Ihe E Kwuru n’Akwụkwọ Ndị A Kpọrọ Aha n’Usoro Ihe Omume Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ
EPREL 13-19
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | JENESIS 31
“Jekọb na Leban Agbaa Ọgbụgba Ndụ Udo”
it-1 883 ¶1
Galied
Mgbe Jekọb na Leban dozichara ihe na-esere ha, ha abụọ gbara ndụ. N’ihi ya, Jekọb wetara nkume, guzobe ya ka ọ bụrụ ogidi ma gwa “ụmụnne” ya ka ha tụkọta nkume n’ebe ahụ. O nwere ike ịbụ na ha tụkọtara ya ka o yie tebụl ka ha nọrọ na ya rie nri ọgbụgba ndụ ahụ. Leban kpọrọ ikpo nkume ahụ “Jiga-sahaduta,” nke bụ́ aha si n’asụsụ Sirian Arameik. Mana, Jekọb kpọrọ ya “Galied,” nke pụtara otu ihe ahụ n’asụsụ Hibru. Leban kwuru, sị: “Ikpo nkume a [ya bụ, gal n’asụsụ Hibru] bụ ihe àmà [ya bụ, ʽedh n’asụsụ Hibru] n’etiti mụ na gị taa.” (Jen. 31:44-48) Ikpo nkume ahụ (na nkume ahụ e guzobere dị ka ogidi) bụụrụ ndị niile na-agafe ebe ahụ ihe àmà. Dị ka e kwuru n’amaokwu nke 49, ọ ghọrọ “Ụlọ Nche [ya bụ, mits·pahʹ n’asụsụ Hibru]” nke na-egosi na Jekọb na Leban ekwekọrịtala na ha ga-eme ka udo dịrị n’etiti ezinụlọ ha abụọ, nakwa na ha ga-eme ka udo dịrị n’ime ezinụlọ ha. (Jen. 31:50-53) E nwekwara oge ndị ọzọ e ji nkume mere ihe àmà otú ahụ Jekọb na Leban mere.—Jọsh. 4:4-7; 24:25-27.
it-2 1172
Ụlọ Nche
Jekọb kpọrọ ikpo nkume ahụ o guzobere “Galied” (nke pụtara “Ikpo Ihe Àmà”), a kpọkwara ya “Ụlọ Nche.” Leban gwara Jekọb, sị: “Ka Jehova bụrụ onye nche n’etiti mụ na gị mgbe anyị nọ n’ebe anyị na-adịghị ahụ ibe anyị.” (Jen. 31:45-49) Ikpo nkume a ga-abụ ihe àmà na-egosi na Jehova na-ele Jekọb na Leban ka ọ mara ma hà na-edebekwa ọgbụgba ndụ udo ha gbara.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-2 1087-1088
Terafim
Ihe ndị mgbe ochie e gwupụtara na Mesopotemia na n’ebe ndị dị ya nso gosiri na ọ na-abụkarị onye ji terafim ezinụlọ na-eketa ihe ezinụlọ ahụ nwere. Otu ihe e dere n’ụrọ nke a hụrụ na Nuzi kwuru na n’ọnọdụ ụfọdụ, ọ bụrụ na nwoke ji arụsị ndị ezinụlọ nwunye ya, o nwere ike ịbịa n’ụlọ ikpe kwuo ka e nye ya ihe ndị ọgọ ya nwoke nwụrụ anwụ nwere. (Ancient Near Eastern Texts, nke J. Pritchard dezigharịrị n’afọ 1974, peeji nke 219, 220, na ihe e dere n’ala ala peeji nke 51) Ọ ga-abụ ihe a ka Rechel bu n’obi chee na o ziri ezi izuru terafim nna ya ebe ọ bụ na nna ya ghọrọ Jekọb di ya aghụghọ. (Tụlee Jen. 31:14-16.) Ọ ga-abụ otú a terafim si dị mkpa ma a bịa n’ihe gbasara inweta ihe nketa mere Leban ji foro ntụtụ taa na ya ga-enwetaghachirịrị terafim ahụ. Ihe a medịrị ka ọ kpọrọ umunne ya chụrụ Jekọb gawa ruo abalị asaa. (Jen. 31:19-30) Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na Jekọb amaghị na Rechel weere terafim ahụ (Jen. 31:32), o nwekwanụghị ihe gosiri na Jekọb chọrọ iji terafim ahụ nweta ihe nketa nna nwunye ya. O nweghị ihe Jekọb ji arụsị eme. Ihe ọzọ bụ na ọ ga-abụ na terafim ahụ so na chi ndị mba ọzọ ahụ ndị ezinụlọ Jekọb wekọtara nke o liri n’okpuru nnukwu osisi dị nso na Shikem.—Jen. 35:1-4.
EPREL 20-26
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | JENESIS 32-33
“Ị̀ Na-agba Mgba Iji Nweta Ngọzi?”
it-2 190
Inwe Nkwarụ
Nkwarụ Jekọb. Mgbe Jekọb dị ihe dị ka afọ iri itoolu na asaa, ya na otu mmụọ ozi Chineke gbara mgba abalị niile. O jichiri mmụọ ozi ahụ ruo mgbe mmụọ ozi ahụ gọziri ya. Ka ya na mmụọ ozi ahụ nọ na-agba mgba, mmụọ ozi ahụ kpatụrụ ya aka n’isi ọkpụ, isi ọkpụ ya echipụ. Ihe a mere ka Jekọb na-agazi nsụkwarachị. (Jen. 32:24-32; Hos. 12:2-4) Ka e mechara, e mere ka Jekọb mata na ọ bụ eziokwu na ya ‘na Chineke [ya bụ, mmụọ ozi Chineke] na mmadụ agbawo mgba, o wee merie n’ikpeazụ,’ ma ọ pụtaghị na o meriri mmụọ ozi ahụ dị ike. Ọ bụ n’ihi na Chineke hapụrụ ya mere o ji nwee ike iso mmụọ ozi ahụ gbaa mgba. O ji ya gosi na Jekọb chọsiri ike ka Chineke gọzie ya.
it-1 1228
Izrel
1. Izrel bụ aha Chineke gụrụ Jekọb mgbe ọ dị ihe dị ka afọ iri itoolu na asaa. Ọ bụ n’abalị, mgbe Jekọb gafere ndagwurugwu Jabọk mgbe ọ na-aga izute nwanne ya nwoke Isọ, ka ya na mmụọ ozi gbara mgba. Chineke gbanwere aha Jekọb ka ọ bụrụ Izrel iji gosi na ọ gọziela ya n’ihi na ọ nọgidesiri ike na-achọ ka a gọzie ya. Iji na-echeta ihe a, Jekọb kpọrọ ebe ahụ Penayel. (Jen. 32:22-31) Mgbe e mechara, na Betel, Chineke mere ka o doo anya na aha Jekọb ga-abụzi Izrel. Malite mgbe ahụ ruo mgbe Jekọb nwụrụ, ọ bụzi Izrel ka e ji mara ya. (Jen. 35:10, 15; 50:2; 1 Ihe 1:34) Mana, n’ihe karịrị ugboro puku abụọ na narị ise e dere aha a bụ́ Izrel na Baịbụl, ọ bụ ụmụ Jekọb ka a na-ekwu.—Ọpụ. 5:1, 2.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-1 980
Chineke bụ́ Chineke Izrel
N’ihi mgba a Jekọb na mmụọ ozi Jehova gbara na Penayel, a gụgharịrị Jekọb aha, ya azawazie Izrel. Mgbe o zutere Isọ nwanne ya, ya na ya emee udo, o biweziri na Sọkọt, mechaakwa gaa biri na Shikem. N’ebe ahụ, ọ zụtara ala n’aka ụmụ Hemọ ma birizie ebe ahụ. (Jen. 32:24-30; 33:1-4, 17-19) “E mesịa, o wuru ebe ịchụàjà n’ebe ahụ wee kpọọ ya Chineke bụ́ Chineke Izrel,” ma ọ bụ “Chineke bụ Chineke Izrel.” (Jen. 33:20) Ntinye a Jekọb tinyere aha ọhụrụ ya n’aha a ọ gụrụ ebe ịchụàjà a gosiri na ọ nabatara aha ahụ a gụrụ ya, nakwa na obi dị ya ụtọ maka ya. O gosikwara na obi dị ya ụtọ maka otú Chineke si duru ya n’udo dubaghachi ya n’Ala Nkwa ahụ. Ọ bụ naanị otu ebe ka aha a bụ́ “Chineke bụ́ Chineke Izrel” gbara na Baịbụl.
EPREL 27–MEE 3
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-1 600 ¶4
Debora
1. Debora bụ nwaanyị nyere Ribeka ara. Mgbe Ribeka hapụrụ ụlọ nna ya Betuel gaa Palestaịn, ya na Aịzik alụọ, Debora so ya gaa. (Jen. 24:59) Mgbe Debora jechara ozi n’ụlọ Aịzik ruo ọtụtụ afọ, ọ gara soro ezinụlọ Jekọb biri. Ọ ga-abụ na Ribeka anwụọla mgbe ahụ. Ihe dị ka otu narị afọ na iri afọ abụọ na ise Aịzik na Ribeka lụchara, Debọra nwụrụ, e liekwa ya n’okpuru otu osisi buru ibu na Betel. Aha a kpọrọ osisi ahụ (Alọn-bakọt, nke pụtara “Oké Osisi nke Ibe Ákwá”) na-egosi otú Jekọb na ndị ezinụlọ ya hụruru Debora n’anya.—Jen. 35:8.