Ihe E Kwuru n’Akwụkwọ Bekee Ndị A Kpọrọ Aha n’Usoro Ihe Omume Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ
EPREL 3-9
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | JEREMAYA 17-21
“Kwee Ka Jehova Kpụzie Echiche Gị na Àgwà Gị”
it-2-E 776 ¶4
Nchegharị
Ọkpụite nwere ike iji ụrọ na-akpụ arịa ma mechaa jirizie ụrọ ahụ kpụọ ụdị arịa ọzọ ma ọ bụrụ na ‘aka ọkpụite ahụ emebie’ arịa ahụ ọ na-akpụ. (Jere. 18:3, 4) N’ihe atụ a, Jehova anaghị egosi na aka ya na-emebi arịa ọ na-akpụ dị ka aka ọkpụite nwere ike imebi arịa ọ na-akpụ, kama, ihe Jehova na-ekwu bụ na ya nwere ikike ịgwa ụmụ mmadụ ihe ha kwesịrị ime. Jehova nwere ikike ịgbanwe otú o si emeso ha ihe ma ọ bụrụ na ha erubere ya isi ma ọ bụ nupụrụ ya isi. (Tụlee Aịza. 45:9; Rom 9:19-21.) O nwere ike ‘ịgbanwe obi ya n’ọdachi o bu n’obi ime ka ọ dakwasị’ obodo ma ọ bụ ‘gbanwee obi ya banyere ihe ọma o kwuru n’obi ya na ọ ga-eme maka ọdịmma’ obodo ahụ. Ma, ihe ga-ekpebi nke ọ ga-eme bụ otú obodo ahụ si kpaa àgwà mgbe ọ gwara ha ihe ha ga-eme. (Jere. 18:5-10) N’ihi ya, ọ bụghị na Ọkpụite Ukwu ahụ bụ́ Jehova na-emehie ihe, kama ọ bụ ụmụ mmadụ bụ́ “ụrọ” na-agbanwe obi ha ma nwee mwute n’ihi ihe ha na-emebu.
EPREL 24-30
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | JEREMAYA 29-31
“Jehova Buru Amụma Banyere Ọgbụgba Ndụ Ọhụrụ”
it-2-E 524 ¶3-4
Ọgbụgba ndụ
Ọgbụgba Ndụ Ọhụrụ. Ihe dị ka narị afọ isii tupu Kraịst, Jehova si n’aka Jeremaya onye amụma buo amụma gbasara ọgbụgba ndụ ọhụrụ. Ọ sịkwara na ọ gaghị adị ka ọgbụgba ndụ Iwu ahụ, nke ụmụ Izrel mebiri. (Jere. 31:31-34) N’abalị bọtara ụbọchị Jizọs nwụrụ, ya bụ, na Naịsan 14, afọ 33, mgbe Jizọs bidoro Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị, o kwuru banyere ọgbụgba ndụ ọhụrụ, nke àjà ọ na-aga ịchụ ga-eme ka ọ dị irè. (Luk 22:20) Abalị iri ise a kpọlitechara Jizọs n’ọnwụ, ya bụ, abalị iri ọ rịgochara n’eluigwe, Jizọs wụsara ndị na-eso ụzọ ya mmụọ nsọ ọ natara n’aka Nna ya mgbe ha nọ n’otu ọnụ ụlọ dị n’elu na Jeruselem.—Ọrụ 2:1-4, 17, 33; 2 Kọr. 3:6, 8, 9; Hib. 2:3, 4.
Ndị so n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ bụ Jehova na “Izrel nke Chineke,” ya bụ, ụmụ Chineke e ji mmụọ nsọ mụọ, ndị ha na Kraịst dị n’otu, ndị nọkwa n’ọgbakọ Kraịst. (Hib. 8:10; 12:22-24; Gal. 6:15, 16; 3:26-28; Rom 2:28, 29) Ihe mere ka ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ dị irè bụ ọbara Jizọs, ya bụ, àjà Jizọs Kraịst ji ndụ ya chụọ, nke o gosiri Nna ya mgbe ọ gbagooro n’eluigwe. (Mat. 26:28) Ọ bụrụ na Chineke ahọrọ mmadụ iso ná ndị ga-aga eluigwe (Hib. 3:1), ọ ga-emezi ka onye ahụ soro n’ọgbụgba ndụ ahụ àjà Kraịst mere ka ọ dị irè. (Ọma 50:5; Hib. 9:14, 15, 26) Ọ bụ Kraịst bụ onye ogbugbo nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ, (Hib. 8:6; 9:15) bụrụkwa onye bụ́ isi ná mkpụrụ Ebreham. (Gal. 3:16) Ebe Jizọs bụ onye ogbugbo nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ, ọ ga-enyere ndị niile so n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ aka ịghọ mkpụrụ Ebreham, (Hib. 2:16; Gal. 3:29) n’ihi na a ga-agbaghara ha mmehie ha. Jehova ga-akpọzi ha ndị ezi omume.—Rom 5:1, 2; 8:33; Hib. 10:16, 17.
g-E 6/12 14 ¶1-2
Baịbụl—Amụma Dị na Ya Na-emezu Nnọọ Otú E Si Buo Ya, Nkebi nke 2
Mgbe o mezuru: Mgbe afọ 70 ndị Juu ga-anọ na Babịlọn gwụrụ, ya bụ, malite n’afọ 607 ruo n’afọ 537 T.O.N.K., Eze Saịrọs nke Peshia hapụrụ ha ka ha laghachi n’ala ha gaa rụghachi ụlọ nsọ dị na Jeruselem.—Ezra 1:2-4.
Gịnị ka akụkọ ihe mere eme na-egosi:
● À dọọrọ ndị Izrel n’agha, ha anọọ afọ iri asaa na Babịlọn otú ahụ Baịbụl buru n’amụma? Otu onye Izrel bụ́ ọkachamara n’ihe gbasara ndị mgbe ochie aha ya bụ Ephraim Stern kwuru, sị: “O nweghị ihe ọ bụla a hụrụ gosiri na e nwere ndị bi n’obodo a malite n’afọ 604 T.O.N.K. ruo n’afọ 538 T.O.N.K. N’ime oge a niile, o nweghị obodo ọ bụla Babịlọn dọọrọ n’agha laghachiri n’obodo ha.” Oge ahụ e kwuru na o nweghị ndị Babịlọn meriri laghachiri n’obodo ha dabara nnọọ n’oge ahụ Baịbụl kwuru na a dọọrọ ụmụ Izrel n’agha laa Babịlọn, ya bụ, malite n’afọ 607 ruo 537 T.O.N.K.—2 Ihe E Mere 36:20, 21.