Ihe E Kwuru n’Akwụkwọ Ndị A Kpọrọ Aha n’Usoro Ihe Omume Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ
FEBỤWARỊ 3-9
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | JENESIS 12-14
“Ọgbụgba Ndụ nke Gbasara Gị”
it-1 522 ¶4
Ọgbụgba Ndụ
Ọgbụgba Ndụ Chineke na Ebreham. Ọ ga-abụ na ọgbụgba ndụ ahụ Chineke na Ebreham gbara malitere ịdị irè mgbe Ebram (Ebreham) gafere Osimiri Yufretis mgbe ọ na-aga Kenan. Jehova na ụmụ Izrel gbara Ọgbụgba Ndụ Iwu ahụ mgbe narị afọ anọ na iri atọ gachara. (Gal. 3:17) Jehova agwabuola Ebreham okwu mgbe o bi na Mesopotemia, ya bụ Ọọ nke ndị Kaldia. Ọ gwara ya ka ọ gaa n’obodo ọ ga-egosi ya. (Ọrụ 7:2, 3; Jen. 11:31; 12:1-3) Ọpụpụ 12:40, 41 (LXX) gwara anyị na mgbe narị afọ anọ na iri atọ ụmụ Izrel biri n’ala Ijipt nakwa n’ala Kenan gachara, “n’ụbọchị a kpọmkwem” ka ụmụ Izrel si n’ala Ijipt pụọ. Ụbọchị Chineke napụtara ha n’ala Ijipt bụ n’abalị iri na anọ n’ọnwa Naịsan, n’afọ 1513 T.O.N.K., nke bụ́ ụbọchị e ji eme Ememme Ngabiga. (Ọpụ. 12:2, 6, 7) Ihe a na-egosi na o nwere ike ịbụ na Ebreham gafere Osimiri Yufretis mgbe ọ na-aga Kenan n’abalị iri na anọ n’ọnwa Naịsan afọ 1943 T.O.N.K. O yikwara ka ọ̀ bụ mgbe ahụ ka ọgbụgba ndụ Ebreham malitere ịdị irè. Chineke pụtakwara ìhè ọzọ n’ihu Ebreham mgbe o ruru n’ebe a na-akpọ Shikem nke dị n’obodo Kenan ma gwakwuo ya banyere nkwa ahụ. Ọ sịrị ya: “Ọ bụ mkpụrụ gị ka m ga-enye ala a.” Ihe a ọ gwara ya gosiri na o nwere ihe jikọrọ ọgbụgba ndụ a na nkwa ahụ o kwere n’Iden. O gosikwara na “mkpụrụ” ahụ ga-abụ mmadụ, ya bụ na ọ ga-esi n’agbụrụ ụmụ mmadụ. (Jen. 12:4-7) Jehova kwukwara ihe ndị ọzọ gbasara nkwa ahụ na Jenesis 13:14-17; 15:18; 17:2-8, 19; 22:15-18.
w89 7/1 3 ¶4
Ihe Mere I Ji Kwesị Ịmara Eziokwu Banyere Abraham
Nke ahụ bụ nkwa buru ibu nke ukwuu, Abraham nụkwara ka e kwuru ya ma ọ dịkarịa ala n’oge abụọ ọzọ dị iche iche. (Jenesis 18:18; 22:18) Iji wee mezuo ya, Chineke gaje ọbụna ịkpọlite site n’ọnwụ ndị nnọchianya nke ezinụlọ ndị nwụchapụworonụ. Ndụ ga-abụ ihe ngọzi n’ezie nye ndị dị otú a a kpọlitere n’ọnwụ ebe ọ bụ na ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime ha ga-alọghachi n’ọnọdụ elu ala nke yiri Paradaịs ahụ funahụrụ mmadụ na mbụ. Mgbe nke a gasịrị, a ga-ezi ha ụzọ ha ga-esi nweta ngọzi nke ndụ ebighị ebi.—Jenesis 2:8, 9, 15-17; 3:17-23.
it-2 213 ¶3
Iwu
N’ihi ihe ndị mere eme n’oge ochie, ụfọdụ ndị ọkà mmụta Baịbụl na-ekwu na ọ bụrụ na a chọrọ ire ala, a na-anọ n’ebe e nwere ike ịnọ hụ ala ahụ nke ọma gosi ya onye chọrọ ịzụ ya, gosikwa ya ebe ókè dị. Ọ bụrụ na onye ahụ chọrọ ịzụ ala ahụ asị, “Ahụla m ya,” o gosila n’ụzọ iwu kwadoro na o kwetala. Mgbe Jehova kwere Ebreham nkwa na ọ ga-enye ya ala Kenan, ọ gwara ya ka o leruo akụkụ ya anọ anya. Ebreham asịghị, “Ahụla m ya.” Ihe mere na o kwughị otú ahụ nwere ike ịbụ n’ihi na Chineke kwere nkwa na ọ ga-enye mkpụrụ Ebreham Ala Nkwa ahụ n’ọdịnihu. (Jen. 13:14, 15) A gwara Mozis, bụ́ onye na-anọchite anya ụmụ Izrel, ka “ọ hụ” ala ahụ. Ọ bụrụ na ihe ahụ ndị ọkà mmụta Baịbụl ụfọdụ kwuru bụ eziokwu, Mozis ịhụ ala ahụ ga-egosi na e nyefeela ya ụmụ Izrel n’ụzọ iwu kwadoro, Jọshụa eduruzie ha banye na ya. (Diut. 3:27, 28; 34:4; tụleekwa ihe Setan gwara Jizọs na Mat. 4:8.) Ụzọ ọzọ iwu kwadoro esikwa enyefe mmadụ ala bụ onye ahụ ịgagharị na ya ma ọ bụ ịbanye na ya ka ọ bụrụzie nke ya. (Jen. 13:17; 28:13) N’ihe ndekọ mgbe ochie ụfọdụ, a na-edepụta osisi ole dị n’ala nke ọ bụla a chọrọ ire.—Tụlee Jen. 23:17, 18.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-2 683 ¶1
Onye Nchụàjà
Melkizedek bụ́ eze Selem bụ onye nchụàjà (ko·henʹ) pụrụ iche. Baịbụl ekwughị ihe ọ bụla gbasara usoro ọmụmụ ya, ọmụmụ ya ma ọ bụ ọnwụ ya. Ọ bụghị onye nchụàjà n’ihi ezinụlọ o si, o nweghịkwa onye nchụàjà ọ nọchiri ma ọ bụkwanụ onye nọchiri ya. Melkizedek bụ eze, bụrụkwa onye nchụàjà. Ọbụbụ ọ bụ onye nchuàjà karịrị nke ndị Livaị n’ihi na e nwere ike ikwu na Livaị kwụrụ Melkizedek otu ụzọ n’ụzọ iri. Ihe mere o ji dị otú a bụ n’ihi na Livaị ka nọ n’úkwù Ebreham mgbe Ebreham kwụrụ Melkizedek otu ụzọ n’ụzọ iri, Melkizedek agọziekwa ya. (Jen. 14:18-20; Heb 7:4-10) Melkizedek nọchiri anya Jizọs Kraịst bụ́ “onye nchụàjà dị ka Melkizedek ruo mgbe ebighị ebi.”—Hib. 7:17.
FEBỤWARỊ 10-16
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | JENESIS 15-17
“Gịnị Mere Jehova Ji Gụgharịa Ebram na Seraị Aha?”
it-1 817
Ntụpọ, Ịchọpụta Ntụpọ
Ma, otú ụmụ mmadụ si ebi ndụ na ihe ndị ha na-emepụta na-enwekarị ntụpọ. Mmadụ niile ketara mmehie na ezughị okè n’aka Adam. (Rom 5:12; Ọma 51:5) Ma, Jehova enweghị ntụpọ ọ bụla. Ọ “maara nnọọ otú e si kpụọ anyị, ọ na-echeta na anyị bụ ájá,” na-emekwara anyị ebere. (Ọma 103:13, 14) O lere Noa anya ka “onye na-enweghị ntụpọ n’etiti ndị ya na ha dịkọrọ ndụ” n’ihi otú o si rubere ya isi. (Jen. 6:9) Ọ gwara Ebreham, sị: “Jee ije n’ihu m, bụrụkwa onye na-enweghị ntụpọ.” (Jen. 17:1) N’agbanyeghị na mmadụ abụọ a ezughị okè nakwa na ha mechara nwụọ, Jehova, onye “na-ahụ ihe dị n’obi,” lere ha anya ka ndị na-enweghị ntụpọ. (1 Sam. 16:7; tụlee 2 Eze 20:3; 2 Ihe 16:9) Ọ gwara ụmụ Izrel, sị: “Ị gaghị enwe ntụpọ n’ebe Jehova bụ́ Chineke gị nọ.” (Diut. 18:13; 2 Sam. 22:24) O nyere anyị Ọkpara ya na-enweghị ntụpọ (Hib. 7:26) ka o jiri ndụ ya chụọ àjà iji gbapụta anyị. N’ihi àjà a, Jehova nwere ike ịkpọ ndị nwere okwukwe n’ebe ọ nọ ma na-erubere ya isi ndị “ezi omume” ma ọ bụ ndị na-enweghị ntụpọ, ka bụrụkwa onye ezi omume na onyeikpe na-enweghị ntụpọ.—Rom 3:25, 26.
it-1 31 ¶1
Ebreham
Oge ụfọdụ agaala. Ha ebiela ugbu a na Kenan ruo ihe dị ka afọ iri, ma Sera ka bụ nwaanyị aga. N’ihi ya, ọ gwara di ya ka ọ kpọrọ Hega bụ́ nwaanyị Ijipt na-ejere ya ozi ka o nwee ike isi n’aka ya mụta nwa. Ebreham kwetara. N’ihi ya, n’afọ 1932 T.O.N.K., mgbe Ebreham dị iri afọ asatọ na isii, a mụụrụ ya Ishmel. (Jen. 16:3, 15, 16) Mgbe ọtụtụ afọ gafechara, n’afọ 1919 T.O.N.K., mgbe Ebreham dị afọ iri itoolu na itoolu, Jehova gwara ya ka o bie ụmụ nwoke niile nọ n’ụlọ ya úgwù ka ọ bụrụ ihe àmà nke ọgbụgba ndụ ahụ ya na ya gbara. N’oge ahụkwa, Jehova gbanwere aha Ebram ka ọ bụrụ Ebreham. Ọ gwara ya sị: “N’ihi na m ga-eme ka ị ghọọ nna nke ìgwè mba dị iche iche.” (Jen. 17:5, 9-27; Rom 4:11) Mgbe nke ahụ gachara, ndị mmụọ ozi atọ ndị bịara n’ụdị mmadụ bịakwutere Ebreham, Ebreham anabatakwa ha n’aha Jehova. Ha kwuru na Sera ga-atụrụ ime mụọ nwa nwoke n’ime afọ na-abịa abịa.—Jen. 18:1-15.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-1 460-461
Ọgụgụ Oge
Jehova gwara Ebram (Ebreham), sị: “Ka o doo gị anya na mkpụrụ gị ga-abụ ndị mbịarambịa n’ala na-abụghị nke ha, ha ga-agbakwara ha ohu, ndị a ga-emekpakwa ha ahụ́ ruo narị afọ anọ.” (Jen. 15:13; gụọkwa Ọrụ 7:6, 7.) Chineke gwara ya ihe a tupu a mụọ Aịzik bụ́ onye nketa ma ọ bụ “mkpụrụ” e kwere ya ná nkwa. N’afọ 1932 T.O.N.K., ohu Ebram bụ́ Hega onye Ijipt mụụrụ ya Ishmel; n’afọ 1918 T.O.N.K., a mụzie Aịzik. (Jen. 16:16; 21:5) E si n’ụbọchị ahụ ndị Izrel pụrụ n’Ijipt, bụ́ mgbe oge ‘mmekpa ahụ́’ ahụ gwụrụ, gụọ narị afọ anọ laa azụ, (Jen. 15:14), ọ ga-eduru anyị rute n’afọ 1913 T.O.N.K. N’afọ ahụ, Aịzik dị ihe dị ka afọ ise. Ọ ga-abụ na a napụla Aịzik ara mgbe ahụ, ọ bụrụkwala onye “mbịarambịa” n’ala na-abụghị nke ya. N’oge ahụ, Ishmel nọ na-eme ya “akaje,” si otú ahụ na-emekpa ya ahụ́. Ishmel dị ihe dị ka afọ iri na itoolu mgbe ahụ. Ọ bụ mgbe ahụ ka mmekpa ahụ́ ahụ e kwuru okwu ya malitere. (Jen. 21:8, 9) Ọ bụ eziokwu na taa, e nwere ike ile akaje ahụ Ishmel mere onye nketa Ebreham anya ka ihe na-enweghị ihe o mere, ma ọ bụghị otú ahụ ka ọ dị n’oge ochie. Ihe gosiri na ọ dịghị otú ahụ bụ ihe Sera mere nakwa otú Jehova si kwadoo mbọ ọ gbara ka a chụpụ Hega na nwa ya Ishmel. (Jen. 21:10-13) Otú e si dekọọ ihe a niile n’Akwụkwọ Nsọ gosiri na ọ bụ mgbe ahụ n’eziokwu ka narị afọ anọ nke mmekpa ahụ́ ahụ malitere. Oge mmekpa ahụ́ ahụ agaghịkwa agwụ ruo mgbe ụmụ Izrel si n’Ijipt pụọ.—Gal. 4:29.
it-1 778 ¶4
Ọpụpụ
“N’ọgbọ nke anọ.” Anyị kwesịrị icheta na Jehova gwara Ebreham na ụmụ ya ga-alọghachi n’ala Kenan n’ọgbọ nke anọ. (Jen. 15:16) N’ime narị afọ anọ na iri atọ, malite mgbe ọgbụgba ndụ Ebreham malitere ịdị irè ruo mgbe ụmụ Izrel pụrụ n’Ijipt, e nwere ihe karịrị ọgbọ anọ n’agbanyeghị na ndị oge ahụ na-adịte ndụ aka. Ma, ọ bụ naanị narị afọ abụọ na iri na ise ka ndị Izrel biri n’Ijipt. Ọ bụ ‘n’ọgbọ nke anọ’ malite n’oge ahụ ha banyere n’Ijipt ka ha ga-enwere onwe ha. E nwere ike iji ndị biri ndụ n’otu ebo dị n’Izrel mata ọgbọ nke anọ a. Ka anyị jiri ebo Livaị mata ya: (1) Livaị, (2) Kohat, (3) Amram, na (4) Mozis.—Ọpụ. 6:16, 18, 20.
FEBỤWARỊ 17-23
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | JENESIS 18-19
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
w88 5/15 23 ¶4-5
Ọ̀ Dịtụwo Onye Hụrụ Chineke Anya?
Ugbu a, anyị nwere ike ịghọta ihe mere Ebreham ji na-agwa ndị mmụọ ozi ahụ bịara n’ụdị mmadụ okwu ka ọ̀ na-agwa Jehova Chineke n’onwe ya. Ebe ọ bụ na mmụọ ozi ahụ gwara Ebreham kpọmkwem ihe Chineke chọrọ ịgwa ya, nọrọkwa ebe ahụ dị ka onye nnọchiteanya Chineke, Baịbụl kwuru na “Jehova pụtara ìhè n’ihu ya.”—Jenesis 18:1.
Chetakwa na mmụọ ozi ahụ nwere ike ịgwa mmadụ kpọmkwem ihe Chineke gwara ya otú ahụ telefon ma ọ bụ redio nwere ike ime ka mmadụ nụ kpọmkwem ihe anyị na-agwa ya. N’ihi ya, anyị nwere ike ịghọta otú Ebreham, Mozis na Manoa si gwa ndị mmụọ ozi bịara n’ụdị mmadụ okwu ka hà na-agwa Chineke n’onwe ya. Ha hụrụ ndị mmụọ ozi ahụ anya, hụkwa ebube Jehova nke dị n’ahụ ha, ma ha ahụghị Chineke. N’ihi ya, ihe a emegideghị ihe Jọn onyeozi kwuru mgbe ọ sịrị: “Ọ dịghị mmadụ hụtụrụla Chineke mgbe ọ bụla.” (Jọn 1:18) Ihe ndị a hụrụ bụ ndị mmụọ ozi na-anọchite anya Chineke, ọ bụghị Chineke n’onwe ya.
FEBỤWARỊ 24–MACH 1
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | JENESIS 20-21
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
w89 7/1 20 ¶9
Abraham—Ihe Nlereanya Nye Ndị Nile Na-achọ Ịbụ Enyi Chineke
9 Abram zaghachiri site n’ime ihe ọzọ dabeere n’okwukwe. Dị ka ihe ndekọ ahụ na-akọ: ‘O wee wuoro Jehova ebe ịchụ àjà n’ebe ahụ.’ (Jenesis 12:7) O yiri ka nke a ọ gụnyere iji otu anụmanụ chụọ àjà, n’ihi na okwu Hibru maka “ebe ịchụ àjà” pụtara “ebe a na-anọ achụ àjà.” Mgbe e mesịrị, Abram meghachiri ihe ndị a dabeere n’okwukwe n’akụkụ ndị ọzọ nke ala ahụ. Tụkwasịkwa na nke ahụ, ‘ọ kpọkuru aha Jehova.’ (Jenesis 12:8; 13:18; 21:33) Okwu Hibru ahụ bụ ‘kpọkuo aha ahụ’ pụtakwara “kpọsaa (kwusaa) aha ahụ.” Ọ ghaghị ịbụ na ezinụlọ Abram nakwa ndị Kenean ahụ nụrụ ka o ji nkwuwa okwu na-akpọsa aha nke Chineke ya, bụ́ Jehova. (Jenesis 14:22-24) Otú ahụkwa, ndị nile na-achọ ịbụ enyị Chineke taa aghaghị ịkpọku aha ya n’okwukwe. Nke a ga-agụnye ikere òkè n’ọrụ nkwusa ihu ọha, “na-achụ àjà, bụ́ otuto, nye Chineke mgbe niile, nke ahụ bụ, mkpụrụ egbugbere ọnụ nke na-ekwupụta nye aha ya.”—Ndị Hibru 13:15; Ndị Rom 10:10.