Ihe E Kwuru n’Akwụkwọ Ndị A Kpọrọ Aha n’Usoro Ihe Omume Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ
JUN 3-9
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | NDỊ GALESHIA 4-6
“Otu ‘Ihe Ngosi Bụ́ Ihe Atụ’ nke Nwere Ihe Ọ Ga-akụziri Anyị”
it-1 1018 ¶2
Hega
Pọl onyeozi kọwara na Hega e kwuru okwu ya n’otu ihe ngosi bụ́ ihe atụ nọchiri anya mba Izrel ha na Jehova gbara ọgbụgba ndụ Iwu n’Ugwu Saịnaị. Ọgbụgba ndụ a ‘mụrụ ụmụ nye ịnọ n’ohu.’ Mba ahụ enwelighị ike idebe ọgbụgba ndụ ahụ n’ihi na ha bụ ndị mmehie. N’oge ahụ, mba Izrel enwereghị onwe ha, kama a mara ha ikpe na ha kwesịrị ịnwụ n’ihi mmehie ha. Ọ bụ ya mere ha ji bụrụ ndị ohu. (Jọn 8:34; Rom 8:1-3) Jeruselem e nwere n’oge Pọl yiri Hega n’ihi na Jeruselem ahụ na ndị bi na ya nọ n’ohu. Jeruselem ahụ nọchikwara anya mba Izrel niile n’ihi na ọ bụ ya bụ isi obodo Izrel. Ma, Ndị Kraịst e tere mmanụ bụ ụmụ “Jeruselem nke dị n’elu,” ya bụ, nwaanyị ihe atụ Chineke. Jeruselem nke a dị ka Sera. O nwetụbeghị mgbe ọ nọ n’ohu. Ma, Ishmel kpagburu Aịzik. Otú ahụkwa ka ụmụ Jeruselem nke nọ n’ohu kpagburu ụmụ “Jeruselem nke dị n’elu,” bụ́ ndị Ọkpara Chineke mere ka ha nwere onwe ha. Ma, a chụpụrụ Hega na ụmụ ya. Nchụpụ a nọchịrị anya nchụpụ Jehova mechara chụpụ ụmụ Izrel ma ọ bụkwanụ ọjụjụ ọ jụrụ ha.—Gal. 4:21-31; gụọkwa Jọn 8:31-40.
JUN 10-16
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | NDỊ EFESỌS 1-3
“Otú Jehova Si Elekọta Ihe na Ihe Ọ Na-elekọta”
it-2 837 ¶4
Ihe Nzuzo Dị Nsọ
Alaeze Mesaya. N’ihe Pọl dere, o mere ka ihe nzuzo dị nsọ banyere Kraịst doo anya. Ná Ndị Efesọs 1:9-11, o kwuru na Chineke na-eme ka a mata banyere “ihe nzuzo dị nsọ” banyere uche ya. O kwuru, sị: “Ihe nzuzo a bụ dị ka ihe dị ya ụtọ si dị bụ́ nke o zubere n’ime onwe ya maka ilekọta ihe mgbe oge ahụ a kara aka zuru, ya bụ, ịchịkọtaghachi ihe niile n’ime Kraịst, ihe ndị dị n’eluigwe na ihe ndị dị n’ụwa. Ee, n’ime ya, n’ịdị n’otu nke anyị na onye e kenyekwara anyị na ya dị ka ndị nketa, ebe a họpụtara anyị tupu oge eruo dị ka nzube nke onye ahụ si dị bụ́ onye ji ihe niile na-arụ ọrụ dị ka uche ya si agwa ya okwu.” Ihe so ‘n’ihe nzuzo ahụ dị nsọ’ bụ otu ọchịchị a na-akpọ Alaeze Mesaya. “Ihe ndị dị n’eluigwe” Pọl kwuru okwu ya bụ ndị nwere olileanya iso Kraịst chịa n’Alaeze eluigwe. “Ihe ndị dị n’ụwa” bụ ndị Alaeze ahụ ga-achị. Jizọs mere ka ndị na-eso ụzọ ya mata na ihe nzuzo ahụ gbasara Alaeze ya. Ọ sịrị ha: “Ọ bụ unu ka e nyere ikike ịghọta ihe nzuzo dị nsọ nke alaeze Chineke.”—Mak 4:11.
JUN 17-23
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-1 1128 ¶3
Ịdị Nsọ
Mmụọ Nsọ. Jehova na-achịkwa mmụọ nsọ ya ma ọ bụ ike ya nọ n’ọrụ, ọ na-emezukwa nzube ya mgbe niile. Ọ dị ọcha, dịkwa nsọ. Ọ bụ ihe Chineke na-eji arụ ọrụ. N’ihi ya, a na-akpọ ya “mmụọ nsọ” na “mmụọ nke ịdị nsọ.” (Ọma 51:11; Luk 11:13; Rom 1:4; Efe. 1:13) Ọ bụrụ na mmụọ nsọ ana-arụ ọrụ n’ahụ́ mmadụ, ọ na-eme ka onye ahụ dị nsọ ma ọ bụ dị ọcha. Ọ bụrụ na onye ahụ ana-eme ihe na-adịghị ọcha ma ọ bụ ihe na-adịghị mma, ọ pụtara na ọ na-emegide mmụọ nsọ ma ọ bụ na-eme ka o “nwee mwute.” (Efe. 4:30) N’agbanyeghị na mmụọ nsọ abụghị onye, ọ na-egosi ụdị onye Chineke bụ, na ọ dị nsọ. N’ihi ya, mmụọ nsọ nwere ike ‘inwe mwute.’ Ọ bụrụ na mmadụ ana-eme ihe na-adịghị mma, ọ ‘na-emenyụ ọkụ nke mmụọ nsọ.’ (1 Tesa. 5:19) Ọ bụrụ na mmadụ anọgide na-eme omume ahụ na-adịghị mma, e nwere ike ikwu na onye ahụ emeela “ihe wutere mmụọ nsọ.” Ihe a nwere ike ime ka mmadụ ghọọ onye iro Chineke. (Aịza. 63:10) Onye na-eme ihe na-ewute mmụọ nsọ nwere ike mere ya ruo na nke ikwulu mmụọ nsọ. Jizọs Kraịst sịrị na a gaghị agbaghara onye kwuluru mmụọ nsọ ma n’usoro ihe a ma na nke na-abịa abịa.—Mat. 12:31, 32; Mak 3:28-30; Gụọkwa isiokwu bụ́ SPIRIT (MMỤỌ).
it-1 1006 ¶2
Anyaukwu
Ihe Mmadụ Na-eme Na-egosi ma Ò Nwere Anyaukwu. A na-esi n’ihe ụfọdụ mmadụ na-eme mata ma ò nwere anyaukwu. Ihe ndị onye ahụ na-eme ga-egosi ma ọ̀ bụ onye oké ọchịchọ. Jems bụ́ onye so dee Baịbụl gwara anyị na ọ bụrụ na mmadụ enwee ọchịchọ ọjọọ, ọchịchọ ahụ tụrụ ime, na ọ na-amụpụta mmehie. (Jems 1:14, 15) N’ihi ya, e nwere ike iji ihe mmadụ na-eme mata na ọ dị anyaukwu. Pọl onyeozi kwuru na onye anyaukwu, na-ekpere arụsị. (Efe. 5:5) Onye anyaukwu na-eme ka ihe ndị ọ na-achọsi ike bụrụ chi ya. Ọ na-ewere ha ka ihe ka mkpa karịa ife Chineke na ijere ya ozi.—Rom 1:24, 25.
JUN 24-30
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-2 528 ¶5
Àjà Dị Iche Iche
Àjà Ihe Ọṅụṅụ. A na-eji ihe ọṅụṅụ na ihe ndị ọzọ achụ àjà, karịchaa mgbe ndị Izrel banyere n’Ala Nkwa ahụ. (Ọnụ Ọgụ. 15:2, 5, 8-10) Mmanya, ya bụ, “mmanya na-egbu egbu,” so n’ihe ndị eji achụ àjà ihe ọṅụṅụ ahụ. A na-awụpụkwa ya n’ebe ịchụ àjà. (Ọnụ Ọgụ. 28:7, 14; tụlee Ọpụ. 30:9; Ọnụ Ọgụ. 15:10.) Pọl onyeozi degaara ndị Kraịst nọ na Filipaị akwụkwọ ozi, sị: “Ọ bụrụgodị na a na-awụsa m dị ka àjà ihe ọṅụṅụ n’elu àjà a na-achụ n’ihe metụtara ozi a na-ejere ọha mmadụ, nke okwukwe kpaliri unu ime, enwere m obi ụtọ.” Pọl onyeozi ji àjà ihe ọṅụṅụ a gosi otú o si dị njikere ịwụpụ onwe ya, jeere ụmụnna ya ozi. (Fil. 2:17) Obere oge tupu ya anwụọ o degaara Timoti akwụkwọ ozi, sị: “A malitelarị ịwụpụ m dị ka àjà ihe ọṅụṅụ, oge a kara aka a ga-atọhapụ m dịkwa nso.”—2 Tim. 4:6.