9 Nwaanyị nke na-ezi Zayọn ozi ọma,+
Gbagoo n’ugwu dị elu.
Nwaanyị nke na-ezi Jeruselem ozi ọma,
Jiri ike gị tie mkpu.
Tie mkpu. Atụla egwu.
Gwa obodo ndị dị na Juda, sị: “Leenụ Chineke unu.”+
10 Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova ga-abịa gosi ike ya.
Aka ya ka ọ ga-eji na-achị.+
Ọ dị njikere ịkwụ ndị ya ụgwọ ọrụ.
Ihe ọ ga-akwụ ha dịkwa n’ihu ya.+