Ihe E Kwuru n’Akwụkwọ Ndị A Kpọrọ Aha n’Usoro Ihe Omume Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ
MEE 4-10
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | JENESIS 36-37
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-1 678
Idọm
(Idọm) [Ọbara ọbara], Ndị Idọm
Idọm bụ aha ọzọ a kpọrọ ejima Jekọb bụ́ Isọ. (Jen. 36:1) A kpọrọ ya aha a n’ihi na o ji maka ofe na-acha ọbara ọbara ree ọnọdụ ya dị ka diọkpara. (Jen. 25:30-34) Mgbe a mụrụ Isọ, ọ dabakwara na ahụ́ ya na-acha ọbara ọbara (Jen. 25:25), ájá na nkume ndị dị n’ebe ya na ndị si n’agbụrụ ya mechara gaa biri na-achakwa ọbara ọbara.
it-1 561-562
Nlekọta
Ọ bụrụ na onye na-azụ anụmanụ ekweta na ọ ga-elekọta ma ọ bụ na-eche ìgwè anụmanụ nche, ọ na-egosi n’ụzọ iwu kwadoro na ya kwetara na anụmanụ ndị ahụ dịzi ya n’aka. Ihe ọ pụtara bụ na ọ na-agwa onye nwe anụmanụ ndị ahụ na ya ga na-enyeju ha afọ, nakwa na ya agaghị ekwe ka e zuru ha. O nwee nke a chọrọ achọ, ọ ga-akwụ onye nwe ya ụgwọ ya. Ma, ọ pụtaghị na ihe ọ bụla mere anụmanụ ndị ahụ ga-adịzi onye na-elekọta ya n’isi. N’ihi na iwu ahụ kwukwara na o nweghị ikpe ga-ama onye ahụ na-elekọta anụmanụ ma ọ bụrụ na ihe mere ụmụ anụmanụ ndị ahụ abụghị ihe ọ ga-egbochili, dị ka, anụ ọhịa ịbịa dọgbuo ha. Ma, o nwere ihe ọ ga-eme iji gosi na aka ya dị ọcha. Ọ ga-eweta ihe akaebe gosiri na anụ ọhịa dọgburu ha n’eziokwu, dị ka, ozu ha anụ ọhịa dọriri. Ma, ọ́ bụghị ya, ọ ga-abụ onye ikpe mara. Onye nwe anụmanụ ndị ahụ lechaa ihe akaebe ndị ahụ, ọ ga-ewere ya na aka onye ahụ na-azụrụ ya anụmanụ dị ọcha.
Ọ bụ ụdị ihe a ka a na-eme n’ihe ọ bụla e nyefere mmadụ ilekọta, ma n’ezinụlọ. Dị ka ihe atụ, ọ bụ nwa nwoke kacha okenye n’ezinụlọ ga na-elekọta ụmụnne ya. Ọ bụ ya mere Ruben, bụ́ onye kacha okenye n’ime ụmụ Jekọb, ji na-echegbu onwe ya mgbe ụmụnne ya nọ na-akpa nkata igbu Josef, dị ka e dere na Jenesis 37:18-30. “O wee sị: ‘Ka anyị ghara igbu ya egbu.’ . . . ‘Unu awụfula ọbara. . . . Unu emerụla ya ahụ́.’ O bu n’obi ịnapụta ya n’aka ha ka o wee kpọghachiri ya nna ya.” Mgbe Ruben hụrụ na Josef anọghịzi n’olulu ahụ, o wutere ya nke ukwuu nke na ‘ọ dọwara uwe ya’ ma tie mkpu, sị: “Nwatakịrị ahụ anọkwaghị n’ebe ahụ! Mụ onwe m kwa—gịnịzi ka m ga-eme?” Ọ ma na a ga-ajụ ya ajụjụ Josef nwanne ya. Iji mee ka a ghara ịmata ihe ha mere, ha kpara nkata iweta ihe ga-egosi na anụ ọhịa adọgbuola Josef ma gosi ya nna ha. Ha gburu otu ewu ma bịanye uwe Josef n’ọbara ya. Ha wetaara ya Jekọb nna ha iji gosi na anụ ọhịa dọgburu Josef. N’ihi ihe a ha mere, o nweghịzi ihe ọ bụla e mere Ruben n’ihi na uwe ahụ mere ka Jekọb kwubie na anụ ọhịa adọgbuola Josef.—Jen. 37:31-33.
MEE 11-17
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | JENESIS 38-39
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-2 555
Onan
(Oʹnan) [O si n’okwu pụtara “mmalite ike ịmụ nwa; ike dị ukwuu”].
Ọ bụ aha nwa Juda nke abụọ, nke nwa nwaanyị otu nwoke onye Kenan aha ya bụ Shua mụụrụ ya. (Jen. 38:2-4; 1 Ihe 2:3) Mgbe Jehova gburu nwanne Onan nke okenye aha ya bụ Er, bụ́ onye nwụrụ na-amụtaghị nwa, Juda gwara Onan ka ọ lụwa Tema bụ́ nwunye Er nwanne ya nwoke. Ọ bụrụ na ha amụta nwa nwoke, ọ gaghị abụ ọkpara Onan, kama ọ ga-abụ nke Er. N’ihi ya, ọ bụ ya ga-enweta ihe nketa a na-ekenye diọkpara. Ma, ọ bụrụ na ha amụtaghị nwa, ọ bụ Onan ga-enweta ihe nketa a na-ekenye diọkpara. Mgbe Onan na Tema nwere mmekọahụ, “ọ nyụfusịrị ọbara ọcha ya n’ala.” Ihe a Onan mere abụghị iji aka ya egboro onwe ya agụụ mmekọahụ n’ihi na amaokwu Baịbụl ahụ sịrị na “mgbe ya na nwunye nwanne ya nwere mmekọahụ,” ọ nyụfusịrị ọbara ọcha ya n’ala. Ọ ga-abụ na ihe o mere bụ ịkpachara jichie ọbara ọcha ya mgbe ọ chọrọ ịpụta ma nyụpụ ya n’ala kama ịnyụba ya n’ahụ́ Tema. Jehova gburu Onan n’ihi inupụrụ nna ya isi, inwe anyaukwu, na inupụ isi ná ndokwa Chineke mere maka alụmdi na nwunye, ọ bụghị n’ihi iji aka ya egboro onwe ya agụụ mmekọahụ. Onan nwụrụ n’amụtaghị nwa.—Jen. 38:6-10; 46:12; Ọnụ Ọgụ. 26:19.
MEE 25-31
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | JENESIS 42-43
“Josef Jidere Onwe Ya”
it-2 108 ¶4
Josef
N’ihi ihe a niile, ụmụnne Josef malitere iche na Chineke na-ata ha ahụhụ maka orire ahụ ha rere nwanne ha ọtụtụ afọ gara aga. Ha nọ n’ihu nwanne ha, bụ́ onye ha na-amataghịzi, na-ekwu banyere ihe ọjọọ ahụ ha mere. Mgbe Josef nụrụ ihe ha nọ na-ekwurịta nke na-egosi na ha echegharịala, o nweghịzi ike ijide onwe ya. O si n’ebe ha nọ pụọ ma malite ibe ákwá. Mgbe ọ lọghachiri, ọ kpọchiri Simiọn, kee ya agbụ ruo mgbe ndị nke ọzọ kpọtara nwanne ha nke kacha ntakịrị.—Jen. 42:21-24.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-2 795
Ruben
A matara ụfọdụ àgwà ọma ndị Ruben nwere mgbe ọ gwara ụmụnne ya itoolu ndị ọzọ ka ha ghara igbu Josef, kama ka ha tụba ya n’ime olulu mmiri nke mmiri na-adịghị. O bu n’obi izoro ezoro gaa kpọpụta Josef n’olulu mmiri ahụ mgbe e mechara. (Jen. 37:18-30) Ugbu a, mgbe ihe karịrị iri afọ abụọ gachara, ka Ruben na ụmụnne ya nọ n’Ijipt na-ekwurịta na ihe mere e ji bo ha ebubo na ha bụ ndị nledo bụ n’ihi ihe ha mere Josef, Ruben chetaara ha na ya esoghị ha kpaa nkata ahụ ha kpara megide Josef. (Jen. 42:9-14, 21, 22) Mgbe Jekọb Jụrụ ikwe ka ha kpọrọ Benjamin ma ha laghachiwa Ijipt, ọ bụkwa Ruben sịrị nna ha ka ọ kpọrọ ụmụ ya abụọ ma ọ bụrụ na ya akpọghachighị Benjamin. Ọ gwara nna ha, sị: “I nwere ike igbu [ha] ma ọ bụrụ na mụ akpọghachighịrị gị [Benjamin]”—Jen. 42:37.