanyị ahụ gakwara ọzọ ịjụ nwoke ahụ nwe ụlọ. Ọ nọtere aka karịa otú ọ nọrọ na nke mbụ, ụmụnna ndị ahụ echewezie ma ọ̀ ga-abịaghachikwa. O mechara pụta, sị ha batawa. Ọ bụ mgbe ahụ ka ụmụnna ndị ahụ matara na nna ahụ nwe ụlọ bụ agadi nwoke aha ya bụ Yirgu. Ọrịa ekweghị ya pụọ èzí kemgbe afọ iri. Ọ naghịdị ebili ọtọ ma ọ bụ nọrọ ọdụ. Ihe mere nwata nwaanyị ahụ ji nọtee aka bụ na o nyeere nwoke ahụ aka iyiri uwe, o dozikwara ime ụlọ ahụ.
Ụmụnna ndị ahụ ziri Yirgu ozi ọma. Ihe ọ nụrụ tọrọ ya ụtọ, ya ekweta ka a mụwara ya Baịbụl. Ka a na-amụrụ ya Baịbụl, ahụ́ dịtụwara ya mma. Obere oge, ọ na-esizi n’ebe ahụ o dina ebili, jiri ígwè ndị ngwọrọ na-agagharị. N’oge na-adịghị anya, ọ malitere ịga ọmụmụ ihe. E mere ya baptizim n’otu mgbakọ distrikti e mere n’oge na-adịbeghị anya.
Chọọchị nke Biri Akwụkwọ Nna Ya
Na Zimbabwe, e nwere otu nwata nwoke aha ya bụ Calvin. Ọ dị afọ anọ mgbe nna ya nwụrụ. Naanị ihe nna ya hapụụrụ ya bụ otu akpa o tinyere Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ na akwụkwọ bụ́ Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ, Mpịakọta nke 1. Nna Calvin gwara ya, sị: “Ahapụla chọọchị na-ebipụta akwụkwọ ndị a. Ọ bụ ha na-akụzi eziokwu.”
Mgbe mama Calvin nwụrụ, nne nne Calvin kpọọrọ ya. Afọ itoolu gara, ma Calvin ekweghị eso nne nne ya aga chọọchị ha. O kwuru na obi siri ya ike na otu ụbọchị, na ya ga-ahụ “chọọchị” na-ebipụta akwụkwọ ndị ahụ nna ya nyere ya.
Otu ụbọchị, nne nne ya hụrụ otu nwanna nwaanyị, ma ọ maghị na ọ bụ Onyeàmà Jehova. N’ihi ya, ọ gwara nwanna nwaanyị ahụ na nwa nwa ya dị isi ike, na o kweghị eso ha aga chọọchị ha. Kama, ihe ọ na-arụ kwa ụbọchị Sọnde bụ ịgụ akwụkwọ nna ya hapụụrụ ya. Nwanna nwaanyị ahụ jụrụ ya aha akwụkwọ ahụ. Nne nne Calvin kwuru na ọ dị ka ọ̀ bụ “otu n’ime akwụkwọ iberiibe ndị ahụ ndị Ụlọ Nche na-ebipụta.”
Nwanna nwaanyị ahụ kwuru na ya chọrọ ịhụ Calvin. Obi tọrọ Calvin ezigbo ụtọ mgbe ọ hụrụ nwanna nwaanyị ahụ. Nwanna nwaanyị ahụ ji akwụkwọ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? malite ịmụrụ ya ihe ozugbo, ya agawa ọmụmụ ihe n’egbughị oge n’agbanyeghị mmegide kpụ ọkụ n’ọnụ nne nne ya na-emegide ya. O kpebisiri ike na ya agaghị ahapụ eziokwu ọ mụtara. Ọ na-atụsikwa anya ike ịhụ nne ya na nna ya mgbe ha ga-esi n’ọnwụ bilie. E mere Calvin baptizim n’ọnwa asatọ n’afọ 2012.
“Chi Ahụ Ị Na-efe Dị Ike”
E nwere otu nwaanyị bi na Yuganda aha ya bụ Caro. Di ya bụ́ Martin bụ onye amoosu. Caro malitere ịmụ Baịbụl. Ma mgbe naanị otu ọnwa gara, di ya ji iwe bido imegide ya. Di ya kwuru, sị: “Akwụkwọ gị emeela ka ndị nna nna anyị ghara ịna-abata n’ụlọ anyị.” Ọ nọ na-arụsa nwunye ya arụrụala, kwuokwa na ya ga-egbu ya ma ọ bụrụ na ọ kwụsịghị ịmụ Baịbụl. Ọ kwụsịkwara igboro ndị ezinụlọ ya mkpa ha. Caro weturu obi, were ihe ọ na-akọta n’ugbo na-elekọta ezinụlọ ha ma na-amụ Baịbụl. Caro mechara si n’ụlọ ha gbapụ mgbe o doro anya na di ya chọrọ igbu ya. Ọ gbalịsiri ike ịna-akpata ihe ọ ga na-eri. Ma, mgbe ọ nụrụ na ụmụ ya na-arịa ọrịa, o ji obere ego ọ kpatara zụtara ha ọgwụ.
Ka oge na-aga, di Caro kpọrọ ya n’ekwentị, sị ya: “Achọrọ m ka ị lọta. Ahụla m na Chi ahụ ị na-efe dị ike nakwa na ọ nọnyeere gị. Achọrọ m ka ị gwa ndị ahụ na-akụziri gị ihe ka ha bịa kụziwere m. N’eziokwu, achọrọ m ịgbanwe otú m si ebi ndụ.” Ihe ahụ Martin kwuru abụghị egwuregwu. Ezinụlọ ahụ dum dịzi n’otu ma na-enwe obi ụtọ. E mere Martin na Caro baptizim n’otu mgbakọ distrikti e mere n’ọnwa asatọ n’afọ 2012.
Onye Naanị Ya Na-ekwusa Ozi Ọma n’Otu Obodo Dịpụrụ Adịpụ
David bụ onye obodo Lokicha nke dị na Kenya. Ndịàmà Jehova malitere ịmụrụ ya Baịbụl mgbe o bi n’otu obodo dị ezigbo anya. Ma, n’oge na-adịghị anya, o kpebiri ịlaghachi n’obodo ha, bụ́ ebe dịpụrụ adịpụ, nke dị n’agbata ebe ugwu na ebe ọdịda anyanwụ Kenya. Ọgbakọ kacha dịrị ya nso dị n’obodo Lodwa, nke dị ihe dị ka otu narị kilomita na iri isii na ise. Ruo afọ anọ, David na Ndịàmà Jehova hụrụ naanị ugboro ole na ole. Ma, ọ nọ na-ezi ndị agbata obi ya na ndị ikwu ya ozi ọma, na-agwa ha ihe ndị ọ mụtara n’obere oge ahụ ọ mụrụ Baịbụl. Ụfọdụ ndị gere ya ntị. N’oge na-adịghị anya, o nwetara ọtụtụ ndị ọ na-amụrụ Baịbụl. N’afọ 2007, ọ gakwuuru ụmụnna nọ n’obodo Lodwa, ha amalitekwa ịmụrụ ya ihe. Ọ na-aba ọgba tum tum, tagzi, na obere bọs aga ebe ahụ ugboro abụọ n’ọnwa.
Ka David na-amụtakwu ihe, otú ahụ ka ọ na-ekwusasi ozi ọma ike. Ọ bụ eziokwu na e mebeghị ya baptizim, o ji ájá na akịrịka rụọ ebe ọ kpọrọ Ụlọ Nzukọ Alaeze n’akụkụ ụlọ ya. Ọ bụ n’ebe ahụ ka ya na ndị nwere mmasị na-anọ enwe ọmụmụ ihe ọgbakọ. Ma, ọ bụghị mmadụ niile nọ n’obodo ha ka obi dị ụtọ na ọ na-ezi ndị mmadụ ozi ọma. Ndị mmadụ kparịrị ya ma na-arụsa ya arụrụala ruo afọ abụọ. O nwere mgbe ụfọdụ ndị obodo ha kụrụ ya isi aba okpu, na-ekwu na o ji “ofufe Ekwensu” bịa n’obodo ha. Ma, mgbe David gara gwa ndị uwe ojii ka ha nyere ya aka, ndị mmadụ kwụsịrị iti ya ihe, ya ana-ekwusa ozi ọma. David kwuru, sị: “Ihe kacha m mkpa bụ eziokwu Baịbụl. E nweghị ụdị mmegide ga-eme ka m kwụsị.”
N’afọ 2009, e mere David baptizim. Ọ bụ ohu na-eje ozi na ọsụ ụzọ oge niile ugbu a. Nwa ya nwoke dị afọ iri na ise. Ọ bụ naanị ha abụọ bụ ndị nkwusa e nwere n’ebe ahụ. Ma n’ọnwa anọ n’afọ 2012, ihe dị ka mmadụ iri isii bụ́ ndị obodo ahụ bịara Ncheta Ọnwụ Jizọs, nke e mere n’ụlọ ahụ David rụrụ n’akụkụ ụlọ ya.
‘Jiri Akwụkwọ Nsọ Gosi na Ihe O Kwuru Abụghị Eziokwu’
Na Gana, e nwere otu nwanna nwaanyị bụ́ ọsụ ụzọ aha ya bụ Janet. Mgbe ọ nọ na bọs na-aga ebe dị ezigbo anya, ọ nọ na-agụ akwụkwọ Bible Na-akụzi. Otu nwoke batara na bọs ahụ, kwuchaa okwuchukwu, gwa ndị mmadụ ka ha tụọrọ ya ego. Janet gwara ya, sị: “I kwuru na ọ bụ Jizọs bụkwa Chineke. Oleezi onye gwara Jizọs okwu mgbe a na-eme ya baptizim?”
Nwoke ahụ sịrị ya, “Ọ bụ ihe omimi.”
Janet meghere isi nke anọ n’akwụkwọ Bible Na-akụzi, họrọ amaokwu ụfọdụ, gwa ndị ọzọ nọ na bọs ahụ ka ha gụpụta amaokwu ndị ahụ. Ọ kọwara ihe dị iche na Jizọs na Jehova, bụ́ Chineke Pụrụ Ime Ihe Niile.
Nwoke ahụ sịrị ya: “Ị bụ onye amoosu.”
N’ihi ya, ndị nọ n’ụgbọala ahụ gbachiteere Janet ma sị nwoke ahụ: “Kama ịkpọ ya onye amoosu, i kwesịrị iji Akwụkwọ Nsọ gosi na ihe o kwuru abụghị eziokwu.” Iwe were nwoke ahụ, ya arịtuo mgbe a gbatụrụ obere. Otu nwa agbọghọ nọ Janet n’akụkụ gwara ya, sị: “Echere m na Jehova bụ aha ụlọ chọọchị Ndịàmà Jehova. Amaghị m na ọ bụ aha Chineke. Ọ bụ ụka gị na nwoke ahụ kparịtara mere ka m mata ya.”
Ha abụọ kwurịtara ihe gbasara Baịbụl. Janet natara nwa agbọghọ ahụ nọmba ekwentị ya ma gwa ya na ya ga-akpọ ya. Nwa agbọghọ ahụ lara, kọọrọ nne nne ya ihe merenụ. O juru nne nne ya anya ịnụ na aha Chineke bụ Jehova. Janet mechara gwa ụfọdụ ụmụnna ka ha gaa mụwara nwa agbọghọ ahụ na nne nne ya Baịbụl. Ha abụọ na-agazi ọmụmụ ihe.
MBA NDỊ DỊ N’AMERỊKA
MBA 57
MMADỤ OLE BI NA HA 946,087,916
NDỊ NKWUSA OLE NỌ NA HA 3,861,145
MMADỤ OLE A MỤỤRỤ BAỊBỤL 4,196,922
Ọ Hụrụ Eziokwu n’Ebe Ọ Na-atụghị Anya Ya
Na Bolivia, ndị na-eche ụlọ mkpọrọ nche kpụụrụ otu nwa agbọghọ dị afọ iri abụọ aha ya bụ Andrea banye n’ụlọ mkpọrọ. Ọ nọ na-akpọ ha iyi, na-ekwukwa na ya ga-emesi ha ike. Otú o si akpa ike mere ka ndị mmadụ na-atụ ya ụjọ. E nwere otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Leidy. E boro ya ebubo ụgha ma tụọ ya mkpọrọ n’ebe ahụ. Ọ tụghị Andrea egwu, kama o meteere ya ebere. Kwa ụtụtụ, Leidy na-agụpụta ihe e dere n’otu abụ n’akwụkwọ abụ anyị. Mgbe Andrea nụrụ ihe ọ na-agụ, ọ jụrụ ya, sị, “Ị̀ bụ Onyeàmà Jehova?”
Peruu: Ebe a na-ezi ndị ọrụ ugbo ozi ọma n’ugwu dị n’akụkụ Ndagwurugwu Utkubamba
Mgbe Leidy gwara Andrea na ya bụ, Andrea kwuru, sị: “Mama m bụ Onyeàmà Jehova. M na-esobu ya aga ọmụmụ ihe. Ọ mụụrụ m Baịbụl.” Andrea malitere ibe ákwá. Leidy na Andrea kwurịtara ihe banyere Chineke ruo ụbọchị ole na ole. Mgbe oge a ga-ekpe Andrea ikpe ruru, ha abụọ kpere ekpere rịọ Jehova ka o nyere ya aka ma duzie ya. E mechara hapụ Andrea, ya ana-amụkwu banyere Jehova. N’oge na-adịghị anya, o ruru eru ịbụ onye nkwusa a na-emebeghị baptizim. Ọ na-ejikere ugbu a ka e mee ya baptizim.
Leidy ji oge ahụ a tụrụ ya mkpọrọ arụrụala malitere mmadụ iri abụọ na otu ọmụmụ Baịbụl tupu a hapụ ya. Ugbu a, ọ na-aga n’ụlọ mkpọrọ ahụ ugboro atọ kwa izu ịmụrụ ndị nwere mmasị Baịbụl.
Ọ Bụ Adres Ịntanet Bụ́ www.jw.org
N’otu ụbọchị Sọnde n’ihe dị ka n’ọnwa anọ n’afọ 2011, otu nwoke na nwunye ya na ụmụ ya jiri ejiji dị mma bata n’otu Ụlọ Nzukọ Alaeze dị na Kanada. Mmadụ niile chere na ha bụ ụmụnna si n’obodo ọzọ bịa ileta mmadụ. N’ọgbakọ ahụ, e nwere otu ohu na-eje ozi aha ya bụ Dominic. Ya na nwoke ahụ matara ibe ha ozugbo. Dominic mụụrụ nwoke ahụ Baịbụl ihe dị ka afọ iri na asaa tupu mgbe ahụ. Aha nwoke ahụ bụ Marc-André. Aha nwunye ya abụrụ Josée. Kemgbe afọ abụọ, ha abụọ na-aga n’adres Ịntanet anyị bụ́ www.jw.org na-agụ Ụlọ Nche na Teta! ma ghọta na ezinụlọ ha dum kwesịrị ịna-aga n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. A malitere ịmụrụ ha Baịbụl ozugbo. Ha niile bidokwara ịga ọmụmụ ihe niile. Mgbe a mụụrụ ha ihe naanị ọnwa abụọ, ha malitere inwe Ofufe Ezinụlọ kwa izu. Ha na-eme nke ọma. Josée mere ihe omume mbụ ya n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke n’ọnwa ise n’afọ 2012.
‘O Nyere M Nri Ehihie Ya na Okpu Ya’
N’obodo Chili, e nwere otu nwata nwoke dị afọ iri aha ya bụ Marcelo. Mgbe ọ nọ ná mgbakọ distrikti nke afọ 2010, ọ hụrụ na otu agadi nwoke nọ n’akụkụ ya ejighị akwụkwọ ọ bụla. Aha nwoke ahụ bụ Victor.
Marcelo takwunyeere mama ya, sị: “Nwoke a ejighị Baịbụl.”
Mama ya sịrị ya: “Jiri nke gị na-egosi ya ebe a na-agụ.” N’ihi ya, Marcelo nọketere nwoke ahụ ma na-egosi ya ebe ọ bụla a kpọrọ ka a gụọ. Mgbe a gbasara nke ụtụtụ, Marcelo gwara mama ya, sị: “Nwoke a ejighị nri bịa.” Mama ya gwara ya ka o nyetụ nwoke ahụ nri nke ya. N’ihi ya, Marcelo nyere Victor bred na otu iko tii dị ọkụ. Ka Victor na-eri nri ahụ, Marcelo gosiri ya amaokwu Baịbụl niile o chetara.
N’ehihie, anwụ malitere ịchasi ike. Marcelo tụgharịrị gwakwa mama ya, sị: “Nwoke a ejighị okpu bịa.”
Mama ya sịrị ya: “Nye ya nke gị.” N’ihi ya, o weere okpu ya nye Victor. Mgbe a gbasara, Marcelo na Victor sịrị ibe ha ka e mesịa.
Ná mgbakọ distrikti nke afọ 2011, Marcelo legharịrị anya ka ọ mara ma Victor ọ̀ bịara. Obi tọrọ ya ụtọ mgbe ọ hụrụ Victor n’ebe ahụ, hụkwa na ọ kpọ taị! Mgbe Victor hụrụ Marcelo, ọ gwara ndị nọ ebe ahụ, sị: “Ọ bụ nwatakịrị a mere ka m nọrọ ebe a taa. N’afọ gara aga, abịara m mgbakọ distrikti n’ihi na e nyere m akwụkwọ ịkpọ òkù. Nwatakịrị a ji Baịbụl ya na-egosi m ebe a na-agụ, nye m nri ehihie ya na okpu ya. M na-amụ Baịbụl ugbu a.” Victor aghọọla onye nkwusa a na-emebeghị baptizim.
Onye Nta Akụkọ Toro Ndịàmà Jehova
N’otu akwụkwọ akụkọ, otu onye nta akụkọ a ma ama na Venezuwela dere ihe mere mgbe ọ kpọrọ ụlọ ọrụ telefon ka ha nyere ya aka ná nsogbu laịn ya na-enwe. Onye zara ya enyereghị ya aka. O jighịkwa olu ọma gwa ya okwu. Mgbe ọ kpọrọ ọzọ, onye zara ya bụ otu nwa okorobịa kwuru na aha ya bụ “Misael.” O weturu obi zaa ya ajụjụ ya ma nyere ya aka. O dere, sị: “Obiọma nwa okorobịa ahụ na otú o si kwanyere m ùgwù ma jiri olu ọma nyere m aka mgbe mụ na ya na-ekwurịta okwu enweghị atụ. O nyeere m aka idozi nsogbu ahụ, meekwa ka m mata ihe m ga-eme ma ụdị ihe ahụ mee ọzọ.”
Mgbe nwaanyị ahụ jara Misael mma, Misael gwara ya na ya bụ Onyeàmà Jehova nakwa na ya na-agbalị imeso ndị agbata obi ya otú Jizọs kwuru ka a na-eme. Onye nta akụkọ ahụ kwuru na ya chọrọ ịgwa onyeisi Misael n’ụlọ ọrụ ahụ okwu. Ọ jara Misael mma maka otú o si arụ ọrụ ya nke ọma. N’akwụkwọ akụkọ ahụ, nwaanyị ahụ kwuru na Misael bụ onye Venezuwela nke na-akpa àgwà ọma nakwa na ọ bụ Onyeàmà Jehova. Ihe ikpeazụ o dere bụ: “Ọ bụ ndị na-akpa ụdị àgwà ahụ kwesịrị ịna-arụ ọrụ n’ebe niile a na-arụrụ ọhaneze ọrụ.”
“Unu Akpọchila Ntị!”
Meksiko Siti nke dị na Meksiko: Ndị a na-amụrụ Baịbụl na Meksiko karịrị otu nde. Ndị nkwusa maliteere ọtụtụ n’ime ha ọmụmụ Baịbụl mgbe a na-agba àmà okporo ámá
E nwere otu nwata nwaanyị dị afọ iri na ise aha ya bụ Gabriela. Ọ dara ogbi. Obi dị ya ezigbo ụtọ mgbe e mere ya baptizim n’ọnwa iri n’afọ 2011, ná mgbakọ distrikti ndị ogbi e mere n’Ekwedọọ. Mgbe ọ gara ụlọ akwụkwọ n’ụbọchị Mọnde, otú obi si dị ya ụtọ mere ka ọ gwa onye nkụzi ha na o nwere ihe ya chọrọ ịgwa ụmụ klas ha. Onye nkụzi ahụ kwetara. Gabriela guzoro n’ihu klas ha, jiri obi ụtọ kwuo n’asụsụ ndi ogbi, sị: “M chọrọ ịgwa unu na m gara mgbakọ na Fraịdee, Satọdee, na Sọnde. E mere m baptizim n’ebe ahụ, mụ aghọọ Onyeàmà Jehova. M chọkwara ịgwa unu na anyị bi n’oge ikpeazụ nke usoro ihe ochie a. Oge agwụla agwụ! Onye ọ bụla kwesịrị ịgbanwe àgwà ya ozugbo. N’ihi ya, unu akpọchila ntị. Tụọnụ egwu Chineke!” Ihe o kwuru tọrọ ụmụ klas ha ụtọ.
E nwere nwa agbọghọ ọzọ bụ́ onye ogbi aha ya bụ Katty. Ọ bụ Onyeàmà Jehova, ma ọ naghịzi aga ozi ọma. Mgbe a pụrụ brek n’ụbọchị ahụ, ọ bịara jụọ Gabriela banyere mgbakọ ahụ. Gabriela gwara ya hoo haa, sị: “Ọ tọrọ ezigbo ụtọ. Ma ebe m bụzi Onyeàmà Jehova e mere baptizim, achọrọ m iji obi m niile na-efe Jehova. N’ihi ya, achọrọ m ịgwa gị na mụ na gị agaghịzi abụ enyi n’ihi na ị na-ebi ndụ rụrụ arụ. Ọ bụrụ na mụ na gị ana-akpa, o nwere ike ime ka m ghara ịbụ enyi Chineke. I kwesịrị ịgbanwe àgwà gị. Ọ dị mkpa ka i kpegara Jehova ekpere, gakwurukwa ndị okenye ka ha nyere gị aka. Ama m na i nwere ike ịgbanwe ma kpawa àgwà ọma.” Ndụmọdụ ahụ Gabriela ji obiọma nye Katty n’ezoghị ọnụ mere ka Katty gaa gwa ndị okenye, ha enyere ya aka, ya amalitekwa ije ozi ọma.
O Ji Kọmputa Onye Nkụzi Ha Chọta Ihe
E nwere otu nwanna nwaanyị dị afọ iri na isii bi n’Amerịka. Ndị klas ha niile nọ na-ajụ ya banyere okpukpe ya. Ma o jighị akwụkwọ ọ bụla. O jighịdị Baịbụl ya. Ọ chọrọ iji Baịbụl zaa ajụjụ ụmụ klas ha jụrụ ya. N’ihi ya, ọ rịọrọ onye nkụzi ha ka ya jiri obere kọmputa ya chọta ihe n’adres Ịntanet anyị bụ́ www.jw.org. Ọ zara ha ajụjụ ha niile, gosikwa ha otú e si achọta ihe n’ebe anyị na-edewe ihe n’Ịntanet. Ọ gwara ha na mgbe ọ bụla ha nwere ajụjụ, ọ bụrụkwa na e nweghị Onyeàmà Jehova nọ nso ha ga-ajụ ya, ha nwere ike ịga n’ebe ahụ chọta azịza ya. N’izu ahụ, ọ chọpụtara na ụmụ klas ha anaghịzi ajụkarị ya ajụjụ. Ọ jụrụ ha ihe kpatara ya. Ụfọdụ agwa ya na ha na-ejikarị ekwentị ha achọ ihe n’adres Ịntanet anyị. Onye nkụzi ha sokwa na-achọ ihe n’ebe ahụ.
ESHỊA, IZREL NA MBA NDỊ GBARA YA GBURUGBURU
MBA 48
MMADỤ OLE BI NA HA 4,222,869,785
NDỊ NKWUSA OLE NỌ NA HA 674,608
MMADỤ OLE A MỤỤRỤ BAỊBỤL 662,736
O Mere Ka A Ghara Ịlụso Obodo Ọgụ
E nwere ụmụnna si n’otu obere obodo dị n’Indonisha gafere mgbe ha na-aga olili ozu. Otu ọsụ ụzọ hụrụ ndị na-eto eto guzo n’akụkụ ụzọ. O ziri ha ozi ọma ma nye ha broshọ bụ́ Gee Chineke Ntị Ka I Wee Dị Ndụ Ebighị Ebi. Otu nwanna nwaanyị mechara si ebe ahụ gafee mgbe ọ na-ala. Otu nwoke ejiri broshọ ahụ bịakwute ya ma kelee ya maka akwụkwọ ahụ e nyere ụmụ ya. Nwoke ahụ kwuru, sị: “Akwụkwọ a zọrọ ụmụ m ndụ!” Nwanna nwaanyị ahụ amaghị mgbe e nyere ha akwụkwọ ahụ. Ọ jụrụ nwoke ahụ ihe merenụ. Nwoke ahụ gwara ya na e nwere otu obodo ụmụaka ahụ chọrọ ịga lụso ọgụ. Ha bu n’obi ịga mesie ndị obodo ahụ ike n’ihi ihe ha mere otu enyi ha. Ọ bụ omenala ndị obodo ha. Ma, mgbe ha gụrụ broshọ ahụ, ha mụtara na ndị na-alụ ọgụ agaghị eso biri na Paradaịs ahụ na-abịanụ. O mere ka iwe ha dajụọ, ha agbanwee obi ha ma laghachi n’ụlọ ha. Ozi ọma si na Baịbụl nke dị na broshọ ahụ mere ka a ghara ịlụ ọgụ nke gaara akpata ọgba aghara.
Nwoke nke Na-eme Ka Nwaanyị Gbanwere Otú O Si Ebi Ndụ
Obodo Shau Kei Wan nke dị na Họng Kọng: Ebe a na-ezi nwa agbọghọ ozi ọma n’ahịa
E nwere otu nwa okorobịa toro n’otu ezinụlọ dị na Kambodia. Aha ya bụ Rek. Ya na nwanne ya nwoke bụ ejima. Malite mgbe ha ka dị obere, ọ na-adị ha ka hà bụ ụmụ nwaanyị. Ha na-eji nwa bebi egwuri egwu, na-eyikwa uwe ụmụ nwaanyị. Omume ha na-eme mama ha ihere. Ọ maghịkwa otú ọ ga-esi mee ka ha kwụsị ya. Ha gawa ụlọ akwụkwọ, ha na-eyi uwe ụmụ nwoke. Ma, ha na-eyiri uwe ụmụ nwaanyị ozugbo ha ruru. Mgbe ha dị afọ iri na isii, ha gara asọmpi e mere maka ụmụ nwoke na-eyi uwe ụmụ nwaanyị na ụmụ nwaanyị na-eyi uwe ụmụ nwoke. Asọmpi ahụ mere ka ndị na-eme fim mata ụmụ ejima ahụ. A malitere igosi ha na tiivi. Ha sokwa na-eme soro m chịa. N’oge na-adịghị anya, Rek malitere idina nwoke ibe ya, ya na ụmụ nwoke ndị na-eji ejiji ka ụmụ nwaanyị na-akpakwa.
Mama Rek malitere ịga chọọchị, meekwa ka Rek soro ya na-aga. N’agbanyeghị na Rek kwetara na-eyi uwe ụmụ nwoke, o kweghị akpụ ogologo ntutu isi ya. Pastọ chọọchị ha na-akparịkarị Rek, na-akọkwa ya ọnụ maka ụdị ndụ ọ na-ebi. Ma, Rek chere na ya ga-agbalị mụọ Baịbụl na chọọchị ahụ. N’izu nke mbụ, Rek tetara ụra n’isi ụtụtụ, gbaa ígwè ọtụtụ kilomita gaa na chọọchị ahụ. Ma, pastọ ahụ kwuru na ya agaghị akụziri ya ihe ọ bụla. N’izu nke abụọ, ezigbo iwe were Rek mgbe pastọ ahụ na-ekweghịdị ka ya na ya hụ.
Ma, mgbe Rek lọtara, ejima ya gwara ya na otu nwaanyị bịara n’ụlọ ha nakwa na o kwetara ịbịa n’ụlọ ha na-amụrụ ya Baịbụl n’anaghị ego. Nwaanyị ahụ nyere ya akwụkwọ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Ya na di ya malitere ịmụrụ ụmụ ejima ahụ ihe. Mgbe ọnwa isii gachara, ejima Rek kwụsịrị imụ ihe n’ihi na ọ chọbeghị ịgbanwe otú o si ebi ndụ. Ma, ihe e kwuru ná 1 Ndị Kọrịnt 6:9, 10 ruru Rek n’obi. Ọ ghọtakwara ihe o kwesịrị ime. Ọ kwụsịrị ibi ndụ rụrụ arụ. Ihe nyeere ya aka bụ ịmụsi ihe ike, ịgụ Baịbụl, ikpe ekpere, na ịga ọmụmụ ihe. Mama Rek na-amụ Baịbụl ugbu a, na-emekwa nke ọma. Mgbe e mere Rek baptizim, anya mmiri juru mama ya anya mgbe o kwuru, sị: “Obi dị m ezigbo ụtọ ịhụ ka e mere nwa m baptizim, ya ekweta na ya bụ nwoke.” Ọ bụ ọsụ ụzọ oge niile ugbu a.
Nwaanyị Mgbaasị Gbanwere Otú O Si Ebi Ndụ
Otu nwaanyị aha ya bụ Or-Ya bụ onye mgbaasị, na-agwọ ọrịa, na-enye ndị mmadụ ndụmọdụ, na-ekwukwa ihe ga-eme n’ọdịnihu. E nwere di na nwunye, bụ́ ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche, n’obodo Haịfa dị n’Izrel. Ha hụrụ nwaanyị ahụ mgbe ha na-ekwusa ozi ọma n’ụlọ n’ụlọ. Mgbe ha kụrụ aka n’ọnụ ụzọ ya, ọ sịrị ha: “Ọ bụrụ na unu na-ekwu banyere Chineke, batawanụ!” Ihe juru n’ụlọ ya bụ ngwongwo ndị e ji eme mgbaasị. O kwuru na Chineke na-agwa ya okwu, na mgbe ụfọdụ, ọ na-esi n’aka “mmụọ” onye nkụzi okpukpe ha nwụrụ anwụ.
Obi dị ya ụtọ mgbe ha gwara ya na ha ga-eji akwụkwọ Bible Na-akụzi na-amụrụ ya ihe n’ụlọ ya. Ụbọchị abụọ tupu ha abịa n’ụlọ nwaanyị ahụ, o kpere ekpere rịọ Chineke ka o zitere ya onye ga na-akụziri ya Baịbụl. Ma, ọ rịọrọ Chineke ka ọ bụrụ onye na-agaghị akọwa ya otú ndị nkụzi okpukpe ha si akụzi. Tupu otu ọnwa agaa, ọ jụrụ ụmụnna ndị ahụ, sị: “È nwere ndị ọzọ kweere ihe ndị unu kweere?” Ọ gara ọmụmụ ihe. Otú e si nabata ya ma gosi ya ịhụnanya tọrọ ya ụtọ. Ọ na-agachi ọmụmụ ihe anya kemgbe ahụ.
“Naanị ọnwa abụọ ka unu nwere iji mee ka m ruo eruo ka e mee m baptizim!”
Mgbe Or-Ya mụrụ ihe ọnwa abụọ, ọ jụrụ banyere mgbakọ na-abịanụ, sị: “Ọ́ bụghị ná mgbakọ ka a na-eme ndị mmadụ baptizim? Ọ bụrụ otú ahụ, naanị ọnwa abụọ ka unu nwere iji mee ka m ruo eruo ka e mee m baptizim.” Ihe mbụ o mere bụ ịtụfu ihe niile o ji eme mgbaasị n’agbanyeghị na ọ zụrụ ha oké ọnụ. Ọ kwụsịrị ime mgbaasị, malite izi ndị ọzọ ozi ọma. Ọ na-egosi ndị niile ọ na-agwọbu ọrịa na ndị ọ na-emeburu mgbaasị akwụkwọ Bible Na-akụzi na magazin. Mgbe ọ rịawara ọrịa, o kweghị eme ihe ndị ọ na-emebu mgbe ọ na-agwọ ọrịa. Ịkwụsị ọrụ mgbaasị ahụ mere ka ego ghara ịbata ya n’aka ruo ọnwa anọ. Ma, o kpebiri na ya ga na-arụ ọrụ naanị ụbọchị anọ n’izu nakwa awa isii n’ụbọchị ka ya nwee ike ịna-amụ ihe, na-aga ozi ọma na ọmụmụ ihe. O mechara chọta ụdị ọrụ ọ chọrọ. O rere nnukwu ụlọ ya, gaa biri n’obere ụlọ ebe ọ na-akwụ ụgwọ.
Or-Ya mechara ruo eruo ka e mee ya baptizim. Ma, otu izu tupu ha agaa mgbakọ, ọ gbajiri ụkwụ. Ma ọ daghị mbà. O bu ihe e kere ya n’ụkwụ gaa mee baptizim. Ugbu a, ọ bụ onye nkwusa na-anụ ọkụ n’obi. Ọ na-ezikwa ndị ọ na-emeburu mgbaasị ozi ọma, na-amụkwara ụfọdụ ndị Baịbụl.
Otú Onye Nọ n’Òtù Nzuzo Si Chọta Eziokwu
N’otu ebe bụ́ ugwu ugwu na Filipinz, e nwere ụmụ nwoke abụọ bụ́ ejima a malitere ịmụrụ Baịbụl. Ha abụọ dara ogbi. Ha nọ n’òtù ndị kweere na e nweghị ihe a ga-eji merụọ ha ahụ́ ma ọ bụrụhaala na ha ji ọtụmọkpọ ha na ákwà ha ji echebe onwe ha. A kụziiri ha otú e si eji mma na égbè alụ ọgụ. Ha esorokwala gaa lụso ndị agha na-agba gọọmenti mgba okpuru ọgụ ọtụtụ ugboro n’ebe ndị bụ́ ugwu ugwu. Ndị isi òtù ahụ kwere ka ụmụ ejima ahụ na-amụ Baịbụl ma ọ bụrụhaala na Ndịàmà Jehova agaghị amanye ha isi n’òtù ha pụọ.
Ụmụnna gbara ụmụ ejima ahụ ume ka ha jiri ihe ha na-amụta na Baịbụl kpebie ihe ha ga-eme. Otu n’ime ha achọghị ịgbanwe otú o si ebi ndụ iji fewe Chineke nke ọma. Ma, ejima ya akwụsịghị ịmụ Baịbụl. Iji gbaa ya ume, nwanna na-amụrụ ya ihe mepere Baịbụl, jiri asụsụ ndị ogbi gwa ya, sị: “Samuel ị na-aza dị na Baịbụl. Samuel Baịbụl kọrọ akụkọ ya fere ezi Chineke, bụ́ Jehova, ruo mgbe o mere agadi. Gịnwa nwekwara ike iji obi gị niile rubere Jehova isi.” Ihe a o kwuru ruru Samuel n’obi. Samuel chere, sị: “Ọ bụrụ na aha m dị na Baịbụl, m kwesịrị ife Jehova.” Ọ gwara ndị òtù ya na ya ga-esi n’ebe ahụ kwapụ. Ọ kpọrọ ọtụmọkpọ ya niile na ihe ndị ha ji eme mgbaasị ọkụ ma na-eme nke ọma n’ihe gbasara ofufe Chineke. E meela ya baptizim. O jikwa ịnụ ọkụ n’obi na-enyere ndị ogbi ibe ya aka ịmụta eziokwu Baịbụl.
Nwatakịrị A Nọ Na-akpagbu
Obodo Edenet nke dị na Mọngolịa: Ebe a na-amụrụ nwaanyị bi n’ebe dịpụrụ adịpụ Baịbụl
E nwere otu nwata nwoke bi n’otu ime obodo dị n’ebe ugwu India. Aha ya bụ Rajiv. Mgbe ọ dị afọ itoolu ma nọrọ na klas nke anọ n’ụlọ akwụkwọ praịmarị, onye nkụzi ha, bụ́ Onyeàmà Jehova, ji akwụkwọ Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ kụziere ndị klas ha otú e si akpa àgwà ọma. Rajiv kwetara ihe niile ọ kụziiri ha, malitekwa ime ya. Ọ gwara onye nkụzi ha na ya akwụsịla ịgha ụgha na ịlụ ọgụ nakwa na e nwee ụmụ akwụkwọ na-ejighị nri ehihie bịa, na ya na-enyetụ ha nke ya.
Ị bịadala isi m n’ihu ihe a a kpụrụ akpụ, ma ị gaghị emeli ka m kpọọrọ ya isiala”
Ka ọ na-amụtakwu banyere nkwa Chineke kwere na ụwa ga-abụ Paradaịs, ọ malitere ịgwa ndị ọzọ ihe ọ na-amụta, ma ndị obodo ha ma ndị ha na ya bakọrọ ụgbọ okporo ígwè. Ozi ọma Rajiv na-ezi were nne ya na nna ya iwe, na-emekwa ha ihere. Ha gwara ya ka ọ kwụsị ikwu banyere Jehova na Jizọs. Ma o kweghị akwụsị. N’ihi ya, ha malitere iti ya ihe. Mama ya na-ezokwa uwe ya niile ka ọ ghara ịhụ nke ọ ga-eyi gaa na-agwa ndị mmadụ banyere ihe ọhụrụ ndị ọ mụtara. Ha ekweghị ka ọ na-ehi n’àkwà ya. Ha anaghịkwa enyeju ya afọ. Mgbe ha hụrụ na ihe niile ha na-eme ya emeghị ka ọ gbanwee, ha kpọrọ onyeisi okpukpe ha ka ọ bịa mee ka Rajiv gbanwee obi ya.
Nwoke ahụ nọrọ n’ụlọ ha ọtụtụ ụbọchị, na-agbalị ịmanye Rajiv ka ọ kpọọrọ arụsị ha isiala. Mgbe Rajiv kwuru na arụsị ahụ bụ okwute nkịtị, na ọ bụghị chi dị ndụ, nwoke ahụ gwara ya na o nwee okwukwe, na ọ ga-ahụ na ihe ahụ bụ chi. Rajiv weere otu mpempe akwụkwọ, dee ihe dị ka otu narị naịra n’elu ya. O nyere ya nwoke ahụ, sị ya jiri ya gaa zụta ihe ma wetara ya ego fọrọnụ. Nwoke ahụ gwara Rajiv na ya abụghị onye iberiibe, na ihe ahụ bụ mpempe akwụkwọ nkịtị, na ọ bụghị ego. Rajiv sịrị ya: “Ọ bụrụ na i nwere okwukwe, i lee mpempe akwụkwọ a anya, ị ga-ahụ na ọ bụ ezigbo ego.” Nwoke ahụ ji iwe bịada isi Rajiv n’ihu arụsị ahụ. Rajiv asị ya: “Ị bịadala isi m n’ihu ihe a a kpụrụ akpụ, ma ị gaghị emeli ka m kpọọrọ ya isiala.” N’ikpeazụ, nwoke ahụ lawara, kwuo na e nweghị onye ga-agbanweli nwata ahụ nakwa na ọ bụrụ na ya anọkwuo n’ebe ahụ, na ya agaghịzi ekwere ihe ya kweere. Nne na nna Rajiv tinyeziri ya n’ụlọ akwụkwọ ọzọ. Ma Rajiv akwụsịbeghị ịgwa onye ọ bụla chọrọ ịnụ banyere Jehova na Paradaịs o kwere ná nkwa. Ugbu a ọ dị afọ iri, ọ ka tụkwasịrị Jehova obi ka o nyere ya aka mee ka okwukwe ya na-esikwu ike.
Ọ Hụrụ Baịbụl Ọ Na-achọ
N’Aminia, mgbe otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Larisa na-ezi otu nwaanyị na-ere akwụkwọ ozi ọma, otu nwaanyị batara, jụọ onye ahụ ma ò nwere Baịbụl “Ụwa Ọhụrụ.” Nwaanyị nke na-ere akwụkwọ gwara ya na ya enweghị Baịbụl ahụ, ma na ya nwere Baịbụl ọzọ n’asụsụ Aminia. Nwaanyị ahụ jụrụ ya, sị: “Ọ̀ dị mfe nghọta?” Onye ahụ na-ere akwụkwọ gụrụ amaokwu ole na ole na Baịbụl ahụ, sị ya, “O yiri ka ọ̀ dị mfe nghọta.” Nwaanyị ahụ ekwetaghị ihe o kwuru. N’ihi ya, ọ gwara nwaanyị ahụ na-ere akwụkwọ na ihe ya chọrọ bụ Baịbụl “Ụwa Ọhụrụ.” Larisa chetara ozugbo na Baịbụl e dere n’asụsụ Aminia dị n’akpa ya. O gosiri ya nwaanyị ahụ, sị ya gụọ ihe e dere n’elu ya. Nwaanyị ahụ gụrụ, “Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ.” Ọ bụ Baịbụl a ka ọ na-achọ!
Nwaanyị ahụ kwuru na nwa ya nwaanyị na di ya bi na Gris, ma Ndịàmà Jehova ka malitere ịmụrụ ha Baịbụl amalite. Ebe ọ bụ na ha amụtabeghị asụsụ Grik, ha gwara ya ka o wetara ha Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ e dere n’asụsụ Aminia ma ọ bịawa ileta ha ọzọ. Nwanna nwaanyị ahụ nyere ya Baịbụl ahụ, sị ya, “Biko nye ha Baịbụl a, gwakwa ha na ọ bụ onyinye Jehova nyere ha.” Obi tọrọ nwaanyị ahụ ụtọ mgbe Larisa gwara ya ka ya bịa mụwara ya Baịbụl. Larisa natara nwaanyị ahụ nọmba ekwentị ya, nyekwa ya nọmba nke ya ka e nwee ike ịmalite ịmụrụ ya Baịbụl ma o si Gris lọta.
YUROP
MBA 47
MMADỤ OLE BI NA HA 738,679,198
NDỊ NKWUSA OLE NỌ NA HA 1,595,888
MMADỤ OLE A MỤỤRỤ BAỊBỤL 841,260
O Weghachiri Obere Akpa Ego Ọ Tụtụtara
Na Bọznia, e nwere otu nwanna nwaanyị bụ́ ọsụ ụzọ aha ya bụ Nina. Ọ na-amụrụ otu ezinụlọ na-asụ asụsụ Romani Baịbụl. E nwere otu nwata nwaanyị dị afọ iri n’ezinụlọ ahụ. Otu ụbọchị, ka ọ na-agbada n’okporo ámá, ọ tụtụtara otu obere akpa. Ihe dị na ya bụ ma ego ma kaadị e ji azụ ihe ma akwụkwọ ụfọdụ. A sị na ọ bụ mgbe ha na-amụwabeghị Baịbụl, ọ gaara ewere ya na ọ bụ onyinye. Ma, ya na mama ya kwurịtara otú a ga-eme akpa ahụ, ya ekpebie ịga nye ya ndị uwe ojii. Ihe ahụ o kpebiri ime nwere ike iju mmadụ anya n’ihi na ezinụlọ ha dara ogbenye. Ọ na-esidịrị ha ike inweta ego ha ji azụta ihe ha ga-eri. O juru onye uwe ojii anya mgbe e nyere ya akpa ahụ. Mgbe awa abụọ gara, a kpọrọ ezinụlọ ahụ n’ekwentị, gwa ha ka ha bịa n’ụlọ ọrụ ndị uwe ojii. Onye nwe akpa ahụ nọ ebe ahụ na-eche ha ka o kelee ha ma chọtụrụ ha ihe. O nyere ha ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ puku naịra ise. O ruru ego ole mmadụ ga-arụta n’ụbọchị abụọ.
Isiokwu Ya Masịrị Ya
Obodo Jọgv nke dị na Feroo Aịlandz: N’afọ 2012, ọnụ ọgụgụ kacha elu nke ndị nkwusa e nwere n’agwaetiti ndị a bụ 118
Na Bọznia, otu nwanna aha ya bụ Nihad mechiri ozi ọma, rute n’ebe ụgbọala ya dị, hụ otu nwoke guzo n’akụkụ ụgbọala ahụ. Nihad kelere ya, ya asị Nihad: “Biko, ewela iwe. Elere m anya n’ụgbọala gị, hụ otu isiokwu magazin bụ́ ‘Otú Ị Ga-esi Bụrụ Ezigbo Nna.’ Achọrọ m inweta magazin ahụ. Anọ m ebe a kemgbe ihe dị ka otu awa, na-eche onye nwe ya. Biko, nyenụ m ya.” Obi dị Nihad ezigbo ụtọ inye ya magazin ahụ. O jikwa ohere ahụ zie nwoke ahụ ozi ọma.
A Kasiri Ndị Na-arụ Ọrụ n’Ụgbọ Mmiri Obi
Na Nedalandz, otu nwanna na nwunye ya na-ezi ozi ọma n’ọdụ ụgbọ mmiri dị n’obodo Rọtadam. Mgbe ha banyere n’otu ụgbọ mmiri, ha hụrụ ka ndị na-arụ ọrụ n’ụgbọ ahụ nọcha ka ndị mmadụ nwụnahụrụ. Anya mmiri juru onyeisi ha anya ka ọ na-agwa ụmụnna ndị ahụ na ha enweela ọtụtụ nsogbu n’ụgbọ ha. Ọtụtụ ugboro, ọ fọrọ obere ka ụgbọ nke ha na ụgbọ ọzọ suo ihu na ihu, ya emebiekwa ihe ụfọdụ n’ụgbọ ha. N’ihi ya, nwoke ahụ gwara ha, sị: “Biko, kpeerenụ anyị ekpere.” Nwanna ahụ na nwunye ya gwara ya na ha ga-eji Baịbụl gbaa ha ume. N’elekere asaa ná mgbede echi ya, ndị nkwusa ahụ na ụmụnna anọ ndị ọzọ, ndị bụ́kwa di na nwunye, batara n’ụgbọ mmiri ahụ, a nabata ha. Ndị nọ ebe ahụ bụ mmadụ iri na ise n’ime mmadụ iri na isii na-arụ ọrụ n’ụgbọ mmiri ahụ. Mgbe e kpechara ekpere mmeghe, otu nwanna kwuru okwu isiokwu ya bụ “Ọ̀ Bụ Chineke Na-akpata Ọdachi?” Ụmụnna ndị ahụ ji ọtụtụ Baịbụl bịa ma na-enyere ndị ahụ na-arụ ọrụ n’ụgbọ mmiri aka ịsapeta amaokwu ndị a chọrọ ịgụ. Mgbe e kpechara ekpere mmechi, ndị ahụ niile na-arụ ọrụ n’ụgbọ mmiri ka nọdụrụ ala, ha na ụmụnna ndị ahụ ana-akparịta ụka. Obi ruru ndị ahụ ala, dịkwa ha ụtọ. Otu n’ime ha kwuru, sị, “Ihe a bụ otú Chineke si zaa ekpere anyị.” Ha naara akwụkwọ iri abụọ nakwa Baịbụl na ihe ndị ọzọ. Onyeisi ụgbọ mmiri ahụ mechara nye ndị nkwusa ahụ onyinye si ha n’obi maka akwụkwọ ndị ahụ. Ọ karịrị iri puku naịra atọ.
O Kpere Ekpere Ka O Nwee Ike Inye Aka
E nwere otu nwanna nwaanyị bi na Swidin aha ya bụ Irene. O dere, sị: “Adị m afọ iri asatọ. Ahụ́ mgbu anaghị ekwe m gaa ozi ọma. M kpere ekpere, rịọ Jehova ka e nwee onye m ga-enyere aka. Arịọrọ m ya ka ọ bụrụ onye m gara na nke ya ọtụtụ afọ gara aga, onye ga-achọkwa ka anyị na-ekwurịta ihe gbasara Baịbụl ma ọ bụ ka m bịa na-eleta ya.
“Otu ụbọchị, telefon anyị kụrụ, di m azaa ya. Nwaanyị kpọrọnụ gwara ya, sị: ‘Biko, ewela iwe, ọ bụ naanị unu ka m chetara. Ọ bụ ya mere m ji kpọọ unu. Nwunye gị ọ̀ ga-achọ ịbịa na-akụziri m Okwu Chineke? Amụrụ m Baịbụl ihe dị ka afọ iri na ise ma ọ bụ iri afọ abụọ gara aga. Ma, di m nọ na-emegide m mgbe ahụ tupu ya anwụọ. Ọ bụ ya mere m ji kwụsị ịmụ Baịbụl.’
“Echetara m na mụ agatụla n’ụlọ nwaanyị ahụ. Ọ bụ nwanna nwaanyị nke na-amụburu ya ihe ka m so gaa. O juru m anya na nwaanyị ahụ chetara m. Obi tọrọ m ụtọ. Mụ na ya kwukwara otú anyị ga-esi hụ. Kemgbe ahụ, m na-amụrụ ya ihe kwa izu. Ọ bịara Ncheta Ọnwụ Jizọs na okwu ihu ọha pụrụ iche. Ọ na-abịakwa ọmụmụ ihe kemgbe ahụ. Ana m ekele Jehova kwa ụbọchị maka ịza ekpere m.”
A Gaghị Etinye Chọkọlet n’Igbe Onyinye
E nwere otu nwata nwoke dị afọ asatọ aha ya bụ Sergio. O bi n’Ịtali. Ọ chọrọ ime ka o doo ndị okenye anya na ya eruola ịbụ onye nkwusa a na-emebeghị baptizim. Otu ụbọchị, o so papa ya gaa ịrụziri otu nwoke ihe e ji akpọchi ọnụ ụzọ. Nwoke ahụ na nwunye ya akarịala afọ iri asaa. Sergio weere ụfọdụ magazin. O kwuru, sị: “Mgbe papa m na-arụzi ihe ahụ, enyere m nwoke ahụ ụfọdụ magazin ahụ. O juru ya anya, ya akpọọ nwunye ya, gosi ya magazin ndị ahụ. M dere aha ha, ebe ha bi, na nọmba ekwentị ha ka m nwee ike ịga nletaghachi. Ọ bụ nwunye nwoke ahụ gwara m ihe ndị ahụ m dere, nyekwa m otu ogologo chọkọlet.” Mgbe ụbọchị ole na ole gara, Sergio na otu okenye n’ọgbakọ ha gaara nwoke ahụ na nwunye ya nletaghachi. Sergio pịrị mgbịrịgba dị n’ọnụ ụzọ, nwunye nwoke ahụ apụta. Sergio gwara ya na ya chọrọ inye ha akwụkwọ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Obi tọrọ nwaanyị ahụ ụtọ, ya anara akwụkwọ ahụ. N’ihi ya, o nyere Sergio ogologo chọkọlet ọzọ. Sergio kwuru, sị: “Arachara m chọkọlet ahụ n’ihi na agaghị m etinyeli ya n’igbe onyinye. Ndị okenye mechara ghọta na m chọsiri ike ịbụ onye nkwusa a na-emebeghị baptizim.”
Pastọ Chọrọ Ịmụtakwu Ihe
Na Bọlgeria, e nwere otu nwoke aha ya bụ Simeon. Ọ bụ pastọ n’otu chọọchị dị n’obodo Gọkọvo. Ma e nweghị Ndịàmà Jehova n’obodo ahụ. Ihe ọ mụtara na Baịbụl mere ka ọ ghọta na ihe Baịbụl na-akụzi dị iche n’ihe a na-akụzi na chọọchị. Otu ụbọchị, ọ natara ụfọdụ magazin anyị mgbe ọ nọ n’ụgbọ okporo ígwè. Obi tọrọ Simeon ụtọ ịmụta na Jehova bụ ezi Chineke nakwa na ọ bụghị Atọ n’Ime Otu. Ọ chọkwuru ịmụta ọtụtụ ihe. N’ihi ya, o degaara alaka ụlọ ọrụ akwụkwọ ozi, degakwara chọọchị niile ọ ma. Naanị otu chọọchị zara akwụkwọ ozi ya, gwa ya ka ọ ghara ichegbuwe onwe ya banyere “ihe ahụ na-abaghị uru.” Ma alaka ụlọ ọrụ ziri ụmụnna abụọ bi n’obodo Kazanluk ka ha gaa leta nwoke ahụ n’ebe o bi. Ebe ahụ dị ihe dị ka kilomita iri atọ na ise. Ha malitere ịmụrụ Simeon na ezinụlọ ya Baịbụl. Ihe Simeon na-amụta tọrọ ya ezigbo ụtọ. Ọ kpọrọ ndị agbata obi ya na ndị enyi ya ka ha soro na-amụ ihe. N’oge na-adịghị anya, mmadụ iri abụọ na ise na-abịa amụ Baịbụl kwa izu. E nwere otu onye agbata obi ya dị afọ iri asaa na ise nke bịara ọmụmụ Baịbụl ahụ. N’ụbọchị mbụ ọ bịara, anya mmiri gbara ya, ya ekwuo, sị: “Ihe m ghọtara n’otu awa karịrị ihe m ghọtara kemgbe afọ iri atọ m gawara chọọchị.” Ndị na-abịa ọmụmụ ihe ụmụnna ndị ahụ si na Kazanluk na-eduzi n’obodo Gọkọvo kwa ọnwa na-eru mmadụ iri isii. Mmadụ iri asaa na itoolu bịakwara Ncheta Ọnwụ Jizọs.
“Ihe m ghọtara n’otu awa karịrị ihe m ghọtara kemgbe afọ iri atọ m gawara chọọchị”
“Biko, Akwụsịla Otú A I Si Ebi Ndụ”
E nwere otu nwanna nwaanyị dị afọ iri na ise aha ya bụ Valya. O bi na Yukren. Otu ụbọchị, ọ hụrụ na onye nkụzi ha yi uwe ojii bịa ụlọ akwụkwọ. Ihu ya gosikwara na o bere ákwá. Mgbe Valya chọpụtara na mama onye nkụzi ha nwụrụ, o kpebiri iji ihe Baịbụl kwuru banyere mbilite n’ọnwụ kasie ya obi. Valya weere Baịbụl na broshọ abụọ bụ́ Gịnị Na-eme Anyị Mgbe Anyị Nwụrụ? na Mgbe Onye Ị Hụrụ n’Anya Nwụrụ, ma kpebie na ya ga-agakwuru onye nkụzi ahụ ma a gbasaa. Valya kwuru, sị: “Mgbe m nọ n’ọnụ ụzọ ọfis ya na-eche ya, obi nọ na-akụ m kpim kpim. N’ihi ya, m kpere ekpere, rịọ Jehova ka o nyere m aka.”
Mgbe Valya banyere n’ọfis ahụ, onye nkụzi ha jụrụ ya, sị: “Gịnị ka ị chọrọ?”
Valya zara ya, sị: “Achọrọ m ịkasi gị obi n’ihi na ama m otú obi dị gị. Papa mama m nwụrụ afọ ole na ole gara aga.”
Jọjia: Ebe a na-ekwusa ozi ọma n’ubi vaịn
Ihe ahụ Valya mere metụrụ onye nkụzi ahụ n’obi. Anya mmiri juru ya anya mgbe o kwuru na ndị ikwu ya na ndị ọrụ ibe ya egosighị ya ụdị ọmịiko ahụ si n’obi. Valya gụụrụ ya Mkpughe 21:3, 4, kọwaakwa ya. Onye nkụzi ahụ natara broshọ abụọ ahụ, sị ya: “Ị dị iche n’ụmụ akwụkwọ ndị ọzọ.”
Valya gwara ya, sị: “M na-agbalị ịgụ Baịbụl na ime ihe o kwuru, na-egekwa nne m na nna m ntị.”
Onye nkụzi ahụ gwara Valya ka o wetara ya Baịbụl na akwụkwọ Bible Na-akụzi. O wetakwaara ya ha abụọ. Onye nkụzi ahụ kelere Valya, sị ya: “Ọ bụ okpukpe unu bụ nke ezigbo ya. I nwekwara nne na nna na-akụziri gị ihe ziri ezi. Biko, akwụsịla otú a i si ebi ndụ.”
Ọ Pịrị Nọmba Onye Ọzọ
N’ụbọchị mbụ ná mgbakọ distrikti nke afọ 2011, nke e mere n’obodo Malakasa, dị na Gris, otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Natalie ji ekwentị ya chọọ ịkpọ papa ya ka ọ gwa ya banyere ụgbọala ga-ebu ha aga mgbakọ. Ma, ọ pịrị nọmba onye ọzọ. O nweghị onye zara ya. N’oge na-adịghị anya, onye ahụ ọ kpọrọ hụrụ nọmba ahụ n’ekwentị ya ma kpọọ ka ọ mata onye kpọrọ ya. Ma, mgbe onye ahụ kpọrọ, mgbakọ ebidola. Natalie nụrụ ka ekwentị ya na-akụ, chọọ ịgbanyụ ya, ma ọ maghị na ọ pịala aka n’ebe e si aza ya, onye ahụ kpọrọ ya ana-anụ ihe a na-ekwu ná mgbakọ. Natalie amaghị na nwoke ahụ gere okwu mmeghe onyeisi oche mgbakọ ahụ, ya achọọ ịmatakwu.
Nwoke ahụ mechara zitere Natalie ozi n’ekwentị, jụọ ya, sị: “Ònye ka ị bụ? Ị̀ bụ ụkọchukwu?” Mgbe a gbasara nke ụtụtụ, Natalie hụrụ ozi ahụ, zaa nwoke ahụ, sị: “Abụghị m ụkọchukwu. Abụ m Onyeàmà Jehova. Anyị nọ ná mgbakọ.”
Obodo Pitenwim nke dị na Skọtland: Ebe a na-ekwusa ozi ọma n’ọdụ ụgbọ mmiri
Nwoke ahụ kpọrọ ọzọ na Satọdee ma jụọ ma è mechaala mgbakọ ahụ. Papa Natalie ziri nwoke ahụ ozi ọma. Nwoke ahụ asị ya: “Ihe m nụrụ n’okwu ahụ m ji ekwentị m gee nkeji ole na ole zara ọtụtụ ajụjụ na-echu m ụra kemgbe.” O mechara bụrụ na ndị mmụọ ọjọọ na-enye ezinụlọ nwoke ahụ nsogbu. Ma ha amaghị ndị bụ́ ndị mmụọ ọjọọ, na ihe mere ha ji enye ha nsogbu. Nwoke ahụ kwuru, sị: “Ekwetụbeghị m ka Ndịàmà Jehova zie m ozi ọma. Ma m ga-achọ ka mụ na nwoke ahụ m nụrụ olu ya n’ekwentị kwurịta okwu ma ọ bụrụ na ọ ga-ekwe omume.”
N’eziokwu, o kwere omume. Nwoke ahụ bịara mgbakọ ahụ na Sọnde. Ihe ọ hụrụ juru ya anya. Ezinụlọ dị iche iche jiri ejiji dị mma, obi adịkwa onye ọ bụla ụtọ. A naghị atụfu ihe aghara aghara. O nweghị onye na-agwa ibe ya okwu ọjọọ. E nweghịkwa onye na-aṅụ sịga. O kwuru, sị: “Amaghị m na e nwere ndị dị ka unu n’ụwa a. Ọ dị m ka m̀ banyere n’ụwa ọzọ.” Papa Natalie kpọ nwoke ahụ gaa n’ọfis onyeisi oche mgbakọ ahụ, ya na ya ekwurịta okwu. Mgbakọ ahụ na ihe ndị a zara nwoke ahụ tọrọ ya ụtọ. Ọ natara akwụkwọ Bible Na-akụzi, otu Baịbụl, na ụfọdụ magazin, a haziekwa otú a ga-esi gaara ya nletaghachi.
MBA NDỊ DỊ N’OKÉ OSIMIRI PASIFIK
MBA 29
MMADỤ OLE BI NA HA 38,495,300
NDỊ NKWUSA OLE NỌ NA HA 94,924
MMADỤ OLE A MỤỤRỤ BAỊBỤL 59,431
“Abụ Kacha Ụtọ M Nụtụrụla”
N’obodo Savaị nke dị na Samoa, ụmụ akwụkwọ na-abụ abụ chọọchị ụtụtụ ọ bụla tupu ha abanye na klas. Ma, Celina na Levaai weturu obi gwa onyeisi ụlọ akwụkwọ ha na ha agaghị eso na-abụ abụ ahụ n’ihi na ha bụ Ndịàmà Jehova. Celina dị afọ ise. Levaai adịrị afọ isii. E nwere ike ịta onye na-ekweghị abụ abụ ahụ ezigbo ahụhụ. Ma, ọ dị ka onyeisi ụlọ akwụkwọ ahụ ò chere na ya menye ụmụaka ahụ ihere, ha ga-eso bụọ abụ ahụ. N’ihi ya, ọ sịrị ha: “Ọ bụrụ na unu agaghị abụ abụ anyị, ngwa bụọnụ abụ nke unu.” Celina na Levaai bụrụ abụ nke 111, nke ha mụrụ n’Ofufe Ezinụlọ ha n’oge na-adịbeghị anya. Isiokwu abụ ahụ bụ “Ọ Ga-akpọ Òkù.” Mgbe ha bụchara ya, anya mmiri gbara onyeisi ụlọ akwụkwọ ha. O kwuru, sị: “Abụ a bụ abụ kacha ụtọ m nụtụrụla. Biko bụọnụ ya ọzọ.” Ha bụrụ ya ọzọ. Ọ gwara ha, sị: “Malite ugbu a gawa, m ga na-agwa unu ka unu bụọ abụ unu, ọ bụghị nke anyị.”
“Malite ugbu a gawa, m ga na-agwa unu ka unu bụọ abụ unu, ọ bụghị nke anyị”
Ọ Bụ Jizọs Ka Ọ Na-ekpegara Ekpere Kemgbe Ụwa Ya
Obodo Timọ-Leste: N’obodo a agha kpara aka ọjọọ, ndị nkwusa ndị nyere akụkọ ozi ha kwa ọnwa n’afọ ije ozi 2011 dị otu narị na iri asaa na asatọ. Ma n’afọ ije ozi 2012, ha dịzi otu narị na iri itoolu na anọ
Otu nwoke, bụ́ onye na-ekwu okwuchukwu n’otu chọọchị dị na Fiji, kpebiri ịga nọrọ mgbe Ndịàmà Jehova na-amụrụ onye ọzọ Baịbụl. Mgbe a na-amụ ihe ahụ, nwoke ahụ nụrụ na Jizọs abụghị Chineke. Ihe a nyere ya nsogbu nke na ụra ekweghị atụ ya. Mgbe nwunye nwoke ahụ hụrụ na obi ezughị di ya ike, ọ gwara ya, sị: “Agakwala gee ndị ahụ ntị ọzọ!” Ma, ihe ahụ ekweghị apụ nwoke ahụ apụ n’obi. N’izu na-esonụ, ọ gakwara mgbe a na-amụrụ onye ahụ Baịbụl. Mgbe a mụchara nke ugboro abụọ ahụ, ụbọchị ole na ole agaa, ọ gara na chọọchị ha gwa ha na ya agaghịzi na-arụ ọrụ pastọ. N’oge ahụ, a malitebeghị ịmụrụ ya ihe. Ihe a o mere tụrụ ndị ikwu ya na ndị chọọchị ha n’anya, weekwa ha iwe. Ọ bụghị naanị na ọ ga-akwụsị ịga chọọchị ahụ, ọ ga-akwụsịkwa ọrụ ahụ na-enye ya ezigbo ego. Ihe ọ mụtara na Baịbụl mere ka ọ ghọta ihe bụ́ eziokwu gbasara Jizọs. Ma, o siiri ya ike ikpegara Jehova ekpere n’ihi na ọ bụ Jizọs ka ọ na-ekpegara ekpere kemgbe ụwa ya. Ka ọtụtụ ọnwa gachara, o kpegaara Jehova ekpere. Ugbu a, ọ na-ezi ndị ọzọ ozi ọma, na-enyekwara ha aka ịmata Jehova na ịhụ ya n’anya.
Obere Obodo Gere Ntị n’Ozi Ọma
Naanị mmadụ iri isii na abụọ bi n’agwaetiti Makatea, nke dị n’Ebe Ndịda Pasifik. Ọ bụ ọgbakọ Ndịàmà Jehova e nwere na Tehiti na-akụziri ha banyere Jehova. E ji ekwentị amụrụ mmadụ itoolu bi n’obodo ahụ Baịbụl kwa izu. Ihe ruru mmadụ iri na ise na-ezukọ n’ụlọ otu n’ime ndị ahụ a na-amụrụ ihe ma jiri ekwentị na-egere ọmụmụ ihe a na-enwe na Tehiti. Otu n’ime ndị ahụ a na-amụrụ Baịbụl bụ otu nwaanyị a ma ama na chọọchị ha, a tụkwara anya na a ga-echi ya dikọnes. N’oge na-adịbeghị anya, ọ gara na chọọchị ha gwa ha ihe mere na ya anaghịzi abịa chọọchị. O ji Baịbụl gosi ha ihe mere na nwaanyị ekwesịghị ịna-akụzi ihe n’ọgbakọ Ndị Kraịst. Ọ kọwakwaara ha ọrụ Jizọs Kraịst na-arụ, na ihe Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị pụtara nakwa na e kwesịrị ịna-eme ya otu ugboro n’afọ, ọ bụghị kwa ụbọchị Sọnde. Ihe ọzọ ọ kọwaara ha bụ na ọ bụ naanị otu narị puku mmadụ na puku iri anọ na puku anọ ka ha na Kraịst ga-anọ n’eluigwe nakwa na ọ bụ naanị ha kwesịrị ịna-ata achịcha, na-aṅụkwa mmanya e ji echeta ọnwụ Jizọs. Ihe ahụ o mere gbara nwaanyị ọzọ ume, mee ka ọ kwụsị ịga chọọchị, ya na Ndịàmà Jehova na-amụchikwa Baịbụl anya ugbu a.
Ezinụlọ Ha Zara Òkù A Kpọrọ Ha
Na Sọlọmọn Aịlandz, e nwere otu nwoke na-agabeghị ọmụmụ ihe kemgbe afọ 1998. Aha ya bụ Joshua. Ndị okenye abụọ gara leta ya n’ihi na ha na-agbalịsi ike ịkpọ ndị na-adịghị ejekwa ozi ọma ka ha bịa Ncheta Ọnwụ Kraịst. Joshua na mmadụ iri abụọ bụ́ ndị ezinụlọ ya ji ụkwụ gaa awa abụọ iji gaa Ncheta Ọnwụ Kraịst. Otú ndị ọgbakọ ahụ si jiri obi ụtọ nabata ha mere ka anya mmiri gbaa Joshua. Ọtụtụ ndị ezinụlọ ya bịakwara gere okwu ihu ọha pụrụ iche. Mgbe a gbasara, ha gwara ndị okenye na ha chọrọ ka a mụwara ha Baịbụl. A gwara ụfọdụ ndị nkwusa ka ha gaa mụwara mmadụ iri na ise n’ime ha Baịbụl.
Ọ Ma Azịza Ajụjụ Ahụ
E nwere ihe karịrị otu puku agwaetiti n’ebe alaka ụlọ ọrụ dị na Gụwam na-elekọta. Ndị mmadụ bi n’ihe karịrị otu narị n’ime ha. Ma, ọ bụ naanị agwaetiti iri na atọ n’ime ha dị nso n’ebe e nwere ọgbakọ. Ndịàmà Jehova agatụbeghị kwusaa ozi ọma n’ọtụtụ agwaetiti ndị ahụ. N’ihi ya, ụmụnna na-achọ ụzọ dị iche iche ha ga-esi garuo ebe ndị ahụ. N’ọnwa anọ n’afọ 2012, ụfọdụ ndị nkwusa ji ụgbọ mmiri gaa Polowat, nke so n’agwaetiti kacha dịpụ adịpụ. Ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ na e nweghị ihe jikọrọ ndị obodo ahụ na ndị ọzọ n’ụwa. Ndị nwoke na-awa ákwà, na-arụkwa ụgbọ epeepe. Ọ bụkwa ihe ha kọtara n’ugbo ka ha ji biri.
Otu n’ime ndị nkwusa ahụ jụrụ otu nwa okorobịa n’ebe ahụ, sị: “Gịnị na-eme anyị ma anyị nwụọ?”
Ọ zara ya, sị: “Ama m azịza ya!” Ọ maliri ozugbo, si n’ebe ọ na-edebe akwụkwọ were akwụkwọ Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala, nke e dere n’asụsụ Chukiiz, sapee ebe e dere isiokwu ndị dị na ya. Ọ tụrụ aka n’isi nke 8, nke isiokwu ya bụ, “Gịnị Na-eme n’Ọnwụ,” jiri obi ụtọ kọwaa ihe ọ mụtara n’akwụkwọ ahụ.
Obodo Kịngstịn nke dị na Nọfọk Aịland: Ebe a na-ezi mmadụ ozi ọma n’akụkụ okporo ụzọ a kpọrọ Kwọliti Roo
Oleekwanụ otú o si nweta akwụkwọ ahụ? N’afọ 2009, ndị nkwusa ndị nọ n’agwaetiti ndị a kpọrọ Chuk kwusara ozi ọma n’ọdụ ụgbọ mmiri ndị dị n’ebe ahụ ka ha nwee ike izi ndị na-aga n’agwaetiti ndị dịpụrụ adịpụ ozi ọma. Ha nyekwara ha akwụkwọ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi. Otu nwoke nke na-aga Polowat ji obi ụtọ kweta iburu otu katọn akwụkwọ ahụ ọ ga-ekesara ndị agbata obi ya. Nwa okorobịa ahụ so ná ndị e nyere ya.
Tupu ụmụnna ndị ahụ esi na Polowat lawa, ha letara nwa okorobịa ahụ ọtụtụ ugboro ka ha gbaa ya ume ma gosi ya otú ọ ga-esi na-amụ Baịbụl ka o nwee ike ịbara ya uru. Ha kụzikwaara ya otú ọ ga-esi na-achọta amaokwu Baịbụl ma na-ede ihe ndị dị mkpa n’akụkụ akwụkwọ ya.
Obi dị anyị ụtọ na akwụkwọ anyị na-enyere ndị mmadụ aka ịmụta eziokwu Baịbụl n’asụsụ ha ma n’agwaetiti ndị dịpụrụ adịpụ, bụ́ ebe a na-enweghị tiivi, redio, akwụkwọ akụkọ, ma ọ bụ Ịntanet.
Mgbọ Atọ na Ihe Atọ Mere na Ọ Gaghị Alụ Ya
N’obodo Bugenvil nke dị na Papiuwa Niu Gini, e nwere otu nwa agbọghọ aha ya bụ Anna. Mgbe agha kpụ ọkụ n’ọnụ n’obodo ahụ, ọ dị ihe dị ka afọ iri abụọ na atọ, bụrụkwa onye nkwusa a na-emebeghị baptizim. N’afọ 1991, o so ná Ndịàmà Jehova si n’Ọgbakọ Arawa gbaa ọsọ ndụ gbaba n’ọhịa. Naanị ihe ole na ole ka ha ji gbapụ. Ndị toro eto n’ime ha dị mmadụ isii. Ndị bụ́ ụmụaka adịrị asaa. Ruo afọ abụọ, ha biri n’ụlọ ndị nwe ha hapụrụ gbaa ọsọ. Ha na-agagharịkwa achọ ihe ha ga-eri. Naanị akwụkwọ abụọ ha ji ka ha ji na-amụ ihe, ya bụ, Baịbụl Anna na akwụkwọ Ịdị n’Otu n’Ofufe nke Nanị Ezi Chineke Ahụ. Ha na-ekpekọ ekpere ọnụ, na-abụ abụ Alaeze, na-ezikwa ndị ha hụrụ ozi ọma.
Ndị so ná ndị agha ndị na-agba gọọmenti mgba okpuru hụrụ ha, chọọ ka ụmụnna nwoke abụọ n’ime ụmụnna ndị ahụ soro ná ndị agha. Ma, ụmụnna ndị ahụ gwara ha na Ndịàmà Jehova anaghị alụ agha, ha ahapụ ha. E nwere mgbe otu onye agha gosiri Anna mgbọ atọ, sị ya: “Ọ bụrụ na ị lụghị m, m ga-egbu gị.” Anna gwara ya ihe atọ mere na ya agaghị alụ ya, otu maka mgbọ nke ọ bụla. Nke kacha mkpa bụ na Baịbụl gwara Ndị Kraịst ka ha lụọ “naanị n’ime Onyenwe anyị.” (1 Kọr. 7:39) Nwoke ahụ tụgharịrị gawa.
“O nweghị ihe ga-akwụsịli ọrụ Jehova. Agha agaghịdị akwụsịli ya”
N’afọ 2012, Anna bụzi ọsụ ụzọ oge niile. Mgbe ọ nụrụ na a chọkwuru ndị ga na-ekwusa ozi ọma n’Arawa, ọ laghachiri ebe ahụ, ya na nwanna nwaanyị ọzọ bụ́ ọsụ ụzọ ibe ya, ka ha gaa nyere ndị nkwusa nọ n’ebe a na-enweghị ọgbakọ aka. N’oge agha, ọ tara ezigbo ahụhụ n’obodo ahụ, jirikwa anya ya hụ ebe a sụrụ ndị mmadụ akwụ. N’ihi ya, a jụrụ ya ma ịlaghachi n’obodo ahụ ọ̀ na-enye ya nsogbu n’obi. Ọ zara, sị: “Obi dị m ụtọ ịlaghachite ebe a. O nweghị ihe ga-akwụsịli ọrụ Jehova. Agha agaghịdị akwụsịli ya.”