Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • dp isi 6 p. 82-97
  • Ikpughe Ihe Omimi nke Osisi ahụ Dị Ukwuu

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ikpughe Ihe Omimi nke Osisi ahụ Dị Ukwuu
  • Ṅaa Ntị n’Amụma Daniel!
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • EZE ETOO ONYE KASỊ IHE NILE ELU
  • OSISI DỊ UKWUU
  • EZE AHỤ ENWETA OZI ỌJỌỌ
  • MMEZU MBỤ NKE NRỌ AHỤ
  • MWEGHACHI NEBUKADNEZA
  • È NWERE IHE ÀMÀ NA-ESITEGHỊ NA BIBLE?
  • OGE ASAA NKE NA-EMETỤTA ANYỊ
  • Alaeze E Ji Tụnyere Nnukwu Osisi
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • Mbili na Ọdịda nke Otu Onyinyo Dị Ukwuu
    Ṅaa Ntị n’Amụma Daniel!
  • Alaeze Nke Ga-adịru Mgbe Ebighị Ebi
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
Ṅaa Ntị n’Amụma Daniel!
dp isi 6 p. 82-97

Isi nke Isii

Ikpughe Ihe Omimi nke Osisi ahụ Dị Ukwuu

1. Gịnị mere Eze Nebukadneza, na-ewelite ajụjụ ndị dị aṅaa?

JEHOVA kwere ka Eze Nebukadneza ghọọ onye ọchịchị ụwa. Dị ka eze Babilọn, o nwere akụ̀ na ụba dị ukwuu, nri mara abụba, obí eze dị ebube—ihe onwunwe ọ bụla ọ chọrọ. Ma na mberede e wedara ya n’ala. N’ịghọ onye isi gbakara, Nebukadneza mere ka anụ ọhịa! N’ịbụ onye a chụpụrụ na tebụl eze na n’ebe obibi eze, o biri n’ọhịa ma taa ahịhịa dị ka oké ehi. Gịnị dugara n’ọdachi a? N’ihi gịnịkwa ka o kwesịrị iji agbasa anyị?—Tụlee Job 12:17-19; Eklisiastis 6:1, 2.

EZE ETOO ONYE KASỊ IHE NILE ELU

2, 3. Gịnị bụ ọchịchọ eze Babilọn maka ndị ọ na-achị, oleekwa otú o si were Chineke Kasị Ihe Nile Elu?

2 Ntakịrị oge ọ gbakesịrị site n’ịwị ara ahụ, Nebukadneza zipụrụ akụkọ dị ịrịba ama n’ebe nile ọ na-achị banyere ihe meworonụ. Jehova nyere Daniel onye amụma ike mmụọ nsọ ya idekọ ihe omume ndị a n’ụzọ ziri ezi. O ji okwu ndị a malite: “Nebukadneza, bụ́ eze, na-ezigara ndị nile dị iche iche, na mba nile, na ndị nile na-asụ asụsụ dị iche iche, ozi, bụ́ ndị bi n’ụwa nke a nile; ka udo baara unu ụba. Ihe ịrịba ama nile na ihe ijuanya nile nke Chineke Onye kachasị ihe nile elu meworo n’imeso m, ọ dị m mma n’anya ịkọ akụkọ ha. Ihe ịrịba ama Ya nile, lee ka ha si dị ukwuu hie nne! ihe ijuanya Ya nile kwa, lee ka ha si dị ike nke ukwuu! alaeze Ya bụ alaeze ebighị ebi, ọchịchị Ya na-adịgidekwa n’ọgbọ nile.”—Daniel 4:1-3.

3 Ndị Nebukadneza na-achị “bi n’ụwa nke a nile”—alaeze ya na-agụnye ihe ka ukwuu n’ụwa nke e dere banyere ha na Bible. Banyere Chineke nke Daniel, eze ahụ sịrị: “Alaeze Ya bụ alaeze ebighị ebi.” Lee ka okwu ndị ahụ si too Jehova n’Alaeze Ukwu Babilọn nile! Ọzọkwa, nke a bụ nke ugbo abụọ e gosiworo Nebukadneza na ọ bụ nanị Alaeze Chineke ga-adịru ebighị ebi, na-eguzosi ike “ruo mgbe ebighị ebi.”—Daniel 2:44.

4. N’ihe metụtara Nebukadneza, olee otú “ihe ịrịba ama nile na ihe ijuanya nile” nke Jehova si malite?

4 Olee “ihe ịrịba ama nile na ihe ijuanya nile” ndị “Chineke Onye kachasị ihe nile elu” mere? Ha malitere n’ahụmahụ eze nwere n’onwe ya nke a kọrọ n’okwu ndị a: “Mụ onwe m, bụ́ Nebukadneza, nọ n’udo n’ụlọ m, nọọkwa ka osisi nwezuru akwụkwọ ndụ ya n’ụlọ ukwu m. Nrọ ka m hụrụ, o wee mee ka m tụọ egwu; echiche nile m na-eche n’elu ihe ndina m na ọhụụ nile nke isi m wee mee ka m maa jijiji.” (Daniel 4:4, 5) Olee ihe eze Babilọn ahụ mere banyere nrọ a na-enye ya nsogbu n’obi?

5. Olee otú Nebukadneza si were Daniel, n’ihi gịnịkwa?

5 Nebukadneza kpọkọrọ ndị amamihe nke Babilọn ma zeere ha nrọ ahụ. Ma leenụ ka ha si daa! Ha enwetụghị ike ịkọwa isi ya. Ihe ndekọ ahụ gbakwụnyere: “N’ikpeazụ Daniel batara n’ihu m, onye aha ya bụ Belteshaza, dị ka aha chi m si dị, onye mmụọ nke chi nsọ nile dịkwa n’ime ya: ọ bụkwa n’ihu ya ka m zere nrọ ahụ.” (Daniel 4:6-8) Aha a na-akpọ Daniel n’obí eze bụ Belteshaza, chi ụgha ahụ nke eze kpọrọ “chi m” pụrụ ịbụworị Bel ma ọ bụ Nebo ma ọ bụ Marduk. N’ịbụ onye na-efe ọtụtụ chi, Nebukadneza weere Daniel dị ka onye “mmụọ nke chi nsọ nile” dị n’ime ya. N’ihi ọkwá Daniel kwa dị ka onyeisi nke ndị amamihe nile nke Babilọn, eze zoro aka n’ebe ọ nọ dị ka “onyeisi [ndị nchụàjà na-eme majik, NW ].” (Daniel 2:48; 4:9; tụlee Daniel 1:20.) N’ezie, ọ dịghị mgbe Daniel na-ekwesị ntụkwasị obi gbahapụrụ ofufe nke Jehova iji mee majik.—Levitikọs 19:26; Deuterọnọmi 18:10-12.

OSISI DỊ UKWUU

6, 7. Olee otú ị ga-esi akọwa ihe Nebukadneza hụrụ ná nrọ?

6 Gịnị bụ nrọ ahụ na-atụ egwu nke eze Babilọn rọrọ? “Ọhụụ nile nke isi m n’elu ihe ndina m dị otú a: anọ m na-ahụ,” ka Nebukadneza sịrị, “ma lee, otu osisi n’etiti ụwa, ịdị elu ya dịkwa ukwuu. Osisi ahụ gbara agba, dị ike, ịdị elu ya rutekwara n’eluigwe, a pụrụ ịhụ ya anya site ná nsọtụ nke ụwa nke a nile. Akwụkwọ ya mara mma, mkpụrụ ya hikwara nne, ihe oriri izuru ihe nile dịkwa ya: n’okpuru ya ka anụ ọhịa na-eze ndo, ọ bụkwa n’alaka ya ka nnụnụ nile nke eluigwe na-ebi, e sitekwa na ya zụọ anụ ahụ nile, bụ́ mmadụ.” (Daniel 4:10-12) Dị ka a kọrọ, Nebukadneza nwere mmasị ná nnukwu osisi cedar nke Lebanọn, ọ na-aga ekiri ha, ma mee ka e bute ụfọdụ na Babilọn dị ka ogwe osisi. Ma ọ hụtụbeghị ihe ọ bụla yiri osisi ahụ ọ hụrụ ná nrọ. O guzo n’ebe pụtara ìhè “n’etiti ụwa,” a pụrụ ịhụ ya anya n’ụwa nile, ọ na-amịkwa mkpụrụ nke ukwuu nke na o mepụtara nri maka anụ ahụ nile.

7 Nrọ ahụ akwụsịghị n’ebe ahụ, n’ihi na Nebukadneza gbakwụnyere, sị: “Anọ m na-ahụ n’ọhụụ nile nke isi m n’elu ihe ndina m, ma, lee, otu onye na-amụrụ anya, nke bụkwa onye nsọ, na-esi n’eluigwe rịda. Ọ na-akpọsi mkpu ike, ọ bụkwa otú a ka ọ na-asị, Gbutuonụ osisi ahụ, gbukapụsịa alaka ya nile, rurupụ akwụkwọ ya nile, kpasaa mkpụrụ ya: ka anụ ọhịa si n’okpuru ya gbapụ, ka nnụnụ nile sikwa n’alaka ya fepụ. Ma hapụnụ ogwe mkpọrọgwụ ya nile n’ala, ọbụna n’agbụ e kere ya nke ígwè na ọla [copper], n’ahịhịa ndụ nke ọhịa: ka igirigi nke eluigwe deekwa ya, ka òkè ya dịkwa n’etiti anụ ọhịa n’ihe ọkụkụ nke ụwa.”—Daniel 4:13-15.

8. Ònye bụ ‘onye ahụ na-amụrụ anya’?

8 Ndị Babilọn nwere echiche okpukpe nke ha banyere ihe e kere eke bụ́ mmụọ ndị dị mma na ndị dị njọ. Ma ònye bụ “onye na-amụrụ anya,” ma ọ bụ onye nche a, sitere n’eluigwe? N’ịbụ onye a kpọrọ “onye nsọ,” ọ bụ mmụọ ozi na-eme ezi omume nke na-anọchite anya Chineke. (Tụlee Abụ Ọma 103:20, 21.) Cheedị banyere ajụjụ ndị na-aghaghị inyeworị Nebukadneza nsogbu n’obi! Gịnị mere a ga-eji gbutuo osisi a? Gịnị bụ uru nke igbochi ogwe mkpọrọgwụ ya ito eto site n’iji ígwè na ọla copper kee ya agbụ? N’ezie, olee nzube nke ogwe nkịtị na-arụzu?

9. N’ụzọ bụ́ isi, gịnị ka onye ahụ na-amụrụ anya kwuru, oleekwa ajụjụ ndị nke a na-ewelite?

9 Ọ ghaghị ịbụ na ihe nile gbara Nebukadneza gharịị ka ọ nụrụ okwu ndị ọzọ onye ahụ na-amụrụ anya gara n’ihu na-ekwu: “Ka obi ya gbanwee ghara ịbụ obi mmadụ, ka e nyekwa ya obi anụ ọhịa; ka oge asaa gabigakwa ya n’isi. N’iwu ndị na-amụ anya nyere ka okwu a siteworo, ọ bụkwa n’okwu ọnụ ndị nsọ ka ihe a si pụta: ka ndị dị ndụ wee mara na Onye ahụ nke kachasị ihe nile elu na-achị achị n’alaeze nke mmadụ, ọ bụkwa onye ọ bụla Ọ chọrọ inye ya ka Ọ na-enye ya, ọ bụkwa onye dị ala karịa mmadụ nile ka ọ na-eme ka o bilie ịbụ onyeisi ya.” (Daniel 4:16, 17)Ogwe mkpọrọgwụ osisi adịghị enwe obi mmadụ nke na-eti eti n’ime ya. A bịa na nke ahụ, olee otú a pụrụ isi nye ogwe mkpọrọgwụ osisi obi anụ ọhịa? Gịnị bụ “oge asaa” ahụ? Oleekwa otú ihe ndị a nile si metụta ịchịisi “n’alaeze nke mmadụ”? N’eziokwu, Nebukadneza chọrọ ịma.

EZE AHỤ ENWETA OZI ỌJỌỌ

10. (a) N’echiche Akwụkwọ Nsọ, gịnị ka osisi pụrụ ịnọchi anya ya? (b) Gịnị ka osisi ahụ gbara agba na-anọchi anya ya?

10 Mgbe Daniel nụrụ nrọ ahụ, o juru ya anya ruo nwa mgbe, o mesịa tụwa ụjọ. Mgbe Nebukadneza gbara ya ume ịkọwa ya, onye amụma ahụ sịrị: “Onyenwe m, ka nrọ a dịrị ndị na-akpọ gị asị, ka akụkọ isi ya dịkwara ndị iro gị. Osisi ahụ nke ị hụrụ, nke gbara agba, nke dị ike . . . : gị onwe gị ka ọ bụ, eze, n’ihi na ị bawo ụba, dị ike: ịdị ukwuu gị abawokwa ụba, rute n’eluigwe, ebe ị na-achị erutewokwa ná nsọtụ ụwa.” (Daniel 4:18-22) N’ime Akwụkwọ Nsọ, osisi pụrụ ịnọchi anya ndị mmadụ, ndị ọchịchị, na alaeze dị iche iche. (Abụ Ọma 1:3; Jeremaịa 17:7, 8; Ezikiel, isi nke 31) Dị ka osisi ahụ dị ukwuu nke ọ hụrụ ná nrọ, Nebukadneza ‘agbawo agba, dị ike’ dị ka onyeisi nke ike ọchịchị ụwa. Ma osisi ahụ dị ukwuu nọchitere anya ‘ịchịisi ruo ná nsọtụ ụwa,’ na-agụnyekwa alaeze nile nke ihe a kpọrọ mmadụ. N’ihi ya ọ na-anọchi anya ọbụbụeze eluigwe na ala nke Jehova, karịsịa n’otú o si metụta ụwa.—Daniel 4:17.

11. Olee otú nrọ eze ahụ si gosi na ọ ga-enweta mgbanwe nke na-eweda n’ala?

11 Mgbanwe na-ewetu mmadụ n’ala na-echere Nebukadneza. N’izo aka n’ebe nke a dị, Daniel kwukwasịrị: “Ma ebe eze hụrụ otu onye na-amụrụ anya, nke bụkwa onye nsọ, ka ọ na-esi n’eluigwe rịdata, sị, Gbutuonụ osisi ahụ, mebie ya; ma hapụnu ogwe mkpọrọgwụ ya nile n’ala, ọbụna n’agbụ e kere ya nke ígwè na ọla [copper], n’ahịhịa ndụ nke ọhịa; ka igirigi nke eluigwe deekwa ya, ka òkè ya dịkwa n’etiti anụ ọhịa, ruo mgbe oge asaa ga-agabiga n’isi ya; nke a bụ akụkọ isi ya, eze, iwu nke Onye ahụ nke kachasị ihe nile elu ka ọ bụkwa, nke ruteworo onyenwe m, bụ́ eze, ahụ.” (Daniel 4:23, 24) N’ezie, obi ike dị mkpa iji zie eze ahụ dị ike ozi ahụ!

12. Gịnị na-aga ịdakwasị Nebukadneza?

12 Gịnị ga-adakwasị Nebukadneza? Cheedị ihe bụ mmeghachi omume ya ka Daniel gbakwụnyere, sị: “Ọ bụkwa gị ka a ga-achụpụ n’ebe mmadụ bi, ọ bụkwa n’etiti anụ ọhịa ka ebe obibi gị ga-adị, ọ bụkwa ihe ọkụkụ ka a ga-eme ka ị taa dị ka ehi, igirigi nke eluigwe ga na-edekwa gị, oge asaa ga-agabiga n’isi gị; ruo mgbe ị ga-ama na Onye ahụ nke kachasị ihe nile elu na-achị achị n’alaeze nke mmadụ, ọ bụkwa onye ọ bụla Ọ na-achọ inye ya ka Ọ ga-enye ya.” (Daniel 4:25) O doro anya na ọbụna ndị na-eje ozi n’obí eze Nebukadneza ‘ga-achụpụ ya site n’ebe mmadụ bi.’ Ma ndị na-azụ anụ ma ọ bụ ndị ọzụzụ atụrụ dị ọmịiko hà ga-elekọta ya? Ee e, n’ihi na Chineke enyewo iwu na Nebukadneza ga-ebi “n’etiti anụ ọhịa,” na-ata ihe ọkụkụ.

13. Gịnị ka nrọ osisi ahụ gosiri ga-eme ọkwá Nebukadneza dị ka onye ọchịchị ụwa?

13 Dị nnọọ ka e gbuturu osisi ahụ, a ga-akwatu Nebukadneza n’ọchịchị ụwa—ma ọ bụ nanị ruo nwa oge. Daniel kọwara, sị: “Ebe ha sịrị ka a hapụ ogwe mkpọrọgwụ nke osisi ahụ; alaeze gị ga-eguzosiri gị ike, site na mgbe ị ga-ama na eluigwe na-achị achị.” (Daniel 4:26) Ná nrọ Nebukadneza, e kwere ka ogwe mkpọrọgwụ nke osisi ahụ e gbuturu egbutu dịgide, ọ bụ ezie na e kere ya agbụ ka ọ ghara ito. N’otu aka ahụ, “ogwe mkpọrọgwụ nke osisi” eze Babilọn ga-adịgide, ọ bụ ezie na a ga-eke ya agbụ ka ọ ghara ito eto ruo “oge asaa.” Ọnọdụ ya dị ka onye ọchịchị ụwa ga-eyi ogwe mkpọrọgwụ osisi ahụ e kere agbụ. A ga-echebe ya ruo mgbe oge asaa gabigara n’isi ya. Jehova ga-ahụ na n’oge ahụ ọ dịghị onye ga-anọchi Nebukadneza dị ka onye nanị ya na-achị Babilọn, ọ bụ ezie na ọ pụrụ ịbụworị na nwa ya aha ya bụ Evil-merodak nọchiteere ya dị ka onye na-achịgodị mgbe ahụ.

14. Gịnị ka Daniel gbara Nebukadneza ume ime?

14 N’ihi ihe e buru n’amụma banyere Nebukadneza, Daniel ji obi ike gbaa ya ume, sị: “N’ihi nke a, eze, kwee ka ndụmọdụ m dị gị mma n’anya, werekwa ezi omume tijipụ mmehie gị nile, werekwa [imere] ndị e wedara n’ala amara tijipụ ajọ omume gị nile; a sị na ogologo mgbe ga-adịrị udo gị.” (Daniel 4:27) A sị na Nebukadneza ga-esi n’ụzọ mmehie ya nke mmegbu na nganga wezụga onwe ya, ikekwe nke a ga-agbanwere ya ihe. E kwuwerị, ihe dị ka narị afọ abụọ tupu mgbe ahụ, Jehova ekpebiworị ibibi ndị bi n’isi obodo Asiria, bụ́ Nineve, ma o meghị nke ahụ n’ihi na eze ya na ndị ọ na-achị chegharịrị. ( Jona 3:4, 10; Luk 11:32) Gịnị banyere Nebukadneza dị mpako? Ọ̀ ga-agbanwe ụzọ ya nile?

MMEZU MBỤ NKE NRỌ AHỤ

15. (a) Àgwà dị aṅaa ka Nebukadneza nọgidere na-egosipụta? (b) Gịnị ka ihe odide dị iche iche na-ekpughe banyere ihe omume Nebukadneza?

15 Nebukadneza nọgidere na-adị mpako. Ka ọ na-agagharị n’elu ụlọ nke obí ya ọnwa 12 mgbe nrọ osisi ahụ gasịrị, o turu ọnụ, sị: “Ọ́ bụghị nke a bụ Babilọn ukwu a, nke mụ onwe m wuworo ịbụ ụlọ alaeze, site n’ike nke akụ̀ m na n’ihi ebube nke ịma mma m?” (Daniel 4:28-30) Nimrọd ewuworị Babilọn (Bebel), ma Nebukadneza nyere ya ùgwù. (Jenesis 10:8-10) N’otu n’ime ihe odide cunieform ya, o turu ọnụ, sị: “Nebukadreza, bụ́ Eze Babilọn, onye wughachiri Esagila na Ezida, nwa Nabopolassar ka m bụ. . . . Emere m ka ebe e wusiri ike nke Esagila na Babilọn sie ike ma mee ka aha ọchịchị m gbanyesie mkpọrọgwụ ike ruo mgbe ebighị ebi.” (Archaeology and the Bible, nke George A. Barton dere, 1949, peji nke 478-479) Ihe odide ọzọ na-ezo aka n’ihe dị ka ụlọ nsọ 20 ndị ọ rụziri ma ọ bụ wughachi. “N’okpuru ọchịchị Nebukadneza,” ka The World Book Encyclopedia na-ekwu, “Babilọn ghọrọ otu n’ime obodo ndị kasị maa mma n’ụwa oge ochie. N’ihe ndị ya onwe ya dekọrọ, o kwukebeghị okwu banyere ihe omume agha ya, kama o dere banyere ọrụ ihe owuwu ya na anya o lekwasịrị chi dị iche iche nke Babilọn. Ikekwe ọ bụ Nebukadneza wuru Ubi Ndị Koro n’Elu nke Babilọn, otu n’ime Ihe Ịtụnanya Asaa nke Ụwa Oge Ochie.”

16. Olee otú a na-aga isi weda Nebukadneza n’ala?

16 Ọ bụ ezie na o turu ọnụ, a na-aga iweda Nebukadneza dị mpako ala. Ihe ndekọ ahụ sitere n’ike mmụọ nsọ na-asị: “Mgbe eze kpụ okwu a n’ọnụ, otu olu siri n’eluigwe daa, sị, Gị ka a na-agwa okwu, Nebukadneza, bụ́ eze, sị: Alaeze apụwo n’aka gị. A ga na-esikwa n’ebe mmadụ bi chụpụ gị, ọ bụkwa n’etiti anụ ọhịa ka ebe obibi gị ga-adị; ihe ọkụkụ ka a ga-eme ka ị taa dị ka ehi, oge asaa ga-agabigakwa n’isi gị; ruo mgbe ị ga-ama na Onye ahụ nke kachasị ihe nile elu na-achị achị n’alaeze nke mmadụ, ọ bụkwa onye ọ bụla Ọ na-achọ ka Ọ na-enye ya.”—Daniel 4:31, 32.

17. Gịnị mere Nebukadneza dị mpako, n’ọnọdụ ndị dịkwa aṅaa ka ọ chọtara onwe ya n’oge na-adịghị anya?

17 Ara gbawara Nebukadneza ozugbo ahụ. N’ịbụ onye a chụpụrụ n’ebe mmadụ bi, ọ tara ihe ọkụkụ “dị ka ehi.” N’etiti anụ ọhịa, o doro anya na ọ nọghị nkịtị n’ahịhịa nke ebe yiri paradaịs, na-anara ikuku ndụ kwa ụbọchị. N’Iraq oge a, bụ́ ebe mkpọmkpọ ebe nke Babilọn dị, ọ̀tụ̀tụ̀ okpomọkụ ya na-adị malite n’ịdị oké ọkụ nke 50 degrees Celcius n’ọnwa okpomọkụ ruo n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị ala karịa ọ̀tụ̀tụ̀ mkpụkọ ice n’oge oyi. N’ịbụ onye a na-adịghị elekọta na onye e kpughere nye ihu eluigwe, ogologo agịrị isi Nebukadneza, nke hịkọrọ ahịkọ yiri abụ́bà ugo, mbọ aka na mbọ ụkwụ ya a na-ebeghị ebe yikwara mbọ nnụnụ. (Daniel 4:33) Lee mweda n’ala ọ bụụrụ onye ọchịchị ụwa a dị mpako!

18. N’ime oge asaa ahụ, gịnị weere ọnọdụ banyere ocheeze Babilọn?

18 Ná nrọ Nebukadneza, e gbuturu osisi ahụ dị ukwuu, e kekwara ogwe mkpọrọgwụ ya agbụ iji gbochie ya ito eto ruo oge asaa. N’otu aka ahụ, ‘e mere ka Nebukadneza si n’ocheeze nke alaeze ya rịdata’ mgbe Jehova mere ka ara gbawa ya. (Daniel 5:20) N’ezie, nke a gbanwere obi eze ahụ site n’ịbụ nke mmadụ gaa n’ịbụ nke oké ehi. N’agbanyeghị nke ahụ, Chineke chebeere Nebukadneza ocheeze ya ruo mgbe oge asaa ahụ gwụsịrị. Ebe ọ pụrụ ịbụ na Evil-merodak rụrụ ọrụ dị ka onyeisi ọchịchị ruo nwa oge, Daniel jere ozi dị ka “onye na-achị ala ahụ nile a na-achị achị, bụ́ Babilọn, na onyeisi ndị nọchiri anya eze n’ịchị ndị amamihe nile nke Babilọn.” Ndị enyi ya atọ bụ́ ndị Hibru nọgidere na-ekere òkè n’ọrụ ọchịchị nke ala ahụ a na-achị achị. (Daniel 1:11-19; 2:48, 49; 3:30) Mmadụ anọ ahụ bi n’ala ọzọ cheere mweghachi Nebukadneza n’ocheeze ya dị ka eze isi zuru okè onye mụtaworo na “Onye ahụ nke kachasị ihe nile elu na-achị achị n’alaeze nke mmadụ, ọ bụkwa onye ọ bụla Ọ na-achọ ka Ọ na-enye ya.”

MWEGHACHI NEBUKADNEZA

19. Mgbe Jehova mesịrị ka isi zuo Nebukadneza okè ọzọ, gịnị ka eze Babilọn ahụ bịara ghọta?

19 Jehova mere ka isi zuo Nebukadneza okè ọzọ mgbe oge asaa ahụ gwụsịrị. Mgbe ahụ n’ikweta na e nwere Chineke Kasị Ihe Nile Elu, eze ahụ kwuru, sị: “N’ọgwụgwụ ụbọchị ahụ nile mụ onwe m, bụ́ Nebukadneza, weliri anya m abụọ lekwasị eluigwe, ihe ọmụma m wee laghachikwute m, ọ bụkwa Onye ahụ nke kachasị ihe nile elu ka m gọziri, ọ bụkwa Onye ahụ nke na-adị ndụ mgbe ebighị ebi ka m jara sọpụrụkwa, Onye ọchịchị Ya bụ ọchịchị ebighị ebi, alaeze Ya na-adịgidekwa n’ọgbọ nile: ọ bụkwa ndị nile bi n’ụwa ka a na-agụ n’ihe efu: ọ bụkwa dị ka O si achọ ka Ọ na-eme n’usuu ndị agha nke eluigwe, na n’etiti ndị bi n’ụwa: ọ dịghịkwa onye ga-eti aka Ya ihe, sị Ya, Gịnị ka I meworo?” (Daniel 4:34, 35) Ee, Nebukadneza bịara ghọta na Onye Kachasị Ihe Nile Elu bụ n’ezie Onye Na-achị Eluigwe na Ala n’alaeze nke mmadụ.

20, 21. (a) Olee otú mwepụ nke agbụ ọla ahụ gburugburu ogwe mkpọrọgwụ nke osisi ahụ a hụrụ ná nrọ si yie ihe mere Nebukadneza? (b) Gịnị ka Nebukadneza kwetara, nke a kwa ò mere ka ọ bụrụ onye na-efe Jehova?

20 Mgbe Nebukadneza rigoghachiri n’ocheeze ya, ọ dị nnọọ ka a ga-asị na e wepụwo agbụ ọla ahụ dị gburugburu ogwe mkpọrọgwụ nke osisi ahụ a hụrụ ná nrọ. Banyere mweghachi ya, ọ sịrị: “N’otu mgbe ahụ ka ihe ọmụma m na-alaghachikwute m; ọzọ, n’ihi ebube nke alaeze m, ịma mma m na igbu mara mara m na-alaghachikwute m; ọ bụkwa mụ ka ndị ndụmọdụ m na ndị isi m na-ekpere; ọzọ, n’elu alaeze m ka e mere m ka m nọzie, ọ bụkwa ịdị ukwuu nke kachasị ka a tụkwasịịrị m.” (Daniel 4:36) Ọ bụrụ na onye ọchịchị ọ bụla nọ n’obí eze ledaburu eze ahụ isi gbakara anya, ugbu a ha “na-ekpere” ya n’ido onwe ha n’okpuru ya kpam kpam.

21 Lee “ihe ịrịba ama nile na ihe ijuanya nile” Chineke Kasị Ihe Nile Elu meworo! O kwesịghị iju anyị anya na eze Babilọn ahụ e weghachiri kwuru, sị: “Ugbu a mụ onwe m, bụ́ Nebukadneza, na-aja, na-ebuli, na-asọpụrụ Eze nke eluigwe; n’ihi na ọrụ Ya nile bụ eziokwu, ụzọ Ya nile bụkwa ikpe: ọzọ, ndị na-ejegharị ná mpako, Ọ pụrụ ime ka ha dị ala.” (Daniel 4:2, 37) Otú ọ dị, nkweta dị otú ahụ emeghị ka Nebukadneza bụrụ onye Jentaịl na-efe Jehova ofufe.

È NWERE IHE ÀMÀ NA-ESITEGHỊ NA BIBLE?

22. Ọrịa dị aṅaa ka ụfọdụ sịworo na ara Nebukadneza bụ, ma gịnị ka anyị kwesịrị ịghọta banyere ihe kpatara ọnọdụ isi mgbaka ya?

22 Ụfọdụ ekwuwo na ara gbara Nebukadneza bụ lycanthropy. Otu akwụkwọ ọkọwa okwu ọgwụ na ahụ ike na-asị: “LYCANTHROPY . . . site na [lyʹkos], lupus, nkịta ọhịa; [anʹthro·pos], homo, mmadụ. Aha a ka a na-akpọ ọrịa nke ndị kwenyere na a gbanwere ha ịghọ anụmanụ, bụkwa ndị na-eṅomi ụda olu ma ọ bụ ubé, ọdịdị ma ọ bụ omume nke anụmanụ ahụ. Ndị a na-echekarị na a gbanwere ha ịghọ nkịta ọhịa, nkịta ma ọ bụ nwamba; mgbe ụfọdụkwa ịghọ oké ehi, dị ka ọ dị n’ọnọdụ Nebukadneza.” (Dictionnaire des sciences médicales, par une société de médicins et de chirurgiens, Paris, 1818, Mpịakọta nke 29, peji nke 246) Mgbaàmà nke lycanthropy yiri nke ọnọdụ isi mgbaka nke Nebukadneza. Otú ọ dị, ebe ọ bụ Chineke mere ka isi gbakaa ya, a pụghị ikwu kpọmkwem na ọ bụ ọrịa ọ bụla a ma ama.

23. Olee akaebe na-esiteghị na Bible e nwere maka isi mgbaka Nebukadneza?

23 Ọkà mmụta bụ́ John E. Goldingay na-ehota ọtụtụ ihe ndị yiri ara Nebukadneza na mweghachi ya. Dị ka ihe atụ, ọ na-asị: “Ikekwe otu ihe odide cuneiform na-ezughị ezu na-ezo aka n’otu ụdị isi mgbaka nke Nebukadneza, eleghịkwa anya na ya ileghara Babilọn anya na ịhapụ ya.” Goldingay na-ezo aka n’otu ihe odide a kpọrọ “Job nke Babilọn” ma na-ekwu na ọ “na-agba akaebe banyere ntaramahụhụ ndị Chineke nyere, ọrịa, mweda n’ala, ịchọ isi nkọwa nke nrọ na-atụ ụjọ, ịbụ onye a kwadara dị ka osisi, ịbụ onye a chụpụrụ n’èzí, ịta ahịhịa, enwekwaghị uche, iyi ehi, ịbụ onye Marduk mere ka mmiri maa, mbọ ibibisị, agịrị isi ịdị na-eto, na ịbụ onye e kere agbụ, e mesịakwa mweghachi bụ́ nke o ji n’ihi ya too chi ahụ.”

OGE ASAA NKE NA-EMETỤTA ANYỊ

24. (a) Gịnị ka osisi ahụ dị ukwuu a hụrụ ná nrọ na-anọchi anya ya? (b) Gịnị ka e gbochiri ruo oge asaa, oleekwa otú nke ahụ si mee?

24 Dị ka osisi ahụ dị ukwuu sere onyinyo ya, Nebukadneza nọchiri anya ịchịisi ụwa. Ma cheta, osisi ahụ na-anọchi anya ịchịisi na ọbụbụeze dị nnọọ ukwuu karịa nke eze Babilọn. Ọ na-ese onyinyo ọbụbụeze eluigwe na ala nke Jehova, bụ́ “Eze nke eluigwe,” karịsịa n’ihe metụtara ụwa. Tupu ndị Babilọn ebibie Jerusalem, alaeze ahụ nke hiwere isi n’obodo ahụ na-enwe Devid na ndị nketa ya dị ka ndị na-anọdụ “n’ocheeze Jehova” nọchiri anya ọbụbụeze Chineke n’ihe metụtara ụwa. (1 Ihe E Mere 29:23) Chineke n’onwe ya mere ka e gbutuo ọbụbụeze dị otú ahụ ma kee ya agbụ na 607 T.O.A. mgbe o ji Nebukadneza bibie Jerusalem. E gbochiri ọbụbụeze nke Chineke n’elu ụwa site n’otu alaeze dị n’eriri Devid ruo oge asaa. Oge asaa a ha hà aṅaa n’ogologo? Olee mgbe ha malitere, gịnịkwa kara ọgwụgwụ ha akara?

25, 26. (a) N’ọnọdụ Nebukadneza, olee ókè “oge asaa” ahụ haruru n’ogologo, n’ihi gịnịkwa ka i ji zaa otú ahụ? (b) Ná mmezu ya bụ́ isi, olee mgbe, ọ bụkwa n’ụzọ dị aṅaa ka “oge asaa” ahụ si malite?

25 Mgbe ara na-agba Nebukadneza, “agịrị isi ya toputara dị ka abụ́bà ugo, mbọ aka ya kwa dị ka mbọ nnụnụ.” (Daniel 4:33) Nke a were ogologo oge karịrị ụbọchị asaa ma ọ bụ izu asaa. Nsụgharị dị iche iche na-asị “oge asaa,” ndị ọzọ e jikwa mee ihe bụ “oge a kara aka” ma ọ bụ “oge ụfọdụ.” (Daniel 4:16, 23, 25, 32) Nsụgharị ọzọ nke (Septuagint) Grik Ochie na-asị “afọ asaa.” Onye Juu na-akọ akụkọ ihe mere nke narị afọ mbụ bụ́ Josephus weere “oge asaa” ahụ dị ka “afọ asaa.” (Antiquities of the Jews, Akwụkwọ nke 10, Isi nke 10, paragraf nke 6) Ụfọdụ ndị ọkà mmụta Hibru ewerewokwa “oge” ndị a dị ka “afọ.” “Afọ asaa” bụ otú e si sụgharịa ya na An American Translation, Today’s English Version, nakwa nsụgharị nke James Moffatt.

26 Dị ka ihe àmà na-egosi, “oge asaa” nke Nebukadneza gụnyere afọ asaa. N’amụma, otu afọ na-adị ụbọchị 360 ná nkezi, ma ọ bụ ọnwa 12 nke nke ọ bụla nwere ụbọchị 30. (Tụlee Mkpughe 12:6, 14.) Ya mere “oge asaa,” ma ọ bụ afọ asaa nke eze ahụ, bụ 360 a mụbara okpukpu 7, ma ọ bụ ụbọchị 2,520. Ma gịnị banyere mmezu bụ́ isi nke nrọ ya? “Oge asaa” ahụ nke amụma nọfere nnọọ ụbọchị 2,520. Okwu Jisọs gosiri nke a: “Ndị mba ọzọ ga-azọda Jerusalem n’ala, ruo mgbe oge nke mba ọzọ ga-emezu.” (Luk 21:24) ‘Nzọda n’ala’ ahụ malitere na 607 T.O.A. mgbe e bibiri Jerusalem, alaeze ihe atụ nke Chineke kwụsịkwa ịdị na Juda. Olee mgbe nzọda n’ala ahụ ga-ejedebe? Ọ bụ ‘n’oge a ga-eme ka ihe nile dị ka ha dị na mbụ,’ mgbe ọbụbụeze Chineke ga-amaliteghachi ọzọ n’elu ụwa site na Jerusalem ihe atụ ahụ, bụ́ Alaeze Chineke.—Ọrụ 3:21.

27. N’ihi gịnị ka ị ga-eji kwuo na “oge asaa” ahụ malitere na 607 T.O.A. ejedebeghị mgbe ụbọchị 2,520 nkịtị gasịrị?

27 Ọ bụrụ na anyị agụọ ụbọchị 2,520 nkịtị malite na mgbe e bibiri Jerusalem na 607 T.O.A., nke ahụ ga-eweta anyị nanị na 600 T.O.A., bụ́ afọ na-enweghị ihe mere na ya n’Akwụkwọ Nsọ. Ọbụna na 537 T.O.A., mgbe ndị Juu a tọhapụrụ atọhapụ laghachiri Juda, ọbụbụeze Jehova amaliteghị n’ụwa. Nke ahụ dị otú ahụ n’ihi na e meghị Zerubabel, bụ́ onye nketa nke ocheeze Devid, eze kama nanị onye na-achị ala Juda nke nọ n’okpuru Peasia.

28. (a) Ụkpụrụ dị aṅaa ka a na-aghaghị iji mee ihe n’ihe banyere ụbọchị 2,520 nke “oge asaa” amụma ahụ? (b) Olee ókè “oge asaa” amụma ahụ haruru n’ogologo, oleekwa ụbọchị kara mmalite ha na ọgwụgwụ ha akara?

28 Ebe ọ bụ na “oge asaa” ahụ bụ nke amụma, anyị aghaghị iji ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ bụ́: “Otu ụbọchị n’ọnọdụ otu afọ” mee ihe n’ihe banyere ụbọchị 2,520 ahụ. E setịpụrụ ụkpụrụ a n’amụma banyere ịgba gburugburu nke Babilọn gbara Jerusalem. (Ezikiel 4:6, 7; tụlee Ọnụ Ọgụgụ 14:34.) Ya mere, “oge asaa” nke ndị Jentaịl ịchị ụwa n’enweghị ihe mgbochi site n’Alaeze Chineke dị afọ 2,520 n’ogologo. Ha ji mbibi nke Juda na Jerusalem malite n’ọnwa nke asaa dabeere n’usoro iji ọnwa agụ oge (Tishri 15) nke 607 T.O.A. (2 Ndi Eze 25:8, 9, 25, 26) Malite mgbe ahụ ruo 1 T.O.A. dị afọ 606. Afọ 1,914 fọdụrụnụ sitere mgbe ahụ ruo 1914 O.A. N’ihi ya, “oge asaa” ahụ ma ọ bụ afọ 2,520, jedebere na Tishri 15, ma ọ bụ October 4/5, 1914 O.A.

29. Ònye bụ “onye dị ala karịa mmadụ nile,” gịnịkwa ka Jehova mere iji mee ka ọ nọkwasi n’ocheeze?

29 N’afọ ahụ “oge nke mba ọzọ” zuru, Chineke nyefekwara ịchịisi n’aka “onye dị ala karịa mmadụ nile”—Jisọs Kraịst—bụ́ onye ndị iro ya werewooro dị ka onye a na-asọ oyi nke na ọbụna na ha mere ka a kpọgbuo ya. (Daniel 4:17) Iji mee ka Eze Mesaịa ahụ nọkwasị n’ocheeze, Jehova tọpụrụ agbụ ígwè na ọla copper ihe atụ ahụ e kere gburugburu “ogwe mkpọrọgwụ” nke ọbụbụeze ya. N’ụzọ dị otú a Chineke Kasị Ihe Nile Elu kwere ka “ome” ga-abụ eze topụta na ya dị ka ngosipụta nke ọbụbụeze Chineke n’elu ụwa site n’Alaeze eluigwe nke dị n’aka Onye Nketa kasị ukwuu nke Devid, bụ́ Jisọs Kraịst. (Aịsaịa 11:1, 2; Job 14:7-9; Ezikiel 21:27) Lee ka anyị si ekele Jehova maka ihe a na-enye obi ụtọ si na ya pụta nakwa maka ikpughe ihe omimi nke osisi ahụ dị ukwuu!

Gịnị Ka Ị Ghọtara?

• Gịnị ka osisi ahụ dị ukwuu nke dị ná nrọ Nebukadneza na-anọchi anya ya?

• Gịnị dakwasịrị Nebukadneza ná mmezu mbụ nke nrọ ya banyere osisi?

• Mgbe nrọ ya mezusịrị, gịnị ka Nebukadneza kwetara?

• Ná mmezu bụ́ isi nke nrọ amụma ahụ banyere osisi, “oge asaa” ahụ hà aṅaa n’ogologo, oleekwa mgbe ha malitere ma kwụsị?

[Foto dị na peeji nke nke 83]

[Foto dị na peeji nke nke 91]

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya