Ihe E Kwuru n’Akwụkwọ Ndị A Kpọrọ Aha n’Usoro Ihe Omume Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ
MACH 2-8
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-1 853 ¶5-6
Ịmara Ihe Ga-eme n’Ọdịnihu, Ikwu Ihe Ga-eme n’Ọdịnihu
Ọ na-ahọrọ ihe ọ chọrọ ịma. Ihe a abụghị ịka ihe niile ga-eme n’ọdịnihu aka. Ihe ọ bụla Chineke na-eme banyere ịma ihe ga-eme n’ọdịnihu agaghị abụ ihe ga-emegide ikpe ziri ezi ya na ụdị onye Okwu ya gwara anyị na ọ bụ. Kama ịka ihe niile ga-eme n’ọdịnihu aka, ụfọdụ ihe e dere na Baịbụl gosiri na e nwere mgbe Chineke na-eleru ihe ndị na-emenụ anya ma jiri ihe ndị ọ chọpụtara mee mkpebi.
Na Jenesis 11:5-8, e kwuru na Chineke chere ihu ya n’ụwa, leba anya n’ihe na-eme na Bebel ma kpebie ihe ọ ga-eme iji kwụsị ọrụ megidere nzube ya a na-arụ n’ebe ahụ. Mgbe ihe ọjọọ jupụtara na Sọdọm na Gọmọra, Jehova gwara Ebreham na ya chọrọ ime nchọpụta (site n’aka ndị mmụọ ozi ya) ka ọ ‘hụ ma hà na-eme nnọọ dị ka mkpu ákwá a na-eti maka ya si dị, bụ́ nke ruworo ya ntị, ọ bụrụkwa na ọ dịghị otú ahụ, ọ ga-ama.’ (Jen. 18:20-22; 19:1) Chineke sịri na ya ‘amarawo Ebreham.’ Mgbe Ebreham chọkwara iji Aịzik chụọ àjà, Jehova sịrị, “N’ihi na ugbu a ka m matara na ị na-atụ egwu Chineke n’ihi na ị jụghị inye m nwa gị nke ị mụrụ naanị ya.”—Jen. 18:19; 22:11, 12; tụlee Nehe. 9:7, 8; Gal. 4:9.
MACH 16-22
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | JENESIS 25-26
“Isọ Rere Ọnọdụ Ya Dị Ka Diọkpara”
it-1 1242
Jekọb
Isọ bụ nwa nna ya ka hụ n’anya. Ọ gbasiri ike. Ọ na-anọkwa n’ọhịa ọtụtụ mgbe na-achụ nta. Ma, e kwuru na Jekọb bụ “nwoke na-enweghị ihe a ga-eji taa ya ụta [na Hibru, tam], onye bi n’ụlọikwuu.” Ọ bụkwa onye ọzụzụ atụrụ dị nwayọọ, onye na-elekọtakwa ihe ndị dị n’ụlọ nke ọma. Mama ya hụrụ ya n’anya nke ukwuu. (Jen. 25:27, 28) E nwere ebe ọzọ e ji okwu Hibru ahụ bụ́ tam kọwaa ndị ha na Chineke dị ná mma. Dị ka ihe atụ, “ndị ịwụfu ọbara na-agụ agụụ kpọrọ onye ọ bụla nke na-enweghị ihe a ga-eji taa ya ụta asị.” Ma Jehova kwuru na “[onye na-enweghị ihe a ga-eji taa ya ụta] ga-enwe udo n’ọdịnihu.” (Ilu 29:10; Ọma 37:37) Nwoke ahụ kwesịrị ntụkwasị obi aha ya bụ Job bụ onye “na-enweghị ihe a ga-eji taa ya ụta, bụrụkwa onye ezi omume.”—Job 1:1, 8; 2:3.
it-1 835
Nwa Mbụ, Mkpụrụ Mbụ
Kemgbe oge ochie, nwa nwoke mbụ a mụrụ n’ezinụlọ nwere ihe ùgwù pụrụ iche, ọ bụkwa ya na-anọchi onyeisi ezinụlọ. Ọ na-eketa okpukpu abụọ n’ihe nna ya nwere. (Diut. 21:17) Ruben nọ ọdụ n’akụkụ Josef mgbe ya na ụmụnne ya na-eri nri n’ihi na ọ bụ ya bụ ọkpara. (Jen. 43:33) Ma, ọ bụghị mgbe niile ka Baịbụl na-ebu ụzọ akpọ aha ọkpara tupu ya akpọọ aha ụmụ nwoke ndị ọzọ. Onye ọ na-ebukarị ụzọ akpọ aha ya bụ onye nke a kacha mara amara ma ọ bụ onye nke kwesịrị ntụkwasị obi.—Jen. 6:10; 1 Ihe 1:28; tụlee Jen. 11:26, 32; 12:4.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-2-245 ¶6
Ụgha
Nke bụ́ eziokwu bụ na Baịbụl katọrọ mmadụ ịkpachara anya jiri aghụghọ ghaa ụgha iji duhie ndị ọzọ, ma nke ahụ apụtaghị na iwu ji mmadụ ịgwa ndị ọzọ eziokwu ma ọ bụrụ na ha ekwesịghị ịma banyere ya. Jizọs gwara anyị, sị: “Unu enyela nkịta ihe dị nsọ, unu atụpụkwarala ézì nkume pel unu, ka ha wee ghara ịzọ ha ụkwụ ma tụgharịa dọrie unu.” (Mat. 7:6) Ọ bụ ya mere mgbe ụfọdụ, Jizọs anaghị agwa ndị mmadụ ihe niile ma ọ bụkwanụ zaa ha kpọmkwem ihe ha jụrụ ya n’ihi na ime otú ahụ nwere ike ịkpata nsogbu na-enweghị isi. (Mat. 15:1-6; 21:23-27; Jọn 7:3-10) O doro anya na ọ bụ otú a ka e kwesịrị isi ewere ihe Ebreham, Aịzik, Rehab, na Ịlaịsha mere mgbe ha gwara ndị na-anaghị efe Jehova ihe ndị na-abụghị eziokwu ma ọ bụ mgbe ha na-agwaghị ha ihe niile.—Jen. 12:10-19; Jọsh. 2:1-6; Jems 2:25; 2 Eze 6:11-23.
MACH 23-29
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | JENESIS 27-28
“Jekọb Nwetara Ngọzi Ruuru Ya”
it-1 341 ¶6
Ngọzi
N’oge ochie, nna na-agọzikarị ụmụ ya ndị nwoke obere oge tupu ya anwụọ. Ihe a dị ezigbo mkpa, a naghịkwa eji ya egwu egwu. Ọ bụ ya mere Aịzik ji gọzie Jekọb n’ihi na o chere na ọ bụ Isọ. Aịzik kwuru na ihe ga-agaziri Jekọb karịa Isọ nwanne ya. Ebe ọ bụ na Aịzik akaala nká, kpuokwa ìsì, o doro anya na ọ rịọrọ Jehova ka o mee ka ngọzi ahụ ọ gọziri Jekọb mezuo. (Jen. 27:1-4, 23-29; 28:1, 6; Hib. 11:20; 12:16, 17) Mgbe e mechara, Aịzik ghọtara na ọ bụ Jekọb ka ọ gọziri, ya agọzikwuo ya. (Jen. 28:1-4) Tupu ya anwụọ, o bu ụzọ gọzie ụmụ Josef abụọ tupu ya agọziwe ụmụ nke ya. (Jen. 48:9, 20; 49:1-28; Hib. 11:21) Mozis gọzikwara ụmụ Izrel niile tupu ya anwụọ. (Diut. 33:1) Ihe mechara mee gosiri na ngọzi ndị a bụ amụma. Mgbe ụfọdụ, onye na-agọzi mmadụ na-ebikwasị ya aka n’isi ma ọ gọziwe ya.—Jen. 48:13, 14.
MACH 30–EPREL 5
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | JENESIS 29-30
“Jekọb Alụọ Nwaanyị”
it-2-341 ¶3
Alụmdi na Nwunye
Ememme. Ọ bụ eziokwu na o nweghị ememme a kapịrị ọnụ a na-eme ma e mewe agbamakwụkwọ n’oge ụmụ Izrel, ma oge ahụ na-abụ oge obi ụtọ. N’ụbọchị agbamakwụkwọ, nwaanyị a na-aga ịlụ na-eme ezigbo nkwadebe n’ụlọ ha. Ọ na-ebu ụzọ saa ahụ́ ma tee mmanụ. (Tụlee Rut 3:3; Ezik. 23:40.) Mgbe ụfọdụ, ndị enyi ya na-enyere ya ikebichi ihe ha na-ekebichi n’ara na iyiri uwe mwụda ọcha. A na-achọ ihe ndị ahụ mma dabere n’otú ego onye ahụ nwere hà. (Jere. 2:32; Mkpu. 19:7, 8; Ọma 45:13, 14) Ọ bụrụ na o nwere ego, ọ na-eji ọla dị iche iche chọọ onwe ya mma (Aịza. 49:18; 61:10; Mkpu. 21:2), ọ na-ejikwa ákwà dị fere fere kpuchie onwe ya si n’isi ruo n’ụkwụ. (Aịza. 3:19, 23) Ọ bụ ya mere o ji dịrị Leban mfe ịghọgbu Jekọb nke na Jekọb amaghị na ọ bụ Lia ka ọ kpọnyere ya n’ọnọdụ Rechel. (Jen. 29:23, 25) Ribeka jikwa ákwà kpuchie ihu ya mgbe ọ na-abịa izute Aịzik. (Jen. 24:65) Ihe a na-egosi na nwaanyị ahụ nọ n’okpuru di ya, nke bụ́ onyeisi ya.—1 Kọr. 11:5, 10.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-1 50
Ikuchi mmadụ
Rechel na Lia weere ụmụ ndị ohu ha nwaanyị mụtaara Jekọb ka ụmụ nke ha, ụmụ ‘a mụrụ n’ikpere ha.’ (Jen. 30:3-8, 12, 13, 24) E kenyere ụmụ ha ndị a okè otú ahụ e kenyekwara ụmụ ndị nke ha mụrụ n’onwe ha. Ha bụ ụmụ nna ha. Ebe ọ bụkwa na ọ bụ Rechel na Lia nwe ndị odibo ahụ, ọ bụ ha nwe ụmụ ha mụtara.