Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • dp isi 7 p. 98-113
  • Okwu Anọ Ndị Gbanwere Ụwa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Okwu Anọ Ndị Gbanwere Ụwa
  • Ṅaa Ntị n’Amụma Daniel!
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • OTU OKÉ ORIRI AGBAA AGHARA
  • IHE E DERE N’ELU MGBIDI
  • A KPỌỌ NWOKE NWERE NGHỌTA
  • A KỌWAA OKWU DỊ MGBAGWOJU ANYA!
  • ỌDỊDA BABILỌN
  • ỊMỤTA IHE SITE N’IHE AHỤ E DERE N’ELU MGBIDI
  • Alaeze Ukwu Efunahụ Otu Eze Dị Nganga
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Ihe Aka Dere ná Mgbidi
    Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
  • Daniel—Akwụkwọ A Na-ekpe Ikpe
    Ṅaa Ntị n’Amụma Daniel!
  • Ị̀ Maara?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2020
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ṅaa Ntị n’Amụma Daniel!
dp isi 7 p. 98-113

Isi nke Asaa

Okwu Anọ Ndị Gbanwere Ụwa

1. Mmetụta hà aṅaa ka okwu anọ ahụ e dere n’elu mgbidi n’ogologo oge gara aga nwere?

OKWU anọ dị mfe e dere n’elu mgbidi e tere ete. Ma, okwu anọ ahụ menyere otu onye ọchịchị dị ike ụjọ nke na ọ fọrọ nke nta ka isi gbakaa ya. Ha kpọsara nkwatu nke ndị eze abụọ, ọnwụ nke otu n’ime ha, na njedebe nke otu ike ọchịchị ụwa dị ike. Okwu ndị ahụ mere ka e weda otu òtù okpukpe a na-asọpụrụ ala. Nke kasị mkpa, ha buliri ofufe dị ọcha nke Jehova elu ma mesighachi ọbụbụeze ya ike n’oge mgbe ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ na-ejighị nke ọ bụla n’ime ha kpọrọ ihe. Leenụ, okwu ndị ahụ ọbụna mere ka a ghọtakwuo ihe ndị na-eme n’ụwa taa! Olee otú okwu anọ ga-esi eme ihe ahụ nile? Ka anyị lee.

2. (a) Gịnị mere na Babilọn mgbe Nebukadneza nwụsịrị? (b) Olee onye ọchịchị chịwazirinụ?

2 Ọtụtụ iri afọ agabigawo kemgbe ihe ndị ahụ a kọwara n’isi nke 4 nke Daniel mere. Ọchịchị Eze Nebukadneza dị mpako chịrị na Babilọn afọ 43 bịara ná njedebe mgbe ọ nwụrụ na 582 T.O.A. Ọtụtụ ndị nọchiri ya sitere n’ezinụlọ ya, ma nnwụchu ọnwụ ma ọ bụ ogbugbu wetara ọchịchị ha nile n’otu n’otu ná njedebe. N’ikpeazụ, otu nwoke aha ya bụ Nabonidus rigooro n’ocheeze ahụ site n’ibu agha nnupụisi. N’ịbụ ọkpara nke nwanyị bụ́ onyeisi nchụàjà nke chi ọnwa bụ́ Sin, ihe àmà na-egosi na Nabonidus na ezinụlọ ndị eze nke Babilọn abụghị otu ọbara. Ụfọdụ akwụkwọ na-atụ aro na ọ lụrụ otu nwa nwanyị Nebukadneza iji mee ka ọchịchị ya kwekọọ n’iwu, mee nwa ha bụ́ Belshaza onye so ya na-achị, ma hapụrụ ya Babilọn ruo ọtụtụ afọ. Ọ bụrụ otú ahụ, Belshaza ga-abụworị nwa nwa Nebukadneza. Site n’ahụmahụ nna nna ya, ọ̀ mụtawo na Jehova bụ Chineke Kachasị Elu, onye nwere ike iweda eze ọ bụla n’ala? Ọ dịghị ma ọlị!—Daniel 4:37.

OTU OKÉ ORIRI AGBAA AGHARA

3. Olee ihe oké oriri Belshaza dị ka ya?

3 Isi nke 5 nke akwụkwọ Daniel ji otu ememe oriri malite. “Belshaza, bụ́ eze, mere oké oriri nye [otu puku ndị isi ya], ọ bụkwa n’ihu [otu puku] ahụ ka ọ na-aṅụ mmanya vine.” (Daniel 5:1) Dị ka ị pụrụ iche, ọ ghaghị ịbụ ụlọ nzukọ buru ibu ga-abata ndị ikom a nile, tinyere ndị nwunye ndị ọzọ nke eze na ndị iko ya nwanyị. Otu ọkà mmụta na-ekwu, sị: “Oké oriri Babilọn na-ebu ibu, ọ bụ ezie na ọ na-ejedebekarị n’ịṅụbiga mmanya ókè. Mmanya, bụ́ ndị e si ná mba ọzọ bubata, na ụdị ihe okomoko ọ bụla na-ejupụta na tebụl. Ísì ụtọ na-esiju ụlọ nzụkọ ahụ; ndị na-agụ egwu na ndị na-akụ akụ na-eme ndị ọbịa zukọrọnụ obi ụtọ.” N’ịnọ n’isi oche ebe onye ọ bụla pụrụ ịhụ ya, Belshaza ṅụrụ mmanya ya—nọgidekwa na-aṅụ.

4. (a) N’ihi gịnị ka ọ pụrụ iji yie ihe dị ịtụnanya na ndị Babilọn na-eri oriri n’abalị nke October 5/6, 539 T.O.A.? (b) Gịnị ka ihe àmà na-egosi mere ndị Babilọn ji nwee obi ike n’agbanyeghị ndị agha ahụ na-eme mwakpo?

4 O yiri ihe ịtụnanya na Babilọn nọ n’oké ememe dị otú a n’abalị a—October 5/6, 539 T.O.A. Ala ha nọ n’agha, ihe adịghị agazikwara ha. Usuu ndị agha Medo-Peasia na-eme mwakpo ka merisịrị Nabonidus, ọ gbagawokwa na Borsippa, n’akụkụ ndịda nke ebe ọdịda anyanwụ Babilọn. Ugbu a kwa ndị agha Saịrọs mara ụlọ ikwuu ha kpọmkwem n’èzí Babilọn. N’agbanyeghị nke ahụ, o yighị ka ọ na-echegbu Belshaza na ndị isi ya. E kwuwerị, obodo ha bụ Babilọn ahụ a na-apụghị ịbanye abanye! Mgbidi ya ndị gbara agba guzo n’ụzọ dị oké elu n’akụkụ olulu miri emi nke nnukwu Osimiri Yufretis na-asọju ka o si n’etiti obodo ahụ na-erufe. Ọ dịbeghị onye iro wakwasịworo Babilọn na mberede n’ime ihe karịrị otu puku afọ. N’ihi ya gịnị mere mmadụ ga-eji sogbuwe onwe ya? Ikekwe Belshaza chere na ụzụ nke oriri oké mkpọtụ ha ga-agwa ndị iro ha nọ n’èzí na ha nwere obi ike ma kụda ha mmụọ.

5, 6. Gịnị ka Belshaza mere mgbe mmanya na-egbu ya, n’ihi gịnịkwa ka nke a ji bụrụ oké mkparị nye Jehova?

5 Ọ dịghị anya, mmanya malitere igbu Belshaza. Dị ka Ilu 20:1 na-ekwu, “onye na-akwa emo ka mmanya vine bụ.” N’ezie, n’ọnọdụ a, mmanya dugara eze ahụ n’ime ihe nzuzu kaṣi njọ. O nyere iwu ka a chịta arịa ndị dị nsọ sitere n’ụlọ nsọ Jehova n’oké oriri ahụ. A na-eji arịa ndị a, bụ́ ndị e buuru dị ka ihe nkwata n’agha n’oge Nebukadneza meriri Jerusalem, eme ihe nanị maka ofufe dị ọcha. Ọbụna a dọrọ ndị nchụàjà ndị Juu e nyere ikike iji ha eme ihe n’ụlọ nsọ dị na Jerusalem n’oge gara aga aka ná ntị ka ha debe onwe ha ọcha.—Daniel 5:2; tụlee Aịsaịa 52:11.

6 Otú ọ dị, Belshaza ka bu àgwà mkparị ndị ọzọ n’uche. “Eze na ndị isi ya na ndị bụ nwunye ya na ndị iko ya nwanyị . . . ṅụrụ mmanya vine, wee jaa chi nile nke ọlaedo, na nke ọlaọcha, na nke ọla [copper], na nke ígwè, na nke osisi, na nke nkume.” (Daniel 5:3, 4) Ya mere Belshaza bu n’uche ibuli chi ụgha ya nile elu karịa Jehova! O yiri ka àgwà a ọ̀ bụ nnọọ ihe ndị Babilọn na-emekarị. Ha lelịrị ndị Juu ha ji eji anya, na-akwa ofufe ha emo, ha adịghịkwa enye ha olileanya ọ bụla maka nlaghachi n’ala nna ha ha hụrụ n’anya. (Abụ Ọma 137:1-3; Aịsaịa 14:16, 17) Ikekwe eze a mmanya na-egbu chere na iweda ndị a bi n’ala ọzọ n’ala na ịkparị Chineke ha ga-amasị ndị inyom na ndị ọrụ ya, na-eme ka o yie onye dị ike.a Ma ọ bụrụ na Belshaza nwetụrụ mkpali nke inwe ike, ọ dịteghị anya.

IHE E DERE N’ELU MGBIDI

7, 8. Olee otú e si kwụsị oké oriri Belshaza, oleekwa mmetụta nke a nwere n’ahụ eze ahụ?

7 “N’otu oge awa ahụ,” ka ihe ndekọ ahụ sitere n’ike mmụọ nsọ na-ekwu, “ka mkpịsị aka ụfọdụ nke aka mmadụ pụtara, dee ihe ná ncherịta ihu ihe ịdọba oriọna n’elu nzụ e tere ná mgbidi ụlọ ukwu eze: eze na-ahụkwa ọbụ aka ahụ nke na-ede ihe.” (Daniel 5:5) Lee ihe na-atụ egwu ọ bụ! Aka nọkatara pụta, na-efegharị n’ikuku na nso akụkụ mgbidi ahụ ebe ìhè na-achakwasị nke ọma. Chetụdị otú nnọkọ oriri ahụ ga-esi daa jụụ ka ndị ọbịa ahụ tụgharịrị imoropụ anya na-ele ya. Aka ahụ malitere ide ozi dị omimi n’ahụ ájá ahụ e tere ete.b Ihe a merenụ bụ nnọọ mgbaàmà ihe ọjọọ, nke a na-agaghị echezọ echezọ nke na ruokwa taa ndị mmadụ ka na-eji okwu ahụ bụ́ “ihe e dere n’ahụ mgbidi” enye echiche ịdọ aka ná ntị nke ọdachi na-abịanụ.

8 Olee mmetụta o nwere n’ahụ eze a dị mpako bụ́ onye nwaworo ibuli onwe ya na chi ya elu karịa Jehova? “Mgbe ahụ igbu maramara nke ihu eze gbanwere, echiche ya nile na-emekwa ka ọ maa jijiji; nkwonkwo úkwù ya na-atọpụsịkwa, ikpere ya abụọ na-akụkọrịtakwa onwe ha.” (Daniel 5:6) Belshaza ezubewo ime onwe ya ka o yie onye ukwu na onye dị ebube n’ihu ndị ọ na-achị. Kama nke ahụ, ọ ghọrọ onye oké egwu ji—ihu ya chanwụrụ, úkwù ya mara jijiji, ahụ ya nile mara jijiji nke ukwuu nke na ikpere ya nọ na-akụkọta. N’ezie, okwu Devid gwara Jehova n’abụ bụ eziokwu: “Anya Gị abụọ dịkwasị ndị dị elu, ka I wee mee ka ha dị ala.”—2 Samuel 22:1, 28; tụlee Ilu 18:12.

9. (a) N’ihi gịnị ka ụjọ nke ji Belshaza na egwu Chineke na-ejighị bụrụ otu ihe? (b) Gịnị ka eze ahụ kwere ndị amamihe Babilọn ná nkwa?

9 E kwesịrị ịrịba ama na ụjọ nke ji Belshaza na egwu Chineke, egwu nsọpụrụ miri emi maka Jehova, nke bụ́ mmalite nke amamihe, abụghị otu ihe. (Ilu 9:10) Ee e, nke a bụ egwu ọjọọ, ọ rụpụtaghịkwa ihe ọ bụla yiri amamihe n’ahụ eze ahụ na-ama jijiji.c Kama ịrịọ Chineke nke ọ ka kparịsịrị mgbaghara, o ji oké olu kpọọ “ndị dibịa na ndị Kaldea na ndị na-eke eluigwe.” Ọbụna o kwupụtara, sị: “Onye ọ bụla nke ga-agụ ihe a e dere, kọọkwara m isi ya, uwe odo odo ka ọ ga-eyi, ịyagba ọlaedo ga-adịkwa n’olu ya, ọ bụkwa dị ka otu n’ime ndị eze atọ n’alaeze a ka ọ ga-achị achị.” (Daniel 5:7) Onye ọchịchị nke atọ n’alaeze ahụ ga-adị ike n’ezie, bụrụ onye nanị ndị eze abụọ na-achị achị, bụ́ Nabonidus na Belshaza n’onwe ya ga-akarị. Ọkwá dị otú ahụ nwere ike ịbụ nke a gaara ahapụrụ ọkpara Belshaza n’ọnọdụ dị otú o kwesịrị. Ọ dị nnọọ eze ahụ ọkụ n’ahụ ka a kọwaara ya ozi a bụ ọrụ ebube!

10. Olee otú ihe si gaara ndị amamihe ahụ ná mgbalị ha mere ịkọwa ihe ahụ e dere n’elu mgbidi?

10 Ndị amamihe ahụ kwụrụ n’ahịrị wee banye ná nnukwu ụlọ nzụkọ ahụ. Ha akọghị ụkọ, n’ihi na Babilọn bụ obodo jupụtara n’okpukpe ụgha ma jupụtakwa n’ụlọ nsọ. Ndị ikom na-azọrọ na ha na-amata ihe àmà ọdịnihu ma na-akọwa ihe odide ndị dị omimi juru nnọọ eju. Ọ ghaghị ịbụ na obi tọrọ ndị amamihe a ụtọ n’inweta ohere a chere ha ihu. Nke a bụ ohere ha nwere ime ihe ha mụrụ amụ n’ihu ndị oké ozu zukọrọnụ, nweta ihu ọma eze, ma rịgoro n’ọkwá nke inwe ike dị ukwuu. Ma lee otú ha si dawasịa afọ! “Ha apụghị ịgụ ihe ahụ e dere, ma ọ bụ ime ka eze mara isi ya.”d—Daniel 5:8.

11. N’ihi gịnị ka ndị amamihe Babilọn pụrụ iji ghara inwe ike ịgụ ihe ahụ e dere?

11 E jighị n’aka ma ndị amamihe nke Babilọn hà hụrụ ihe odide ahụ n’onwe ya—mkpụrụ akwụkwọ ndị ahụ—dị ka ihe a na-apụghị ịghọta. Ọ bụrụ na ha hụrụ ya otú ahụ, ndị ikom a na-enweghị ụkpụrụ gaara enwewo ohere dị ukwuu ichepụta nkọwa ụgha ọ bụla, eleghị anya ọbụna nke ga-eme ka isi buo eze. Ọ pụkwara ịbụ na a pụrụ nnọọ ịgụtali mkpụrụ akwụkwọ ndị ahụ nke ọma. Otú ọ dị, ebe a na-adịghị edenye ụdaume n’asụsụ ndị dị ka Aramaic na Hibru, otu okwu nwere ike ịpụtawo ọtụtụ ihe. Ọ bụrụ otú ahụ, ọ pụrụ ịbụ na ndị amamihe ahụ enweghị ike ịmata okwu ndị e zubere ikwu. Ọ bụrụgodị na ha pụrụ imeworị nke ahụ, ha ka ga-abụ ndị na-enweghị ike ịghọta ihe okwu ndị ahụ pụtara iji kọọ isi ha. Otú ọ bụla o si dị, e ji otu ihe n’aka: ndị amamihe Babilọn dara ada—dawaa nnọọ afọ!

12. Gịnị ka ọdịda nke ndị amamihe ahụ dara gosiri?

12 Otú a, e kpughere ndị amamihe ahụ dị ka ndị wayo, òtù okpukpe ha a na-asọpụrụ dị ka ihe aghụghọ. Lee ihe mmechuihu ha bụ! Mgbe Belshaza hụrụ na obi ọ tụkwasịrị ndị okpukpe a abụwo n’efu, ọ tụkwuru ụjọ, akpụkpọ ahụ ya chanwụkwuru, ọbụnakwa ‘ọ gbara ndị isi ya gharịị.’e—Daniel 5:9.

A KPỌỌ NWOKE NWERE NGHỌTA

13. (a) N’ihi gịnị ka eze nwanyị ahụ ji tụọ aro ka a kpọọ Daniel? (b) Ụdị ndụ dị aṅaa ka Daniel na-ebi?

13 N’oge a siri ike, eze nwanyị n’onwe ya—ikekwe nne eze—batara n’ụlọ oriri ahụ. Ọ nụwo banyere ọgba aghara dara n’oké oriri ahụ, ọ makwaara onye pụrụ ịghọta ihe ahụ e dere n’elu mgbidi. Ọtụtụ iri afọ tupu mgbe ahụ nna ya, bụ́ Nebukadneza, ahọpụtawo Daniel ịbụ onyeisi nke ndị amamihe ya nile. Eze nwanyị ahụ chetara ya dị ka nwoke nwere “mmụọ nke kachasị, na ihe ọmụma, na uche.” Ebe o yiri ka Belshaza amaghị Daniel, ọ pụrụ ịbụ na onye amụma ahụ anọkwaghị n’ọkwá ọchịchị ya dị elu mgbe Nebukadneza nwụsịrị. Ma Daniel ejighị ịbụ onye a ma ama kpọrọ oké ihe. Ma eleghị anya ọ nọ n’afọ ndị 90 ya ugbu a, ka na-ejekwara Jehova ozi n’ikwesị ntụkwasị obi. N’agbanyeghị ihe dị ka iri afọ asatọ nke ịbụ onye bi n’ala ọzọ na Babilọn, a ka ji aha Hibru ya mara ya. Ọbụna eze nwanyị ahụ kpọrọ ya Daniel, ọ bụghị aha Babilọn ahụ a gụrụ ya n’otu mgbe. N’ezie, ọ gbara eze ahụ ume, sị: “Ka a kpọta Daniel, ọ ga-akọkwa isi ihe a e dere.”—Daniel 1:7; 5:10-12.

14. Gịnị bụ nsogbu Daniel nwere mgbe ọ hụrụ ihe ahụ e dere n’elu mgbidi?

14 A kpọrọ Daniel, o wee bịa n’ihu Belshaza. Ọ bụ ihe ihere ịrịọ enyemaka nke onye Juu a, bụ́ onye eze a ka kparịsịrị Chineke ya. N’agbanyeghị nke ahụ, Belshaza gbalịrị ime ka isi buo Daniel, na-ekwe nkwa inye ya otu ụgwọ ọrụ ahụ—ọnọdụ nke atọ n’alaeze ahụ—ma ọ bụrụ na o nwere ike ịgụ ma kọwaa okwu ndị ahụ dị omimi. (Daniel 5:13-16) Daniel lere ihe ahụ e dere n’elu mgbidi anya, mmụọ nsọ mekwara ka ọ ghọta ihe ọ pụtara. Ọ bụ ozi ọdachi sitere n’aka Jehova Chineke! Olee otú Daniel pụrụ isi gwa eze a dị mpako okwu amamikpe ọjọọ n’ihu ya—nakwa n’ihu ndị nwunye ya na ndị isi ya? Chetụdị nsogbu Daniel nọ na ya! Okwu na-ebu isi nke eze na nkwa o kwere inye ya akụ̀ na ụba na ọkwá ukwu ò megharịrị ya anya? Onye amụma ahụ ọ̀ ga-ebelata okwu ikpe Jehova?

15, 16. Olee ihe dị mkpa sitere n’akụkọ ihe mere eme nke Belshaza na-amụtaghị, oleekwa otú ụdị ihie ụzọ ahụ si jupụta ebe nile taa?

15 Daniel ji obi ike kwuo okwu, na-asị: “Ka onyinye gị dịrị gị onwe gị, gị nyekwa onye ọzọ ụgwọ ọrụ gị; ma m ga-agụrụ eze ihe a e dere, mee ka ọ mara isi ya.” (Daniel 5:17) Ọzọ, Daniel kwetara ịdị ukwuu nke Nebukadneza, bụ́ eze nke siri oké ike nke na o nwere ike igbu, itipịa, ibuli, ma ọ bụ iweda onye ọ bụla ọ chọrọ ala. Otú ọ dị, Daniel chetaara Belshaza na Jehova, bụ́ “Chineke Nke kachasị ihe nile elu,” emewo ka Nebukadneza dị ukwuu. Ọ bụ Jehova wedara eze ahụ dị ike ala mgbe ọ ghọrọ onye dị mpako. Ee, a manyewo Nebukadneza ịmata na “Chineke Nke kachasị ihe nile elu na-achị achị n’alaeze nke mmadụ, na ọ bụkwa onye ọ bụla Ọ na-achọ ido onyeisi ya ka Ọ na-edo.”—Daniel 5:18-21.

16 Belshaza “maara ihe a nile.” Ma, ọ mụtaghị ihe site n’akụkọ ihe mere eme. N’ezie, ọ gafewo nnọọ mmehie Nebukadneza mere bụ́ ịdị mpako ma mee omume nke ịkparị Jehova kpọmkwem. Daniel gbara mmehie eze ahụ n’anwụ. Ọzọkwa, n’ihu ndị ahụ gbakọrọnụ bụ́ ndị na-ekpere arụsị, o ji anyaike gwa Belshaza na chi ụgha nile ‘adịghị ahụ ụzọ, ha adịghịkwa anụ ihe, ha adịghịkwa ama ihe.’ Onye amụma Chineke nwere obi ike gbakwụnyere na n’ụzọ dị iche n’ebe chi ndị ahụ na-abaghị uru dị, Jehova bụ Chineke “Onye ume gị dị n’aka Ya.” Ruo taa, ndị mmadụ na-eji ihe ndị na-adịghị ndụ emere chi, na-eji ego, ọrụ, ùgwù, ọbụna ihe ụtọ na-emere chi. Ma ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ihe ndị a pụrụ inye ndụ. Nanị Jehova bụ onye ịdị adị anyị nile dị n’aka ya, onye anyị na-adabere na ya maka ume ọ bụla anyị kuuru.—Daniel 5:22, 23; Ọrụ 17:24, 25.

A KỌWAA OKWU DỊ MGBAGWOJU ANYA!

17, 18. Gịnị bụ okwu anọ ahụ e dere n’elu mgbidi, gịnịkwa ka ha pụtara n’ụzọ nkịtị?

17 Onye amụma ahụ meworo agadi malitere ugbu a ime ihe na-ekweghị ndị amamihe nile nke Babilọn omume. Ọ gụrụ ma kọwaa isi ihe ahụ e dere n’elu mgbidi. Okwu ndị ahụ bụ: “MENE, MENE, TEKEL, UFASIN.” (Daniel 5:24, 25) Gịnị ka ha pụtara?

18 N’ụzọ nkịtị, okwu ndị ahụ pụtara “otu maịna, otu maịna, otu shekel, na ọkara shekel.” Okwu nke ọ bụla bụ ihe ọ̀tụ̀tụ̀ ego, nke e depụtara n’ọnụ ahịa ha site na nke kasịnụ gbadaa. Lee ka o si bụrụ ihe na-agbagwoju anya! Ọ bụrụgodị na ndị amamihe Babilọn nwere ike ịmata mkpụrụ akwụkwọ ndị ahụ, ọ ka bụkwa ihe na-adịghị eju anya na ha apụghị ịkọwa isi ha.

19. Gịnị bụ nkọwa nke okwu ahụ bụ́ “MENE”?

19 Site n’ike mmụọ nsọ Chineke, Daniel kọwara, sị: “Nke a bụ akụkọ isi ihe ahụ: MENE; Chineke agụtawo alaeze gị ọnụ, mee ka mgbe ya ruzuo.” (Daniel 5:26) Mgbochiume ndị dị n’okwu mbụ nyere ohere maka ya ịpụta ma okwu ahụ bụ́ “maịna” ma otu ụdị nke okwu Aramaic maka “gụpụtara,” ma ọ bụ “a gụrụ ọnụ,” na-adabere n’ụdaume onye na-agụ ya tinyere. Daniel maara nke ọma na ibi n’ala ọzọ nke ndị Juu na-eru ná njedebe ya. N’ime afọ 70 e buru amụma na ọ ga-adịru, afọ 68 agaala. (Jeremaịa 29:10) Onye Ukwu Na-edebe Oge, bụ́ Jehova, agụwo ụbọchị nile nke ọchịchị Babilọn dị ka ike ọchịchị ụwa ọnụ, ọgwụgwụ ya eruwokwa nso karịa ka onye ọ bụla bịara oriri Belshaza chere. N’ezie, oge agwụwo—ọ bụghị nanị nye Belshaza kamakwa nye nna ya, bụ́ Nabonidus. Ọ pụrụ ịbụ nke ahụ mere e ji dee okwu ahụ bụ́ “MENE” ugboro abụọ—iji maa ọkwa ọgwụgwụ nke ọbụbụeze abụọ a.

20.Gịnị bụ nkọwa nke okwu bụ́ “TEKEL,” oleekwa otú o si metụta Belshaza?

20 N’aka nke ọzọ, e dere “TEKEL” otu ugboro, ọ dịkwa n’ụdị ihe bụ nanị otu. Nke a pụrụ igosi na ọ bụ Belshaza ka a gwara ya kpọmkwem. Nke a ga-ekwesịkwa ekwesị, n’ihi na o gosiwo oké enweghị nkwanye ùgwù maka Jehova. Okwu ahụ n’onwe ya pụtara “shekel,” ma mgbochiume ndị dị na ya nyekwara ohere maka ya ịpụta okwu bụ́ “a tụrụ n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀.” N’ihi ya, Daniel gwara Belshaza, sị: “TEKEL; a tụwo gị n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀, hụ na ihe kọrọ n’ime gị.” (Daniel 5:27) Nye Jehova, mba nile dị nnọọ nta dị ka uzuzu kukwasịrị n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀. (Aịsaịa 40:15) Ha adịghị ike iji mebie nzube ya. Gịnịzi ka otu eze dị mpako pụrụ ime? Belshaza anwawo ibuli onwe ya elu karịa Eze eluigwe na ala. Mmadụ nkịtị a anwawo ịkparị Jehova na ịkwa ofufe dị ọcha emo ma a hụwo na “ihe kọrọ n’ime ya.” Ee, Belshaza kwesịrị nnọọ ikpe ahụ nke na-abịa ngwa ngwa!

21. Olee otú “UFASIN” si bụrụ iji okwu atọ yiri ibe ha mee ihe, oleekwa ihe okwu a gosiri banyere ọdịnihu Babilọn dị ka ike ọchịchị ụwa?

21 Okwu ikpeazụ dị n’ahụ mgbidi ahụ bụ “UFASIN.” Daniel gụrụ ya n’ụdị na-egosi ihe dị nanị otu, bụ́ “PERES,” ikekwe n’ihi na ọ na-agwa otu eze okwu mgbe nke ọzọ na-anọghị ya. Okwu a ji okwu atọ yiri ibe ha weta oké okwu dị mgbagwoju anya nke Jehova ná njedebe. N’ụzọ nkịtị, “ufasin” pụtara “ọkara shekel.” Ma mkpụrụ akwụkwọ ndị dị ya na-enyekwa ohere maka ihe abụọ ọzọ ọ pụrụ ịpụta—“nkewa” na “ndị Peasia.” N’ihi ya Daniel buru amụma, sị: “PERES; e kewawo alaeze gị, nye ndị Midia na ndị Peasia.”—Daniel 5:28.

22. Olee otú Belshaza si meghachi omume ná nkọwa nke okwu ahụ dị mgbagwoju anya, gịnịkwa nweworo ike ịbụ olileanya ya?

22 Otú a ka e si kọwaa okwu ahụ dị mgbagwoju anya. Babilọn dị ike na-aga ịda n’aka usuu ndị agha Medo-Peasia. Ọ bụ ezie na nkwupụta nke ọdachi a wedara ya n’ala, Belshaza mezuru okwu ya. O mere ka ndị ohu ya yikwasị Daniel uwe odo odo, konye ya ịyagba ọlaedo, ma kpọsaa ya dị ka onye nke atọ na-achị alaeze ahụ. (Daniel 5:29) Daniel ajụghị ịnara nsọpụrụ ndị a, na-aghọta na ha gosipụtara nsọpụrụ kwesịrị Jehova. N’ezie, ọ pụrụ ịbụ na Belshaza nwere olileanya ibelata amamikpe Jehova site n’ịkwanyere onye amụma Ya ùgwù. Ọ bụrụ otú ahụ, oge agaala ya inwe mmetụta ọ bụla.

ỌDỊDA BABILỌN

23. Olee amụma ochie nọ na-emezu ọbụna mgbe oké oriri Belshaza na-aga n’ihu?

23 Ọbụna ka Belshaza na ndị òtù ya nọ na-aṅụ mmanya iji too chi ha nile ma na-akwa Jehova emo, ihe omume dị ukwuu na-eme n’ọchịchịrị dị n’èzí obí eze ahụ. Amụma e buworo site n’ọnụ Aịsaịa ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ narị afọ abụọ tupu mgbe ahụ nọ na-emezu. Banyere Babilọn, Jehova ekwuworị, sị: “Ize ume ya nile ka M meworo ka ọ kwụsị.” Ee, mmegide nile nke obodo ọjọọ ahụ na-emegide ndị Chineke họpụtara na-aga ịbịa ná njedebe. N’ụzọ dị aṅaa? Otu amụma ahụ sịrị: “Rịgoo, gị Ilam; nọchigide n’agha, gị Midia.” Ilam ghọrọ akụkụ nke Peasia mgbe oge Aịsaịa onye amụma gasịrị. Ka ọ na-erule oge oké oriri nke Belshaza, bụ nke e kwuwokwara banyere ya n’otu amụma ahụ site n’ọnụ Aịsaịa, Peasia na Midia ejikọwo aka n’ezie iji “rịgoo” ma ‘nọchigide Babilọn n’agha.’—Aịsaịa 21:1, 2, 5, 6.

24. Olee ihe ọmụma sara mbara banyere ọdịda Babilọn nke amụma Aịsaịa bu ụzọ kwuo?

24 N’ezie, e buwo kpọmkwem aha onyeisi usuu ndị agha a n’amụma, dịkwa ka e buru isi ihe dị iche iche banyere atụmatụ agha ya. Ihe dị ka afọ 200 tupu mgbe ahụ, Aịsaịa ebuwo amụma na Jehova ga-ahọpụta otu onye aha ya bụ Saịrọs ịwakwasị Babilọn. Mgbe ọ na-eme mwakpo ya, a ga-ewepụrụ ya ihe mgbochi nile ga-anọchiri ya ụzọ. Mmiri Babilọn ‘ga-atachasị,’ a ga-eghebekwa ọnụ ụzọ ámá ukwu ya oghe. (Aịsaịa 44:27–45:3) Otú ahụkwa ka o mere. Usuu ndị agha Saịrọs chelara Osimiri Yufretis ihu n’ebe ọzọ, na-eme ka mmiri atụ talata ka ha wee nwee ike ịgafere mmiri ahụ. Ndị nche na-adịghị elezi anya eghebewo ọnụ ụzọ ámá nke mgbidi Babilọn oghe. Dị ka ndị ụwa bụ́ ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme kwetara, a wakporo obodo ahụ mgbe ndị bi n’ime ya nọ n’oriri oké mkpọtụ. E weghaara Babilọn n’alụghị oké ọgụ ọ bụla. (Jeremaịa 51:30) Otú ọ dị, e nwere otu onye nwụrụnụ nke dị ịrịba ama. Daniel kọrọ, sị: “N’abalị ahụ ka e gburu Belshaza, bụ́ eze Kaldea. Ma Daraịọs, bụ́ onye Midia, natara alaeze ahụ mgbe ọ gbara ihe ha ka [iri afọ isii na abụọ].”—Daniel 5:30, 31.

ỊMỤTA IHE SITE N’IHE AHỤ E DERE N’ELU MGBIDI

25. (a) N’ihi gịnị ka Babilọn oge ochie ji bụrụ ihe nnọchianya kwesịrị ekwesị nke usoro okpukpe ụgha zuru ụwa ọnụ nke taa? (b) N’echiche dị aṅaa ka ndị ohu Chineke nke oge a nọrọ ná ndọrọ n’agha na Babilọn?

25 Ihe ndekọ ahụ sitere n’ike mmụọ nsọ nke dị na Daniel isi nke 5 nwere ihe dị ukwuu ọ pụtara nye anyị. Dị ka ebe bụ́ isi maka ihe omume okpukpe ụgha, Babilọn oge ochie bụ ihe nnọchianya kwesịrị ekwesị nke alaeze ụwa nke okpukpe ụgha. N’ịbụ nke e sere onyinyo ya ná Mkpughe dị ka nwanyị na-akwa iko, akpịrị ọbara na-akpọ nkụ, a na-akpọ njikọ aghụghọ a zuru ụwa ọnụ “Babilọn Ukwu ahụ.” (Mkpughe 17:5) N’aṅaghị ntị n’ịdọ aka ná ntị nile banyere ozizi ụgha na omume ya nile ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke, ọ kpagbuwo ndị na-ekwusa eziokwu nke Okwu Chineke. Dị ka ndị bi na Jerusalem na Juda oge ochie, e mere ka ndị ahụ fọdụrụ n’ime ndị Kraịst e tere mmanụ na-ekwesị ntụkwasị obi jee biri n’ala “Babilọn Ukwu ahụ” mgbe mkpagbu ndị ụkọchukwu kpasuru fọrọ nke nta ka o mechichaa ọrụ nkwusa Alaeze ahụ na 1918.

26. (a) Olee otú “Babilọn Ukwu ahụ” si daa na 1919? (b) Olee ịdọ aka ná ntị nke anyị onwe anyị kwesịrị ịṅa ntị ma soro ndị ọzọ kerịta?

26 Otú ọ dị, na mberede, “Babilọn Ukwu ahụ” dara! Ewo, ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ọdịda a dara n’emeghị mkpọtụ ọ bụla—dị nnọọ ka Babilọn oge ochie dara n’ụzọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ n’emetụghị mkpọtụ, na 539 T.O.A. Ma ka o sina dị, ọdịda ihe atụ a bibiri ihe. O mere na 1919 O.A. mgbe a tọhapụrụ ndị Jehova site ná ndọrọ n’agha Babilọn, werekwa ihu ọma Chineke gọzie ha. Nke a wetara ike “Babilọn Ukwu ahụ” nwere n’ahụ ndị Chineke ná njedebe ma kaa akara mmalite nke mkpughe ya n’ihu ọha dị ka ihe wayo a na-apụghị ịdabere na ya. Ọdịda ahụ abụrụwo ihe a na-apụghị ịgbanwe agbanwe, mbibi ikpeazụ ya dịkwa nso. N’ihi ya ndị ohu Jehova anọwo na-ekwughachi ịdọ aka ná ntị ahụ bụ́: “Ndị nke m, sinụ n’ime ya pụta, ka unu wee ghara iso ya nwekọọ mmehie ya nile.” (Mkpughe 18:4) Ị̀ ṅawo ntị n’ịdọ aka ná ntị ahụ? Ì so ndị ọzọ na-ekerịta ya?f

27, 28. (a) Olee eziokwu dị mkpa nke Daniel na-echezọtụghị? (b) Olee ihe àmà anyị nwere na-egosi na Jehova ga-eme ihe n’isi nso megide ajọ ụwa nke taa?

27 Ya mere e dere ihe n’elu mgbidi taa—ma ọ bụghị nanị maka “Babilọn Ukwu ahụ.” Cheta otu eziokwu dị mkpa nke akwụkwọ Daniel: Jehova bụ Eze Eluigwe na Ala. Nanị ya nwere ikike ido onye ga-achị ihe a kpọrọ mmadụ. (Daniel 4:17, 25; 5:21) A ga-ewepụ ihe ọ bụla na-emegide nzube Jehova. Ọ fọdụrụ nanị ntakịrị oge tupu Jehova emee ihe. (Habakuk 2:3) Nye Daniel, oge ahụ bịara n’ikpeazụ mgbe ọ dị otu narị afọ. Mgbe ahụ ọ hụrụ ka Jehova wepụrụ otu ike ọchịchị ụwa—nke nọworo na-emegbu ndị Chineke kemgbe Daniel bụ nwatakịrị.

28 E nwere ihe àmà a na-apụghị ịgbagha agbagha na-egosi na Jehova Chineke echiwo otu Onye Ọchịchị eze n’eluigwe maka ihe a kpọrọ mmadụ. Na ụwa elegharawo Eze a anya ma megide ịchịisi ya bụ ihe àmà e ji n’aka na Jehova ga-ekpochapụ ndị nile na-emegide ịchịisi Alaeze n’isi nso. (Abụ Ọma 2:1-11; 2 Pita 3:3-7) Ị̀ na-eme ihe n’ụzọ kwekọrọ n’ịdị ngwa nke oge anyị ma na-atụkwasị obi gị n’Alaeze Chineke? Ọ bụrụ otú ahụ, ị mụtawo ihe n’ezie site n’ihe ahụ e dere n’elu mgbidi!

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a N’otu ihe odide oge ochie, Eze Saịrọs kwuru banyere Belshaza, sị: “E chiwo onye na-adịghị ike eze dị ka [onye ọchịchị] nke ala ya.”

b Ọbụna nkọwa ọma a e nyekwuru n’ihe ndekọ Daniel abụrụwo ihe ziri ezi. Ndị ọkà mmụta ihe ochie achọpụtawo na mgbidi obí eze nke Babilọn oge ochie bụ nke e ji blọk e tere ete wuo.

c Ma eleghị anya nkwenkwe ụgha nke Babilọn mere ka ọrụ ebube a na-atụkwu ụjọ. Akwụkwọ bụ́ Babylonian Life and History na-ekwu, sị: “Tinyere ọnụ ọgụgụ nke chi ndị Babilọn na-efe, anyị na-ahụ na ha kwenyesiri ike ná ndị mmụọ, nke a sikwara ike ruo n’ókè nke na ekpere na arịrịọ a na-arịọ maka nchebe pụọ n’aka ha na-abụ akụkụ dị ukwuu nke akwụkwọ okpukpe ha.”

d Akwụkwọ bụ́ Biblical Archaeology Review na-ekwu, sị: “Ndị ọkachamara nke Babilọn depụtara ọtụtụ puku mgbaàmà ihe ọjọọ. . . . Mgbe Belshaza chọrọ ịma ihe ihe ahụ e dere n’elu mgbidi pụtara, ihe ịrụ ụka adịghị ya na ndị amamihe nke Babilọn chigharikwuuru nnukwu akwụkwọ nká ihe ọmụma ndị a e dejuru mgbaàmà ihe ọjọọ. Ma ha abaghị uru ọ bụla.”

e Ndị na-ede akwụkwọ ọkọwa okwu na-ekwu na okwu e jiri mee ihe ebe a maka ‘ịgba gharịị’ nwere echiche nke oké ọgba aghara, dị ka a ga-asị na e tinyere ndị ahụ gbakọrọnụ ná mgbagwoju anya.

f Lee peji nke 205-271 nke akwụkwọ bụ́ Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.

GỊNỊ KA Ị GHỌTARA?

• Olee otú e si kwụsị oké oriri Belshaza n’abalị nke October 5/6, 539 T.O.A.?

• Gịnị bụ nkọwa nke ihe ahụ e dere n’elu mgbidi?

• Amụma dị aṅaa banyere ọdịda Babilọn ka a na-emezu mgbe oké oriri Belshaza na-aga n’ihu?

• Olee ihe ihe ndekọ nke ihe ahụ e dere n’elu mgbidi pụtara maka ụbọchị anyị?

[Foto dị na peeji nke nke 98]

[Foto dị na peeji nke nke 103]

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya