Ịzụlite Ụmụaka Nwere Omume Ọma Ọ̀ Ka Kwere Omume?
“ANYỊ na-ebi ugbu a n’ọha mmadụ dị mgbagwoju anya, ọdịbendị gwara ọgwa nke ukwuu, ebe a na-enweghị otu ụkpụrụ nke omume ọma,” ka Robert Glossop nke Ụlọ Akwụkwọ Vanier Maka Ezinụlọ dị n’Ottawa, Canada, na-ekwu. Gịnị ka ọ kpatara? Otu akụkọ dị n’akwụkwọ akụkọ The Toronto Star na-asị: “Ịtụrụ ime nke ndị nọ n’afọ iri na ụma, ime ihe ike nke ndị ntorobịa na igbu onwe onye nke ndị nọ n’afọ iri na ụma na-arịcha elu.”
Nsogbu ahụ na-agbasa gabiga Ugwu America. Bill Damon, onye ntụzi nke Ogige Maka Nzụlite Mmadụ na Mahadum Brown dị na Rhode Island, U.S.A., amụwo banyere nsogbu ndị a na Britain na mba Europe ndị ọzọ, tinyekwara n’Australia, Israel, na Japan. O zoro aka ná ndalata e nwere na chọọchị, ụlọ akwụkwọ, na ụlọ ọrụ ndị ọzọ n’inye ndị na-eto eto nduzi. Ọdịbendị anyị, ka ọ na-ekwenye, “enwekwaghị ihe dị ụmụaka mkpa iji zụlite omume na àgwà ndị dị mkpa.” N’izo aka n’ebe ndị ọkachamara n’ịzụ ụmụaka nọ, bụ́ ndị na-akụzi na “ịdọ aka ná ntị dị ize ndụ nye ahụ ike nke ụmụaka,” Damon na-ekwusi ike na nke a bụ “ụkpụrụ maka ịzụlite ụmụaka na-eme ihe masịrị ha, ndị na-enupụ isi.”
Gịnị dị ndị ntorobịa taa mkpa? Ha chọrọ ọzụzụ nke a na-enye n’ịhụnanya mgbe nile nke na-agbazi uche na obi. Ndị ntorobịa dị iche iche chọrọ ụdị ịdọ aka ná ntị dịgasị iche iche. Mgbe ịhụnanya kwaliri ya, a pụrụ isitekarị ná mkparịta ụka nye ịdọ aka ná ntị. Nke ahụ mere e ji gwa anyị n’Ilu 8:33 ka anyị ‘nụrụ ịdọ aka ná ntị.’ Otú ọ dị, a dịghị eji ‘nanị okwu adọ ụfọdụ ndị aka ná ntị.’ Nye ha, ntaramahụhụ kwesịrị ekwesị a na-enye n’ókè kwesịrị ekwesị maka nnupụisi pụrụ ịdị mkpa. (Ilu 17:10; 23:13, 14; 29:19) N’ịtụ aro a, Bible adịghị akwado iji iwe na-apịa ụtarị ma ọ bụ iti oké ihe, nke pụrụ ichifịa ma merụọ nwatakịrị ahụ. (Ilu 16:32) Kama nke ahụ, nwatakịrị kwesịrị ịghọta ihe mere e ji enye ya mgbazi ma ghọta na ọ bụ n’ihi na onye mụrụ ya kwụ ya n’akụkụ, na-akwado ya.—Tụlee Ndị Hibru 12:6, 11.
E mere ka ndụmọdụ ọma dị otú ahụ, dị irè nke sitere na Bible pụta ìhè n’akwụkwọ bụ́ Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ.