Ihe E Kwuru n’Akwụkwọ Ndị A Kpọrọ Aha n’Usoro Ihe Omume Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ
JENỤWARỊ 6-12
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | JENESIS 1-2
“Jehova Ekee Ihe Ndị Dị Ndụ n’Ụwa”
it-1 527-528
Okike
Mgbe Chineke kwuru n’Ụbọchị nke Mbụ, sị: “Ka ìhè dị,” ìhè si na mbara ígwé nwuo n’agbanyeghị na e nweghị ike ịnọ n’ụwa hụ ihe ndị ahụ na-enye ìhè. Ọ ga-abụ na ihe a mere nwayọọ nwayọọ. Otu onye nsụgharị aha ya bụ J. W. Watts kwuru, sị: “Ìhè ji nwayọọ nwayọọ bịa dịrị.” (Jen. 1:3, A Distinctive Translation of Jenesis) Chineke kpara ókè n’etiti ìhè ahụ na ọchịchịrị ahụ, kpọọ ìhè ahụ Ehihie, kpọọkwa ọchịchịrị ahụ Abalị. Ihe a gosiri na ụwa nọ na-agba anyanwụ gburugburu, ya ana-eme ka akụkụ ya abụọ, ebe ọwụwa anyanwụ na ebe ọdịda anyanwụ, na-enwe oge ehihie na oge abalị.—Jen. 1:3, 4.
N’Ụbọchị nke Abụọ, Chineke mere ka e nwee mbara site n’ikewa “mmiri na mmiri.” Mgbe o kewara ya, o mere ka mmiri buru ibu gbagoo n’elu, ụfọdụ anọrọ n’ụwa, e nwezie mbara n’etiti ha abụọ. Chineke kpọrọ mbara ahụ Eluigwe. Ma, ọ bụghị eluigwe nke ebe Chineke bi, kama ọ bụ mbara ígwé a na-ahụ anya n’ihi na mmiri ahụ adịghị n’elu kpakpando ma ọ bụ n’elu ihe ndị ọzọ dị n’ime mbara ígwé.—Jen. 1:6-8.
N’Ụbọchị nke Atọ, Chineke ji ike o ji arụ ọrụ ebube mee ka mmiri ndị dị n’ụwa sọkọta ọnụ, ala nkịtị apụta. Ọ kpọrọ ala ahụ Elu Ala. Ọ bụkwa n’ụbọchị a ka Chineke mere ka ala nwee ike ịna-epupụta ahịhịa ndụ, ahịhịa ndị na-amị mkpụrụ nakwa osisi ndị na-amị mkpụrụ. Ihe ndị a esighị n’evolushọn ma ọ bụ nọkata dịwa. Chineke kere ihe ndị a ka ha nwee ike ịna-emepụtaghachi onwe ha, nke ọ bụla “n’ụdị” ya.—Jen. 1:9-13.
it-1 528 ¶5-8
Okike
Anyị kwesịkwara ịghọta na e deghị okwu Hibru bụ́ ba·raʼʹ nke pụtara “ike ihe” na Jenesis 1:16, kama e dere okwu Hibru bụ́ ʽa·sahʹ, nke pụtara “ime.” Ebe ọ bụ na anyanwụ, ọnwa na kpakpando so ‘n’eluigwe’ e kwuru okwu ya na Jenesis 1:1, ọ pụtara na e keela ha ogologo oge tupu Ụbọchị nke Anọ. N’ụbọchị nke anọ, e nwere ihe Chineke mere gbasara ihe ndị ahụ na-enye ìhè. Mgbe a sịrị, “Chineke wee debe ha na mbara eluigwe ka ha na-enye ìhè n’elu ụwa,” ihe ọ pụtara bụ na e nweziri ike ịnọ n’ụwa na-ahụ ihe ndị ahụ na-enye ìhè, ya eyie ka hà nọ na mbara ahụ. E mekwara ihe ndị ahụ na-enye ìhè ka ha bụrụ “ihe ịrịba ama na ihe e ji agụ oge na ụbọchị na afọ.” Ihe ndị a mechara na-eduzi ụmụ mmadụ n’ụzọ dị iche iche.—Jen. 1:14.
N’Ụbọchi nke Ise, Chineke kere ihe ndị mbụ a kpọrọ mkpụrụ obi dị ndụ, mana, ha abụghị mmadụ. Chineke ekeghị naanị otu ihe dị ndụ ka ọ ghọọ ụdị ihe ndị ọzọ dị ndụ, kama, o ji ike ya dị ebube kee ìgwè ihe ndị dị ndụ. Baịbụl kwuru, sị: “Chineke wee kee nnukwute anụ mmiri na mkpụrụ obi ọ bụla dị ndụ nke na-agagharị agagharị, bụ́ ndị mmiri nupụtara n’ụdị ha dị iche iche, nakwa anụ ufe ọ bụla nwere nku n’ụdị ya dị iche iche.” Obi tọrọ Chineke ụtọ maka ihe ndị o kere, ya agọzie ha ma sị ha ‘baa ụba.’ Ọ ga-ekwe omume ihe ndị a dị iche iche dị ndụ Chineke kere ịmụba n’ihi na o kere ha ka ha nwee ike ịmụta ụmụ, nke ọ bụla “n’ụdị” ya.—Jen. 1:20-23.
N’Ụbọchị nke Isii, ‘Chineke mere anụ ọhịa nke ụwa n’ụdị ya dị iche iche nakwa anụ ụlọ n’ụdị ya dị iche iche nakwa anụ ọ bụla ọzọ na-agagharị agagharị nke ala n’ụdị ya dị iche iche.’ Ihe ndị a dị mma ka ihe ndị ọzọ niile Chineke bu ụzọ kee.—Jen. 1:24, 25.
Ná ngwụcha nke ụbọchị nke isii ahụ Chineke ji kee ihe, o kere ihe pụrụ iche n’ihe ndị ọzọ o kere. Ihe ahụ o kere karịrị anụmanụ niile, ọ bụ eziokwu na ọ dị ala karịa ndị mmụọ ozi. Ihe ahụ Chineke kere bụ mmadụ. Chineke kere ya n’onyinyo ya nakwa n’oyiyi ya. Jenesis 1:27 kwuru ná nkenke banyere mmadụ, sị, “Nwoke na nwaanyị ka [Chineke] kere ha.” E kwuru ihe yiri ya na Jenesis 2:7-9. Ebe ahụ gosiri na Jehova bụ́ Chineke ji ájá dị n’ala kee mmadụ, kunye ya ume ndụ n’imi, ya aghọọ mkpụrụ obi dị ndụ. Chineke kwadebere ụwa nke bụ́ paradaịs ka mmadụ ahụ biri na ya, ihe oriri dị iche iche dịkwa na ya. Mgbe Jehova na-eke mmadụ, o ji ihe ndị dị n’ụwa kee ya. Mgbe o kechara mmadụ mbụ ahụ bụ́ Adam, o ji otu n’ime ọgịrịga ya kee nwaanyị. (Jen. 2:18-25) Mgbe Chineke kechara nwaanyị, mmadụ bịaziri zuo ezu ‘n’ụdị nke ya.’—Jen. 5:1, 2.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-2 52
Jizọs Kraịst
O soghị Chineke bụrụ Onye Okike. Na Jizọs so Nna ya kee ihe emeghị ka ọ bụrụ Onye Okike dị ka Nna ya. Ikike e ji kee ihe si n’ebe Chineke nọ. Ọ na-eji mmụọ nsọ ya ma ọ bụ ike ya nọ n’ọrụ enye ya. (Jen. 1:2; Ọma 33:6) Ebe ọ bụ Jehova bụ Isi Iyi nke ndụ, ọ bụ ya nyere ihe niile e kere eke ndụ, ma ndị nke a na-ahụ anya ma ndị nke a na-adịghị ahụ anya. (Ọma 36:9) Kama ịbụ Onye Okike, Ọkpara ahụ bụ onye ọrụ Jehova, bụ́ Onye Okike, ji kee ihe. Jizọs n’onwe ya kwudịrị na ọ bụ Chineke kere ihe niile, otú ahụ Akwụkwọ Nsọ n’ozuzu ya si kwuo.—Mat. 19:4-6.
JENỤWARỊ 13-19
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | JENESIS 3-5
“Ọtụtụ Nsogbu Ụgha Mbụ Ahụ Kpatara”
it-2 186
Ihe Mgbu Ịmụ Nwa
Ihe mgbu a na-enwe n’ịmụ nwa. Mgbe nwaanyị mbụ bụ́ Iv mehiechara, Chineke gwara ya otú ihe ahụ o mere ga-esi emetụta ọmụmụ nwa ya. Á sị na o rubere isi, Chineke gaara na-agọzi ya, ọ garaghị na-enwe ihe mgbu n’ịmụ nwa n’ihi na “ngọzi Jehova na-eme mmadụ ọgaranya, ọ dịghịkwa atụkwasị ihe mgbu na ya.” (Ilu 10:22) Ma ugbu a, mmadụ ga na-enwe ihe mgbu n’ịmụ nwa n’ihi na ahụ́ ya ezughịzi okè. N’ihi ya, Chineke kwuru, sị (otú a na-esikarị ekwu na Chineke kwere ka ihe mee bụ na ọ bụ ya mere ya): “M ga-eme ka ihe mgbu nke afọ ime gị mụbaa nke ukwuu; ime ga-eme gị mgbe ị ga-amụ ụmụ.”—Jen. 3:16.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-2 192 ¶5
Lemek
Abụ uri Lemek rọọrọ ndị nwunye ya (Jen. 4:23, 24) gosiri na a na-eme ihe ike n’oge ya. Ihe ọ gụrụ n’abụ uri ahụ sịrị: “Nụrụnụ olu m, unu ndị inyom Lemek; ṅaanụ ntị n’okwu m: egburu m otu nwoke n’ihi na o merụrụ m ahụ́, ee, nwa okorobịa n’ihi na o tiri m ihe. Ọ bụrụ na a ga-abọrọ Ken ọbọ okpukpu asaa, mgbe ahụ a ga-abọrọ Lemek ọbọ okpukpu iri asaa na asaa.” O yiri ka Lemek ò ji uri a na-egosi ihe mere mgbe ọ chọrọ ichebe onwe ya, ọ bụghị na ọ kpachaara anya gbuo mmadụ dị ka Ken. Lemek kwuru na ya gburu nwoke ahụ ka ya nọ na-achọ ichebe onwe ya mgbe nwoke ahụ na-eti ya ihe ma na-emerụ ya ahụ́. N’ihi ya, o ji uri a na-arịọ ka onye ọ bụla chọrọ ịbọrọ nwoke ahụ o gburu ọbọ ghara ime ya ihe ọ bụla n’ihi na aka ya dị ọcha.
it-1 338 ¶2
Nkwulu
“Aha Jehova” ndị mmadụ malitere ịkpọku n’oge Inọsh abụghị n’ụzọ ziri ezi n’ihi na ogologo oge tupu mgbe ahụ, o doro anya na Ebel na-akpọku aha Jehova mgbe ọ na-efe ya. (Jen. 4:26; Hib. 11:4) Ọ bụrụ na, dị ka ụfọdụ ndị ọkà mmụta Baịbụl si kwuo, na aha Jehova ha na-akpọ bụ n’ụzọ na-ezighị ezi na ịkpọ ndị mmadụ ma ọ bụ arụsị ha Jehova, ọ pụtara na ihe ha na-eme bụ ikwulu aha Jehova.
JENỤWARỊ 27–FEBỤWARỊ 2
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | JENESIS 9-11
“Ụwa Niile Wee Na-asụ Otu Asụsụ”
it-1 239
Babịlọn Ukwu Ahụ
Njirimara Babịlọn Oge Ochie. Mgbe Babịlọn oge ochie, nke dị na Ndagwurugwu Shaịna, malitere dịwa bụ mgbe ndị mmadụ gbara mbọ ka ha rụọ Ụlọ Elu Bebel. (Jen. 11:2-9) Ihe mere ha ji chọọ iwu ụlọ elu ahụ abụghị iji too aha Chineke, kama ha chọrọ iji ya ‘meere onwe ha aha na-ewu ewu.’ E nwere ike ịhụ ụlọ elu ndị yiri nke Bebel ahụ ná mkpọmkpọ ebe nke Babịlọn nakwa n’ebe ndị ọzọ na Mesopotemia. N’agbanyeghị otú ha si rụọ ụlọ elu ndị ahụ, ha na-egosi n’eziokwu na e nwere ihe jikọrọ ụlọ elu Bebel na okpukpe ụgha. Otú Jehova Chineke si mee ihe ngwa ngwa ime ka ha kwụsị iwu ụlọ ahụ gosiri n’eziokwu na o sitere n’okpukpe ụgha. Aha Hibru a gụrụ ụlọ ahụ bụ Bebel nke pụtara “Ọgba Aghara.” Ma, aha Sumeria ya (Ka-dingir-ra) na aha Akad ya (Bab-ilu) pụtachara “Ọnụ Ụzọ Ámá nke Chineke.” N’ihi ya, ndị fọrọ n’obodo ahụ n’oge ahụ gụgharịrị ya aha ka ọ ghara ịpụta ihe na-adịghị mma. Ma, aha ọ bụla ọ sọrọ ha gụọ ya, ọ ka na-eme ka a mata na o nwere ihe jikọrọ ya na okpukpe.
it-2 202 ¶2
Asụsụ
Akwụkwọ Jenesis kọrọ otú ụfọdụ ndị biri ndụ mgbe Iju Mmiri ahụ gachara si jikọọ aka rụọ ụlọ megidere uche Chineke, nke ọ gwara Noa na ụmụ ya. (Jen. 9:1) Kama ịgbasa ma “jupụta ụwa,” ha kpebiri na ha ga-eme ka mmadụ niile nọrọ otu ebe, biri n’ebe e mechara mara ka Ndagwurugwu Shaịna nke dị na Mesopotemia. O yiri ka ihe ha bu n’obi na-arụ ebe ahụ bụ ka ọ bụrụ ebe ụlọ okpukpe ha ga-adị.—Jen. 11:2-4.
it-2 202 ¶3
Asụsụ
Chineke Pụrụ Ime Ihe Niile mere ihe iji mee ka ọrụ ha ji mpako na-arụ ghasaa. Ọ ghagburu asụsụ ha nke mere ka ha gharazie ịdị n’otu. Ihe a mere ka ha ghara inwe ike ịhazi ọrụ ahụ, meekwa ka ha gbasaa n’ebe niile n’ụwa. Asụsụ ahụ a ghagburu ga-emekwa ka ọ ghara ịdịrị ha mfe ime ihe ọ bụla ha bu n’obi ime n’ọdịnihu nke megidere nzube Chineke. Ọ gaghịzi adịrị ụmụ mmadụ mfe ịgbakọ aka ọnụ chepụta ihe ha ga-eme ma jiri ike ha mee ya. Ọ ga-emekwa ka o siere ndị na-asụ asụsụ dị iche iche ike isi n’aka ibe ha mụta ihe ndị ha chọpụtara n’ọrụ ha na-arụ nakwa na nchọnchọ ndị ha na-eme. Ihe ndị a ha mụtara esighịkwanụ n’ebe Chineke nọ. (Tụlee Ekli. 7:29; Diut. 32:5) Ọ bụ eziokwu na asụsụ a a ghagburu so n’isi ihe kpatara nkewa, ma ọ baara ụmụ mmadụ uru n’ihi na o mere ka ha ghara imezu ihe ọjọọ ndị ha bu n’obi nke gaara etinye ha ná nsogbu. (Jen. 11:5-9; tụlee Aịza. 8:9, 10.) Ọ bụrụ na anyị echee banyere ihe dị iche iche ụmụ mmadụ merela taa n’ihi amamihe ha nwere nakwa n’ihi iji amamihe ha na-eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi, anyị ga-aghọta ihe Chineke hụrụ gaara eme ma á sị na o gbochighị ụmụ mmadụ ịrụ ụlọ elu Bebel.
it-2 472
Mba Dị Iche Iche
Ebe ọ bụ na ụmụ mmadụ anaghịzi asụ otu asụsụ, ndị na-asụ asụsụ nke ọ bụla na-ewepụta omenala, nkà, àgwà, na okpukpe nke ha. (Lev. 18:3) Ebe ọ bụ na ha kewapụrụ onwe ha n’ebe Chineke nọ, ha malitere ịkpụ ihe oyiyi nke chi ha dị iche iche.—Diut. 12:30; 2 Eze 17:29, 33.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-1 1023 ¶4
Ham
O nwere ike ịbụ na Kenan so hụ ọtọ nna nna ya, nna ya bụ́ Ham agharakwa ịbara ya mba. Ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na Noa si n’ike mmụọ nsọ buo amụma na ụmụ Kenan ga na-akpa àgwà ọjọọ nna nna ha bụ́ Ham, nke o nwere ike ịbụ na nwa Ham bụ́ Kenan na-akpa mgbe ahụ. Ọnụ a a bụrụ Kenan mezutụrụ mgbe ndị Izrel oge ochie meriri ndị Kenan. Ndị nke a na-ebibighị (dị ka ihe atụ, ndị Gibiọn [Jọsh. 9]) ghọọrọ ụmụ Izrel ohu. Mgbe ọtụtụ narị afọ gachara, ọnụ ahụ a bụrụ Kenan mezukwuru mgbe obodo ndị si n’agbụrụ Jefet, ya bụ, Midia na Peshia, Gris, na Rom mere ka ndị si n’ezinụlọ Kenan nọrọ n’okpuru ha.
it-2 503
Nimrọd
Ebe alaeze Nimrọd malitere gụnyere Bebel, Irek, Akad, na Kalne. Ha niile nọcha n’ala Shaịna. (Jen. 10:10) N’ihi ya, o yiri ka ọ̀ bụ ya kwuru ka a rụọ Bebel na ụlọ elu ya. Ihe a dabara n’ihe ndị Juu kweere. Josifọs dere, sị: “[Nimrọd] ji nke nta nke nta ghọọ onye ọchịchị aka ike nke na-achị n’oge ahụ, n’ihi na o kweere na ụzọ ọ ga-esi eme ka ndị mmadụ kwụsị ịtụ egwu Chineke bụ ịna-eme ka ha tụkwasị obi n’ọchịchị nke yanwa. O kwuru na ya agaghị agbachi Chineke nkịtị ma ọ chọọ iweta Iju Mmiri ọzọ, na ya ga-ewu ụlọ elu nke ga-adị elu karịa ebe mmiri Iju Mmiri ahụ ruru iji megwara ihe Chineke mere ndị nna nna ha. Ndị mmadụ ji obi ha kwadoo ihe a [Nimrọd] chọrọ ime, na-ewere ya na irubere Chineke isi bụ ịgba ohu; n’ihi ya, ha malitere iwu ụlọ elu ahụ . . . Ụlọ ahụ malitekwara ịdị elu karịa ka mmadụ nwere ike ịtụ anya ya.”—Jewish Antiquities, I, 114, 115 (iv, 2, 3).