Ihe E Kwuru n’Akwụkwọ Ndị A Kpọrọ Aha n’Usoro Ihe Omume Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ
DISEMBA 2-8
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | MKPUGHE 7-9
“Oké Ìgwè Mmadụ A Na-apụghị Ịgụta Ọnụ Bụ Ndị Jehova Gọziri Agọzi”
it-1 997 ¶1
Oké Ìgwè Mmadụ
Ajụjụ bụ: Ọ bụrụ na “oké ìgwè mmadụ” ahụ bụ ndị a ga-azọpụta, ha anọrọkwa n’ụwa, oleezi otú o si bụrụ na ha ‘guzo n’ihu ocheeze Chineke nakwa n’ihu Nwa Atụrụ ahụ’? (Mkpu. 7:9) Mgbe ụfọdụ na Baịbụl, ‘iguzo’ na-egosi na ihe mmadụ ma ọ bụ ìgwè mmadụ masịrị onye ahụ ha guzo n’ihu ya ma ọ bụkwanụ na ihe ha dị onye ahụ mma. (Ọma 1:5; 5:5; Ilu 22:29, AT; Luk 1:19) Ná Mkpughe isi isii, e kwudịrị na “ndị eze nke ụwa na ndị nọ n’ọkwá ukwu na ndị ọchịagha na ndị bara ọgaranya na ndị dị ike na ndị ohu niile na ndị niile nweere onwe ha” ga-aga zoo onwe ha ka ‘Onye ahụ nke nọ n’ocheeze ahụ ghara ịhụ ha, ka ọnụma nke Nwa Atụrụ ahụ gharakwa ịbịakwasị ha, n’ihi na oké ụbọchị nke ọnụma ha abịawo, ònye pụrụ iguzo?’ (Mkpu. 6:15-17; tụlee Luk 21:36.) N’ihi ya, ihe ọ pụtara bụ na “oké ìgwè mmadụ” ahụ bụ ndị e chebere n’oge iwe Jehova nakwa ndị “guzo” dị ka ndị ihe ha dị Chineke na Nwa Atụrụ ahụ mma.
it-2 1127 ¶4
Mkpagbu
Ihe dị ka afọ iri atọ e bibichara Jeruselem, a gwara Jọn onyeozi gbasara oké ìgwè mmadụ, ndị si ná mba niile na ebo niile na ndị niile, sị: “Ndị a bụ ndị si n’oké mkpagbu ahụ pụta.” (Mkpu. 7:13, 14) Na ‘oké ìgwè mmadụ ahụ si n’oké mkpagbu ahụ pụta’ gosiri na ha lanahụrụ ya. Ihe gosiri na ihe a bụ eziokwu bụ ihe yiri ya e kwuru n’Ọrụ Ndịozi 7:9, 10. Ebe ahụ sịrị: “Chineke nọnyeere [Josef]. Ọ napụtakwara ya ná mkpagbu ya niile.” Na a napụtara Josef ná mkpagbu ya niile apụtaghị naanị na e nyeere ya aka idi mkpagbu ya kama na ọ lanahụrụ mkpagbu ndị ahụ.
it-1 996-997
Oké Ìgwè Mmadụ
Ihe E Ji Amata Ha. Ihe bụ́ isi a ga-eji amata “oké ìgwè mmadụ” ahụ bụ ihe e dere banyere ha ná Mkpughe isi asaa na amaokwu Baịbụl ndị ọzọ kwuru ihe yiri ihe e dere ebe ahụ. Mkpughe 7:15-17 kwuru na Chineke ‘ga-agbasa ụlọikwuu ya n’isi ha,’ na a ga-edugakwa ha “n’isi iyi nke mmiri nke ndụ,” nakwa na Chineke ‘ga-ehichapụ anya mmiri ọ bụla n’anya ha.’ Ná Mkpughe 21:2-4, e kwuru ihe yiri ihe ndị a. E kwuru na “Ụlọikwuu nke Chineke dịnyeere mmadụ,” na Chineke “ga-ehichapụkwa anya mmiri niile n’anya ha,” nakwa na “ọnwụ agaghị adị ọzọ.” Ihe e kwuru n’ọhụụ a abụghị banyere ndị nọ n’eluigwe, bụ́ ebe ‘Jeruselem Ọhụrụ ahụ si na-agbadata,’ kama ọ bụ banyere ndị nọ n’ụwa, ya bụ, ụmụ mmadụ.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-1 12
Abadọn
Ònye bụ Abadọn, mmụọ ozi nke abis?
Ma, ná Mkpughe 9:11, e kwuru na “Abadọn” bụ aha “mmụọ ozi nke abis.” Aha ahụ n’asụsụ Grik bụ Apọlịọn, nke pụtara “Onye Mbibi.” N’agbata afọ 1801 na afọ 1900, ndị mmadụ gbalịrị igosi na amụma Baịbụl a na-ekwu gbasara ndị dị ka Eze Ukwu Vespasian, Muhammad, na Napoleon, e kwukwara na mmụọ ozi a bụ mmụọ ozi Setan. Ma, Mkpughe 20:1-3 gosiri na mmụọ ozi ahụ nke “ji mkpịsị ugodi nke abis” bụ onye si n’eluigwe na-anọchite anya Chineke, nakwa na ọ bụghị mmụọ ozi Setan, kama na o kere Ekwensu agbụ ma tụba ya n’abis. Mgbe akwụkwọ bụ́ The Interpreter’s Bible na-ekwu gbasara Mkpughe 9:11, ọ sịrị: “Abadọn abụghị mmụọ ozi Ekwensu, kama ọ bụ mmụọ ozi Chineke nke na-ebibi ihe Chineke gwara ya bibie.”
N’akwụkwọ nsọ Hibru ndị a anyị ka tụlechara n’elu, o doro anya na e nwere ihe jikọrọ okwu Hibru bụ́ ʼavad·dohnʹ na Shiol na ọnwụ. Ná Mkpughe 1:18, Jizọs Kraịst kwuru, sị: “Ana m adị ndụ ruo mgbe niile ebighị ebi, achịkwa m mkpịsị ugodi nke ọnwụ na nke Hedis.” Luk 8:31 gosiri na Jizọs nwere ikike ịtụba ma Setan ma ndị mmụọ ọjọọ ya n’abis. Ná Ndị Hibru 2:14, e gosikwara na o nwere ikike ibibi Setan. Ebe ahụ sịrị na Jizọs keere òkè n’ọbara na anụ ahụ́, “ka o wee site n’ọnwụ ya mee ka ọ ghara ịdị bụ́ onye ahụ nke nwere ikike ịkpata ọnwụ, ya bụ, Ekwensu.” Mkpughe 19:11-16 gosiri nke ọma na ọ bụ onye Chineke họpụtara ka o bibie ndị ọjọọ niile.
DISEMBA 9-15
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-2 880-881
Akwụkwọ Mpịakọta
Mgbe Ọ Na-anọchi Anya Ihe. E nwere ọtụtụ ebe e kwuru gbasara “akwụkwọ mpịakọta” na Baịbụl, ma ọ bụghị akwụkwọ mpịakọta nkịtị ka a na-ekwu. Ma Ezikiel ma Zekaraya hụrụ akwụkwọ mpịakọta e dere ihe ihu na azụ. Ebe ọ bụ n’otu akụkụ ka a na-edekarị ihe n’akwụkwọ mpịakọta, ide ya ihe ihu na azụ nwere ike igosi otú okwu ikpe ọmụma e dere na ya siruru n’ike. (Ezik. 2:9–3:3; Zek. 5:1-4) N’ọhụụ e dekọrọ ná Mkpughe, e kwuru na onye nọ n’ocheeze ahụ ji akwụkwọ mpịakọta n’aka nri ya, e jikwa ihe asaa a kara akara mechisie ya ike ka a ghara ịhụ ihe e dere n’ime ya ruo mgbe Nwa Atụrụ Chineke mepere ha. (Mkpu. 5:1, 12; 6:1, 12-14) N’ọhụụ ahụ, e mechara nye Jọn akwụkwọ mpịakọta ma gwa ya ka ọ taa ya. Mgbe ọ tara ya, ọ tọrọ ya ụtọ n’ọnụ ma mee ka afọ luo ya ilu. Ebe ọ bụ na e meghere akwụkwọ mpịakọta ahụ emeghe, e mechighị ya emechi, a ga-aghọta ihe e dere na ya. Ọ tọrọ Jọn “ụtọ” ịgụ ihe ndị dị n’akwụkwọ mpịakọta ahụ, ma ọ ga-abụkwa na o nwere ihe ndị na-elu ilu dị na ya a gwara ya buo n’amụma. (Mkpu. 10:1-11) A gwakwara Ezikiel ka o mee ụdị ihe a mgbe e nyere ya akwụkwọ mpịakọta e dere “abụ iru uju na ịkwa ákwá na ákwá arịrị.”—Ezik. 2:10.
it-2 187 ¶7-9
Ihe Mgbu A Na-enwe n’Ịmụ Nwa
N’ọhụụ e gosiri Jọn onyeozi ná Mkpughe, ọ hụrụ otu nwaanyị n’eluigwe ka ọ na-eti mkpu “n’ihi ihe mgbu ọ na-enwe na oké ihe ụfụ ọ na-enwe ịmụpụta nwa.” Ọ mụrụ “ọkpara, bụ́ nwa nwoke, onye ga-eji mkpanaka ígwè zụọ mba niile dị ka atụrụ.” N’agbanyeghị mbọ dragọn ahụ gbara iji ripịa nwa ya, ‘e kuuru nwa ya gaa n’ebe Chineke nọ nakwa n’ebe ocheeze ya dị.’ (Mkpu. 12:1, 2, 4-6) N’oge ochie, ọ na-abụ a mụọ nwa ọhụrụ, e kunye ya nna ya ka ọ nabata ya. N’ihi ya, otú ahụ Chineke kuuru nwa ahụ gosiri na ọ nabatara ya ka nwa ya. Ọ pụtara na “nwaanyị ahụ” bụ “nwunye” Chineke, ya bụ́ “Jeruselem nke dị n’elu” na “nne” Kraịst na ụmụnna ya.—Gal. 4:26; Hib. 2:11, 12, 17.
O doro anya na “nwaanyị” Chineke nke nọ n’eluigwe zuru okè nakwa na ọ gaghị enwe ihe mgbu nkịtị ma ọ mụwa nwa. N’ihi ya, ihe mgbu ahụ pụtara na “nwaanyị” ahụ ga-ama na oge eruola mgbe ọ ga-amụ nwa, ọ ga na-atụ anya na ọ gaghị anọte aka, ya amụọ nwa.—Mkpu. 12:2.
Ònye ga-abụ ‘ọkpara a’? Ọ “ga-eji mkpanaka ígwè zụọ mba niile dị ka atụrụ.” Ọ bụ ihe a ka e bụrụ n’amụma banyere Eze bụ́ Mesaya n’Abụ Ọma 2:6-9. Ma, mgbe Jọn hụrụ ọhụụ a bụ mgbe ọtụtụ afọ gachara a mụrụ Jizọs n’ụwa, ya anwụọ, a kpọlitekwa ya n’ọnwụ. N’ihi ya, ọhụụ a yiri ka ọ na-ekwu banyere mgbe Alaeze Mesaya, nke Ọkpara Chineke bụ́ Jizọs Kraịst ga-abụ Eze ya, ga-amalite ịchị. Mgbe a kpọlitere Jizọs n’ọnwụ, ọ ‘nọdụrụ ala n’aka nri Chineke. Malite mgbe ahụ gawa, ọ nọ na-echere ruo mgbe a ga-edebe ndị iro ya ka ha bụrụ ihe mgbakwasị ụkwụ ya.’—Hib. 10:12, 13; Ọma 110:1; Mkpu. 12:10.
DISEMBA 23-29
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | MKPUGHE 17-19
“Agha Chineke Ga-akwụsị Agha Niile”
it-1 1146 ¶1
Ịnyịnya
N’ọhụụ ahụ e gosiri Jọn onyeozi, ọ hụrụ Eze Jizọs Kraịst ka ọ na-agba ịnyịnya ọcha, hụkwa ụsụụ ndị agha ji ịnyịnya ọcha na-eso ya. Ọhụụ a e gosiri Jọn na-egosi na agha Kraịst ga-alụrụ Nna ya bụ́ Jehova Chineke bụ agha ezi omume na nke ikpe ziri ezi. (Mkpu. 19:11, 14) Ná Mkpughe isi isii, e gosiri Jọn ndị ịnyịnya anọ na ụdị ịnyịnya ha na-agba. Ha na-egosi na ọchịchị Kraịst amalitela, na-egosikwa ọdachi ndị ga-eso ya.—Mkpu. 6:2-8.
DISEMBA 30–JENỤWARỊ 5
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-2 249 ¶2
Ndụ
N’iwu Chineke nyere Adam, ihe o kwuru gosiri na ọ bụrụ na Adam erubere ya isi, ọ gaghị anwụ. (Jen. 2:17) Mgbe a ga-eme ka onye iro ikpeazụ bụ́ ọnwụ ghara ịdị, ụmụ mmadụ na-erube isi agaghịzi enwe mmehie ga na-arụ ọrụ n’ime ha nke ga-akpatara ha ọnwụ. Ha agaghịzi na-anwụ anwụ. (1 Kọr. 15:26) Mgbe a ga-eme ka ọnwụ ghara ịdị bụ ná ngwụcha ọchịchị Kraịst nke akwụkwọ Mkpughe kwuru na ọ ga-ewe otu puku afọ. O kwukwara na ndị ha na Kraịst ga-eso bụrụ ndị nchụàjà na ndị eze bịara “dịrị ndụ ma soro Kraịst chịa dị ka ndị eze ruo otu puku afọ.” “Ndị fọdụrụ ná ndị nwụrụ anwụ” ndị na-adịghị ndụ “ruo mgbe otu puku afọ ahụ gwụsịrị” ga-abụ ndị dị ndụ ná ngwụcha otu puku afọ ahụ, tupu atọhapụ Setan n’abis ka o lee ụmụ mmadụ ule ikpeazụ. Ná ngwụcha otu puku afọ ahụ, ndị bi n’ụwa ga-ezu okè, otú ahụ Adam na Iv zuru tupu ha emehie. Mgbe ahụ, ụmụ mmadụ ga-ebi ndụ zuru okè. Ndị ga-agafe ule Setan mgbe a ga-atọhapụ ya nwa oge ga-adị ndụ zuru okè ruo mgbe ebighị ebi.—Mkpu. 20:4-10.
it-2 189-190
Ọdọ Ọkụ
Ọ bụ naanị n’akwụkwọ Mkpughe ka e kwuru banyere ọdọ ọkụ ahụ, o dokwara anya na ọ bụghị ọkụ nkịtị ka a na-ekwu banyere ya. Baịbụl kọwakwara ihe ọ pụtara. O kwuru, sị: “Ọdọ ọkụ ahụ pụtara ọnwụ nke abụọ.”—Mkpu. 20:14; 21:8.
Ihe ndị e kwuru mgbe a na-ekwu okwu ọdọ ọkụ ahụ n’akwụkwọ Mkpughe mere ka o dokwuo anya na ọdọ ọkụ ahụ abụghị ọkụ nkịtị. E kwuru na a tụbara ọnwụ n’ọdọ ọkụ ahụ. (Mkpu. 19:20; 20:14) Ma, o doro anya na a gaghị atụbali ọnwụ n’ime ọkụ nkịtị. E kwukwara na a tụbara Ekwensu, bụ́ mmụọ a na-apụghị ihụ anya, n’ime ọdọ ọkụ ahụ. Ebe ọ bụ na ọ bụ mmụọ, ọkụ nkịtị enweghị ike imerụ ya ahụ́.—Mkpu. 20:10; tụlee Ọpụ. 3:2 na Ikpe 13:20.
Ebe ọ bụ na ọdọ ọkụ ahụ pụtara “ọnwụ nke abụọ,” Mkpughe 20:14 ekwuokwa na a tụbara “ọnwụ na Hedis” n’ime ya, ọ pụtara na ọdọ ọkụ ahụ abụghị ọnwụ ụmụ mmadụ ketara n’aka Adam (Rom 5:12); ọ pụtaghịkwa Hedis (Shiol). Ọ pụtara na ọ na-anọchi anya ụdị ọnwụ ọzọ, ya bụ, nke a na-agaghị akpọlite mmadụ na ya, n’ihi na o nweghị ebe e kwuru na “ọdọ ọkụ” ahụ hapụrụ ndị nọ na ya, otú ahụ Hedis (Shiol) na ọnwụ Adam kpatara ga-ahapụ ndị ha ji. (Mkpu. 20:13) Ma, a tụbara ndị aha ha na-adịghị “n’akwụkwọ nke ndụ,” ya bụ, ndị na-emegide ọchịchị Chineke na-ekweghị echegharị, n’ọdọ ọkụ ahụ, nke pụtara mbibi ebighị ebi, ma ọ bụ ọnwụ nke abụọ.—Mkpu. 20:15.