Ihe E Kwuru n’Akwụkwọ Ndị A Kpọrọ Aha n’Usoro Ihe Omume Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ
SEPTEMBA 6-12
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | DIUTERỌNỌMI 33-34
“Gbaba ‘n’Ogwe Aka Jehova Na-adịru Mgbe Ebighị Ebi’”
it-2 51
Jeshurọn
Ọ bụ aha a na-etu mba Izrel. Na Septuagint Grik, “Jeshurọn” bụ okwu e ji kọwaa onye a hụrụ n’anya. Ihe a sụgharịrị ya bụ “onye a hụrụ n’anya.” Aha ahụ bụ́ “Jeshurọn” kwesịrị ichetara mba Izrel na ha bụ mba ha na Chineke gbara ndụ, n’ihi ya, na ha kwesịrị ịna-eme ihe ziri ezi. (Diut. 33:5, 26; Aịza. 44:2) Na Diuterọnọmi 32:15, ihe mere e ji kpọọ mba Izrel Jeshurọn abụghị n’ihi na ha na-eme ihe ziri ezi. Kama, ọ bụ iji gosi na ha kwesịrị ịna-eme ihe ziri ezi, mana ha emeghị ya. Ha emeghị ihe mere e ji kpọọ ha Jeshurọn. Ha ghọrọ ndị isi ike, hapụ Onye kere ha, ledakwa Onye Nzọpụta ha anya.
Tụkwasị Jehova, Bụ́ “Chineke Nke Nkasi Obi Niile,” Obi
Mozis dere abụ na-akasi obi. O mesiri ndị Izrel obi ike, sị: “Chineke nke dị adị site n’oge ochie bụ ebe nzuzo, ogwe aka nke na-adịru mgbe ebighị ebi dịkwa n’okpuru.” (Diut. 33:27) Samuel onye amụma mechara gwa ndị Izrel, sị: “Unu ahapụkwala iso Jehova, jirikwanụ obi unu dum jeere Jehova ozi. . . . Jehova agaghị agbahapụ ndị ya n’ihi aha ukwu ya.” (1 Sam. 12:20-22) Ọ bụrụhaala na anyị anọgide na-efe Jehova, ọ gaghị agbahapụ anyị. Ọ ga na-enyere anyị aka mgbe ọ bụla anyị nọ ná mkpa.
Jiri Ntachi Obi Na-agba Ọsọ Ahụ
16 Dịkwa ka Ebreham, Mozis anọghị ndụ hụ otú nkwa Chineke si mezuo. Mgbe ọ fọrọ obere ka ụmụ Izrel banye n’Ala Nkwa ahụ, a gwara Mozis, sị: “Ị ga-anọ n’ebe dị anya hụ ala ahụ, ma ị gaghị abanye ebe ahụ, n’ala ahụ m na-enye ụmụ Izrel.” A gwara ya ihe a n’ihi ihe ya na nwanne ya bụ́ Erọn mere mgbe iwe ji ha maka isi ụmụ Izrel nupụrụ. Iwe ahụ mere ka ha ghara ‘imeso Chineke otú ha kwesịrị isi meso ya n’etiti ụmụ Izrel, ná mmiri Meriba.’ (Diut. 32:51, 52) Ihe a a gwara Mozis ò mere ka ike ife Chineke gwụ ya, ma ọ bụ ka o buwere Chineke iwe n’obi? Mba. Ọ rịọrọ Chineke ka ọ gọzie ụmụ Izrel, ihe ndị o kwukwara tupu ya anwụọ bụ: “Obi ụtọ na-adịrị gị, Izrel! Ònye dị ka gị, bụ́ ndị Jehova na-azọpụta, onye bụ́ ọta nke na-enyere gị aka, onye bụkwa mma agha gị nke dị ebube?”—Diut. 33:29.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-2 439 ¶3
Mosis
Mosis gbara otu narị afọ na iri abụọ mgbe ọ nwụrụ. Baịbụl kwuru na ahụ́ gbasiri ya ike. Ọ sịrị: “Anya ya ka na-ahụ ụzọ nke ọma, ahụ́ ka sikwara ya ike.” Jehova mere ka a ghara ịma kpọmkwem ebe ili ya dị ruo taa. (Diut. 34:5-7) Ọ ga-abụ na ihe mere o ji mee ihe a bụ ka ndị Izrel ghara iji ili Mosis mere chi ma na-efe ya ofufe. Ọ ga-abụkwa na Ekwensu chọrọ iji ozu Mosis mere ihe ndị mmadụ ga na-efe ofufe. Jud, onye na-eso ụzọ Jizọs, onye bụ́kwa nwanne Jizọs dere, sị: “Mgbe Maịkel onyeisi ndị mmụọ ozi na Ekwensu sere okwu ma na-arụ ụka banyere ozu Mosis, e nweghị mgbe ọ mara Ekwensu ikpe, ọ gwaghịkwa ya okwu ọjọọ, kama ọ sịrị: ‘Ka Jehova baara gị mba.’ ” (Jud 9) Tupu Joshụa e duru ụmụ Izrel banye n’ala Kenan, ha ruuru Mosis uju ụbọchị iri atọ.—Diut. 34:8.
SEPTEMBA 13-19
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | JOSHỤA 1-2
“Otú Ị Ga-esi Mee Ka Ihe Gaziere Gị”
Nwee Obi Ike, Jehova Nọnyeere Gị!
7 Anyị kwesịrị ịna-amụ Baịbụl ma na-eme ihe anyị mụtara iji nwee obi ike ime uche Chineke. Ọ bụ ihe Chineke gwara Jọshụa mee mgbe ọ nọchiri Mozis. Chineke gwara ya, sị: “Nwee obi ike, dịkwa ike nke ukwuu ka i wee lezie anya mezuo iwu ahụ dum nke Mozis ohu m nyere gị. . . . Akwụkwọ iwu a agaghị apụ n’ọnụ gị, ị ga na-agụkwa ihe dị na ya n’olu dị ala ehihie na abalị, ka i wee lezie anya mee ihe niile e dere na ya; n’ihi na mgbe ahụ, ị ga-eme ka ụzọ gị gaa nke ọma, mgbe ahụkwa, ị ga-eji amamihe mee ihe.” (Jọsh. 1:7, 8) Jọshụa mere ihe ahụ Chineke gwara ya. N’ihi ya, ‘ụzọ ya gara nke ọma.’ Anyị meekwa otú ahụ, anyị ga-enwekwu obi ike, ihe agakwaara anyị nke ọma n’ozi Chineke.
Nwee Obi Ike, Jehova Nọnyeere Gị!
20 Ọ dịghị mfe ịna-eme uche Chineke n’ụwa ochie a nsogbu juru. Ma, Chineke ahapụghị anyị. Ọ nọnyeere anyị. Ọkpara ya, bụ́ Isi nke ọgbakọ, nọnyekwaara anyị. Anyị nwekwara ụmụnna karịrị nde asaa n’ụwa niile. Ka anyị niile na-egosi mgbe niile na anyị nwere okwukwe ma na-ekwusa ozi ọma, burukwa isiokwu afọ 2013 n’uche, ya bụ: ‘Nwee obi ike, dịkwa ike. Jehova bụ́ Chineke gị nọnyeere gị.’—Jọsh. 1:9.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Joshua
2:4, 5—Gịnị mere Rehab ji duhie ndị ozi eze bụ́ ndị na-achọ ndị nledo ahụ? Rehab chebere ndị nledo ahụ, na-etinye ndụ ya n’ihe ize ndụ n’ihi na o nwewo okwukwe na Jehova. N’ihi ya, iwu ejighị ya ịgwa ndị ahụ na-achọ imerụ ndị Chineke ahụ́ ebe ndị nledo ahụ nọ. (Matiu 7:6; 21:23-27; Jọn 7:3-10) N’ezie, e ‘sitere n’ọrụ kpọọ Rehab onye ezi omume,’ tinyere ọrụ nke iduhie ndị ozi eze.—Jems 2:24-26.
SEPTEMBA 20-26
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | JOSHỤA 3-5
“Jehova Na-agọzi Ihe Ndị Anyị Na-eme n’Ihi na Anyị Nwere Okwukwe”
it-2 105
Jọdan
Ọtụtụ mgbe, akụkụ Osimiri Jọdan nke dị nso n’Oké Osimiri Galili na-adị ihe dị ka otu mita ruo mita atọ n’omimi, dịkwa ihe dị ka mita iri abụọ na asaa ruo mita iri atọ n’obosara. Ma n’oge udu mmiri, Osimiri Jọdan na-eto, sakwuo mbara, dịkwuokwa omimi. (Josh. 3:15) Osimiri Jọdan too, ọ gaghị adị mfe ndị Izrel, ma ụmụ nwoke ma ụmụ nwaanyị ma ụmụaka, iji ụkwụ gafere ya, karịchaa n’ebe nke dị nso na Jeriko. Mmiri ahụ na-achị ezigbo ọkụ. Na nso nso a, o buuru ndị gara ebe ahụ ịsa ahụ́. Ma, Jehova mere ka mmiri ahụ taa ka ndị Izrel nwee ike iji ụkwụ gafee na ya. (Josh. 3:14-17) Mgbe ọtụtụ afọ gachara, Jehova meere Ịlaịja ụdị ihe a mgbe ya na Ịlaịsha so. O mekwaara ya Ịlaịsha.—2 Eze 2:7, 8, 13, 14.
Mee Ka Ihe Jehova Na-echetara Anyị Na-eme Gị Obi Ụtọ
17 Olee otú ife Jehova si eme ka anyị na-atụkwasịkwu ya obi? Ka anyị tụlee ihe mere mgbe ọ fọrọ obere ka ndị Izrel banye n’Ala Nkwa. Jehova gwara ndị nchụàjà bu igbe ọgbụgba ndụ ya ka ha banye n’Osimiri Jọdan. Ma, mgbe ndị Izrel rutere n’osimiri ahụ, ha chọpụtara na o tojuola ma na-asọsi ike n’ihi mmiri ozuzo. Gịnịzi ka ha ga-eme? Ebe ọ bụ na ha amaghị izu ole ọ ga-ewe tupu mmiri ahụ atalata, hà ga-ama ụlọikwuu n’akụkụ osimiri ahụ, na-eche ka ọ talata? Ha emeghị otú ahụ. Kama, ha tụkwasịrị Jehova obi ha niile, meekwa ihe ọ gwara ha. Gịnị meziri? Baịbụl kwuru, sị: ‘Ozugbo ụkwụ ndị nchụàjà bụ́ ndị bu Igbe ahụ zọnyere n’ọnụ ọnụ mmiri, mmiri nke na-esi n’ebe mgbago asọdata wee guzoro otu ebe. Ụmụ Izrel wee si n’ihu Jeriko gafee. Ka ọ dị mgbe ahụ, ndị nchụàjà bụ́ ndị bu igbe ọgbụgba ndụ Jehova kwụụrụ n’ala akọrọ n’etiti Jọdan, ka Izrel dum nọ na-agafere n’ala akọrọ.’ (Jọsh. 3:12-17) Obi tọrọ ụmụ Izrel ezigbo ụtọ mgbe ha hụrụ na mmiri ahụ na-asọsi ike akwụsịla ịsọ. Ndị Izrel mere ihe Jehova kwuru, ya emezie ka okwukwe ha sikwuo ike.
Mee Ka Ihe Jehova Na-echetara Anyị Na-eme Gị Obi Ụtọ
18 Jehova anaghị arụrụ ndị ohu ya ụdị ọrụ ebube ahụ taa. Ma, ọ na-agọzi anyị ma anyị tụkwasị ya obi, mee ihe ọ gwara anyị. Mmụọ nsọ Chineke na-eme ka anyị jiri obi ike na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke n’ụwa niile. Jizọs Kraịst kwekwara ndị na-eso ụzọ ya nkwa na ya ga-anọnyere ha n’ọrụ a dị mkpa ha na-arụ. Ọ bụ ya bụ onye kacha gbaa àmà gbasara Jehova. Ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ya mere, gaanụ mee ndị mba niile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m . . . M nọnyeere unu ụbọchị niile ruo ọgwụgwụ usoro ihe a.” (Mat. 28:19, 20) E nwere ọtụtụ ụmụnna anyị ihere izi ndị ọzọ ozi ọma na-eme, nweekwa ndị nke na-atụ ụjọ. Ma ha kwuru na ọ bụ mmụọ nsọ Chineke nyeere ha aka ịkata obi na-ezi ndị ha na-amaghị ozi ọma.—Gụọ Abụ Ọma 119:46; 2 Ndị Kọrịnt 4:7.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Joshua
5:14, 15—Ònye bụ “onye isi usuu ndị agha Jehova”? Onye isi ahụ nke bịara iwusi Jọshụa ike ka a malitere imeri Ala Nkwa ahụ eyighị ka ọ̀ bụ onye ọ bụla ọzọ karịa “Okwu ahụ”—Jizọs Kraịst tupu ya aghọọ mmadụ. (Jọn 1:1; Daniel 10:13) Lee ihe na-ewusi ike ọ bụ inwe mmesi obi ike bụ́ na Jizọs Kraịst ahụ e mere ka ọ dị ebube na-anọnyere ndị Chineke taa ka ha na alụ agha ime mmụọ!
SEPTEMBA 27–ỌKTOBA 3
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | JOSHỤA 6-7
“Wepụ Anya Gị n’Ihe Na-abaghị Uru”
Wepụ Anya Gị n’Ihe Na-abaghị Uru!
5 Mgbe ọtụtụ narị afọ gafere, bụ́ mgbe e bibiri Jeriko, anya otu onye Izrel aha ya bụ Ekan duhiere ya, ya ewee zuru ụfọdụ n’ime ihe dị n’obodo ahụ. Chineke nyere iwu ka e bibie ihe niile dị n’obodo ahụ, ma e wezụga ihe ụfọdụ a ga-ewepụtara ya. A dọrọ ụmụ Izrel aka ná ntị, sị: “Unu emetụkwala ihe a ga-ebibi ebibi aka, ka ọ ghara ịgụ unu agụụ” unu ewee were ụfọdụ ihe n’obodo ahụ. Mgbe Ekan nupụrụ isi, ndị E-aị meriri ụmụ Izrel mgbe ha gara ịlụso E-aị agha, e wee gbuo ọtụtụ n’ime ha. Ekan ekwupụtaghị mmehie ya ruo mgbe a chọgidere wee chọpụta na o zuru ohi. Ya ewee, sị: ‘Mgbe m hụrụ ihe ndị ahụ, ha gụrụ m agụụ, m wee chịrị ha.’ Ọchịchọ nke anya ya mere ka a laa ya na “ihe niile bụ́ nke ya” n’iyi. (Jọsh. 6:18, 19; 7:1-26) Ekan chọrọ inweta ihe Jehova gwara ha ka ha ghara imetụ aka.
Gịnị Mere A Ga-eji Gbaa Àmà Ihe Ọjọọ?
Otu ihe mere a ga-eji gbaa àmà ihe ọjọọ bụ na ọ na-arụ ọrụ ichebe ịdị ọcha nke ọgbakọ. Jehova bụ Chineke dị ọcha, Chineke dị nsọ. Ọ chọrọ ka ndị nile na-efe ya ofufe dị ọcha n’ime mmụọ na n’omume. Okwu ya sitere n’ike mmụọ nsọ na-adụ ọdụ, sị: “Dị ka ụmụ nke ịṅa ntị, unu emekwala onwe unu ka unu dị ka agụụ ihe ọjọọ ahụ si dị, bụ́ nke gụrụ unu na mbụ n’amaghị ihe unu: kama dị ka Onye kpọrọ unu dị nsọ, unu onwe unu, ghọọkwanụ ndị dị nsọ n’ibi obi nile dị iche iche; n’ihi na e dewo ya n’akwụkwọ nsọ, sị, Unu ga-adị nsọ; n’ihi na nsọ ka Mụ onwe m dị.” (1 Pita 1:14-16) Mmadụ ndị na-eme omume na-adịghị ọcha ma ọ bụ ihe ọjọọ pụrụ iweta mmetọ na iwe Jehova n’isi ọgbakọ dum ọ gwụla ma e mere ihe iji gbazie ha ma ọ bụ wepụ ha.—Tụlee Joshua, isi nke 7.
Wepụ Anya Gị n’Ihe Na-abaghị Uru!
8 Ndị Kraịst nwekwara ike inwe ọchịchọ nke anya na nke anụ ahụ́. Ya mere, Baịbụl na-agba anyị ume ka anyị nwee njide onwe onye wee kpachara anya n’ihe anyị na-ahụ na ihe anyị na-enwe ọchịchọ inweta. (1 Kọr. 9:25, 27; gụọ 1 Jọn 2:15-17.) Job, bụ́ nwoke ezi omume, ma na mmadụ na-enwekarị ọchịchị inweta ihe ọ na-ahụ anya. Ọ sịrị: “Mụ na anya m agbawo ndụ. Oleezi otú m ga-esi nwee mmasị n’ebe nwa agbọghọ na-amaghị nwoke nọ?” (Job 31:1) Job anaghị emetụ nwaanyị aka n’ahụ́ otú ga-eme ka o nwee agụụ mmekọahụ, ọ naghịkwa ekwe ka ụdị ihe ahụ bata ya n’echiche. Jizọs kwusiri okwu ike ka anyị ghara ịna-eche ihe rụrụ arụ n’obi mgbe ọ sịrị: “Onye ọ bụla nke na-ele nwaanyị anya, o wee gụọ ya agụụ ka ya na ya nwee mmekọahụ, ọ kwasowo ya iko n’obi ya.”—Mat. 5:28.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
N’oge ochie, ọ na-abụ ndị agha bịa ịlụso obodo ọ bụla agha, ha eburu ụzọ nọchibido ya. Ọ bụrụ na ha anọchibido ya ruo ogologo oge, ndị obodo ahụ ga na-eri nri ndị ha chekwara. Ndị agha ahụ mechaa merie obodo ahụ, ha na-akwakọrọ ihe ọ bụla ha hụrụ, ma nri ndị fọrọnụ. N’ihi ya, ihe ndị na-amụ banyere ihe ndị mgbe ochie na-ahụ n’obodo ndị e si otú ahụ bibie na Palestaịn bụ naanị obere nri. Mgbe ụfọdụ, ha anaghịdị ahụ nke ọ bụla. Ma, ihe ha hụrụ na Jeriko oge ochie adịghị otú ahụ. Otu akwụkwọ nke kwuru banyere ihe ndị mgbe ochie sịrị: “E wezụga ite ájá, ihe a kacha hụ ebe ahụ bụ ọka.” O kwukwara na a naghị ahụkarị nri há otú ahụ n’ebe ndị ọzọ.
Baịbụl kwuru ihe mere ndị Izrel ebukọrọghị nri ndị Jeriko. Jehova gwara ha ka ha ghara iwere ihe ọ bụla. (Jọsh. 6:17, 18) Baịbụl kwukwara na mgbe ndị Izrel gara ịlụso Jeriko agha, ọ dịbeghị anya e wechara ihe ubi. N’ihi ya, ọka ha nwere ka buru ibu. (Jọsh. 3:15-17; 5:10) Ọka buru ibu a hụrụ na Jeriko gosiri na ndị Izrel anọchibidoghị Jeriko ruo ogologo oge, otú ahụ Baịbụl kwuru.
ỌKTOBA 4-10
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | JOSHỤA 8-9
“Ihe Anyị Ga-amụta n’Akụkọ Banyere Ndị Gibiọn”
it-1 930-931
Gibiọn
Mmekọrịta Ndị Gibiọn na Joshụa. N’oge Joshụa, ọ bụ ndị Haịvaịt bi na Gibiọn. Ha bụ otu n’ime mba asaa bi n’ala Kenan, ndị Chineke gwara ndị Izrel ka ha bibie. (Diut. 7:1, 2; Josh. 9:3-7) Aha ọzọ a na-akpọ ndị Gibiọn bụ ndị Amọraịt n’ihi na mgbe ụfọdụ, o yiri ka à na-akpọ mba niile bi n’ala Kenan ndị Amọraịt. (2 Sam. 21:2; tụlee Jen. 10:15-18; 15:16.) Ma, ndị Gibiọn emeghị ka mba ndị ọzọ bi n’ala Kenan. Ha ma na n’agbanyeghị na ha nwere ọtụtụ ndị agha dị ike, nweekwa nnukwu obodo, ha agaghị emerili ndị Izrel n’ihi na Jehova na-alụrụ ha ọgụ. N’ihi ya, mgbe ha hụrụ na e meriela Jeriko na E-aị, ha zipụrụ ndị ga-aga hụ Joshụa na Gilgal ka ha mee udo. Ọ ga-abụ na ndị ahụ ha zipụrụ nọchitekwara anya mba atọ ọzọ so ná ndị Haịvaịt, ya bụ, Kefaịra, Bierọt, na Kiriat-jierim (Josh. 9:17). Ndị ahụ ha zipụrụ yi nkịrịka uwe na akpụkpọ ụkwụ mere ochie. Ha jikwa akpụkpọ mmanya merela ochie, nkịrịka akpa, na achịchịa kpọrọ nkụ. Ha mere ihe a niile iji mee ka ndị Izrel chee na ha si mba dị anya, ya bụ, na ha esighị ná mba ọ bụla so ná mba ndị ahụ a gwara ndị Izrel bibie. Ha kwetara na aka Jehova dị n’ihe mere ndị Ijipt na ndị eze Amọraịt abụọ aha ha bụ Saịhọn na Ọg. Ma, ha ekwughị banyere ihe mere Jeriko na E-aị n’ihi na ha ma na akụkọ ya ekwesịbeghị iru obodo ahụ dị anya ha sịrị na ha si bịa tupu ha apụtawa. Ihe a ha mere gosiri na ha ma ihe. Ndị nnọchiteanya ndị Izrel lebara okwu ahụ anya ma kweta n’ihe ndị Gibiọn kwuru. Ha sooro ha gbaa ndụ na ha agaghị ebibi ha.—Josh. 9:3-15.
“Adaberekwala Ná Nghọta Gị”
14 Ebe ọ bụ na anyị ezughị okè, anyị niile, ma ndị okenye jerela ozi ọtụtụ afọ, ekwesịghị ichefu mgbe ọ bụla ịrịọ Jehova ka o duo anyị mgbe anyị na-eme mkpebi. Tụlegodị ihe Jọshụa, onye nọchiri Mozis, na ndị okenye Izrel mere mgbe ndị Gibiọn maara ihe bịakwutere ha ma mee ka hà si ebe dị anya bịa n’Izrel. Jọshụa na ndị ọzọ ajụghị Jehova ase tupu ha ekweta ka ha na ndị Gibiọn mee udo, ha na ha agbaakwa ndụ. N’agbanyeghị na Jehova mechara kwado nkwekọrịta ahụ, ọ hụrụ na ase a ha n’ajụghị ya so n’ihe ndị e dere n’Akwụkwọ Nsọ ka anyị nwee ike jiri ya mụta ihe.—Jọsh. 9:3-6, 14, 15.
“Jegharịa n’Ala Nke A”
14 Ndị nnọchianya ahụ kwuru, sị: ‘Ala dị anya nke ukwuu ka ndị ohu gị si bịa n’ihi aha Jehova, bụ́ Chineke gị.’ (Joshua 9:3-9) Uwe ha na ihe oriri ha yiri ka hà kwadoro na ha si ebe dị anya, ma n’ezie, Gibiọn dị kilomita 30 site na Gilgal. N’ikweta na ha si ebe dị anya, Jọshụa na ndị isi ya soro Gibiọn na obodo ndị dị nso bụ́ ndị ha na Gibiọn nwere njikọ nwee nkwekọrịta udo. Aghụghọ ndị Gibiọn ọ̀ bụ nanị iji gbanahụ mbibi? N’ụzọ megidere nke ahụ, o gosiri ọchịchọ ha inweta ihu ọma nke Chineke nke Izrel. Jehova kwetara ka ndị Gibiọn ghọọ “ndị ọwa nkụ na ndị ose mmiri banyere nzukọ Izrel, banyekwara ebe ịchụàjà Jehova,” ndị na-achịkọta nkụ maka ebe ịchụàjà. (Joshua 9:11-27) Ndị Gibiọn nọgidere na-egosipụta njikere ha dị ịrụ ọrụ ndị dị ala n’ozi Jehova. Eleghị anya, ụfọdụ n’ime ha so ná ndị Netinim bụ́ ndị si Babilọn lọta ma jee ozi n’ụlọ nsọ e wughachiri ewughachi. (Ezra 2:1, 2, 43-54; 8:20) Anyị pụrụ iṅomi àgwà ha site n’ịgbalịsi ike iso Chineke na-adị n’udo na ịdị njikere ịrụ ọbụna ọrụ ndị dị ala n’ozi ya.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-1 1030
Ịkwụwa Mmadụ n’Elu Osisi
N’iwu ahụ Jehova nyere ụmụ Izrel, e kwuru ka a na-akwụwa ndị omekome ụfọdụ n’elu osisi n’ebe ọhaneze ga na-ahụ ha ma e gbuchaa ha. Ịkwụwa mmadụ n’elu osisi pụtara na onye ahụ bụ “onye Chineke bụrụ ọnụ.” Ọ ga-abụkwa ihe ịdọ aka ná ntị maka ndị ọzọ. Tupu chi ejie, a na-ebudata onye a kwụwara n’elu osisi ma lie ya. Ịhapụ mmadụ n’elu osisi ka ọ nọbọọ chi ga-eme ka ala Chineke nyere ụmụ Izrel bụrụ ihe e merụrụ emerụ. (Diut. 21:22, 23) Ụmụ Izrel na-eme ihe a ọ bụrụgodị na onye ahụ a kwụwara n’elu osisi bụ onye mbịarambịa.—Josh. 8:29; 10:26, 27.
ỌKTOBA 11-17
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | JOSHỤA 10-11
“Jehova Lụchiteere Ndị Izrel Ọgụ”
it-1 50
Adonaị-zidek
Ọ bụ eze na-achị Jeruselem mgbe ndị Izrel meriri obodo ndị dị n’Ala Nkwa ahụ. Adonaị-zidek na ntakịrị obodo ndị ọzọ dị n’ebe ọdịda anyanwụ Osimiri Jọdan gbakọrọ aka lụso Joshụa na ndị agha ya ọgụ iji kwụsị mmeri ha na-emeri. (Josh. 9:1-3) Ma, ndị Haịvaịt bi na Gibiọn gara ka ha na Joshụa mee udo. N’ihi ya, Adonaị-zidek mere ihe ozugbo ka a ghara inwe ndị ọzọ ga-aga ka ha na ndị Izrel mee udo. Ọ kpọkọtara ndị agha ya nakwa ndị agha ndị eze anọ ọzọ nke ndị Amọraịt gaa nọchibido ndị Gibiọn ma buso ha agha. Ma, Joshụa meriri ndị eze ise a mmeri kpụ ọkụ n’ọnụ, napụtakwa ndị Gibiọn. Ndị eze ise a na ndị agha ha gbara ọsọ gbaga Makida ma gbaba n’ọgba. Joshụa jidere ha n’ọgba ahụ ma jiri aka ya gbuo Adonaị-zidek na ndị eze anọ ndị ọzọ ahụ n’ihu ndị agha ya, kwụwakwa ha n’elu osisi. E mechara tụba ozu ha n’ime ọgba ahụ, ya abụrụzie ili ha.—Josh. 10:1-27.
it-1 1020
Akụ́ Mmiri Ígwé
Jehova Ji Ya Mee Ihe. Akụ́ mmiri ígwé bụ otu n’ime ihe ndị Jehova jirila mezuo ihe o kwuru, jirikwa gosi ike ya. (Ọma 148:1, 8; Aịza. 30:30) Mgbe mbụ e kwuru banyere ya na Baịbụl bụ mgbe a na-ekwu banyere ihe nke asaa Jehova ji taa ndị Ijipt ahụhụ. Akụ́ mmiri ígwé ahụ dagburu ma ahịhịa ndụ ma osisi, gbuokwa ndị mmadụ na anụ ụlọ ndị nọ n’èzí. Ma, o nweghị ihe mere ndị Izrel bi na Goshen. (Ọpụ. 9:18-26; Ọma 78:47, 48; 105:32, 33) N’oge ụmụ Izrel bi n’Ala Nkwa ahụ, mgbe Joshụa na ụmụ Izrel gbataara ndị Gibiọn ọsọ enyemaka n’ihi na ndị eze ise nke ndị Amọraịt bịara ibuso ha agha, Jehova ji akụ́ mmiri ígwé gbuo ndị Amọraịt ahụ. N’agha ahụ, ndị akụ́ mmiri ígwé dagburu karịrị ndị ụmụ Izrel ji aka ha gbuo.—Josh. 10:3-7, 11.
Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Joshua
10:13—Olee otú ihe ịtụnanya dị otú ahụ si kwe omume? “Ọ̀ dị ihe karịrị Jehova,” bụ́ Onye Okike nke eluigwe na ala, “ime”? (Jenesis 18:14) Ọ bụrụ na Jehova achọọ, ọ pụrụ ịchịkwa ịgba gburugburu nke ụwa ka anyanwụ na ọnwa wee yie ka hà kwụ otu ebe nye onye si n’ụwa na-ekiri ha. Ma ọ bụ ọ pụrụ ikwe ka ngagharị nke ụwa na ọnwa dịgide otú ha dị ma mee ka a nọgide na-ahụ ìhè nke anyanwụ na ọnwa. Ihe ọ sọrọ ya bụrụ, “ọ [dịghị] ụbọchị dị ka nke ahụ” n’akụkọ ihe mere eme nke mmadụ.—Joshua 10:14.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
Na e nwere akwụkwọ ndị a kpọrọ aha na Baịbụl, nweekwa ndị e si na ha nweta ihe ụfọdụ e dere na Baịbụl, ekwesịghị ime ka anyị chee na ha si n’ike mmụọ nsọ. Ma, Jehova bụ́ Chineke chebere ihe niile e dere ede, bụ́ ndị “okwu Chineke anyị” dị na ha, ha “ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.” (Aịza. 40:8) N’eziokwu, ihe Jehova mere ka ha dịrị n’akwụkwọ iri isii na isii dị na Baịbụl bụ ihe dị anyị mkpa iji ‘ruo eru n’ụzọ zuru ezu, bụrụ ndị a kwadebere n’ụzọ zuru ezu ịrụ ezi ọrụ niile.’—2 Tim. 3:16, 17.
ỌKTOBA 18-24
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | JOSHỤA 12-14
“Jiri Obi Gị Niile Na-eso Jehova”
Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Joshua
14:10-13. Ọ bụ ezie na ọ dị afọ 85, Keleb rịọrọ ka e nye ya ọrụ tara akpụ nke ịchụpụ ndị bi na Hibrọn. Ndị bi ebe ahụ bụ ndị Anakịm—ndị gbara agba nke ukwuu. Site n’enyemaka Jehova, onye agha a nwere ahụmahụ nwere ihe ịga nke ọma, Hibrọn ghọkwara obodo mgbaba. (Joshua 15:13-19; 21:11-13) Ihe atụ Keleb na-agba anyị ume ịghara izere ọrụ ọchịchị Chineke ndị tara akpụ.
Inweta Obi Ike Site n’Inwe Okwukwe na Ịtụ Egwu Chineke
11 Okwukwe dị otú a na-eto eto. Ọ na-eto ka anyị na-ebi ndụ kwekọrọ n’eziokwu ahụ, ‘na-edetụ’ uru ọ na-aba ire, ‘na-ahụ’ ka a zara ekpere anyị, ma, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, na-ahụ ka Jehova na-eduzi anyị ná ndụ. (Abụ Ọma 34:8; 1 Jọn 5:14, 15) O doro anya na okwukwe Jọshụa na Keleb siwanyere ike mgbe ha hụrụ ịdị mma Chineke. (Joshua 23:14) Tụlee isi ihe ndị a: Ha anwụghị ná njem ahụ were afọ iri anọ ha ji ụkwụ mee n’ọzara, dị nnọọ ka Chineke kwere ha ná nkwa. (Ọnụ Ọgụgụ 14:27-30; 32:11, 12) Ha keere òkè pụtara ìhè ná mmeri were afọ isii ha meriri Kenan. Ka e mesịrị, ha dịrị ogologo ndụ ma nwee ezi ahụ́ ike, ọbụna nwetakwa ihe nketa nke ha. N’ezie, Jehova na-agọzi ndị ji ikwesị ntụkwasị obi na obi ike na-ejere ya ozi.—Joshua 14:6, 9-14; 19:49, 50; 24:29.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-1 902-903
Gibal
Jehova gụnyere “ala ndị Gibal” n’ala ụmụ Izrel ka ga-eweghara n’oge Joshụa. (Josh. 13:1-5) Ala a dị n’ebe ugwu ma dị anya ma e si n’ala Izrel gawa ya (ihe dị ka 100 km ma e si Dan gawa ya). Ma, o nweghị ihe gosiri na ụmụ Izrel mechara weghara ya. Ndị na-akatọ ihe Baịbụl kwuru na-agbakwasị ụkwụ n’ihe a ekwu na Baịbụl anaghị ekwu otu ihe. Ma, ụfọdụ ndị ọkà mmụta kwuru na o nwere ike ịbụ na ihe ụfọdụ e dere n’amaokwu ahụ n’Akwụkwọ Nsọ Hibru oge ochie dọkapụrụ adọkapụ, nakwa na ọ ga-abụ na ihe e deburu ebe ahụ bụ “ala dị nso na Lebanọn,” ma ọ bụkwanụ ‘ruo n’okè ndị Gibal.’ Ihe ọzọ bụkwa na nkwa ndị ahụ Jehova kwere ụmụ Izrel na Joshụa 13:2-7 ga-emezu ma ha na-erubere ya isi. N’ihi ya, ọ ga-abụ na ha emechaghị nweta ala ahụ n’ihi nnupụisi ha.—Tụlee Josh. 23:12, 13.
ỌKTOBA 25-31
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | JOSHỤA 15-17
“Chebe Ihe Nketa Dị Oké Ọnụ Ahịa I Nwere”
it-1 1083 ¶3
Hebrọn
Ka ụmụ Izrel nọ na-emeri obodo ndị n’ebe ndịda Kenan, ha bibiri ndị Hebrọn, gbuokwa eze ha (ọ ga-abụ na eze ahụ bụ nke nọchiri Hoham). (Josh. 10:36, 37) Ma, n’agbanyeghị na Joshụa na ụmụ Izrel meriri Hebrọn, o yiri ka ndị agha Izrel anọghị ebe ahụ na-eche ala ahụ nche. Ọ ga-abụ na mgbe ụmụ Izrel nọ n’ebe ọzọ na-alụ agha, ndị Anakim bịara weghara ala ahụ. Ọ ga-abụ ya mere Keleb (ma ọ bụ ụmụ Juda ndị Keleb na-edu) ji mechaa gaa napụta ha ala ahụ. (Josh. 11:21-23; 14:12-15; 15:13, 14; Ikpe 1:10) E kenyeburu Keleb ala Hebrọn. Ma, e mechara jiri Hebrọn mere obodo mgbaba. O nwekwara mgbe e ji ya mere obodo ndị nchụàjà. Ma, e kenyere Keleb “ala obodo ahụ [ya bụ, Hebrọn]” na ógbè ya niile.—Josh. 14:13, 14; 20:7; 21:9-13.
it-1 848
Ịmanye Mmadụ Ịrụ Ọrụ
Ọ ga-abụ na ịmanye ndị mmadụ ịrụ ọrụ (n’asụsụ Hibru, mas) bụ ihe zuru ebe niile n’oge Baịbụl. Ndị ọ bụla e meriri n’agha na-abụkarị ndị ohu. (Diut. 20:11; Josh. 16:10; 17:13; Esta 10:1; Aịza. 31:8; Ákwá 1:1) Ndị isi Ijipt nọ na-amanye ndị Izrel ha ji mere ohu ịrụ obodo ndị a ga na-akwakọba ihe na ha, ya bụ, Paịtọm na Ramsis. (Ọpụ. 1:11-14) Mgbe ụmụ Izrel banyekwara n’Ala Nkwa ahụ, ha ji ndị Kenan mere ohu ma na-amanye ha ịrụrụ ha ọrụ kama ịchụpụ ha niile dị ka Jehova nyere ha n’iwu. Ihe a mere ka ndị Kenan rata ụmụ Izrel ikpere arụsị. (Josh. 16:10; Ikpe 1:28; 2:3, 11, 12) Eze Solomọn nọgidekwara jiri ndị si n’agbụrụ ndị Kenan mere ohu ma na-amanye ha ịrụrụ ya ọrụ, ya bụ, ndị si n’agbụrụ ndị Amọraịt, ndị Het, ndị Perizaịt, ndị Haịvaịt, na ndị Jebus.—1 Eze 9:20, 21.
it-1 402 ¶3
Kenan
Ọ bụ eziokwu na ọtụtụ obodo ndị dị na Kenan ekweghị ka ndị Izrel merie ha ma chịwa ha, ma a ka nwere ike ikwu na Jehova ‘nyere ndị Izrel ala niile ọ ṅụrụ iyi na ọ ga-enye ndị nna nna ha,’ na o mere ka ha “zuru ike n’ebe ọ bụla ha nọ,” nakwa na “o nweghị otu n’ime ọmarịcha nkwa niile Jehova kwere ndị Izrel nke na-emezughị. Ha niile mezuchara.” (Josh. 21:43-45) Ndị iro ndị Izrel fọrọnụ enweghị nke nọ na-enye ndị Izrel ezigbo nsogbu. Chineke kwuru na mbụ na ọ ga-eji “nke nta nke nta” chụpụchaa obodo ndị dị na Kenan ka anụ ọhịa ghara ijupụta n’obodo ndị ahụ ma ndị bi na ha jiri ike pụọ. (Ọpụ. 23:29, 30; Diut. 7:22) Ọ bụ eziokwu na ndị Kenan nwere ngwá agha karịrị nke ndị Izrel, nweekwa ụgbọ ịnyịnya agha ndị nwere mma, ọ bụrụ na ndị Izrel emerilighị ụfọdụ n’ime ha, a gaghị asị na Jehova emezughị ihe o kwere ha ná nkwa. (Josh. 17:16-18; Ikpe 4:13) Kama nke ahụ, akụkọ ndị a kọrọ na Baịbụl gosiri na ihe mere e ji merie ụmụ Izrel mgbe ụfọdụ bụ n’ihi na ha hapụrụ Chineke ha.—Ọnụ Ọgụ. 14:44, 45; Josh. 7:1-12.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
Ị̀ Maara?
Ọ̀ bụ eziokwu na oké ọhịa juru n’Izrel oge ochie otú ahụ Baịbụl kwuru?
BAỊBỤL kwuru na e nwere ebe ndị bụ́ oké ọhịa n’Ala Nkwa ahụ nakwa na osisi ndị dị na ha ‘dị ọtụtụ.’ (1 Eze 10:27; Jọsh. 17:15, 18) Ma, ebe ọ bụ na osisi adịghịzi n’ọtụtụ ebe n’Ala Nkwa ahụ taa, ndị na-arụ ihe Baịbụl kwuru ụka nwere ike ichewe ma ihe Baịbụl kwuru ọ̀ bụkwa eziokwu.
Otu akwụkwọ nke kwuru banyere otú ihe dị n’Izrel oge ochie kọwara na e nwere oké ọhịa n’Izrel oge ochie karịa ugbu a. Osisi ndị juru n’ugwu ndị dị n’ala ahụ bụ osisi Alepo paịn, osisi ok, na osisi terebint. Osisi sịkamọ jukwara eju na Shefila, ya bụ, n’ebe e nwere obere ugwu ndị dị n’agbata nnukwu ugwu ndị dị n’Izrel na Ụsọ Oké Osimiri Mediterenian.
Akwụkwọ ọzọ nke kwuru banyere osisi ndị e kwuru okwu ha na Baịbụl kwuru na osisi adịghịzi n’ebe ụfọdụ n’Izrel. Gịnị kpatara ya? Akwụkwọ ahụ kwuru na ndị mmadụ ji nwayọọ nwayọọ gbutuchaa osisi ndị ahụ ka ala ugbo ha bukwuo ibu nakwa ka ha hụ ebe anụ ụlọ ha ga na-ata ahịhịa. E nwekwara osisi ndị ha ji rụọ ụlọ na ndị ha ji mere nkụ.