Ihe E Kwuru n’Akwụkwọ Ndị A Kpọrọ Aha n’Usoro Ihe Omume Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ
NỌVEMBA 4-10
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-1 862 ¶5
Mgbaghara
Ọ dịghị njọ ikpe ekpere ka Chineke gbaghara ndị ọzọ mmehie ha, ma nke ndị niile nọ n’ọgbakọ. Mozis kpekwara ekpere maka mba Izrel. O kwupụtara mmehie ha ma rịọ ka Chineke gbaghara ha, Jehova zakwara ekpere ya. (Ọnụ Ọgụ. 14:19, 20) Mgbe a na-enyefe Chineke ụlọ nsọ ahụ, Sọlọmọn rịọkwara Jehova ka ọ gbaghara ndị ya ma ha mehie ya ma hapụ ihe ọjọọ ha na-eme. (1 Eze 8:30, 33-40, 46-52) Ezra kwupụtakwaara Chineke mmehie nke ndị Juu si ná ndọrọ n’agha lọta n’ihu ọha. Ekpere o ji obi ya niile kpee mere ka ndị Juu mee ihe ga-eme ka Jehova gbaghara ha. (Ezra 9:13–10:4, 10-19, 44) Jems gbara onye mere mmehie ume ka ọ gwa ndị okenye ọgbakọ ka ha kpeere ya ekpere, “ọ bụrụkwa na o mewo mmehie, a ga-agbaghara ya.” (Jems 5:14-16) Ma, e nwere “mmehie nke na-eweta ọnwụ,” mmehie e mere megide mmụọ nsọ, ya bụ, mmadụ ịkpachara anya na-eme mmehie nke ga-eme ka a ghara ịgbaghara ya. Onye Kraịst ekwesịghị ikpere ụdị ndị a ekpere.—1 Jọn 5:16; Mat. 12:31; Hib. 10:26, 27.
NỌVEMBA 11-17
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-2 279
Oriri Ịhụnanya
Baịbụl akọwaghị ihe oriri ịhụnanya a bụ ma ọ bụkwanụ kwuo ugboro ole a na-eme ya. (Jud 12) Ọ bụghị Onyenwe anyị Jizọs Kraịst ma ọ bụkwanụ ndịozi ya kwuru ka a na-eme ya. O dokwara anya na ọ bụghị iwu na mmadụ ga-eme ya ma ọ bụkwanụ na ọ ga-adịgide. Ụfọdụ kwuru na ihe a bụ ememme Ndị Kraịst bara ọgaranya na-eme nke ha na-akpọ ndị Kraịst ibe ha dara ogbenye ka ha bịa. Ụmụ na-enweghị nna, ụmụ nwaanyị isi mkpe, ndị bara ọgaranya, na ndị na-enweghị otú ọ hà ha na-erikọ nri ọnụ ka ụmụnne n’ememme a.
it-2 816
Nkume
Okwu Grik ọzọ bụ́ spi·lasʹ, pụtara nkume zoro n’okpuru mmiri. Jud ji nkume a tụnyere ndị bu ihe ọjọọ n’obi bata n’ọgbakọ Ndị Kraịst. Otú ahụ nkume zoro n’ala mmiri nwere ike ịkpatara ụgbọ mmiri nsogbu ka ndị a gbebatara n’ọgbakọ nwekwara ike ịkpatara ndị nọ n’ọgbakọ nsogbu. Jud kwuru banyere ha, sị: “Ndị a bụ nkume ndị zoro n’ala ala mmiri n’oriri ịhụnanya unu mgbe ha so unu na-eri oriri.”—Jud 12.