IHE ỌMỤMỤ NKE 18
Iji Bible Azaghachi
MGBE a jụrụ anyị ajụjụ banyere ihe ndị anyị kwenyere, ụzọ ndụ anyị, echiche anyị banyere okwu ndị a kpụ n’ọnụ, olileanya anyị maka ọdịnihu, anyị na-agbalị iji Bible zaa ha. N’ihi gịnị? N’ihi na ọ bụ Okwu Chineke. Ọ bụ n’ime Bible ka ihe ndị anyị kwenyere sitere. Ọ bụ na Bible ka ụzọ ndụ anyị dabeere. Ọ na-akpụzi echiche anyị banyere ihe ndị na-eme n’ụwa. Olileanya anyị nwere maka ọdịnihu gbanyesiri mkpọrọgwụ ike ná nkwa dị iche iche sitere n’ike mmụọ nsọ ndị dị n’ime Bible.—2 Tim. 3:16, 17.
Anyị maara nke ọma ibu ọrụ e jikọtara ya na aha anyị. Anyị bụ Ndịàmà Jehova. (Aịsa. 43:12) Ya mere, anyị na-adabere n’ihe Jehova kwuru n’ime Okwu ya sitere n’ike mmụọ nsọ wee na-aza ajụjụ, ọ bụghị na nkà ihe ọmụma ụmụ mmadụ. N’eziokwu, anyị nwere echiche nke anyị n’otu n’otu banyere okwu dị iche iche, ma anyị na-ekwe ka Okwu Chineke kpụzie echiche anyị n’ihi na anyị kwenyesiri ike na ọ bụ eziokwu. N’ezie, Bible na-enye anyị ohere ime ihe otú anyị si chọọ n’ọtụtụ okwu. Kama ịmanye ndị ọzọ ịnakwere echiche anyị, anyị na-achọ ịkụziri ha ụkpụrụ ndị e setịpụrụ n’Akwụkwọ Nsọ, si otú a na-enye ndị na-ege anyị ntị ohere iji otu nnwere onwe ime nhọrọ ahụ anyị nwere na-eme ihe. Dị ka Pọl onyeozi, anyị na-achọ ‘ịkwalite nrubeisi site n’okwukwe.’—Rom 16:26.
Ná Mkpughe 3:14, a kọwara Jizọs Kraịst dị ka “ezi onye àmà ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi.” Olee otú o si zaa ajụjụ ma mee ihe banyere ọnọdụ ndị e chere ya n’ihu? Mgbe ụfọdụ site n’iji ihe atụ ndị ga-eme ka ndị mmadụ chee echiche mee ihe. N’oge ndị ọzọ site n’ịjụ onye jụrụ ajụjụ ihe ọ ghọtara n’otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ. Ọtụtụ ugboro site n’ihota ihe e kwuru n’Akwụkwọ Nsọ, ịkọwa ha, ma ọ bụ izo aka na ha. (Mat. 4:3-10; 12:1-8; Luk 10:25-28; 17:32) Na narị afọ mbụ, a na-edebekarị mpịakọta Akwụkwọ Nsọ n’ụlọ nzukọ. E nweghị ihe àmà gosiri na Jizọs nwere mpịakọta ndị ahụ n’onwe ya, ma ọ maara Akwụkwọ Nsọ nke ọma ma zoo aka na ha ọtụtụ ugboro mgbe ọ na-ezi ndị ọzọ ihe. (Luk 24:27, 44-47) Ọ pụrụ ikwu n’eziokwu na ihe ya kụziri esiteghị n’echiche nke ya. O kwuru ihe ọ nụrụ n’ọnụ Nna ya.—Jọn 8:26.
Ọchịchọ anyị bụ ịgbaso ihe nlereanya Jizọs. Anyị onwe anyị anụtụbeghị ka Chineke kwuru okwu, dị ka Jizọs nụrụ. Ma Bible bụ Okwu Chineke. Mgbe anyị ji ya mere ebe ndabere maka azịza ndị anyị na-enye, anyị na-ezere ịdọta mmasị n’ebe anyị onwe anyị nọ. Anyị na-egosi na kama ikwupụta echiche nke mmadụ na-ezughị okè, anyị kpebisiri ike ikwe ka Chineke kwuo ihe bụ́ eziokwu.—Jọn 7:18; Rom 3:4.
Otú ọ dị, ọchịchọ anyị abụghị nanị iji Bible eme ihe kama iji ya eme ihe n’ụzọ ga-akasị baara onye na-ege anyị ntị uru. Anyị chọrọ ka o jiri ọchịchọ ịnabata echiche ọhụrụ gee ntị. Dabere n’omume onye ahụ, ị pụrụ iwebata echiche sitere na Bible site n’ikwu, sị: “Í kweghị na ihe dị mkpa n’ezie bụ ihe Chineke kwuru?” Ma ọ bụ ị pụrụ ikwu, sị: “Ị̀ maara na Bible zara ajụjụ ahụ?” Ọ bụru na ị na-agwa onye na-ejighị Bible kpọrọ ihe okwu, ọ pụrụ ịdị mkpa ka i jiri okwu mmeghe dịtụ iche mee ihe. Ị pụrụ ikwu, sị: “Ka mụ na gị tụlekọọ amụma oge ochie a.” Ma ọ bụ, ị pụrụ ikwu, sị: “Akwụkwọ a kasị kesaa n’akụkọ ihe mere eme nke mmadụ kwuru, sị . . . ”
N’ọnọdụ ụfọdụ, ị pụrụ ikpebi nanị ịkọwapụta ihe otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ na-ekwu. Otú ọ dị, n’ebe o kwere mee, ọ kasị mma ịsapeta Bible n’onwe ya ma gụọ ihe o kwuru. Gosi onye ahụ akụkụ Akwụkwọ Nsọ ahụ n’ime Bible nke ya n’ebe ọ bụla nke a ga-ekwe omume. Iji Bible n’onwe ya eme ihe otú a na-enwekarị mmetụta dị ike n’ahụ́ ndị mmadụ.—Hib. 4:12.
Ndị Kraịst bụ́ ndị okenye nwere ibu ọrụ pụrụ iche nke iji Bible na-eme ihe mgbe ha na-aza ajụjụ. Otu n’ime ihe a chọrọ iji ruo eru ije ozi dị ka okenye bụ na nwanna nwoke ahụ “na-ejidesi okwu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi aka ike n’ihe metụtara nkà izi ihe ya.” (Taị. 19) Onye nọ n’ọgbakọ pụrụ ime mkpebi dị oké mkpa ná ndụ ya mgbe onye okenye nyesịworo ya ndụmọdụ. Lee ka o si dị mkpa na ndụmọdụ a ga-adaberesi ike n’Akwụkwọ Nsọ! Ihe nlereanya onye okenye na-esetịpụ n’ime nke a pụrụ inwe mmetụta n’ahụ́ ọtụtụ ndị ọzọ n’ụzọ ha si ezi ihe.