Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • be ihe ọmụmụ 46 p. 244-p. 245 para. 4
  • Ihe Atụ Ndị Sitere n’Ọnọdụ Ndị A Maara nke Ọma

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ihe Atụ Ndị Sitere n’Ọnọdụ Ndị A Maara nke Ọma
  • Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Iji Ihe Ndị A Na-ahụ Anya Eme Ihe n’Ụzọ Dị Irè
    Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
  • A Kwanyeere Ndị Ọzọ Ùgwù
    Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
  • “Ọ Dịghị Agwa Ha Okwu Ma Ọ Bụrụ na O Jighị Ihe Atụ”
    ‘Bịa Bụrụ Onye Na-eso Ụzọ M’
  • “Ọ Dịghị Agwa Ha Okwu Ma Ọ Bụrụ Na O Jighị Ihe Atụ”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
be ihe ọmụmụ 46 p. 244-p. 245 para. 4

IHE ỌMỤMỤ NKE 46

Ihe Atụ Ndị Sitere n’Ọnọdụ Ndị A Maara nke Ọma

Gịnị ka ọ dị mkpa ka i mee?

Jiri ihe atụ ndị na-agụnye ihe omume ndị na-ege gị ntị na-eme ma ọ bụ ihe ndị ha maara nke ọma na-eme ihe.

Gịnị mere o ji dị mkpa?

Ihe atụ ndị e si n’ọnọdụ ndị a maara nke ọma were ga-emetụ ndị na-ege ntị n’obi.

N’EZIE, ọ dị mkpa na ihe atụ ọ bụla i ji eme ihe ga-ekwekọ n’ihe ị na-atụle. Otú ọ dị, ka ha wee dị irè karịsịa ọ dịkwa mkpa na ha ga-ekwesị ndị na-ege gị ntị.

Olee otú ụdị ndị ga-ege gị ntị pụrụ isi kpebie ihe atụ ị ga-eji mee ihe mgbe ị na-agwa otu ìgwè okwu? Gịnị ka Jizọs Kraịst mere? Ma ọ̀ na-agwa ìgwè mmadu okwu ma ọ̀ na-agwa ndị na-eso ụzọ ya okwu, Jizọs ewetaghị ihe atụ ya site n’ụzọ ndụ ndị ala ọzọ na-abụghị ndị Izrel. Ndị na-ege ya ntị agaraghị amataworị ihe atụ ndị dị otú ahụ. Dị ka ihe atụ, Jizọs ehotaghị ihe na-eme n’obí eze Ijipt ma ọ bụ ememe okpukpe ndị India. Ka o sina dị, o si n’ihe ndị mmadụ nọ n’ala nile na-eme were ihe atụ ya. O kwuru banyere idozi ákwà, ịzụ ahịa, ihe dị oké ọnụ ahịa ifunahụ mmadụ, na ịga oriri agbamakwụkwọ. Ọ maara otú ndị mmadụ si emeghachi omume n’ọnọdụ dị iche iche, o jikwa ya mee ihe. (Mak 2:21; Luk 14:7-11; 15:8, 9; 19:15-23) Ebe ọ bụ ndị Izrel karịsịa ka o meere nkwusa ihu ọha ya, ihe atụ ndị Jizọs mere zoro aka ọtụtụ ugboro karị n’arịa na n’ihe ndị ha na-eme ná ndụ ha na-adị kwa ụbọchị. Ya mere, o zoro aka n’ihe ndị dị ka ịkọ ugbo, ụzọ atụrụ si ege ntị n’olu onye na-azụ ha, na iji akpụkpọ anụ agbanye mmanya. (Mak 2:22; 4:2-9; Jọn 10:1-5) O zokwara aka n’ihe atụ ndị a maara nke ọma n’akụkọ ihe mere eme—okike nke mmadụ abụọ mbụ, Iju Mmiri nke oge Noa, mbibi nke Sọdọm na Gọmọra, ọnwụ nwunye Lọt, ka anyị hota nanị ole na ole. (Mat. 10:15; 19:4-6; 24:37-39; Luk 17:32) N’otu aka ahụ, ị̀ na-eji nlezianya atụle ihe ndị na-ege gị ntị na-emekarị nakwa ọdịnala ebe ha nọrọ too mgbe ị na-ahọrọ ihe atụ?

Gịnị ma ọ bụrụ na ọ bụghị ìgwè mmadụ buru ibu ka ị na-agwa okwu, kama ọ bụ otu onye ma ọ bụ ikekwe nanị mmadụ ole na ole? Gbalịa ịhọrọ ihe atụ kasị kwesị ekwesị maka ntakịrị ìgwè ahụ na-ege gị ntị. Mgbe Jizọs gbaara nwanyị Sameria àmà n’otu olulu mmiri dịdewere Saịka, o kwuru okwu banyere “mmiri na-enye ndụ,” ‘akpịrị akpọghị nkụ ọzọ,’ na “isi iyi nke mmiri nke na-asụpụta asụpụta inye ndụ ebighị ebi”—ihe a nile bụcha atụmatụ okwu ndị e jikọtara ha na ọrụ nwanyị ahụ na-arụ kpọmkwem. (Jọn 4:7-15) Mgbe ọ gwakwara ndị ikom na-asachasị ụgbụ ha ji na-akụ azụ̀ okwu, atụmatụ okwu o ji mee ihe metụtara ọrụ ịkụ azụ̀. (Luk 5:2-11) Na nke ọ bụla, ọ pụrụ izoworị aka n’ịkọ ugbo, ebe ha bi n’ógbè a na-akọ ugbo, ma lee ka o si dị nnọọ irè karị izo aka n’ihe ha onwe ha na-eme ka ọ na-ese onyinyo ha ga-eji uche ha hụ! Ị̀ na-agbalị ime otú ahụ?

Ọ bụ ezie na Jizọs dọọrọ uche gaa ‘n’atụrụ furu efu nke ụlọ Izrel,’ e zipụrụ Pọl onyeozi ịgakwuru ọ bụghị nanị ndị Izrel kamakwa mba dị iche iche nke ndị Jentaịl. (Mat. 15:24; Ọrụ 9:15) Nke a ò nwere mmetụta n’otú Pọl si kwuo okwu? Ee. Mgbe ọ na-edegara Ndị Kraịst nọ na Kọrint akwụkwọ, o zoro aka n’egwuregwu ịgba ọsọ, hota omume nke iri nri n’ụlọ arụsị, zookwa aka ná ngagharị mmeri, ihe ndị Jentaịl ahụ ga-ama nke ọma.—1 Kọr. 8:1-10; 9:24, 25; 2 Kọr. 2:14-16.

Ị̀ na-akpachara anya otú Jizọs na Pọl si kpachara anya mgbe ị na-ahọrọ ihe atụ ị ga-eji zie ihe? Ị̀ na-atụle ọnọdụ ndị na-ege gị ntị nọ na ha too na ihe ha na-eme kwa ụbọchị? N’ezie, e nwewo ọtụtụ mgbanwe n’ụwa kemgbe narị afọ mbụ. Ọtụtụ ndị pụrụ ịnụ akụkọ ụwa na telivishọn. Ọtụtụ mgbe, ha na-ama nke ọma, ihe ndị na-eme n’ala ndị ọzọ. N’ebe ọ dị otú a, n’ezie isi n’akụkọ ndị dị otú ahụ weta ihe atụ adịghị njọ. Ka o sina dị, ihe ndị kasị enwe mmetụta n’ahụ́ ndị mmadụ na-abụkarị ihe ndị gbasara ha—ebe obibi ha, ezinụlọ ha, ọrụ ha, nri ha na-eri, ihu ígwé nke ógbè ha.

Ọ bụrụ na ihe atụ gị chọrọ nkọwa buru ibu, ọ pụrụ ịbụ na ị na-ekwu ihe ndị na-ege gị ntị na-amaghị nke ọma. N’ụzọ dị mfe, ụdị ihe atụ ahụ nwere ike ikpuchi ihe ị na-ezi. N’ihi ya, ndị na-ege ntị pụrụ icheta ihe atụ gị ma ha agaghị echeta eziokwu sitere n’Akwụkwọ Nsọ nke ị na-agbalị ịkụzi.

Kama iji ihe atụnyere ihe n’ụzọ ga-adị mgbagwoju anya, Jizọs ji ihe ndị dị mfe, ndị a na-ahụ kwa ụbọchị mee ihe. O ji ụmụ obere ihe kọwaa ihe ndị buru ibu, jirikwa ihe ndị dị mfe kọwaa ihe ndị tara akpụ. Site n’igosi njikọ dị n’agbata ihe ndị na-eme kwa ụbọchị na eziokwu ime mmụọ, Jizọs nyeere ndị mmadụ aka ịghọta eziokwu ime mmụọ ndị ọ na-akụzi na icheta ha ngwa ngwa karị. Lee ihe nlereanya ọma ọ bụ ịgbaso!

ỤZỌ ISI ZỤLITE NKÀ AHỤ

  • Mụta iche echiche ọ bụghị nanị banyere ihe ị chọrọ ikwu kamakwa banyere ndị ga-ege gị ntị.

  • Na-eleru anya n’ihe ndị na-eme gburugburu gị.

  • Mee ka ọ bụrụ ihe mgbaru ọsọ gị kwa izu iji otu ihe atụ dị mma, ma ọ dịkarịa ala, bụ́ nke ị na-ejitụbeghị mee ihe, mee ihe.

IHE OMUME: Nyochaa ihe atụ e ji mee ihe na Matiu 12:10-12. Gịnị mere o ji dị irè?

Ihe atụ ndị m pụrụ iji mee ihe mgbe m so onye nọ n’afọ iri na ụma na-atụgharị uche n’ụkpụrụ omume ọma

․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․

Ihe atụ ndị m pụrụ iji mee ihe mgbe m so onye toworo eto na-atụgharị uche n’otu eziokwu bụ́ isi nke Bible

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya