Ihe E Kwuru n’Akwụkwọ Bekee Ndị A Kpọrọ Aha n’Usoro Ihe Omume Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ
MACH 13-19
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | JEREMAYA 5-7
“Ha Kwụsịrị Ime Uche Chineke”
w88 4/1 11-12 ¶7-8
Jeremaịa—Onye Amụma Na-adịghị Ọha Mma nke Ihe Chineke Kpere n’Ikpe
7 “Ha ga-ebusokwa gị agha,” ka Jehova buru ụzọ gwa ya, “ma ha agaghị enwe ike imegide gị.” (Jeremaịa 1:19) Ugbu a, olee ihe mere ndị Juu na ndị na-achị ha ga-eji chọọ ibu agha megide onye amụma nke a? N’ihi na ozi ya megidere afọ ojuju ha nwere n’ịdabere n’onwe ha, megidekwa ụzọ ha si efe ofufe. Jeremaịa alaghị azụ n’ịgwa ha okwu amamikpe ahụ: “Lee, okwu Jehova aghọworo ha ihe ịta ụta; ọ dịghị atọ ha ụtọ. N’ihi na site n’onye dịkarịsịrị nta n’ime ha wee ruo n’onye dịkarịsịrị ukwuu n’ime ha onye ọ bụla bụ onye akpịrị uru na-ezighị ezi na-akpọ nkụ; ọzọ, site n’onye amụma wee ruo onye nchụàjà [bụ́ ndị kwesịrị ichekwa ụkpụrụ omume ziri ezi na ihe ime mmụọ] onye ọ bụla na-eme ihe n’ụgha.”—Jeremaịa 6:10, 13.
8 N’ezie, ha bụ ndị ndú mba ahụ n’ịchụ àjà. Ha na-eme ihe a tụrụ anya ya n’ezi ofufe, ma ọ bụghị site n’obi ha. Ihe ka ha mkpa bụ ihe ndị a na-eme n’okpukpe karịa ime ezi omume. N’otu mgbe ahụ, ndị ndú okpukpe ndị Juu na-eduhie mba ahụ gaa n’inwe echiche n’ezighị ezi nke ịnọ ná ntụkwasị obi, na-asị, “Udo, udo” mgbe udo na-adịghị. (Jeremaịa 6:14; 8:11) Ee, ha na-eduhie ndị mmadụ ikwere na ha na Chineke dị n’udo. Ha echee na ọ dịghị ihe a ga-echegbu onwe onye maka ya, n’ihi na ha bụ ndị Jehova zọpụtaworo, bụrụ ndị nwere obodo nsọ na ụlọ ikwuu ya. Ma ọ̀ bụ otú ahụ ka Jehova si lee ọnọdụ ahụ anya?
w88 4/1 12 ¶9-10
Jeremaịa—Onye Amụma Na-adịghị Ọha Mma nke Ihe Chineke Kpere n’Ikpe
9 Jehova nyere Jeremaịa iwu ka o guzo ebe ọha mmadụ ga-ahụ ya n’ọnụ ụzọ ámá ụlọ ukwuu wee kpọsaa ozi Ya nye ndị nile na-abata ebe ahụ ife ofufe. Ọ ga-agwa ha, sị: ‘Unu atụkwasịla obi unu n’okwu ụgha nile, sị, Ụlọ ukwu Jehova, ụlọ ukwu Jehova, ụlọ ukwu Jehova, ka ndị a bụ, ọ gaghị abara unu uru ma ọlị.’ Ndị Juu na-ejegharị n’ihe a hụrụ anya, ọ bụghị n’okwukwe, ebe ha ji ụlọ ukwu ha na-anya isi. Ha echefuworị okwu ịdọ aka ná ntị nke Jehova; “Eluigwe bụ ocheeze m, ụwa bụkwa ihe mgbakwasị ụkwụ m: aha ụlọ gịnị ka unu ga-ewuru m?” O doro anya na Jehova, Eze Onyenwe elu na ala nile ebighị n’ime ụlọ ukwu ha, n’agbanyeghị otú ọ pụrụ isi dị ebube!—Jeremaịa 7:1-8; Aịsaịa 66:1.
10 Jeremaịa gara n’ihu ịbasi mba ike n’ihu ọha, sị: “Ùnu ga na-ezu ohi, na-egbu mmadụ, na-akwa iko, na-aṅụ iyi ụgha, na-esurere Beal ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ, na-ejeso chi ọzọ dị iche iche nke unu na-amaghị, . . . sị, Anapụtawo anyị; ka unu wee mee ihe arụ ndị a nile?” Ndị Juu, dị ka ‘ndị Chineke họpụtaworo,’ chere na ọ ga-anabata ụdị omume ọ bụla, ọ bụrụhaala na ha na-eweta ihe ịchụ àjà n’ụlọ ikwuu. Otú ọ dị, ọ bụrụ na ha aghọta ya dị ka nna nwere mmetụta, nke na-agụgụ onye bụ nanị otu nwa nke a zụtọsịworo, ha ga-aghọta ọnọdụ ọjọọ ha nile.—Jeremaịa 7:9, 10; Ọpụpụ 19:5, 6.
w88 4/1 13 ¶15
Jeremaịa—Onye Amụma Na-adịghị Ọha Mma nke Ihe Chineke Kpere n’Ikpe
Juda Kwụrụ Ụgwọ ahụ
15 N’ihe dị ka afọ 632 T.O.A., ndị Kaldea na Midia kwaturu Asiria, e wetukwara Ijipt n’ala ịbụ ike ọchịchị dị ala n’akụkụ ndịda nke Juda. Ihe bụ n’ezie ihe ga-eyi Juda egwu ga-esi n’ụzọ mwakwasị ahụ e si eje ebe ugwu bịa. N’ihi nke a, ọ bụ ihe Jeremaịa na-aghaghị ime ịkọrọ ndị Juu ibe ya akụkọ ọjọọ! “Lee, otu ndị na-esi n’ala ugwu bịa . . . mba dị irè ka ọ bụ, ha adịghị enwe obi ebere. . . . E doro mba ahụ n’usoro, dị ka onye na-ebu agha, imegide gị, ada Zaịọn.” Ndị na-anọkwasị n’ike ọchịchị ụwa mgbe ahụ bụ Babilọn. Nke a gaje ịbụ ngwá ọrụ Chineke ga-eji mee ihe inye Juda ahụ na-ekwesịghị ntụkwasị obi ahụhụ.—Jeremaịa 6:22, 23; 25:8, 9.
MACH 20-26
“Ụmụ Mmadụ Ga-enwe Ọganihu Naanị Ma Jehova Duzie Ha”
it-1-E 555
Kukumba
A na-egwunye ogidi, ogwe osisi, ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ n’ubi ka ha na-achụpụ ụmụ anụmanụ. Jeremaya onye amụma ji arụsị mba dị iche iche na-efe tụnyere ihe ndị ahụ na-adịghị ndụ “e ji achụ anụmanụ n’ubi kukumba.”—Jere. 10:5.