Ihe E Kwuru n’Akwụkwọ Bekee Ndị A Kpọrọ Aha n’Usoro Ihe Omume Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ
FEBỤWARỊ 6-12
IHE ANYỊ MỤTARA N’OKWU CHINEKE
it-1-E 643 ¶4-5
Ịgba Alụkwaghịm
Ịgba Alụkwaghịm Ihe Atụ. E ji ịlụ di na nwunye mee ihe atụ n’ebe ụfọdụ n’Akwụkwọ Nsọ. (Aịza. 54:1, 5, 6; 62:1-6) E nwekwara ebe ndị e ji ịgba alụkwaghịm ma ọ bụ ịchụpụ nwaanyị mee ihe atụ.—Jere. 3:8.
A kwaturu alaeze Juda ma bibie Jeruselem n’afọ 607 T.O.N.K., dọrọkwa ndị bi n’obodo ahụ n’agha laa Babịlọn. Ọtụtụ afọ tupu mgbe ahụ, Jehova gwara ndị Juu ahụ e mechara dọrọ n’agha, sị: “Olee akwụkwọ m ji gbaa nne unu m chụpụrụ achụpụ alụkwaghịm?” (Aịza. 50:1) Ihe mere Jehova ji jụ “nne” ha ma ọ bụ obodo ha ziri ezi. Ọ bụghị maka na o mebiri ọgbụgba ndụ ya na ha ma chụpụ nne ha, kama ọ bụ n’ihi nnupụisi ha. Ma, o nwere ụfọdụ ndị Izrel chegharịrịnụ ma rịọ Jehova ka ha na ya dịghachikwa ná mma, nakwa ka ọ kpọghachite ha n’obodo ha ka ha bidokwa fewe ha. Jehova meere ha ebere n’ihi aha nsọ ya ma kpọghachite ha n’obodo ha n’afọ 537 T.O.N.K., mgbe afọ 70 gachara.—Ọma 137:1-9.