Ihe E Kwuru n’Akwụkwọ Ndị A Kpọrọ Aha n’Usoro Ihe Omume Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ
MEE 3-9
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-2 528 ¶5
Àjà
Àjà ihe ọṅụṅụ. A na-achụ àjà ihe ọṅụṅụ ma a chụwa ọtụtụ n’ime àjà ndị ọzọ ụmụ Izrel na-achụ, karịchaa malite mgbe ha banyechara n’Ala Nkwa ahụ. (Ọnụ Ọgụ. 15:2, 5, 8-10) A na-eji mmanya (“mmanya na-egbu egbu”) achụ àjà a. A na-awụsakwa ya n’elu ebe ịchụàjà. (Ọnụ Ọgụ. 28:7, 14; tụlee Ọpụ. 30:9; Ọnụ Ọgụ. 15:10) N’akwụkwọ ozi Pọl onyeozi degaara Ndị Kraịst nọ na Filipaị, ọ gwara ha, sị: “Ọ bụrụgodị na a na-awụsa m dị ka àjà ihe ọṅụṅụ n’elu àjà a na-achụ n’ihe metụtara ozi a na-ejere ọha mmadụ, nke okwukwe kpaliri unu ime, enwere m obi ụtọ.” N’ebe a, o ji otú e si awụpụ àjà ihe ọṅụṅụ kọwaa otú o si dị njikere iwepụta onwe ya ijere Ndị Kraịst ibe ya ozi. (Fil. 2:17) Ntakịrị oge tupu ya anwụọ, o degaara Timoti akwụkwọ ozi, sị: “A malitelarị ịwụpụ m dị ka àjà ihe ọṅụṅụ, oge a kara aka a ga-atọhapụ m dịkwa nso.”—2 Tim. 4:6.
MEE 10-16
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | ỌNỤ ỌGỤGỤ 30-31
“Mezuo Nkwa I Kwere”
it-2 1162
Nkwa
A Naghị Amanye Mmadụ Amanye Ikwe Nkwa, ma Mmadụ Kwehaala Ya, Iwu Ji Ya Imezu Ya. O nwetụghị onye a na-amanye amanye ka o kwe nkwa. Ma, ozugbo mmadụ kwere nkwa, iwu ji onye ahụ imezu ya. Ọ bụ ya mere na ọ bụrụ na mmadụ ekwe nkwa na o nwere ihe ọ ga-eme, e nwere ike ikwu na ‘iwu ji mkpụrụ obi ya’ ime ihe ahụ. Ọ pụtara na o ji ndụ ya na-aṅụ iyi na ọ ga-emerịrị ihe ahụ o kwere ná nkwa. (Ọnụ Ọgụ. 30:2; gụọkwa Rom 1:31, 32.) Mmadụ ikwe nkwa n’emezughị ya nwere ike ịkpatara ya ọnwụ. Ọ bụ ya mere Akwụkwọ Nsọ ji kwuo na mmadụ kwesịrị ịkpachapụ anya tupu ya ekwe nkwa, nakwa na onye ahụ kwesịrị ilezi anya chebara ihe dị n’imezu nkwa ọ chọrọ ikwe echiche. Iwu Mozis kwuru, sị: “Ọ bụrụ na i kwe Jehova bụ́ Chineke gị nkwa, . . . Chineke gị ga-achọrịrị ka i mezuo ya, ọ ga-aghọkwara gị mmehie. Ma ọ bụrụ na ọ dịghị nkwa i kwere, ọ gaghị aghọrọ gị mmehie.”—Diut. 23:21, 22.
it-2 1162
Nkwa
O nwere ike ịbụ nkwa e kwere Chineke ime ihe ụfọdụ, ịchụ àjà ụfọdụ ma ọ bụ inye onyinye ụfọdụ, ije ozi ụfọdụ ma ọ bụ ịnọ n’ọnọdụ ụfọdụ, ma ọ bụkwanụ izere ihe ụfọdụ n’agbanyeghị na ha emegideghị iwu. Mmadụ na-eji aka ya ekpebi na ya ga-ekwe nkwa, a naghị amanye mmadụ amanye ime ya. Ekwesịghị iji nkwa egwu egwu. Ọ dị ka ịṅụ iyi. Mgbe ụfọdụ na Baịbụl, okwu abụọ a na-agakọ. (Ọnụ Ọgụ. 30:2; Mat. 5:33) “Nkwa” na-abụkarị mmadụ ikwupụta ihe ọ chọrọ ime, ebe ‘ịṅụ iyi’ na-abụkarị mmadụ ịgwa onye ka ya na ọ ga-emezu ihe ahụ o kwupụtara na ọ chọrọ ime. A na-aṅụkarị iyi iji gosi na ihe e kwuru n’ọgbụgba ndụ bụ eziokwu.—Jen. 26:28; 31:44, 53.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-2 28 ¶1
Jefta
E nwere ike inyefe Jehova mmadụ ka onye ahụ jiri ndụ ya na-ejere ya ozi n’ụlọikwuu ya. Nne na nna nwere ike ikpebi ma hà ga-enye nwa ha maka ụdị ozi a. Dị ka ihe atụ, Samuel bụ otu n’ime ndị e si otú a nye Jehova. Tupu a mụọ ya, Hana nne ya kwere Jehova nkwa na ọ ga-enye ya Samuel ka o jewere ya ozi n’ụlọikwuu. Elkena kwadokwara nkwa a nwunye ya kwere. Ngwa ngwa a napụrụ Samuel ara, Hana kpọgara ya n’ụlọikwuu ka o jewere Jehova ozi. O wegakwara anụmanụ iji chụọrọ Jehova àjà. (1 Sam. 1:11, 22-28; 2:11) Samsịn bụkwa onye ọzọ e nyere ka o jewere Jehova ozi n’ụzọ pụrụ iche. Ọ bụ onye Naziraịt.—Ikpe 13:2-5, 11-14; tụleekwa ikike nna nwere n’ebe nwa ya nwaanyị nọ dị ka e kwuru n’Ọnụ Ọgụ. 30:3-5, 16.
MEE 17-23
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | ỌNỤ ỌGỤGỤ 32-33
“Chụpụnụ Ndị Niile Bi n’Ala Ahụ”
it-1 404 ¶2
Kenan
Jọshụa ‘ewepụghị otu okwu n’ihe niile Jehova nyere Mozis n’iwu’ n’ihe gbasara ibibi ndị Kenan. (Jọsh. 11:15) Ma, mba Izrel egeghị ya ntị ma wepụchaa ihe ọ bụla ga-emebi ala ha. Ha achụpụghị ndị Kenan niile. Ihe a mere ka ha ghara ịdị ọcha. Ka oge na-aga, ọ kpataara ọtụtụ ndị ọnwụ, (kpatakwa ime mpụ, omume rụrụ arụ, na ikpere arụsị) karịadị otú ịchụpụcha ndị Kenan niile gaara akpata ma a sị na ha gere ntị. (Ọnụ Ọgụ. 33:55, 56; Ikpe 2:1-3, 11-23; Ọma 106:34-43) Jehova dọrọ ụmụ Izrel aka ná ntị na ọ gaghị ele mmadụ anya n’ihu n’ihe banyere mkpebi ikpe ya na ikpe ziri ezi ya, na ọ bụrụ na ha esoro ndị Kenan na-emekọ ihe, na-agọ ọgọ, na-efe chi ha, na-eme omenala okpukpe ha, ma ọ bụkwanụ omume ndị ọzọ rụrụ arụ, na a ga-ebibi ha otú ahụ o kwuru na a ga-ebibi ndị Kenan. ‘Ala ahụ ga-agbọpụkwa ha.’—Ọpụ. 23:32, 33; 34:12-17; Lev. 18:26-30; Diut. 7:2-5, 25, 26.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-1 359 ¶2
Ókè
Mgbe e ji ife nza matachaa ebe a ga-ekenye agbụrụ nke ọ bụla n’Izrel ala, ihe ọzọ ọ dị mkpa ka a mata bụ otú ala a ga-ekenye agbụrụ nke ọ bụla ga-aha. Ihe ga-ekpebi otú ọ ga-aha bụ otú agbụrụ nke ọ bụla hà. “Keenụ ala ahụ n’etiti onwe unu site n’ife nza ka ọ bụrụ nke unu n’ezinụlọ n’ezinụlọ. Unu ga-enye ezinụlọ dị ọtụtụ ihe nketa dị ukwuu, unu ga-enyekwa ezinụlọ dị ole na ole ihe nketa dị obere. Ebe ọ bụla nza mara, ebe ahụ ga-aghọ nke ya. Ọ bụ n’ebo n’ebo ndị nna unu ka unu ga-enweta ala.” (Ọnụ Ọgụ. 33:54) E nwee ebe nza mara na agbụrụ nke ọ bụla ga-eketa ala, ebe ahụ ka ha ga-eketa. A gaghị agbanwe ya. Ma, e nwere ike ịgbanwetụ otú ala nke e kenyere agbụrụ nke ọ bụla hà. Ọ bụ ya mere na mgbe a chọpụtara na ebe e kenyere ebo Juda buru ezigbo ibu, e webitụụrụ ya kenye ebo Simiọn.—Jọsh. 19:9.
JUN 7-13
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | DIUTERỌNỌMI 3-4
“Iwu Jehova Dị Mma ma Zie Ezie”
it-2 1140 ¶5
Nghọta
Ịmụ Okwu Chineke na iwu ya nke ọma na idebe ha nwere ike ime ka mmadụ nwee amamihe karịa ndị nkụzi ya, nweekwa nghọta karịa ndị okenye. (Ọma 119:99, 100, 130; tụlee Luk 2:46, 47.) Ihe mere o ji dị otú a bụ na amamihe na nghọta dị n’iwu na mkpebi ikpe Chineke. N’ihi ya, ọ bụrụ na ụmụ Izrel erube isi n’iwu na mkpebi ikpe ndị a, ọ ga-eme ka mba ndị gbara ha gburugburu na-ele ha anya ka “ndị maara ihe ma nwee nghọta.” (Diut. 4:5-8; Ọma 111:7, 8, 10; tụlee 1 Eze 2:3.) Onye nwere nghọta ma na onye ọ bụla kwesịrị ime ihe dị n’Okwu Chineke, ọ na-ejikwa Okwu Chineke atụle omume ya ma na-arịọ Chineke ka o nyere ya aka. (Ọma 119:169) Ọ na-ekwe ka Okwu Chineke bamie ya n’obi (Mat. 13:19-23), na-edekwa ya n’elu mbadamba nkume nke bụ́ obi ya (Ilu 3:3-6; 7:1-4), ya emezie ka ‘ọ kpọ ụzọ okwu ụgha niile asị’ (Ọma 119:104). Mgbe Ọkpara Chineke bịara n’ụwa, o nwere ụdị nghọta a. Ọ chọwadịghị ụzọ ọ ga-esi hapụ ịnwụ n’elu osisi ịta ahụhụ ebe ọ bụ otú Akwụkwọ Nsọ kwuru na ọ ga-esi anwụ.—Mat. 26:51-54.
JUN 28–JULAỊ 4
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-1 103
Ụmụ Enak
Ha bụ agbụrụ toro ezigbo ogologo ma gbaa dimkpa. Ha bi n’ebe ugwu Kenan nakwa n’ebe ụfọdụ dị n’akụkụ osimiri, karịchaa n’ebe ndịda. O nwere mgbe ụmụ nwoke atọ a ma ama bụ́ ụmụ Enak aha ha bụ Ahaịman, Shishaị na Talmaị bi na Hibrọn. (Ọnụ Ọgụ. 13:22) Ọ bụ n’ebe a ka ndị nledo iri na abụọ ahụ bụ́ ndị Hibru bu ụzọ hụ ụmụ Enak. Mmadụ iri n’ime ndị nledo ahụ kọrọ akụkọ na-emenye ụjọ banyere ụmụ Enak ahụ. Ha sịrị na ha bụ ụmụ ndị Nefilim nakwa na hanwa bụ́ ndị Hibru dị ka “ụkpara” n’anya ha. (Ọnụ Ọgụ. 13:28-33; Diut. 1:28) Otú ha si too ogologo ma gbaa dimkpa medịrị ka e jiri ha tụnyere ndị Imim na ndị Refeyim gbara ajọ dimkpa. Ọ ga-abụ otú ha si dị ike mere a na-eji atụ ilu, sị: “Ònye pụrụ iguzosi ike n’ihu ụmụ Enak?”—Diut. 2:10, 11, 20, 21; 9:1-3.