Aịzaya
62 Agaghị m agbachi nkịtị n’ihi Zayọn.+
Agaghịkwa m anọ jii n’ihi Jeruselem,
Ruo mgbe ezi omume ya malitere inwu ka ìhè,+
Nzọpụta ya ana-enwukwa ka ọwa a mụnyere ọkụ.+
2 “Jeruselem,* mba dị iche iche ga-ahụ ezi omume gị.+
Ndị eze niile ga-ahụkwa ebube gị.+
A ga na-akpọ gị aha ọhụrụ.+
Ọ bụ Jehova ga-eji ọnụ ya gụọ gị aha ahụ.
3 Ị ga-aghọ okpueze mara mma n’aka Jehova,
Ghọọkwa ákwà eze na-eke n’isi n’ọbụ aka Chineke gị.
4 A gaghịzi akpọ gị nwaanyị a hapụrụ ahapụ.+
A gaghịzi asị na ala gị tọgbọ nkịtị.+
Kama a ga-akpọ gị Onye Ihe Ya Masịrị M,+
Kpọọkwa ala gị Nwaanyị A Lụ Alụ.
N’ihi na ihe gị ga-amasị Jehova,
Ala gị ga-adịkwa ka nwaanyị a lụ alụ.
5 N’ihi na ụmụ gị ndị nwoke ga-alụrụ gị
Dị ka nwa okorobịa si alụrụ nwa agbọghọ na-amaghị nwoke.
Chineke gị ga-aṅụrị ọṅụ n’ihi gị+
Otú nwoke na-alụ nwaanyị ọhụrụ si aṅụrị ọṅụ n’ihi nwaanyị ọ na-alụ ọhụrụ.
6 Jeruselem, enyela m ndị nche ọrụ ka ha na-anọ n’elu mgbidi gị niile.
Ha ekwesịghị ịgbachi nkịtị mgbe ọ bụla, ma n’ehihie ma n’abalị.
Ndị na-ekwu gbasara Jehova,
Unu ezula ike.
7 Na-arịọnụ ya ka ọ na-enyere unu aka ruo mgbe o mere ka Jeruselem sie ezigbo ike,
Ruokwa mgbe o mere ka a na-eto Jeruselem n’ụwa.”+
8 Jehova eweliela aka nri ya na aka ya dị ike elu, ṅụọ iyi, sị:
“Agaghịzi m enye ndị iro gị ọka* gị ka ha taa.
Ndị mba ọzọ agaghịzikwa aṅụ mmanya ọhụrụ gị, nke ị tara ahụhụ mepụta.+
9 Kama ọ bụ ndị chịkọtara ọka ahụ ga-ata ya. Ha ga-etokwa Jehova.
Ọ bụkwa ndị mepụtara mmanya ahụ ga-aṅụ ya n’ogige m dị nsọ.”+
10 Pụọnụ, sinụ n’ọnụ ụzọ ámá pụọ.
Wepụnụ ihe nọchiiri ndị m ụzọ.+
Rụọnụ ụzọ. Rụọnụ okporo ụzọ.
Wepụsịanụ nkume ndị dị na ya.+
Gwunyenụ ihe ga na-agbara mba dị iche iche àmà.+
11 Jehova gwara ndị nọ ebe ụwa sọtụrụ, sị:
Chineke dị njikere ịkwụ ndị ya ụgwọ ọrụ.
Ihe ọ ga-akwụ ha dịkwa n’ihu ya.’”+
12 Ndị mmadụ ga-akpọ ha ndị dị nsọ, ndị Jehova gbapụtara.+
A ga-akpọkwa Jeruselem Obodo Chineke Chọtara, Obodo Chineke Na-ahapụghị.+