Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • lr isi 9 p. 52-56
  • Ọ Dị Anyị Mkpa Iguzogide Ọnwụnwa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ọ Dị Anyị Mkpa Iguzogide Ọnwụnwa
  • Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Mụta Ihe n’Ihe Jizọs Mere Mgbe A Nwara Ya Ọnwụnwa
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Ekwensu Nwara Jizọs Ọnwụnwa
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • Ịmụta Ihe Site n’Ọnwụnwa Ndị Jisọs Zutere
    Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
  • “Na-eguzogidenụ Ekwensu” Dị Ka Jizọs Mere
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ
lr isi 9 p. 52-56

ISI NKE 9

Ọ Dị Anyị Mkpa Iguzogide Ọnwụnwa

Ọ̀ DỊTỤWO onye gwara gị ka i mee ihe na-adịghị mma?— Ọ̀ mara gị aka na ị gaghị emeli ya? Ka ọ̀ sịrị na ọ na-atọ ụtọ nakwa na ọ dịghị ihe dị njọ n’ezie n’ime ya?— Mgbe mmadụ mesoro anyị otú a, ọ na-agbalị ịnwa anyị ọnwụnwa ime ihe na-adịghị mma.

Gịnị ka anyị kwesịrị ime mgbe a nwara anyị ọnwụnwa ime ihe na-adịghị mma? Ànyị kwesịrị ikwe ka a nwata anyị ime ihe na-adịghị mma?— Nke ahụ agaghị amasị Jehova Chineke. Ma, ị̀ maara onye ga-enwe obi ụtọ?— Ee, Setan bụ́ Ekwensu ga-enwe obi ụtọ.

Setan bụ onye iro Chineke, Setan bụkwa onye iro anyị. Anyị apụghị ịhụ ya anya n’ihi na ọ bụ mmụọ. Ma ọ pụrụ ịhụ anyị. Otu ụbọchị, Ekwensu na Jizọs, bụ́ Onye Ozizi Ukwu ahụ, kwurịtara okwu, Ekwensu gbalịkwara ịnwa ya ọnwụnwa ime ihe na-adịghị mma. Ka anyị lee ihe Jizọs mere. Mgbe ahụ, anyị ga-ama ihe ziri ezi anyị kwesịrị ime mgbe a nwara anyị ọnwụnwa ime ihe na-adịghị mma.

[Foto dị na peeji nke 52]

Gịnị ka Jizọs pụrụ ịmaliteworị icheta mgbe e mere ya baptizim?

Jizọs na-achọ ime uche Chineke mgbe nile. O gosipụtara nke a n’ihu ọha site n’ịbụ onye e mere baptizim n’Osimiri Jọdan. Ọ bụ ozugbo e mesịrị Jizọs baptizim ka Setan gbalịrị ịnwa Ya ọnwụnwa ka o mee ihe na-adịghị mma. Bible na-ekwu na “eluigwe meghere” nye Jizọs. (Matiu 3:16) Nke a nwere ike ịpụta na ugbu a Jizọs malitere icheta ihe nile banyere ndụ ọ dịburu n’eluigwe mgbe ya na Chineke nọ.

Mgbe e mesịrị ya baptizim, Jizọs bara n’ịkpa ịga tụgharịa uche n’ihe ndị ahụ ọ malitere icheta. Ụbọchị 40 gafere, ehihie na abalị. N’oge a nile, Jizọs erighị ihe ọ bụla, n’ihi ya ezigbo agụụ ji ya ugbu a. Ọ bụ n’oge a ka Setan gbalịrị ịnwa Jizọs ka o mee ihe na-adịghị mma.

[Foto dị na peeji nke 53]

Olee otú Ekwensu si jiri nkume nwaa Jizọs ọnwụnwa?

Ekwensu sịrị: “Ọ bụrụ na ị bụ ọkpara Chineke, gwa nkume ndị a ka ha ghọọ achịcha.” Lee otú achịcha ahụ gaara esiworị tọọ ụtọ! Ma, Jizọs ọ̀ pụrụ imeworị ka nkume ndị ahụ ghọọ ogbe achịcha?— Ee, ọ pụrụ. N’ihi gịnị? N’ihi na Jizọs, bụ́ Ọkpara Chineke, nwere ike pụrụ iche.

Ị̀ gaara emeworị ka nkume ghọọ ogbe achịcha ma a sị na Ekwensu gwara gị ka i mee ya?— Agụụ na-agụ Jizọs. Ya mere, olee ihe dị njọ n’ime ya nanị otu ugboro?— Jizọs maara na iji ike ya mee ihe n’ụzọ dị otú ahụ ezighị ezi. Jehova nyere ya ike ndị ahụ iji na-adọta ndị mmadụ n’ebe Chineke nọ, ọ bụghị iji ha na-eme ihe maka ọdịmma onwe ya.

Ya mere, kama ime ya, Jizọs gwara Setan ihe e dere n’ime Bible, sị: “Ọ bụghị nanị n’achịcha ka mmadụ ga-esi dị ndụ, kama ọ bụ n’okwu ọ bụla nke na-esi n’ọnụ Jehova apụta.” Jizọs maara na ime ihe na-atọ Jehova ụtọ dị mkpa ọbụna karịa inwe ihe oriri a ga-eri.

Ma Ekwensu gbalịrị ọzọ. Ọ kpọọrọ Jizọs banye na Jeruselem ma mee ka o guzoro n’akụkụ dị elu n’ụlọ nsọ ahụ. Mgbe ahụ, Setan sịrị: ‘Ọ bụrụ na ị bụ ọkpara Chineke, si ebe a tụda onwe gị n’ala. N’ihi na e dere na ndị mmụọ ozi Chineke ga-echebe gị ka ị ghara imerụ onwe gị ahụ́.’

Gịnị mere Setan ji kwuo otú a?— O kwuru ya iji nwaa Jizọs ka o mee ihe nzuzu. Ma, ọzọkwa, Jizọs emeghị ihe Setan chọrọ ka o mee. Ọ sịrị Setan: “E dere, sị, ‘Etinyela Jehova bụ́ Chineke gị n’ule.’” Jizọs maara na o zighị ezi itinye Jehova n’ule site n’itinye ndụ ya n’ihe ize ndụ.

N’agbanyeghị nke ahụ, Setan ahapụghị ya. Ọ kpọziiri Jizọs gaa n’ugwu dị oké elu. N’ebe ahụ, o gosiri ya alaeze, ma ọ bụ ọchịchị nile nke ụwa na ebube ha. Setan sịziri Jizọs: “Ihe ndị a nile ka m ga-enye gị ma ọ bụrụ na ị daa n’ala kpọọ isiala nye m.”

Cheedị echiche banyere ihe ahụ Ekwensu kwere nkwa inye ya. Alaeze ndị a nile, ma ọ bụ ọchịchị ụmụ mmadụ, hà bụ nke Setan n’ezie?— N’ezie, Jizọs asịghị na ha abụghị nke Setan. Ọ gaara ekwu otú ahụ ma ọ bụrụ na ọ bụghị Setan nwe ha. Ee, ọ bụ Setan n’ezie na-achị mba nile nke ụwa. Bible ọbụna kpọrọ ya “onye na-achị ụwa a.”—Jọn 12:31.

[Foto dị na peeji nke 55]

N’ihi gịnị ka Setan ji nwee ike ikwe nkwa inye Jizọs alaeze ndị a nile?

Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na Ekwensu ekwe nkwa inye gị otu ihe ma ọ bụrụ na i fee ya ofufe?— Jizọs maara na ọ bụ ihe na-ezighị ezi ife Ekwensu ofufe n’agbanyeghị ihe Ọ ga-enweta. Ya mere, Jizọs sịrị ya: ‘Pụọ, Setan! N’ihi na Bible kwuru na ọ bụ Jehova bụ́ Chineke gị ka ị na-aghaghị ife ofufe na ọ bụkwa nanị ya ka ị na-aghaghị ijere ozi.’—Matiu 4:1-10; Luk 4:1-13.

[Foto ndị dị na peeji nke 55]

Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na a nwaa gị ọnwụnwa?

Ọnwụnwa dị iche iche na-abịakwara anyị. Ị̀ maara ụfọdụ n’ime ha?— Ka m nye gị otu ihe atụ. Nne gị pụrụ ighe akara dị ụtọ unu ga-eji megharịa ọnụ. Ọ pụrụ ịgwa gị ka ị ghara ịta ya ruo mgbe oge ruru. Ma ezigbo agụụ ji gị, n’ihi ya, ọ na-eto gị akpịrị ịta ya. Ị̀ ga-erubere nne gị isi?— Setan chọrọ ka i nupụrụ ya isi.

Cheta Jizọs. Ezigbo agụụ gụkwara ya. Ma, ọ maara na ime ihe ga-atọ Chineke ụtọ dị mkpa karịa iri ihe. Ị na-egosi na ị dị ka Jizọs mgbe i mere ihe nne gị kwuru ka i mee.

Ọ pụrụ ịbụ na ụmụaka ndị ọzọ ga-agwa gị ka ị ṅụọ mkpụrụ ọgwụ ụfọdụ. Ha pụrụ ịgwa gị na mkpụrụ ọgwụ ndị a ga-eme ka i nwee nnọọ obi ụtọ. Ma ọgwụ ndị a pụrụ ịbụ ọgwụ ọjọọ. Ha pụrụ ime ka ị rịa ezigbo ọrịa ma ọ bụ ọbụna gbuo gị. Ma ọ bụ mmadụ pụrụ inye gị siga nke e tinyere ọgwụ ọjọọ na ya, ma kwuo na ị gaghị eseli ya. Gịnị ka ị ga-eme?—

A boy offers two boys cigarettes; one boy takes it, the other walks away

Cheta Jizọs. Setan nwara ime ka Jizọs tinye ndụ ya n’ihe ize ndụ site n’ịgwa ya ka o si n’ụlọ nsọ ahụ mapụ. Ma Jizọs emeghị ya. Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na mmadụ ekwuo na ị gaghị emeli otu ihe dị ize ndụ?— Jizọs emeghị ihe Setan chọrọ ka o mee. I kwesịghịkwa ige onye ọ bụla nke na-achọ ime ka i mee ihe na-ezighị ezi ntị.

[Foto dị na peeji nke 56]

Gịnị mere iji ihe oyiyi na-efe ofufe ji dị njọ?

Otu ụbọchị, a pụrụ ịgwa gị ka i fee ihe oyiyi ofufe, bụ́ ihe Bible sị anyị emela. (Ọpụpụ 20:4, 5) Ọ pụrụ iso n’otu ihe omume a na-eme n’ụlọ akwụkwọ. A pụrụ ọbụna ịsị gị na ị gakwaghị na-aga akwụkwọ ma ọ bụrụ na ị jụ ime ya. Gịnị ka ị ga-eme?—

Ọ na-adị mfe ime ihe ziri ezi mgbe mmadụ nile na-eme ihe ziri ezi. Ma, ime ihe ziri ezi pụrụ ịbụ ihe siri nnọọ ike mgbe ndị ọzọ na-agbalị ime ka anyị mee ihe na-ezighị ezi. Ha pụrụ ikwu na ihe ha na-eme adịchaghị njọ. Ma ajụjụ dị oké mkpa bụ, Olee ihe Chineke kwuru banyere ya? Ọ maara nke kasị mma.

Ya mere, n’agbanyeghị ihe ndị ọzọ na-ekwu, anyị ekwesịghị mgbe ọ bụla ime ihe ndị Chineke kwuru na ha dị njọ. N’ụzọ dị otú ahụ, anyị ga na-eme mgbe nile ka Chineke nwee obi ụtọ, ọ dịghịkwa mgbe anyị ga-eme ihe ga-atọ Ekwensu ụtọ.

A pụrụ inwetakwu ihe ọmụma banyere otú a pụrụ isi merie ọnwụnwa nke ime ihe na-ezighị ezi n’Abụ Ọma 1:1, 2; Ilu 1:10, 11; Matiu 26:41; nakwa na 2 Timoti 2:22.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya