Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • jy isi 1 p. 10-p. 11 para. 8
  • Ozi Abụọ Si n’Aka Chineke

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ozi Abụọ Si n’Aka Chineke
  • Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ozi Ndị Sitere n’Eluigwe
    Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
  • Elizabet Mụrụ Nwa
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • E Nyeghachiri Ha Ụgwọ Ọrụ n’Ihi Ijegharị n’Ụzọ Ụta Na-adịghị Ya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • A Mụọ Onye Ga-akwadebe Ụzọ
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
jy isi 1 p. 10-p. 11 para. 8
Mgbe mmụọ ozi Gebriel pụtara n’ihu Zekaraya; Elizabet nwunye ya dị ime

ISI NKE 1

Ozi Abụọ Si n’Aka Chineke

LUK 1:5-33

  • MMỤỌ OZI GEBRIEL EBUO AMỤMA NA A GA-AMỤ JỌN ONYE NA-EME BAPTIZIM

  • GEBRIEL AGWA MERI NA Ọ GA-AMỤ JIZỌS

Anyị nwere ike ikwu na ihe niile e dere na Baịbụl bụ ozi si n’aka Chineke. Ọ bụ Nna anyị nke eluigwe nyere anyị Baịbụl ka ọ na-eduzi anyị. Ka anyị lee ozi abụọ pụrụ iche e ziri ihe karịrị puku afọ abụọ gara aga. Ọ bụ mmụọ ozi aha ya bụ Gebriel, “onye na-eguzo n’ihu Chineke,” ziri ozi ndị ahụ. (Luk 1:19) Olee otú ihe dịịrị ndị ọ gara zie ozi ndị ahụ dị mkpa?

Ọ bụ n’ihe dị ka n’afọ nke 3 Tupu Oge Ndị Kraịst ka a bịara zie ozi ndị a. Ebee ka Gebriel gara zie ozi nke mbụ? Ọ bụ n’ebe ugwu Judia, nke na-adịchaghị anya na Jeruselem. Ebe ahụ ka otu onye nchụàjà Jehova aha ya bụ Zekaraya bi. Zekaraya na nwunye ya Elizabet emeela agadi, ha amụtabeghịkwa nwa. Mgbe a bịara izi ozi a, ọ bụ Zekaraya nọ ọrụ ịchụ àjà n’ụlọ nsọ. Mgbe Zekaraya nọ n’ụlọ nsọ ahụ, Gebriel pụtara na mberede n’akụkụ ebe ịchụàjà ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ.

Egwu bịara Zekaraya. Ma mmụọ ozi ahụ mere ka obi ruo ya ala. Ọ gwara ya, sị: “Zekaraya, atụla egwu n’ihi na a nụwo arịrịọ ị na-arịọsi ike, nwunye gị bụ́ Elizabet ga-amụkwara gị nwa nwoke, ị ga-akpọkwa aha ya Jọn.” Gebriel kwukwara na Jọn “ga-abụ onye ukwu n’ihu Jehova” nakwa na ‘ọ ga-akwadebere Jehova otu ndị.’—Luk 1:13-17.

Ebe Zekaraya ji aka na-agwa ndị mmadụ okwu

Zekaraya chere na ihe a agaghị ekwe omume. Maka gịnị? Maka na ya na Elizabet emeela agadi. N’ihi ihe ahụ o chere, Gebriel gwara ya sị: “Ị ga-ada ogbi, ị gaghịkwa enwe ike ikwu okwu ruo ụbọchị ihe ndị a ga-eme, n’ihi na i kweghị ihe m kwuru.”—Luk 1:20.

Ka ihe ndị a na-eme, ndị nọ n’èzí nọ na-eche ihe mere Zekaraya ji nọọ ogologo oge n’ime ụlọ nsọ ahụ. Mgbe Zekaraya mechara pụta, ọ naghịzi ekwu okwu. Ihe ọ na-emelizi bụ iji aka na-agwa ndị mmadụ okwu. Ihe a mere ka ha matazie na o nwere ihe dị ebube ọ hụrụ mgbe ọ nọ n’ime ụlọ nsọ.

Zekaraya lawara mgbe ọ rụchara ọrụ ya n’ụlọ nsọ ahụ. Oge na-adịghị anya ihe a mechara, Elizabet dịrị ime. Ka Elizabet nọ na-eche mgbe ọ ga-amụ nwa, ọ nọrọ ọnwa ise n’ụlọ ka ndị èzí ghara ịhụ ya.

Mgbe mmụọ ozi Gebriel pụtara n’ihu Meri

Gebriel bịara ọzọ. Onye ka ọ bịara ịhụ? Ọ bụ nwa agbọghọ na-alụbeghị di aha ya bụ Meri, onye bi n’ebe ugwu Jeruselem, n’obodo Nazaret nke dị na Galili. Gịnị ka mmụọ ozi ahụ gwara Meri? Ọ sịrị ya: “Lee! ị ga-atụrụ ime, mụọ nwa nwoke, ị ga-agụkwa ya Jizọs.” O kwukwara, sị: “Onye a ga-abụ onye ukwu, a ga-akpọkwa ya Ọkpara nke Onye Kasị Elu, . . . ọ ga-achịkwa ụlọ Jekọb dị ka eze ruo mgbe ebighị ebi, alaeze ya agaghịkwa enwe ọgwụgwụ.”—Luk 1:30-33.

O doro anya na obi dị Gebriel ezigbo ụtọ maka ihe ùgwù a e nyere ya izi ozi abụọ a. Ka anyị na-agụkwu gbasara Jọn na Jizọs, anyị ga-amata ihe mere ozi abụọ ahụ si n’eluigwe ji dị ezigbo mkpa.

  • Ònye bịara zie ozi abụọ dị mkpa si n’eluigwe?

  • Olee ndị a bịara zie ozi abụọ ahụ?

  • Olee ihe i chere mere ozi ndị ahụ si n’eluigwe ji siere ndị e ziri ya ike ikweta?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya