ISI NKE 33
Jizọs Pụrụ Ichebe Anyị
Olee otú i si ele Jizọs anya—ọ̀ bụ dị ka Eze dị ike ka ọ̀ bụ dị ka nwa ọhụrụ na-agaghị emeli ihe ọ bụla?
MGBE Jizọs tolitere wee nụ otú e si chebe ya n’oge ọ bụ obere nwa, ì chere na o kpere ekpere kelee Jehova?— Olee ihe i chere Jizọs nwere ike ịgwaworị Meri na Josef ka oge na-aga mgbe ọ nụrụ na ha chebere ya ndụ site n’ịkpọrọ ya gbaga Ijipt?—
N’ezie, Jizọs abụghịzi nwa ọhụrụ. O bighịdị n’ụwa otú o biri na mbụ. Ma, ị̀ chọpụtawo na n’oge a, o yiri ka ụfọdụ ndị hà na-ewere Jizọs nanị dị ka nwa ọhụrụ nọ n’ebe a na-etinyere anụ ụlọ nri?— A na-ahụ nke a n’oge Krismas bụ́ mgbe a na-ahụ foto Jizọs n’ọtụtụ ebe dị ka nwa ọhụrụ.
Ọ bụ ezie na Jizọs ebikwaghị n’ụwa, ì kwere na ọ dị ndụ?— Ee, e mere ka o si n’ọnwụ bilie, ọ bụkwa Eze dị ike ugbu a n’eluigwe. Gịnị ka i chere ọ pụrụ ime iji chebe ndị na-ejere ya ozi?— Dị ka ihe atụ, mgbe Jizọs nọ n’ụwa, o gosiri otú ọ pụrụ isi chebe ndị hụrụ ya n’anya. Ka anyị lee otú o si mee nke ahụ otu ụbọchị mgbe ya na ndị na-eso ụzọ ya ji ụgbọ mmiri nọrọ n’ime mmiri.
O ruola oge mgbede. Jizọs nọ na-ezi ndị mmadụ ihe kemgbe ụtụtụ n’akụkụ Oké Osimiri Galili, bụ́ nnukwu ọdọ mmiri dị ihe dị ka kilomita 20 n’ogologo nakwa kilomita 12 n’obosara. Ugbu a, ọ sịrị ndị na-eso ụzọ ya: “Ka anyị gafee n’ofe nke ọzọ nke ọdọ mmiri a.” Ya mere, ha banyere n’ụgbọ mmiri wee gawa n’akụkụ nke ọzọ nke ọdọ mmiri ahụ. Ike gwụsịrị Jizọs, ya mere ọ gara n’azụ ụgbọ mmiri ahụ wee jiri ohiri isi dinara. N’egbughị oge, ezigbo ụra buuru ya.
Gịnị ka Jizọs na-agwa ifufe na ebili mmiri?
Ndị na-eso ụzọ ya mụ anya iji na-eduzi ụgbọ mmiri ahụ. Ihe nile nọ na-aga were were ruo nwa oge, ma oké ifufe maliteziri. Ọ nọgidere na-efesiwanye ike, ebili mmiri nọgidekwara na-ebuwanye ibu. Mmiri malitere ịbata n’ime ụgbọ ahụ n’ihi ebili mmiri ahụ, mmiri malitekwara ịdọrọ n’ime ụgbọ mmiri ahụ.
Ndị na-eso ụzọ ya tụrụ egwu na ụgbọ ha ga-emi. Ma, Jizọs atụghị egwu. Ọ ka nọ na-ehi ezigbo ụra n’azụ ụgbọ mmiri ahụ. N’ikpeazụ, ndị na-eso ụzọ ya kpọtere ya, sị ya: ‘Onye Ozizi, Onye Ozizi, zọpụta anyị; anyị na-aga ịnwụ n’oké ifufe a.’ Mgbe ha kpọtere ya, Jizọs biliri baara ifufe ahụ na ebili mmiri ahụ mba. Ọ sịrị: “Shịị! Daa jụụ!”
Ifufe ahụ kwụsịrị ozugbo, ọdọ mmiri ahụ dakwara jụụ. O juru ndị na-eso ụzọ ya anya. Ha ahụtụbeghị ụdị ihe ahụ. Ha malitere ịsị ibe ha: “Ònye n’ezie ka onye a bụ, n’ihi na ọ na-enye ọbụna ifufe na mmiri iwu, ha na-erubekwara ya isi?”—Luk 8:22-25; Mak 4:35-41.
Ị̀ ma onye Jizọs bụ?— Ị̀ ma ebe o si nweta ike dị ukwuu o nwere?— Ndị na-eso ụzọ ya ekwesịghịrịị ịtụ egwu ebe ha na Jizọs nọ, n’ihi na Jizọs abụghị mmadụ nkịtị. Ọ pụrụ ime ihe ndị dị ebube, ndị ọ na-adịghị mmadụ ọ bụla ọzọ pụrụ ime ha. Ka m kọọrọ gị ihe ọzọ o mere n’otu oge n’oké osimiri nke ifufe na-efe na ya.
Ọ bụ mgbe oge ụfọdụ gasịworo, n’ụbọchị ọzọ. Mgbe o ruru ná mgbede, Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha banye ụgbọ mmiri gaa n’ofe nke ọzọ nke oké osimiri ahụ tupu ya ana-erute. Mgbe ahụ, Jizọs rịgooro n’elu ugwu nanị ya. Ọ bụ ebe dị jụụ, ebe ọ pụrụ ịnọ kpegara Nna ya, bụ́ Jehova Chineke, ekpere.
Ndị na-eso ụzọ ya banyere n’ụgbọ mmiri wee malite ịgafe oké osimiri ahụ. Ma n’oge na-adịghị anya, ifufe malitere ife. O fesiwanyere ike. Mgbe ahụ, chi ejiela. Ndị ikom ahụ chịdatara ákwà ifufe ha wee malite iji ụmara na-akwọ ụgbọ ahụ. Ma ụgbọ ha adịghị agasi ike n’ihi na ifufe ahụ nke na-efesi ike na-efegide ha. Ụgbọ ahụ na-aṅagharị n’ihi oké ebili mmiri ahụ, mmiri na-awụbatakwa n’ime ụgbọ ahụ. Ndị ikom ahụ nọ na-agbalịsi ike ka ha ruo n’ikpere mmiri, ma o kweghị ha.
Jizọs ka nọ nanị ya n’ugwu. Ọ nọteela aka ebe ahụ. Ma, ugbu a, ọ pụrụ ịhụ na ndị na-eso ụzọ ya nọ n’ihe ize ndụ n’ihi oké ebili mmiri ahụ. Ya mere, o si n’ugwu ahụ gbadata n’ụsọ oké osimiri ahụ. Jizọs chọrọ inyere ndị na-eso ụzọ ya aka, ya mere ọ malitere ịga ije n’elu oké osimiri ahụ oké ifufe na-efe na ya iji gakwuru ha!
Gịnị ga-eme ma ị nwaa ịga ije n’elu mmiri?— Ị ga-emikpu, mmiri pụkwara iri gị. Ma, Jizọs adịghị ka gị. O nwere ike pụrụ iche. Jizọs ga-aga ogologo ije tupu ya eruo n’ebe ụgbọ mmiri ahụ dị. Ya mere, ọ bụ mgbe ọ na-eru n’isi ụtụtụ ka ndị na-eso ụzọ Jizọs hụrụ ya ka ọ na-abịakwute ha, na-aga ije n’elu mmiri. Ma, ihe ha hụrụ tụrụ ha n’anya. Ezigbo ụjọ jidere ha, ha tikwara mkpu n’ihi ụjọ. Jizọs sịziri ha: “Nweenụ obi ike, ọ bụ m; unu atụla egwu.”
Gịnị mere Jizọs ji rụọ ọrụ ebube?
Ozugbo Jizọs bara n’ime ụgbọ mmiri ahụ, oké ifufe ahụ kwụsịrị. Ọzọkwa, o juru ndị na-eso ụzọ ya anya. Ha dara n’ala n’ihu Jizọs, sị ya: “Ị bụ Ọkpara Chineke n’ezie.”—Matiu 14:22-33; Jọn 6:16-21.
Ọ̀ bụ na ọ garaghị abụ ihe magburu onwe ya ịdị ndụ n’oge ahụ ma hụ oge Jizọs na-eme ihe ndị dị otú ahụ?— Ị̀ ma ihe mere Jizọs ji rụọ ọrụ ebube ndị ahụ?— Ọ rụrụ ha n’ihi na ọ hụrụ ndị na-eso ụzọ ya n’anya, chọọkwa inyere ha aka. Ma, ọ rụkwara ha iji gosi ike dị ukwuu o nwere, bụ́ nke ọ ga-eji mee ihe n’ọdịnihu dị ka Onye Ọchịchị nke Alaeze Chineke.
Olee otú Jizọs si echebe ụmụazụ ya taa?
Ọbụna taa, Jizọs na-ejikarị ike ya echebe ụmụazụ ya pụọ ná mgbalị Setan na-eme ime ka ha kwụsị ịgwa ndị ọzọ banyere Alaeze Chineke. Ma, Jizọs adịghị eji ike ya echebe ndị na-eso ụzọ ya ka ha ghara ịrịa ọrịa ma ọ bụ jiri ya na-agwọ ha mgbe ha na-arịa ọrịa. Ọbụna ndịozi Jizọs nile mesịrị nwụsịa. E gburu nwanne Jọn bụ́ Jems egbu, a tụkwara Jọn n’onwe ya mkpọrọ.—Ọrụ 12:2; Mkpughe 1:9.
Otú ahụ ka ọ dị taa. Ma ndị mmadụ hà na-ejere Jehova ozi ma ọ bụ na ha adịghị ejere ya ozi, ha nile nwere ike ịrịa ọrịa ma nwụọ. Ma, n’isi nso, n’oge ịchịisi Jizọs dị ka Eze nke ọchịchị Chineke, ihe agaghị adị otú ha dị ugbu a. Ọ dịghị onye ga-atụ egwu mgbe ahụ ma ọlị n’ihi na Jizọs ga-eji ike ya gọzie ndị nile na-erubere ya isi.—Aịsaịa 9:6, 7.
Akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị ọzọ ndị na-egosi ike dị ukwuu Jizọs nwere, bụ́ onye Chineke mere Onye Ọchịchị n’Alaeze Chineke, bụ Daniel 7:13, 14; Matiu 28:18; nakwa Ndị Efesọs 1:20-22.