Ihe E Kwuru n’Akwụkwọ Ndị A Kpọrọ Aha n’Usoro Ihe Omume Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ
JULAỊ 5-11
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | DIUTERỌNỌMI 11-12
“Otú Jehova Chọrọ Ka E Si Na-efe Ya”
it-2 1007 ¶4
Mkpụrụ Obi
Mmadụ Iji Obi Ya Niile Eje Ozi. Ihe ndị anyị kwuru gosiri na ihe bụ́ isi “mkpụrụ obi” pụtara bụ mmadụ n’ozuzu ya. Ma, amaokwu Baịbụl ụfọdụ kwuru ka anyị jiri ‘obi anyị dum na mkpụrụ obi anyị dum’ na-ejere Chineke ozi (Diut. 4:29; 11:13, 18). Dị ka ihe atụ, Diuterọnọmi 6:5 sịrị: “Jiri obi gị dum na mkpụrụ obi gị dum na ike gị dum hụ Jehova bụ́ Chineke gị n’anya.” Jizọs kwukwara na anyị kwesịrị iji mkpụrụ obi anyị dum na ike anyị dum, ‘jirikwa uche anyị dum’ na-ejere Jehova ozi. (Mak 12:30; Luk 10:27) Ma ajụjụ bụ, gịnịzi mere e ji kpọọ ihe ndị ọzọ ahụ aha n’otu n’otu ebe ọ bụ na ha niile so n’ihe mkpụrụ obi pụtara. Lee ihe atụ ga-enyere anyị aka ịghọta ihe mere o ji dị otú ahụ: Mmadụ nwere ike ire onwe ya (ya bụ, mkpụrụ obi ya) ịgbara onye ọzọ ohu, bụrụzie nke nna ya ukwu. Ma, o nwere ike ghara iji obi ya dum na-ejere nna ya ukwu ozi. Nke a nwere ike ime ka ọ ghara iji ike ya dum ma ọ bụ uche ya dum na-ejere nna ya ukwu ozi. (Tụlee Efe. 6:5; Kọl. 3:22.) Ọ bụ ihe a mere e ji kpọọ ihe ndị nke ọzọ ahụ aha ka anyị nwee ike icheta ha ma jiri nke ọ bụla n’ime ha na-ejere Chineke, bụ́ Onyenwe anyị, ozi, na-ejekwara Ọkpara ya ji ndụ ya gbapụta anyị ozi. Mmadụ iji “mkpụrụ obi” ya dum ejere Chineke ozi pụtara mmadụ iji ihe niile gbasara onwe ya na-ejere Chineke ozi.—Tụlee Mat. 5:28-30; Luk 21:34-36; Efe. 6:6-9; Fil. 3:19; Kọl. 3:23, 24.
it-1 84 ¶3
Ebe Ịchụàjà
A gwara ụmụ Izrel ka ha kwatuo ebe ịchụàjà niile e ji ekpere arụsị, kụrisie ogidi nsọ niile, ma gbutusie ogwe osisi dị nsọ ndị na-adịkarị n’akụkụ ebe ịchụàjà ndị ahụ. (Ọpụ. 34:13; Diut. 7:5, 6; 12:1-3) Ha ekwesịghị ịnwa anwa fewe ihe ndị a ofufe ma ọ bụ bido isure ụmụ ha n’ọkụ otú ahụ ndị Kenan na-eme. (Diut. 12:30, 31; 16:21) Kama inwe ọtụtụ ebe ịchụàjà, ha ga-enwe naanị otu ebe ịchụàjà ha ga-anọ na-efe otu ezi Chineke. Ọ bụkwa ebe Jehova họọrọ ka a ga-arụ ya. (Diut. 12:2-6, 13, 14, 27; ha ekwesịghị ịdị ka ndị Babịlọn, ndị nwere ebe ịchụàjà otu narị na iri asatọ maka naanị chi nwaanyị Ishta.) E bu ụzọ gwa ha ka ha jiri nkume a na-awaghị awa wuo ebe ịchụàjà mgbe ha gafechara Osimiri Jọdan (Diut. 27:4-8), ọ bụkwa Jọshụa wuru ya n’Ugwu Ibal. (Jọsh. 8:30-32) Mgbe ụmụ Izrel kechara ala obodo ndị ha meriri, ebo Ruben, ebo Gad, na ọkara ebo Manase rụrụ ebe ịchụàjà buru ezigbo ibu n’akụkụ Jọdan. Ebe ịchụàjà a ha rụrụ mere ka ebo ndị ọzọ nke Izrel weso ha iwe ha ruo mgbe a chọpụtara na ha arụghị ya maka ife chi ọzọ kama na ha rụrụ ya ka ọ bụrụ ihe àmà na ha agaghị akwụsị ijere Jehova bụ́ ezi Chineke ozi.—Jọsh. 22:10-34.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-1 925-926
Ugwu Gerizim
Ntakịrị oge ụmụ Izrel merichara E-aị, Jọshụa gwara ha ka ha gbakọta n’Ugwu Gerizim na n’Ugwu Ibal dị ka Mozis gwara ha mee. A nọ ebe ahụ gụpụtara ha ngọzi ndị ha ga-enweta ma ọ bụrụ na ha erubere Jehova isi nakwa nkọcha ndị ga-abịara ha ma ha nupụrụ ya isi. Ebo Simiọn, ebo Livaị, ebo Juda, ebo Ịsaka, ebo Josef, na ebo Benjamin gbakọrọ n’ihu Ugwu Gerizim. Ndị Livaị guzo na ndagwurugwu, igbe ọgbụgba ndụ dịkwa ebe ahụ. Ebo isii ndị ọzọ gbakọrọ n’ihu Ugwu Ibal. (Diut. 11:29, 30; 27:11-13; Jọsh. 8:28-35) Ọ ga-abụ na ebo ndị guzo n’ihu Ugwu Gerizim nọ na-azaghachi mgbe ahụ a na-agụpụta ngọzi ndị ahụ, ebo ndị nke ọzọ guzo n’ihu Ugwu Ibal a na-azaghachi mgbe a na-agụpụta nkọcha ndị ahụ. Ọ bụ eziokwu na ụfọdụ ndị ekwuola na ihe mere e ji gụọrọ ndị nọ n’ihu Ugwu Gerizim ngọzi ndị ahụ bụ n’ihi na ugwu ahụ mara ezigbo mma, na-emekwa nri. Ha kwukwara na ihe mere e ji gụọrọ ndị nọ n’ihu Ugwu Ibal nkọcha bụ n’ihi na ugwu ahụ bụ nkume nkume, ọ naghịkwa eme nri. Ma, Baịbụl ekwughị gbasara ihe ndị a. A gụpụtara Iwu ahụ n’olu dara ụda “n’ihu ọgbakọ Izrel dum, tinyere ndị inyom na ụmụntakịrị na ndị mbịarambịa ndị bi n’etiti ha.” (Jọsh. 8:35) Ìgwè mmadụ niile gbakọtaranụ n’ihu ugwu ndị ahụ nụrụ ihe ndị e kwuru nke ọma. Ọ ga-abụ na otú ebe ahụ dị so mee ka ihe ndị ahụ a na-ekwu na-adapụta ụda nke ọma.
JULAỊ 12-18
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | DIUTERỌNỌMI 13-15
“Otú Iwu Jehova Nyere Ụmụ Izrel Si Gosi na O Ji Ndị Ogbenye Kpọrọ Ihe”
it-2 1110 ¶3
Otu Ụzọ n’Ụzọ Iri
Ọ ga-abụ na e nwere otu ụzọ n’ụzọ iri ọzọ a na-ewepụta iche kwa afọ maka ihe ọzọ. Ihe e bu n’obi ewepụta ya abụghị maka iji ya nyere ndị Livaị bụ́ ndị nchụàjà aka, ọ bụ eziokwu na ndị Livaị na-eritekwa uru na ya. A na-ejikarị ya enyere ezinụlọ ọ bụla nọ n’Izrel aka ma ha zukọta maka ememme ndị a na-eme n’Izrel. Ọ bụrụ na ebe mmadụ nọ dị anya na Jeruselem nke na ọ gaghị adịrị ya mfe ibute otu ụzọ n’ụzọ iri nke ya, ọ na-ere ihe ahụ ma weta ego ya. Ezinụlọ ndị Izrel na-eji ya elekọta onwe ha ma ha gaa mgbakọ na Jeruselem. (Diut. 12:4-7, 11, 17, 18; 14:22-27) Ná ngwụcha afọ nke atọ na afọ nke isii nke afọ asaa ọ bụla, anaghị eji otu ụzọ n’ụzọ iri a elekọta ezinụlọ dị iche iche n’oge a na-eme mgbakọ na Jeruselem. Kama, a na-eji ya elekọta ndị Livaị, ndị mbịarambịa, ụmụ nwaanyị di ha nwụrụ, na ụmụ na-enweghị nna.—Diut. 14:28, 29; 26:12.
it-2 833
Afọ Izu Ike
Ihe ọzọ a na-akpọ afọ Izu Ike bụ ‘afọ e ji akagbu ụgwọ [hash·shemit·tahʹ].’ (Diut. 15:9; 31:10) N’afọ ahụ, ndị Izrel na-ahapụ ala ka o zuru ike. Ha a gaghị akọ ihe ọ bụla na ya. (Ọpụ. 23:11) A na-akagbukwa ụgwọ niile ndị mmadụ ji. Ọ bụ “ụgwọ a na-akagbu n’ihi Jehova.” Ụfọdụ ndị na-ekwu na a naghị akagbu ụgwọ ndị ahụ kpamkpam. Kama, na onye Izrel gbazinyere onye Izrel ibe ya ihe agaghị abịa gbawa ya ụgwọ n’afọ ahụ n’ihi na o nweghị ebe onye ahụ ga-esi nweta ihe ọ ga-eji akwụ ya ụgwọ ebe ọ bụ na ọ gaghị arụ ọrụ ugbo n’afọ ahụ. Ma, o nwere ike ịgba onye mba ọzọ ụgwọ ihe ọ gbazinyere ya. E nwekwara ndị chere na ihe a ụfọdụ ndị na-ekwu abụghị eziokwu. (Diut. 15:1-3) Ụfọdụ ndị rabaị na-ekwu na ọ bụ ego a gbazinyere ogbenye iji nyere ya aka ka a na-akagbu, ọ bụghị nke a gbazinyere mmadụ maka azụmahịa. Ha kwukwara na narị afọ mbụ nke oge Ndị Kraịst, na Hillel wepụtara iwu kwuru na onye gbazinyere mmadụ ihe nwere ike ịga n’ụlọikpe ma kwuo ihe ga-eme ka ihe e ji ya n’ụgwọ ghara ifunahụ ya.—The Pentateuch and Haftorahs, nke J. Hertz dezigharịrị, Lọndọn, 1972, peeji nke 811, na nke 812.
it-2 978 ¶6
Ohu
Iwu ndị na-achị mmekọrịta ohu na nna ya ukwu. N’ala Izrel, otú e si ewere ohu bụ́ onye Hibru dị iche n’otú e si ewere ohu bụ́ onye mba ọzọ. A na-ahapụ ohu bụ́ onye Hibru ka o nwere onwe ya n’afọ nke asaa nke ịgba ohu ya, ma ọ bụ n’afọ Jubili, nke ọ bụla bu ụzọ. A na-ewerekwa ya ka onye ọrụ e goro ego. (Ọpụ. 21:2; Lev. 25:10; Diut. 15:12) Ma, ohu na-abụghị onye Hibru na-anọgide na-abụ nke nna ya ukwu. Nna ya ukwu nwụọ, o nwekwara ike ịgbawaziri nwa nna ya ukwu ohu. (Lev. 25:44-46) Onye Hibru rere onwe ya ka ọ gbawara onye mbịarambịa ohu nwere ike ịgbara onwe ya ma ọ bụkwanụ onye ọzọ o ruuru agbara ya mgbe ọ bụla ọ chọrọ. Ihe ga-ekpebi ego ole a ga-eji agbara ya bụ afọ ole fọrọnụ tupu afọ Jubili ma ọ bụ afọ nke asaa n’ịgba ohu ya eruo. (Lev. 25:47-52; Diut. 15:12) A hapụwa onye Hibru bụ́ ohu ka o nwere onwe ya, nna ya ukwu ga-enye ya onyinye ga-enyere ya aka ibido ndụ. (Diut. 15:13-15) Ọ bụrụ na ohu ahụ na nwunye ya so bịa ịgba ohu, nwunye ya ga-eso ya ala. Ma, ọ bụrụ na nna ya ukwu lụnyere ya nwaanyị, (o nwere ike ịbụ nwaanyị mba ọzọ nke na-agaghị enwere onwe ya n’afọ nke asaa nke ịgba ohu ya) nwaanyị ahụ na nwa ọ bụla ọ mụtara ga-abụ nke nna ya ukwu. Ọ́ dị otú ahụ, ohu ahụ bụ́ onye Hibru nwere ike ikpebi ma ọ̀ ga-anọgide na nke nna ya ukwu. Ya kpebie ịnọgide, a ga-eji ahà hapuo ya ntị iji gosi na ọ ga-anọgide na-agbara nna ya ukwu ohu ruo mgbe a na-akaghị aka.—Ọpụ. 21:2-6; Diut. 15:16, 17.
JULAỊ 19-25
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | DIUTERỌNỌMI 16-18
“Ihe Ndị Ga-enyere Mmadụ Aka Ikpe Ikpe n’Ezi Omume”
it-1 343 ¶5
Ikpuchi Anya
E nwere ike ikwu na e kpuchiri onyeikpe anya ma o kpee ikpe na-ezighị ezi n’ihi aka azụ e nyere ya. N’Iwu Chineke nyere ụmụ Izrel, ọ gwara ha ọtụtụ ihe ga-enyere ha aka izere iri ngarị, ịnara onyinye n’ikpe, ma ọ bụ ile mmadụ anya n’ihu. Ihe ndị a nwere ike ikpuchi onye na-ekpe ikpe anya mezie ka ọ ghara ikpe ikpe ziri ezi. “Ngarị na-ekpuchi ndị na-ahụ ụzọ nke ọma anya.” (Ọpụ. 23:8) “Ngarị na-ekpuchi anya ndị maara ihe.” (Diut. 16:19) N’agbanyeghị otú onye ikpe bụruru n’onye ezi omume ma ọ bụ otú o nweruru ná nghọta, e nye ya onyinye, o nwere ike ime ka ọ gbagọọ ikpe ma ọ ma ụma ma ọ bụ na ọ maghị ụma. Ọ bụghị naanị onyinye ka Iwu Chineke kwuru nwere ike ime ka mmadụ gbagọọ ikpe. Kama, o kwukwara na mmadụ nwere ike iji maka ụdị onye ọ na-ekpe ikpe gbagọọ ikpe. Ọ sịrị: “Unu elela onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya anya n’ihu mgbe unu na-emeso ya ihe, unu enwela mmasị karị n’ebe onye ukwu nọ.” (Lev. 19:15) N’ihi ya, onyeikpe ekwesịghị iji maka na mmadụ bụ ọgaranya kpegide ya ikpe. O kwesịghịkwa ikpegide mmadụ ikpe n’ihi ụdị onye onye ahụ bụ ma ọ bụ n’ihi na ọ bụ onye a ma ama.—Ọpụ. 23:2, 3.
it-2 511 ¶7
Ọnụ Ọgụgụ
Abụọ. A na-ekwukarị banyere ọnụ ọgụgụ a bụ́ abụọ n’okwu ikpe. Ọ bụrụ na ndị àmà abụọ ekwuo otu ihe, ọ na-eme ka e kwatakwuo n’ihe ha kwuru. Iji mee ka e kweta na ihe a na-ekwu bụ eziokwu, a ga-enwerịrị ndị àmà abụọ ma ọ bụ atọ ga-agba àmà n’ihu ndị ikpe. A na-emekwa ụdị ihe a n’ọgbakọ Ndị Kraịst. (Diut. 17:6; 19:15; Mat. 18:16; 2 Kọr. 13:1; 1 Tim. 5:19; Hib. 10:28) Chineke mere ihe a mgbe o zitere Ọkpara ya ka ọ bịa zọpụta ụmụ mmadụ. Jizọs kwuru, sị: “E dekwara n’Iwu unu, sị, ‘Àmà mmadụ abụọ gbara bụ eziokwu.’ Ọ bụ m na-agba àmà banyere onwe m, Nna m nke zitere m na-agbakwa àmà banyere m.”—Jọn 8:17, 18.
it-2 685 ¶6
Onye Nchụàjà
Ọ bụ ndị nchụàjà ka e nyere ọrụ ịkọwa iwu Chineke. Ha na-elebakwa anya n’okwu ikpe. Ha na-enyere ndị ikpe aka n’obodo ndị ha na-elekọta. E nwee okwu ikpe siri oké ike nke ụlọikpe dị n’obodo ahụ na-agaghị elebali anya na ya, ha na-enye aka leba okwu ikpe ahụ anya. (Diut. 17:8, 9) Iwu kwuru na ha na ndị okenye obodo ga-eso kpee ikpe gbasara onye e gburu a na-amaghị onye gburu ya iji jide n’aka na e mere ihe niile otú iwu kwuru ka a ghara iwetara obodo ikpe ọmụma ọbara. (Diut. 21:1, 2, 5) Nwoke bo nwunye ya ebubo na ọ kwara iko, ọ ga-akpọta ya n’ebe nsọ, onye nchụàjà ga-emekwa ihe ụfọdụ iwu kwuru ka o mee ka Jehova jiri aka ya mee ka a mata ma aka nwaanyị ahụ ọ̀ dị ọcha ka ò mere ihe ahụ n’eziokwu. (Ọnụ Ọgụ. 5:11-31) Ikpe ọ bụla ndị nchụàjà ma ọ bụ ndị ikpe kpere ga-adị otú ahụ. A ga-egbu onye ọ bụla leziri anya nupụ isi n’ihe ha kpebiri.—Ọnụ Ọgụ. 15:30; Diut. 17:10-13.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-1 787
Nchụpụ
N’Iwu Chineke nyere ụmụ Izrel, o kwuru na tupu e gbuo mmadụ n’ihi mmehie ya, a ga-enwe, ọ́ dịkarịa ala, ndị akaebe abụọ ga-agba akaebe na o mere mmehie ahụ n’eziokwu. (Diut. 19:15) A maa onye ahụ ikpe, ọ bụ ndị akaebe ahụ ga-ebu ụzọ tụọ ya nkume. (Diut. 17:7) Ihe a ga-egosi na ha na-anụ ọkụ n’obi n’idebe iwu Chineke nakwa n’ime ka nzukọ Izrel dịrị ọcha. Ọ ga-emekwa ka ndị ọzọ ghara ịgbara ọsọ gaa gbaa akaebe n’ihe na-edoghị ha anya ma ọ bụ gbaa akaebe ụgha.
JULAỊ 26–ỌGỌST 1
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | DIUTERỌNỌMI 19-21
“Jehova Ji Ndụ Mmadụ Kpọrọ Ihe”
it-1 344
Ọbara
Chineke nyere mmadụ ndụ, mmadụ kwesịkwara ịdị ndụ Chineke nyere ya. N’ihi ya, onye ọ bụla wepụrụ ndụ mmadụ ga-aza Chineke ajụjụ banyere ya. Ọ bụ ihe mere mgbe Ken gburu Ebel. Chineke gwara ya, sị: “Ọbara nwanne gị si n’ala na-etiku m.” (Jen. 4:10) Ọ bụrụ na mmadụ kpọrọ nwanna ya asị, na-achọ ka ọ nwụọ, na-ekwutọ ya, ma ọ bụkwanụ na-agbagide ya akaebe ụgha, nke ga-etinye ndụ nwanna ya ná nsogbu, onye ahụ ga-ewetara onwe ya ikpe ọmụma ọbara n’ihe gbasara ọbara nwanna ya.—Lev. 19:16; Diut. 19:18-21; 1 Jọn 3:15.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-1 518 ¶1
Ụlọikpe
Ụlọikpe obodo na-adị n’ọnụ ụzọ ámá obodo. (Diut. 16:18; 21:19; 22:15, 24; 25:7; Rut 4:1) Ọ na-adị na mbara ala dị n’akụkụ ọnụ ụzọ ámá obodo. Ọ bụ n’ebe ahụ ka a na-anọ agụpụtara ndị mmadụ Iwu Chineke, na-agwakwa ha ihe a chọrọ ka ha mee. (Nehe. 8:1-3) Ebe ọ bụ na ọtụtụ ndị na-esi n’ọnụ ụzọ ámá obodo apụ ma na-abata mgbe niile, ọ na-adị mfe ịnọ ebe ahụ nweta ndị ga-abụ ndị akaebe mgbe a na-eme ihe ndị dị ka ire ala. Ihe ọzọ bụ na ìgwè mmadụ na-anọ ebe ahụ nwere ike ime ka ndị ikpe kpachapụ anya mgbe ha na-ekpe ikpe ka ha ghara ikpe ikpe na-ezighị ezi. Ọ ga-abụ na e nwere ebe dị mma e wepụtara n’akụkụ ọnụ ụzọ àmà ahụ ndị ikpe na-anọ ekpe ikpe. (Job 29:7) Samuel gara Betel, Gilgal, na Mizpa “na-ekpe Izrel ikpe n’ebe ndị a niile.” O kpekwara ikpe na Rema bụ́ ebe ụlọ ya dị.—1 Sam. 7:16, 17.
ỌGỌST 2-8
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | DIUTERỌNỌMI 22-23
“Otú Iwu Jehova Nyere Ụmụ Izrel Si Gosi na O Ji Ụmụ Anụmanụ Kpọrọ Ihe”
it-1 375-376
Ibu Arọ
N’oge ochie, a na-ejikarị ụmụ anụmanụ ebu ibu. A gwara ụmụ Izrel na ọ bụrụ na ha ahụ ịnyịnya ibu onye iro ha ka o bu ibu makpuru, kama ha ga-ahapụ ya, na ha kwesịrị ‘ịtọpụ ya.’ (Ọpụ. 23:5) A na-eji ibu anụmanụ ga-ebuli akọwa otú ibu hà. E nwere ike ịsị: “Ibu ‘ịnyịnya ibu abụọ ga-ebu.’”—2 Eze 5:17.
it-1 621 ¶1
Diuterọnọmi
Iwu Chineke nyere ụmụ Izrel nke e dere n’akwụkwọ Diuterọnọmi gosiri na ọ na-echebara ụmụ anụmanụ echiche. A gwara ha ka ha ghara ịnwụrụ nne nnụnụ kpu n’akwụ́ ya n’ihi na ihe mere o ji kpuru ebe ahụ bụ ka o chebe ụmụ ya. Ha nwere ike ịnwụrụ ụmụ ya, ma hapụ nne ha ka o felaga. Ihe a ga-eme ka nne nnụnụ ahụ nwee ike ịmụta ụmụ ọzọ (Diut. 22:6, 7) Onye ọrụ ugbo ekwesịghị ijikọta ịnyịnya ibu na oké ehi ma jiri ha na-akọ ihe n’ihi na ọ ga-abụ imegbu anụmanụ nke na-adịghị ike. (22:10) Ha ekwesịghị ikechi ọnụ oké ehi mgbe ọ na-azọcha mkpụrụ ka agụụ ghara ịgụgbu ya ebe ọ bụkwanụ na mkpụrụ ọ ga-eri nọ ebe ahụ, o jikwa ike ya niile na-azọcha ya.—25:4.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-1 600
Ụgwọ, Onye Ụgwọ
Ụgwọ bụ ihe mmadụ ji onye ọzọ nke iwu ji ya ịkwụ ya. N’Izrel oge ochie, ihe mere a na-ejikarị eji ụgwọ bụ n’ihi ụkọ ego. Onye Izrel ịghọ onye ji ụgwọ abụghị ihe ọma. Onye ahụ ji ụgwọ na-abịazi bụrụ ohu nke onye o ji ụgwọ. (Ilu 22:7) N’ihi ya, Chineke nyere ụmụ Izrel iwu ka ha na-emesapụ aka ma jiri obi ha niile na-agbazinye ndị Izrel ibe ha nọ ná mkpa ihe, gharakwa ịna ha ọmụrụ nwa. (Ọpụ. 22:25; Diut. 15:7, 8; Ọma 37:26; 112:5) Ma, ha nwere ike ịna ndị mba ọzọ ọmụrụ nwa. (Diut. 23:20) Ụfọdụ ndị Juu kwuru na ọ bụ n’azụmahịa ka e kwuru ka a na-eme ihe a, na ọ bụghị n’ihe mmadụ gbazinyere onye nọ ná mkpa. Ndị mba ọzọ na-anọ obere oge n’ala Izrel. Ọtụtụ mgbe, ha na-abịa ịzụ ahịa. N’ihi ya, a na-ana ha ọmụrụ nwa, karịchaa ebe ọ bụ na hanwa na-anakwa ndị ọzọ ọmụrụ nwa ma ha gbazinye ha ego.
ỌGỌST 9-15
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | DIUTERỌNỌMI 24–26
“Otú Iwu Jehova Nyere Ụmụ Izrel Si Gosi na O Ji Ụmụ Nwaanyị Kpọrọ Ihe”
it-2 1196 ¶4
Ụmụ Nwaanyị
Iwu ndị e nyere banyere ịga agha baara ndị di na nwunye uru. Otu n’ime ha kwuru na nwoke lụrụ nwaanyị ọhụrụ agaghị aga agha ruo otu afọ. Ihe a mere ka di na nwunye nwee ike ịmụta nwa. Ọ bụrụzie na nwoke ahụ emechaa gaa agha ma ọ bụkwanụ nwụọ n’agha, nwaanyị ahụ e nwee nwa ọ ga-eji na-akasi onwe ya obi.—Diut. 20:7; 24:5.
it-1 963 ¶2
Ịtụtụ Ihe E Wefọrọ n’Ubi
Iwu a na-akụziri ụmụ Izrel ịna-emesapụ aka, ịna-enyere ndị ọzọ aka, na ịna-atụkwasị ya obi na ọ ga-agọzi ha. Ma, ọ naghị akụziri ha ịdị umengwụ. Ihe a mere ka anyị ghọta ihe Devid kwuru mgbe ọ sịrị: “Ahụbeghị m ka a hapụrụ onye ọ bụla bụ́ onye ezi omume kpamkpam, ahụbeghịkwa m ụmụ ya ka ha na-arịọ nri.” (Ọma 37:25) Ọ bụrụ na mmadụ, ọ sọgodị ya ya bụrụ ogbenye, agbalịsie ike gaa tụtụrụ ihe e wefọrọ n’ubi, agụụ agaghị agụgbu ya, ya na ụmụ ya agaghịkwa arịọ nri.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-1 640 ¶5
Ịgba Alụkwaghịm
Akwụkwọ Ịgba Alụkwaghịm. Iwu Mozis kwuru na e nwere ihe ụfọdụ nwoke nwere ike iji maka ya nye nwunye ya akwụkwọ ịgba alụkwaghịm. Ma, ụfọdụ ndị mechara jiri maka ihe ndị na-enweghị isi na-enye nwunye ha akwụkwọ ịgba alụkwaghịm. Ma, e kwesịghị iji maka ihe a ụfọdụ ndị na-eme kwuo na Iwu Mozis mere ka ọ dị mfe onye Izrel ịgba nwunye ya alụkwaghịm. Tupu onye Izrel agbaa nwunye ya alụkwaghịm, o nwere ihe ndị iwu kwuru na o kwesịrị ime. O kwesịrị ide akwụkwọ, ya bụ, ‘idere ya akwụkwọ ịgba alụkwaghịm.’ O dechaa ya, ọ ga-ewere ya “nye ya n’aka, wee chụpụ ya n’ụlọ ya.” (Diut. 24:1) Ọ bụ eziokwu na o nweghị ihe ndị ọzọ Akwụkwọ Nsọ kwuru gbasara ihe a, ma o nwere ike ịbụ na nwoke ahụ ga-ebu ụzọ kpọtụrụ ndị a họpụtara ileba ụdị okwu ahụ anya. Ndị ahụ nwere ike ibu ụzọ gbaa ya ume ka ya na nwunye ya mezie. Oge ọ ga-ewe nwoke ahụ iji kwadebe akwụkwọ ịgba alụkwaghịm ahụ na nke ọ ga-ewe ya iji nweta ikike ịgba nwunye ya alụkwaghịm ga-enye ya ohere ichebakwuru ihe ọ chọrọ ime echiche ka ọ mara ma ọ̀ ga-aga n’ihu. A ga-enwerịrị ezigbo ihe mere o ji chọọ ịgba alụkwaghịm. Ọ ga-emekwa ihe niile iwu kwuru tupu ya enwee ike ịgba nwunye ya alụkwaghịm. Ihe a ga-eme ka ndị mmadụ ghara iji ọkụ ọkụ na-agba alụkwaghịm. Ọ ga-echebekwa nwaanyị ahụ a chọrọ ịgba alụkwaghịm. Akwụkwọ Nsọ ekwughị ihe ndị a na-edenye ‘n’akwụkwọ ịgba alụkwaghịm’ ahụ.
ỌGỌST 16-22
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-1 360
Ihe E Ji Kpaa Ókè
Jehova nyere ụmụ Izrel iwu kwuru ka ha ghara iwela ihe ndị e ji kpaa ókè azụ. (Diut. 19:14; gụọkwa Ilu 22:28.) Iwu ahụ kwudịrị na onye welara “ihe e ji kpaa ókè n’ala mmadụ ibe ya azụ” bụ onye a bụrụ ọnụ. (Diut. 27:17) Ebe ọ bụ na ndị nwere ala na-esi n’ihe ha kọpụtara n’ala ha enweta ihe ndị ha ji ebi ndụ, iwela ihe e ji kpaa ókè ala azụ ga-apụta ịnapụ onye nwe ala ahụ ihe ụfọdụ o ji ebi ndụ. Ime ihe a dị ka izu ohi. Ọ bụ otú e si ele ya anya n’oge ochie. (Job 24:2) Ma, o nwere ndị nọ na-eme ihe a n’oge ahụ. N’oge Hosia, e ji ndị isi Juda tụnyere ndị na-ewela ihe e ji kpaa ókè azụ.—Hos. 5:10.
ỌGỌST 23-29
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-1 665 ¶3
Ntị
Jehova si n’ọnụ ndị ohu ya kwuo na ndị Izrel na-anaghị erubere ya isi nwere “ntị a na-ebighị úgwù.” (Jere. 6:10; Ọrụ 7:51) Ha dị ka ndị ntị ha kpọchiri akpọchi. Jehova kwere ka ntị ha kpọchie. Ma, ọ na-enye ndị na-achọ ya ntị nke ịghọta ihe na nke irube isi ma na-ekwe ka ntị nke ndị na-enupụrụ ya isi ghara ịghọta eziokwu banyere ya. (Diut. 29:4; Rom 11:8) Pọl onyeozi kwuru na a ga-enwe oge ndị ụfọdụ sị na ha bụ Ndị Kraịst ga-esi n’ezi ofufe dapụ. Ha agaghị achọ ịnụ eziokwu nke Okwu Chineke. Kama, ha ga-achọ ịna-anụ “ihe na-atọ ha ụtọ ná ntị,” sizie otú ahụ na-ege ndị ozizi ụgha ntị. (2 Tim. 4:3, 4; 1 Tim. 4:1) Ntị mmadụ nwere ike ‘ịzụ wuruwuru’ ma ọ nụ akụkọ ndị na-emenye ụjọ, karịchaa akụkọ banyere ọdachi.—1 Sam. 3:11; 2 Eze 21:12; Jere. 19:3.