Ihe E Kwuru n’Akwụkwọ Ndị A Kpọrọ Aha n’Usoro Ihe Omume Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ
SEPTEMBA 5-11
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | 1 NDỊ EZE 9-10
“Too Jehova Maka Amamihe Ya”
Nleta E Nyeghachiri Ụgwọ Ọrụ n’Ụba
Mgbe o zutere Solomọn, eze nwanyị ahụ malitere iji “ajụjụ ndị na-agbagwoju anya” nwaa ya. (1 Ndị Eze 10:1, NW) A pụrụ ịsụgharị okwu Hibru e ji mee ihe n’ebe a ịbụ “gwam gwam gwam.” Ma nke a apụtaghị na eze nwanyị ahụ na Solomọn malitere igwu egwu ndị na-abaghị uru. Ọ dị mma ịmara na e ji otu okwu Hibru ahụ mee ihe n’Abụ Ọma 49:4 iji kọwaa ajụjụ ndị siri ike banyere mmehie, ọnwụ, na mgbapụta. Mgbe ahụ, ma eleghị anya, eze nwanyị Sheba na Solomọn nọ na-akparịta isiokwu ndị miri emi bụ́ nke nwalere otú Solomọn nweruru amamihe. Bible na-ekwu na ọ ‘gwara ya okwu nile nke dị ya n’obi.’ Solomọn n’aka nke ya, “wee gosi ya okwu ya nile: ọ dịghị okwu ọ bụla e zonahụrụ eze nke ọ na-egosighị ya.”—1 Ndị Eze 10:2b, 3.
Mgbe Mmesapụ Aka Bara Uba
N’ịbụ onye ihe ọ nụrụ ma hụ tụrụ n’anya, eze nwanyị ahụ ji obi umeala zaghachi, sị: “Ndị ihe na-agara nke ọma ka ndị ohu gị ndị a bụ, ndị na-eguzo n’ihu gị mgbe nile, ndị na-anụ amamihe gị.” (1 Ndị Eze 10:4-8) Ọ sịghị na ihe na-agara ndị ohu Solomọn nke ọma n’ihi na ha bụ ndị akụ̀ na ụba gbara gburugburu—ọ bụ ezie na ha bụ. Kama nke ahụ, ndị ohu Solomọn bụ ndị a gọziri agọzi n’ihi na ha pụrụ mgbe nile ige ntị n’amamihe Chineke nyere Solomọn. Lee ezi ihe nlereanya eze nwanyị Sheba bụụrụ ndị Jehova taa, bụ́ ndị na-erite uru n’amamihe nke Onye Okike n’onwe ya nakwa nke Ọkpara ya, bụ́ Jisọs Kraịst!
Nleta E Nyeghachiri Ụgwọ Ọrụ n’Ụba
Amamihe Solomọn na ọganihu nke alaeze ya masịrị nnọọ eze nwanyị Sheba nke na “mmụọ adịghịkwa n’ime ya ọzọ.” (1 Ndị Eze 10:4, 5) Ụfọdụ na-ewere amaokwu a ịpụta na eze nwanyị ahụ “ekughịzi ume.” Ọbụna otu ọkà mmụta nyere echiche na ọ tụbọrọ! Otú ọ bụla o si dị, ihe eze nwanyị ahụ hụrụ ma nụ juru ya anya. Ọ sịrị na ndị ohu Solomọn bụ ndị ihe na-agara nke ọma n’ihi inwe ike ịnụ amamihe nke eze a, ọ gọzikwara Jehova maka idokwasị Solomọn n’ocheeze. O nyeziri eze ahụ onyinye ndị dị oké ọnụ, ọlaedo nanị ruru ihe dị ka $40,000,000 n’ọnụ ego nke oge a. Solomọn nyekwara eze nwanyị ahụ onyinye, na-enye ya “ihe nile na-atọ ya ụtọ, ihe ọ bụla ọ rịọrọ.”—1 Ndị Eze 10:6-13.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
Ị̀ Maara?
Olee otú ọlaedo Eze Sọlọmọn nwere haruru?
Akwụkwọ Nsọ kwuru na Haịram, bụ́ eze Taya, zigaara Sọlọmọn tọn ọlaedo anọ, eze nwaanyị Shiba ebunyekwa ya ọlaedo haruru ka nke ahụ Haịram zigaara ya. Ọtụtụ ụgbọ mmiri Sọlọmọn nwere sikwa n’Ofa butere ya ihe karịrị tọn ọlaedo iri na ise. Baịbụl kwuru na “ọlaedo a na-ebutere Sọlọmọn n’otu afọ dị narị talent ọlaedo isii na iri isii na isii n’ịdị arọ,” ma ọ bụ ihe karịrị tọn iri abụọ na ise. (1 Ndị Eze 9:14, 28; 10:10, 14) Nke a ọ̀ bụ eziokwu? Olee otú ọlaedo ndị eze na-enwe n’oge ochie na-aha?
Otu ihe e dere n’oge ochie, bụ́ nke ndị ọkà mmụta kwetara na ọ bụ eziokwu, kwuru na eze Ijipt, bụ́ Fero Thutmose nke Atọ, (onye dịrị ndụ n’ihe dị ka puku afọ atọ na narị afọ ise gara aga) wetara ihe dị ka tọn ọlaedo iri na atọ na ọkara debe n’ụlọ chi bụ́ Amun-Ra nke dị na Karnak. N’ihe dị ka puku afọ abụọ na narị afọ asaa gara aga, eze Asiria, bụ́ Tiglat-pilesa nke Atọ, natara Taya ụtụ karịrị tọn ọlaedo anọ. Sargon nke Abụọ nyekwara chi Babịlọn ọlaedo hà otú ahụ n’onyinye. E kwuru na eze Masedonia, bụ́ Philip nke Abụọ (359-336 tupu a mụọ Kraịst), nwetara ihe karịrị iri tọn ọlaedo abụọ na asatọ kwa afọ n’ebe a na-egwu ọlaedo na Pangaeum, nke dị na Thrace.
E kwuru na mgbe nwa Philip, bụ́ Alexander Onye Ukwu, (336-323 tupu a mụọ Kraịst) weghaara Susa bụ́ obodo dị na Peshia, o nwetara ihe dị ka otu puku tọn ọlaedo na otu narị tọn na iri asatọ n’obodo ahụ, nwetakwa ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ puku tọn ọlaedo asaa n’ala Peshia dum. Ya mere, ọ bụrụ na e jiri otú ọlaedo ndị a kọrọ akụkọ ha n’ebe a hà tụnyere otú ọlaedo Sọlọmọn nwere hà, anyị ga-ahụ na ihe Baịbụl kwuru bụ eziokwu.
SEPTEMBA 12-18
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | 1 NDỊ EZE 11-12
“Gosi na Ị Ma Ihe Ma Ị Họrọwa Onye Ị Ga-alụ”
“Ònye Dịnyeere Jehova?”
7 Anyị nwere ike ịmụta ọtụtụ ihe n’ihe Eze Sọlọmọn mere. Mgbe ọ na-eto eto, o lekwasịrị Jehova anya ka o duzie ya. Chineke nyere ya amamihe dị egwu ma kwe ka o wuoro ya ụlọ nsọ magburu onwe ya na Jeruselem. Ma o mechara hapụ Jehova. (1 Eze 3:12; 11:1, 2) Iwu Chineke kwuru hoo haa na eze Izrel ekwesịghị ‘ịlụ ọtụtụ ndị inyom, ka obi ya wee ghara ịpụ n’ebe Chineke nọ.’ (Diut. 17:17) Sọlọmọn emeghị ihe a Chineke kwuru. O mechara lụọ narị ụmụ nwaanyị asaa, nweekwa narị ndị iko atọ. (1 Eze 11:3) Ọtụtụ ndị nwunye ya abụghị ndị Izrel, ha na-efekwa chi ọzọ. Sọlọmọn mebikwara iwu Chineke mgbe ọ lụrụ ụmụ nwaanyị ala ọzọ.—Diut. 7:3, 4.
Olee Otú Ị Ga-esi Chebe Obi Gị?
6 Setan chọrọ ka anyị dị ka ya. Ọ bụ onye nnupụisi na-anaghị eji ihe Jehova kwuru kpọrọ ihe. Ihe mere o ji eme ya bụ na ọ na-eme ihe ga-abara naanị onwe ya uru. Ọ gaghị amanyeli anyị iche echiche ka ya ma na-eme ka ya. N’ihi ya, ọ na-agbalị iji ihe ndị ọzọ emezu ihe o bu n’obi. Dị ka ihe atụ, ndị juru n’ụwa a bụ ndị o mebirila obi ha. (1 Jọn 5:19) Ọ chọrọ ka anyị na ha na-akpa, n’agbanyeghị na anyị ma na mkpakọrịta ọjọọ “na-emebi” otú anyị si eche echiche nakwa otú anyị si akpa àgwà. (1 Kọr. 15:33) O ji ụdị ihe a nweta Eze Sọlọmọn. Ọ lụrụ ọtụtụ ụmụ nwaanyị na-efe arụsị. Ha mechara megharịa ya anya, ma “jiri nke nta nke nta mee ka obi ya chigharịa” n’ebe Jehova nọ.—1 Eze 11:3.
“Ònye Dịnyeere Jehova?”
9 Ma Jehova anaghị eleghara ihe ọjọọ anya. Baịbụl kwuru, sị: “Jehova wee weso Sọlọmọn oké iwe, n’ihi na obi ya apụwo n’ebe Jehova . . . nọ, bụ́ onye pụtara ìhè n’ihu ya ugboro abụọ. Ọ bụkwa banyere ihe a ka o nyere ya iwu ka ọ ghara iso chi ọzọ dị iche iche; ma o debeghị ihe ahụ Jehova nyere ya n’iwu.” Ihe a Sọlọmọn mere mere ka Chineke kwụsị ịnọnyere ya ma na-enyere ya aka. Ụmụ Sọlọmọn achịghịzi Izrel niile. Ha takwara ahụhụ ruo ọtụtụ narị afọ.—1 Eze 11:9-13.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
Ọ Gaara Enweta Ngọzi Chineke
Rehoboam kpọkọtara ndị agha ya ka ha gaa buso ndị nupụụrụ ya isi agha. Ma, Jehova zigara Shemaya onye amụma ka ọ gwa ha, sị: “Unu agbagola ibuso ụmụnne unu, bụ́ ụmụ Izrel agha. Laghachinụ onye ọ bụla n’ụlọ ya, n’ihi na ihe a na-emenụ si m n’aka.”—1 Eze 12:21-24.
Ọ̀ dịịrị Rehoboam mfe ige Jehova ntị? Chegodị otú ihe a si nye Rehoboam nsogbu n’obi. Olee ihe i chere ndị mmadụ ga-ekwu banyere eze a yiri ndị ọ na-achị egwu na ọ ga-eji “ụtarị akpụkpọ anụ” pịa ha, ma o nweghị ihe o mere n’isi a ha nupụụrụ ya? (Tụlee 2 Ihe E Mere 13:7.) Ma, eze ahụ na ndị agha ya ‘rubere isi n’ihe Jehova kwuru, wee laghachi n’ụlọ ha dị ka okwu Jehova si dị.’
Olee ihe anyị ga-amụta n’akụkọ a? Ọ bara uru ka anyị rubere Chineke isi, a sịgodị na ndị mmadụ ga-achị anyị ọchị maka ya. Irubere Chineke isi ga-eme ka ọ gọzie anyị, anyị na ya adịrịkwa ná mma.—Diut. 28:2.
Olee uru isi a Rehoboam rubere baara ya? Ọ hapụrụ ịga buso alaeze ọhụrụ a agha, ma gaa na-ewu obodo ndị dị na Juda na Benjamin, bụ́ ndị ọ ka na-achị. O mekwara ka obodo ụfọdụ “sikwuo ike nke ukwuu.” (2 Ihe 11:5-12) Nke ka nke, o rubeere Jehova isi ruo oge ụfọdụ. Ka alaeze ebo iri Jeroboam na-achị malitere ife chi ọzọ, ọtụtụ n’ime ha gara Jeruselem ka ha fee Chineke, ma si otu ahụ ‘kwado Rehoboam.’ (2 Ihe 11:16, 17) N’ihi ya, ọchịchị Rehoboam bịara sikwuo ike n’ihi na o rubeere Jehova isi.
SEPTEMBA 19-25
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | 1 NDỊ EZE 13-14
“Gịnị Mere M Kwesịrị Iji Dị Umeala n’Obi, Ihe M Nwere Ejukwa M Afọ?”
Jiri Obi Dị n’Otu Na-eguzosi Ike
4 Jeroboam wee sị onye nke ezi Chineke ahụ: “Soro m ka anyị gaa n’ụlọ rie ihe, ka m nyekwa gị onyinye.” (1 Eze 13:7) Gịnị ka onye amụma ahụ ga-eme ugbu a? Ọ̀ ga-ekwe soro eze gaa n’ụlọ ya ugbu a o zichara ya ozi ikpe ọmụma Chineke? (Ọma 119:113) Ka ọ̀ ga-ajụ iso eze lawa n’agbanyeghị na o yiri ka eze ahụ ò chegharịala? Jeroboam nwere nnọọ ọtụtụ onyinye ndị dị oké ọnụ ahịa ọ ga-enye onye ọ bụla dị ya mma. Ọ bụrụ na onye amụma Chineke ahụ bụ onye hụrụ ihe onwunwe n’anya, ihe a eze kwere nkwa inye ya ga-adọ ya ezigbo akpịrị. Ma, Jehova nyere onye amụma ahụ iwu, sị: “Erila ihe oriri, aṅụkwala mmiri, esikwala n’ụzọ i siri gaa laghachi.” Ọ bụ ya mere onye amụma ahụ ji kwuo n’ezoghị ọnụ, sị: “I nyegodị m ọkara ụlọ gị agaghị m eso gị baa iri ihe oriri ma ọ bụ ịṅụ mmiri n’ebe a.” Onye amụma ahụ sikwa ụzọ ọzọ lawa. (1 Eze 13:8-10) Olee ihe mkpebi a onye amụma a mere na-akụziri anyị banyere iji obi anyị dum na-eguzosi ike n’ebe Chineke nọ?—Rom 15:4.
Jiri Obi Dị n’Otu Na-eguzosi Ike
15 Gịnị ọzọ ka anyị nwere ike ịmụta n’ihe ahụ onye amụma ahụ si Juda bịa na-emeteghị? Ilu 3:5 na-ekwu, sị: “Jiri obi gị dum tụkwasị Jehova obi, adaberekwala ná nghọta gị.” Kama ịnọgide na-adabere na Jehova dị ka ọ na-emebu, onye amụma ahụ si Juda tụkwasịrị obi ná nghọta nke onwe ya. Ihe a o mejọrọ riri isi ya, mebiekwa adịm ná mma ya na Chineke. Ihe a mere onye amụma ahụ na-enyere anyị aka ịhụ mkpa ọ dị ịdị umeala n’obi na ịnọgidesi ike n’ebe Jehova nọ ka anyị na-ejere ya ozi!
Jiri Obi Dị n’Otu Na-eguzosi Ike
10 Onye amụma ahụ si Juda kwesịrị ịghọta na ọ bụ nghọgbu ka onye amụma ahụ mere agadi na-aghọgbu ya. Ọ gaara ajụ onwe ya, sị, ‘Gịnị mere Jehova ga-eji ziga mmụọ ozi ya ka o zie onye ọzọ ihe ọhụrụ ọ chọrọ ka m mee?’ Onye amụma ahụ gaara arịọ Jehova ka o mee ka ihe ahụ dokwuo ya anya, ma ọ dịghị ebe Akwụkwọ Nsọ kwuru na o mere otú ahụ. Kama nke ahụ, “o sooro [agadi nwoke] ahụ laghachi ka o wee rie nri n’ụlọ ya ma ṅụọ mmiri.” Nke a wutere Jehova. Mgbe onye amụma ahụ a ghọgburu mechara lawa Juda, otu ọdụm hụrụ ya n’ụzọ wee gbuo ya. Otú a ka nke onye amụma ahụ na ọrụ ibu amụma ya si gaa!—1 Eze 13:19-25.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
Ọ Na-achọ Ebe Anyị Na-emezi Emezi
Nke ka nke bụ na ihe e kwuru ná 1 Ndị Eze 14:13 na-akụziri anyị ihe magburu onwe ha banyere Jehova na ihe ọ na-achọ n’ime anyị. Cheta na Chineke ‘hụrụ’ ihe dị mma “n’ime” Abaịja. O doro anya na Jehova nọ na-achọ ihe n’obi Abaịja ruo mgbe Ọ hụrụ obere ihe dị mma. Otu ọkà mmụta kwuru na ọ bụrụ na e jiri Abaịja tụnyere ndị ezinụlọ ya, ọ dị ka otu nkume pel “dị n’ime ikpo nkume.” Jehova nwere mmasị n’ihe a dị mma ma gọzie ya, metụrụ otu onye a nọ n’ajọ ezinụlọ ebere.
SEPTEMBA 26–ỌKTOBA 2
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | 1 NDỊ EZE 15-16
“Ị̀ Na-egosi na I Nwere Obi Ike Ka Esa?”
“Unu Ga-enweta Ụgwọ Ọrụ Maka Ọrụ Unu”
N’ime afọ iri abụọ e kechara alaeze Izrel abụọ, ikpere arụsị riri ndị Juda isi. Mgbe Esa ghọrọ eze n’afọ 977 tupu a mụọ Kraịst, ọbụna ndị isi amalitela ife chi ihe ubi ndị Kenan. Ma ihe e dere na Baịbụl banyere Esa bụ na ‘o mere ihe dị mma na ihe ziri ezi n’anya Jehova bụ́ Chineke ya.’ Esa ‘wepụsịrị ebe ịchụàjà ndị mba ọzọ na ebe ndị dị elu ma kụtusịa ogidi nsọ dị iche iche, gbutusịakwa ogwe osisi ndị dị nsọ.’ (2 Ihe 14:2, 3) Esa chụpụkwara “ndị ikom bụ́ ndị akwụna ụlọ arụsị” n’alaeze Juda, ya bụ, ụmụ nwoke ndị na-edina ụmụ nwoke ibe ha mgbe ha na-efe arụsị. Ihe Esa mere abụghị naanị iwepụ arụsị. Ọ gbakwara ndị mmadụ ume ka ha “chọọ Jehova bụ́ Chineke ndị nna nna ha nakwa ka ha debe iwu ya na ntụziaka ya.”—1 Eze 15:12, 13; 2 Ihe 14:4.
Jiri Obi Gị Niile Na-efe Jehova
7 Onye ọ bụla n’ime anyị nwere ike inyocha obi ya ka ọ mata ma ò ji obi ya niile na-efe Chineke. Jụọ onwe gị, sị: ‘M̀ kpebisiri ike ime ihe dị Jehova mma, ịgbachitere ofufe ya, na ime ka ọgbakọ dị ọcha?’ Chegodị ụdị obi ike Esa nwere, nke mere o ji chụtuo Meaka, bụ́ “nnukwu nwaanyị” na Juda. O nwere ike ị gaghị ama onye metụrụla ụdị ihe ahụ Meaka mere, ma o nwere mgbe i kwesịrị ịkata obi ka Esa. Dị ka ihe atụ, gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na onye ezinụlọ gị ma ọ bụ ezigbo enyi gị emehie ma jụ ichegharị, a chụọ ya n’ọgbakọ? Ị̀ ga-akwụsị gị na ya ịna-akpa? Gịnị ka obi gị ga-agwa gị mee?
it-1 184-185
Esa
E nwere oge ụfọdụ Esa mere ihe gosiri na o kweghị ka amamihe si n’aka Chineke duzie ya, gosikwa na o nweghị nghọta. Ma, o doro anya na àgwà ọma ndị ọ kpara na mbọ ọ gbara ka a kwụsị ife arụsị karịrị ihe ndị o mejọrọ. E wekwaara ya ka otu n’ime ndị eze chiri Juda ji obi ha niile fee Jehova. (2 Ihe 15:17) Esa chịrị afọ iri anọ na otu. Ọ bụ n’oge ọ na-achị ka ndị eze asatọ a chịrị Izrel nọ na-achị: Jeroboam, Nedab, Beasha, Ịla, Zimraị, Ọmraị, Tibnaị (onye nọ na-achị otu mpaghara Izrel mgbe Ọmraị na-achịkwa), na Ehab. (1 Eze 15:9, 25, 33; 16:8, 15, 16, 21, 23, 29) Mgbe Esa nwụrụ, Jehọshafat nwa ya malitere ịchị.—1 Eze 15:24.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
Chineke Ọ̀ Dị Adị n’Ezie Nye Gị?
Dị ka ihe atụ, gụọ amụma banyere ahụhụ maka iwughachi Jeriko ma tụlezie mmezu ya. Joshua 6:26 na-ekwu, sị: “Joshua wee gbaa ha iyi na mgbe ahụ, sị, Onye a na-abụ ọnụ ka nwoke ahụ bụ n’ihu Jehova, nke ga-ebili wuo obodo Jeriko a: ọkpara ya ka ọ ga-ewere tọọ ntọala ya, nwa nwoke ya nke nta ka ọ ga-ewerekwa guzo ọnụ ụzọ ama ya ọtọ.” Mmezu ya bịara n’ihe dị ka afọ 500 n’ihu, n’ihi na anyị na-agụ ná 1 Ndị Eze 16:34, sị: “N’ụbọchị [Eze Ehab] ka Hiel, bụ́ onye Betel, wuru Jeriko: Abaịram, bụ́ ọkpara ya, ka o weere tọọ ntọala ya; Segub, bụ́ nwa ya nwoke nke nta ka o weerekwa guzo ọnụ ụzọ ama ya ọtọ; dị ka okwu Jehova si dị, nke O kwuru n’aka Joshua nwa Nun.” Nanị Chineke dị adị n’ezie pụrụ ime ka e buo amụma ndị dị otú ahụ ma hụ na ha mezuru.
ỌKTOBA 3-9
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | 1 NDỊ EZE 17-18
“Olee Mgbe Unu Ga-akwụsị Ịkwụ Ụzọ Ebe Abụọ?”
Nwee Okwukwe, Jiri Amamihe Na-ekpebi Ihe Ị Ga-eme
6 Ozugbo ndị Izrel banyere n’Ala Nkwa, ha kwesịrị iji aka ha kpebie ma hà ga na-efe Jehova, ka hà ga na-efe chi ndị ọzọ. (Gụọ Jọshụa 24:15.) O nwere ike iyi ihe na-esighị ike ikpebi. Ma, ihe ha kpebiri ga-eme ka ha dị ndụ ma ọ bụ nwụọ. N’oge Ndị Ikpe, ndị Izrel kpebiri ime ihe na-adịghị mma ugboro ugboro. Ha hapụrụ Jehova fewe arụsị. (Ikpe 2:3, 11-23) I nwekwara ike icheta oge ọzọ ndị Izrel kwesịrị ikpebi ihe ha ga-eme. Ịlaịja onye amụma gwara ha hoo haa ihe ha ga-eme, ya bụ, ife Jehova ma ọ bụ ife Bel. (1 Eze 18:21) Ịlaịja baara ha mba maka na ha amaghị nke ha ga-eme eme. I nwere ike iche na ọ dị mfe ikpebi ihe ha ga-eme n’ihi na ife Jehova na-aba uru mgbe niile. Nke bụ́ eziokwu bụ na o nweghị onye ma ihe kwesịrị ịga fewe Bel. Ma, ndị Izrel nọ “na-enwe echiche abụọ dị iche.” Ịlaịja gwara ha ka ha kpebie ife ezi Chineke bụ́ Jehova.
Ọ Gbachiteere Ofufe Chineke
15 Ndị nchụàjà Bel meweziri ara ara. Baịbụl kwuru na ha malitere “ịkpọkusi [Bel] ike, jirikwa daga na ube na-amakasị onwe ha dị ka omenala ha si dị, ruo mgbe ha mere ka ọbara na-agba ha n’ahụ́.” Ma ihe a niile ha mere enweghị isi. Baịbụl kwuru, sị: “A nụghị olu ọ bụla, ọ dịghịkwa onye na-azaghachi, ọ dịghịkwa onye na-aṅa ntị.” (1 Eze 18:28, 29) N’eziokwu, Bel adịghị adị. Ọ bụ Setan mere ka ndị mmadụ chee na Bel dị adị. O jikwa ya eme ka ndị mmadụ hapụ ife Jehova. Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụrụ na mmadụ ahapụ Jehova fewe nna ukwu ọzọ, ihere ga-emerịrị onye ahụ.—Gụọ Abụ Ọma 25:3; 115:4-8.
Ọ Gbachiteere Ofufe Chineke
18 Tupu Ịlaịja amalite ikpe ekpere, o nwere ike ịbụ na ìgwè mmadụ ahụ nọ na-eche ma Jehova ọ̀ ga-akụ afọ n’ala ka Bel. Ma mgbe o kpechara ekpere ahụ, ọ ga-abụ na ha kwụsịrị iche otú ahụ. Baịbụl sịrị: “Ọkụ nke Jehova wee daa repịa àjà nsure ọkụ ahụ na nkụ ahụ na nkume ndị ahụ na ájá, ọ mịkọkwaara mmiri dị n’olulu ahụ.” (1 Eze 18:38) Otú Jehova si zaa ekpere Ịlaịja dị egwu. Gịnị ka ìgwè mmadụ ahụ mere?
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
w08 4/1 19, igbe
Ọ Nọrọ na Nche ma Chere
Oké Ọkọchị E Nwere n’Oge Ịlaịja Ọ̀ Dịruru Afọ Ole?
Ịlaịja onye amụma Jehova gwara Eze Ehab na n’oge na-adịghị anya, mmiri ga-amalitekwa izo n’Izrel. Ịlaịja gwara Ehab ihe a “n’afọ nke atọ.” Ọ ga-abụ na afọ nke atọ a malitere n’ụbọchị Ịlaịja kwuru na mmiri agakwaghị ezo. (1 Eze 18:1) Obere oge Ịlaịja kwuchara na mmiri ga-amalitekwa izo, Jehova mere ka mmiri zoo. Ụfọdụ ndị nwere ike ikwu na ọ bụ n’ime afọ nke atọ ahụ ka mmiri malitekwara izo, n’ihi ya, na oké ọkọchị ahụ kọrọnụ akọrughị afọ atọ. Ma Jizọs na Jems gwara anyị na mmiri ezoghị ruo “afọ atọ na ọnwa isii.” (Luk 4:25; Jems 5:17) Nke a ọ̀ pụtara na Baịbụl anaghị ekwu otu ihe?
Mbanụ! N’Izrel oge ochie, oge ọkọchị na-adị ogologo, ọ na-eru ọnwa isii. O doro anya na mgbe Ịlaịja gwara Ehab na mmiri agakwaghị ezo, ọkọchị akọọla gafee oge o kwesịrị ịkwụsị. Nke a pụtara na oké ọkọchị ahụ amalitela ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ ọnwa isii tupu Ịlaịja ekwuo na mmiri agakwaghị ezo. N’ihi ya, mgbe Ịlaịja kwuru na mmiri ga-ezo “n’afọ nke atọ,” oké ọkọchị ahụ akọruola ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ afọ atọ na ọnwa isii. “Afọ atọ na ọnwa isii” ahụ ezuola tupu ndị Izrel niile ezukọta n’Ugwu Kamel ka ha mara mbe abụọ nke bụ́ oké.
Chegodị echiche ihe mere o ji bụrụ na oge mbụ Ịlaịja gara hụ Ehab bụ oge kwesịrị ekwesị. Ndị Izrel kweere na ọ bụ Bel “na-achị ígwé ojii,” ya bụ, na ọ bụ ya ga-eme ka mmiri zoo ka ọkọchị ahụ kwụsị. Ọ bụrụ na ọkọchị ahụ akọfeela oge o kwesịrị ịkwụsị, ha nwere ike ịna-ajụ, sị: ‘Olee ebe Bel nọ? Olee mgbe ọ ga-eme ka mmiri zoo?’ O doro anya na ahụ́ nwụrụ ndị ahụ na-efe Bel mgbe Ịlaịja kwuru na mmiri agaghị ezo, igirigi agaghịkwa ada ruo mgbe yanwa kwuru ka mmiri zoo ma ọ bụ ka igirigi daa.—1 Eze 17:11.
ỌKTOBA 10-16
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | 1 NDỊ EZE 19-20
“Kwe Ka Jehova Kasie Gị Obi”
Tụkwasị Jehova Obi Mgbe Ị Na-echegbu Onwe Gị
5 Gụọ 1 Eze 19:1-4. Ụjọ jidere Ịlaịja mgbe Eze Nwaanyị Jezibel kwuru na ọ ga-egbu ya. N’ihi ya, ọ gbagara Bia-shiba. Ike ụwa gwụchara ya nke na ọ rịọrọ Jehova ka o mee ka ọ nwụọ. Gịnị mere o ji dị ya otú ahụ? Ịlaịja ezughị okè, ọ bụkwa “nwoke nwere ụdị mmetụta anyị na-enwe.” (Jems 5:17) O nwere ike ịbụ na o chegburu onwe ya nke ukwuu, ezigbo ike agwụkwa ya. Ọ ga-abụkwa na o chere na mbọ ọ na-agba ime ka ndị mmadụ fewe Jehova furu ọhịa, na ndị Izrel agbanwebeghị, nakwa na ọ bụ naanị ya na-efe Jehova. (1 Eze 18:3, 4, 13; 19:10, 14) O nwere ike iju anyị anya na onye amụma a kwesịrị ntụkwasi na-eche ụdị ihe a. Ma Jehova ghọtara otú obi dị ya.
Chineke Ya Kasiri Ya Obi
13 Olee otú i chere obi dị Jehova mgbe o si n’eluigwe lee anya hụ ka onye amụma ya ọ hụrụ n’anya tọgbọ n’okpuru osisi n’ala ịkpa na-arịọ ka ọnwụ bịa gburu ya? Anyị ekwesịghị ichewe ya echewe. Mgbe ezigbo ụra buuru Ịlaịja, Jehova zigaara ya otu mmụọ ozi. Mmụọ ozi ahụ ji nwayọọ metụ Ịlaịja aka, kpọtee ya ma sị ya: “Bilie rie ihe.” Ịlaịja biliri n’ihi na mmụọ ozi ahụ edeberela ya achịcha ka dị ọkụ ọ ga-eri na mmiri ọ ga-aṅụ. Ò kelekwaranụ mmụọ ozi ahụ? Naanị ihe Baịbụl gwara anyị bụ na onye amụma ahụ riri nri, ṅụọ mmiri ma dinarakwa rahụwa ụra. Ọ̀ bụ ike ọgwụgwụ mere na o kwughị okwu? Nke ọ bụla ọ bụ, mmụọ ozi ahụ kpọtere ya nke ugboro abụọ, o nwekwara ike ịbụ na chi abọọla mgbe ahụ. Ọ gwara Ịlaịja ọzọ, sị, “Bilie rie ihe,” gwakwa ya ihe a dị mkpa: “N’ihi na njem ị ga-eme dị ukwuu.”—1 Eze 19:5-7.
Chineke Ya Kasiri Ya Obi
21 Baịbụl kwuru na Jehova anọghị ma n’oké ifufe ahụ ma n’ala ọma jijiji ahụ ma n’ọkụ ahụ. Ịlaịja ma na Jehova abụghị chi nkịtị ka Bel, bụ́ chi ndị na-efe ya na-akpọ “chi na-achị ígwé ojii,” ma ọ bụ chi na-eweta mmiri ozuzo. Ọ bụ Jehova mere ka ifufe na mmiri na ihe ndị ọzọ na-akpa ike dị egwu. Ma, yanwa dị ike karịa ihe ọ bụla o kere eke. Eluigwe enwedịghị ike ịba ya. (1 Eze 8:27) Olee otú ihe niile a merenụ si nyere Ịlaịja aka? Cheta na ụjọ ji ya. Ma, ebe ọ bụ na Jehova, bụ́ onye nwere ike dị egwu, kwụ ya n’azụ, o kwesịghị ịtụwa Ehab na Jezibel ụjọ.—Gụọ Abụ Ọma 118:6.
Chineke Ya Kasiri Ya Obi
22 Mgbe ọkụ ahụ nyụrụ, ebe niile adaakwa jụụ, Ịlaịja nụziri “olu dị ala, nke dịkwa nwayọọ.” Olu ahụ jụkwara Ịlaịja ajụjụ ahụ a jụrụ ya na mbụ. Nke a mere ka Ịlaịja kwuokwa otú obi dị ya ọzọ. O nwere ike ịbụ na nke a mere ka ahụ́ rukwuo ya ala. Ma, o doro anya na ihe kadị gbaa Ịlaịja ume bụ ihe ‘olu ahụ dị ala, nke dịkwa nwayọọ’ gwaziri ya. Jehova mere ka o doo Ịlaịja anya na ya ka ji ya kpọrọ ihe. Olee otú o si mee nke a? Chineke gwara Ịlaịja ọtụtụ ihe ya ka ga-eme iji wepụ ofufe Bel n’Izrel. O doro anya na ọrụ Ịlaịja rụrụ abụghị n’efu n’ihi na ihe Chineke bu n’obi ime ga-emezurịrị. Ihe ọzọkwa bụ na Jehova ka chọrọ ka Ịlaịja soro mezuo ihe ahụ Jehova bu n’obi ime. Ọ bụ ya mere o ji nyekwuo ya ọrụ, gwakwa ya otú ọ ga-esi rụọ ha.—1 Eze 19:12-17.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
Ihe Atụ nke Iji Onwe Onye Achụ Àjà na Iguzosi Ike n’Ihe
Ọtụtụ ndị ohu Chineke taa na-egosipụta mmụọ yiri nke a nke iji onwe onye achụ àjà. Ụfọdụ ahapụwo “ubi” ha, ihe ha ji ebi ndụ, iji kwusaa ozi ọma n’ókèala dịgasị anya ma ọ bụ ije ozi dị ka ndị òtù ezinụlọ Betel. Ndị ọzọ emewo njem gaa ala ọzọ iji rụọ ọrụ n’ihe owuwu nke Society. Ọtụtụ anabatawo ihe a pụrụ ịkpọ ọrụ ndị dị ala. Ma, o nweghị onye na-agara Jehova ozi nke na-eje ozi na-adịghị mkpa. Jehova na-enwe obi ekele maka ndị nile na-efe ya n’afọ ofufo, ọ ga-agọzikwa mmụọ nke iji onwe onye achụ àjà.—Mak 10:29, 30.
ỌKTOBA 17-23
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | 1 NDỊ EZE 21-22
“Na-eme Ka Jehova Mgbe I Ji Ikike I Nwere Edu Ndị Ọzọ”
it-2 21
Jehova nke Ụsụụ Ndị Agha
Mgbe otu mmụọ ozi bịakwutere Joshụa n’ebe dị nso na Jeriko, Joshụa jụrụ ya ma ọ̀ na-akwado ndị Izrel ka ọ̀ na-akwado ndị iro ha. Ọ zara Joshụa, sị, “Abụ m ọchịagha nke ụsụụ ndị agha Jehova.” (Josh. 5:13-15) Mịkaya onye amụma gwara Eze Ehab na Eze Jehọshafat, sị, “M hụrụ ka Jehova nọ n’ocheeze ya nakwa ka ndị mmụọ ozi niile guzo n’aka nri ya nakwa n’aka ekpe ya.” (1 Eze 22:19-21) O doro anya na ọ bụ ụsụụ ndị agha Jehova ka ọ hụrụ. Ọ dabara adaba na a na-akpọ Chineke “Jehova nke ụsụụ ndị agha” n’ihi na e kwuru na a haziri ndị agha a na-ejere Chineke ozi n’ìgwè ndị cherob, n’ìgwè ndị seraf, nakwa n’ìgwè ndị mmụọ ozi. (Aịza. 6:2, 3; Jen. 3:24; Mkpu. 5:11) O gosikwara na a haziri ìgwè nke ọ bụla ahazi. Ọ bụ ya mere Jizọs Kraịst ji sị na ọ bụrụ na ya arịọ Nna ya, a ga-ezitere ya ndị mmụọ ozi dị “ụsụụ iri na abụọ.” (Ihe e dere n’ala ala peeji Mat. 26:53) Mgbe Hezekaya na-arịọ Jehova ka o nyere ya aka, ọ kpọrọ ya “Jehova nke ụsụụ ndị agha, Chineke Izrel, onye nọ n’ocheeze dị n’elu ndị cherob.” Ọ ga-abụ na ọ bụ igbe ọgbụgba ndụ na ndị cherob a kpụrụ n’okwuchi ya ka o bu n’obi mgbe o kwuru ihe a n’ihi na ha nọchiri anya ocheeze Jehova nke dị n’eluigwe. (Aịza. 37:16; i nwere ike ịtụle 1 Sam. 4:4; 2 Sam. 6:2.) Mgbe onye na-ejere Ịlaịsha ozi nọ na-atụ ụjọ maka na ndị agha gbara obodo ebe Ịlaịsha bi gburugburu, obi ruru ya ala mgbe e mere ka ọ hụ na ihe juru n’ebe bụ́ ugwu ugwu n’obodo ahụ bụ “ịnyịnya na ụgbọ ịnyịnya agha ndị na-acha ọkụ ọkụ.” Ndị a ọ hụrụ so ná ndị agha Jehova bụ́ ndị mmụọ ozi.—2 Eze 6:15-17.
“Kraịst Bụ Isi nke Nwoke Ọ Bụla”
9 Ịdị umeala n’obi. Ọ bụ Jehova bụ Onye kacha mara ihe ma n’eluigwe ma n’ụwa. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ na-ege ntị ma ndị ohu ya kwuwe ihe bụ́ uche ha. (Jen. 18:23, 24, 32) E nweekwala mgbe o kwere ka ndị ohu ya kwuo ihe a ga-eme. (1 Eze 22:19-22) Jehova zuru okè, ma ọ naghị atụ anya ka anyị zuo okè ugbu a. Kama nke ahụ, ọ na-enyere ndị ohu ya na-ezughị okè aka ịna-emekwu nke ọma n’ozi ya. (Ọma 113:6, 7) Baịbụl kwuru na Jehova bụ “onye na-enyere” anyị aka. (Ọma 27:9; Hib. 13:6) Eze Devid kwuru na ihe mere ka o nwee ike ịrụcha nnukwu ọrụ e nyere ya bụ n’ihi na Jehova dị umeala n’obi.—2 Sam. 22:36.
it-2 245
Ụgha
Jehova Chineke na-ekwe ka “ozizi ụgha” megharịa ndị ụgha na-atọ ụtọ anya, “ka ha wee na-ekwere okwu ụgha” kama ikwere ozi ọma banyere Jizọs Kraịst. (2 Tesa. 2:9-12) Ụdị ihe a mere eze Izrel, bụ́ Ehab, ọtụtụ narị afọ tupu Pọl edee ihe a. Ndị amụma ụgha gwara Ehab na ọ ga-emeri n’agha ọ ga-aga na Remọt-gilied. Ma, Jehova si n’ọnụ Mịkaya onye amụma kwuo na ihe ọjọọ ga-eme ya n’agha ahụ. E si n’ọhụụ gosi Mịkaya na Jehova kwere ka otu mmụọ ozi mee ka ndị amụma Ehab “ghaara ya ụgha.” Ihe ọ pụtara bụ na mmụọ ozi ahụ ji ikike ya mee ka ndị amụma ahụ ghara ikwu eziokwu, kama ka ha kwuo ihe ha chọrọ ikwu, bụ́kwanụ ihe Ehab chọrọ ịnụ. N’agbanyeghị na e bu ụzọ dọọ Ehab aka ná ntị, ọ họọrọ ka e jiri ụgha megharịa ya anya, ụgha ahụ takwara isi ya.—1 Eze 22:1-38; 2 Ihe 18.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
Gịnị Bụ Ezigbo Nchegharị?
4 Jehova mechara kpebie ime ihe. O zigara Ịlaịja ka ọ gaa gwa Ehab na Jezibel ihe ọ ga-eme ha. Ọ ga-egbu ezinụlọ ha niile. Ihe ahụ Ịlaịja gwara Ehab wutere ya nke ukwuu. O mere ka Ehab bụ́ nwoke dị ezigbo mpako ‘weda onwe ya ala.’—1 Eze 21:19-29.
5 Ọ bụ eziokwu na Ehab weturu onwe ya ala mgbe Jehova kwuru ihe ọ ga-eme ezinụlọ ya, ihe o mechara mee gosiri na o chegharịghị n’eziokwu. Ọ gbalịghị ịkwụsị ofufe Bel n’Izrel. Ọ gbakwanụghị ndị mmadụ ume ka ha fewe Jehova. Ihe ndị ọzọ Ehab mere gosikwara na o chegharịghị n’eziokwu.
6 Mgbe Ehab gwara Jehoshafat bụ́ eze Juda ka o soro ya gaa lụso ndị Siria agha, Jehoshafat gwara ya ka ha buru ụzọ jụọ onye amụma Jehova ihe ha ga-eme. Ná mmalite, Ehab ekweghị eme ihe o kwuru. Ọ sịrị: “A ka nwere otu nwoke anyị ga-esi n’aka ya jụọ Jehova ase. Ma akpọrọ m ya asị, n’ihi na o nweghị mgbe ọ na-eburu m amụma ihe ọma. Naanị ihe ọ na-eburu m bụ amụma ihe ọjọọ.” N’agbanyeghị ihe ahụ o kwuru, ha mechara gakwuru Mịkaya onye amụma. Ihe Ehab kwuru mere. Mịkaya onye amụma gwara ha ihe ọjọọ ga-eme Ehab. Kama Ehab ime ihe ozugbo ka Jehova gbaghara ya, ọ tụbara onye amụma ahụ n’ụlọ mkpọrọ. (1 Eze 22:7-9, 23, 27) N’agbanyeghị na Ehab tụbara Mịkaya onye amụma n’ụlọ mkpọrọ, o meghị ka amụma ahụ Mịkaya buru ghara imezu n’isi ya. Mgbe ha gara agha ahụ, e gburu Ehab.—1 Eze 22:34-38.
ỌKTOBA 24-30
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | 2 NDỊ EZE 1-2
“Onye E Ji Ama Atụ n’Ịzụ Ndị Ọzọ”
Otú Ndị Okenye Si Azụ Ndị Ọzọ Ka Ha Ruo Eruo
15 Ihe Baịbụl kọrọ banyere Ịlaịsha, bụ́ onye na-ejere Ịlaịja ozi, gosikwara otú ụmụnna nwoke taa ga-esi na-akwanyere ndị bụ́ okenye kemgbe ọtụtụ afọ ùgwù. Mgbe Ịlaịja na Ịlaịsha gachara hụ ụmụ ndị amụma nọ na Jeriko, ha abụọ sooro gawa Osimiri Jọdan. Mgbe ha ruru, ‘Ịlaịja weere uwe e ji mara ya, fụkọta ya ma tie ya na mmiri ahụ, o wee kewaa abụọ.’ Mgbe ha gafechara, ha nọ “na-ekwu okwu ka ha na-aga.” O doro anya na Ịlaịsha echeghị na ya amụtachaala ihe niile. Ruokwa mgbe Ịlaịja hapụrụ Ịlaịsha, ọ nọ na-ege ntị nke ọma n’ihe niile Ịlaịja na-agwa ya. Ịlaịja mechara rịgoro n’eluigwe n’oké ifufe. Mgbe Ịlaịsha na-alaghachi, rute na Jọdan, o tiri uwe Ịlaịja na mmiri ahụ, sị: “Olee ebe Jehova bụ́ Chineke Ịlaịja nọ?” Ọzọkwa, mmiri ahụ kewara abụọ.—2 Eze 2:8-14.
Otú Ndị Okenye Si Azụ Ndị Ọzọ Ka Ha Ruo Eruo
16 Ị̀ chọpụtara na ọrụ ebube mbụ Ịlaịsha rụrụ yiri ọrụ ebube ikpeazụ Ịlaịja rụrụ? Gịnị ka ihe a na-akụziri anyị? O doro anya na Ịlaịsha echeghị na ebe ọ bụ ya bụzi nna ukwu, na ya ga-emewe ihe dị iche n’ihe Ịlaịja mere. Kama, ọ ka nọkwa na-eme otú ahụ Ịlaịja mere, nke gosiri na ọ na-akwanyere nna ya ukwu ùgwù, meekwa ka obi sie ndị amụma ibe ya ike. (2 Eze 2:15) Ịlaịsha bụ onye amụma afọ iri isii. N’afọ ndị ahụ, Jehova nyere ya ike ịrụ ọrụ ebube karịrị nke Ịlaịja rụrụ. Gịnị ka ndị a na-azụ taa kwesịrị ịmụta n’ihe a?
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Ndị Eze nke Abụọ
2:11—Olee “eluigwe” nke ‘Ịlaịja rịgooro n’oké ifufe’? Ọ bụghị akụkụ dị anya nke mbara igwe ma ọ bụ ebe obibi ime mmụọ nke Chineke na ụmụ ya ndị ikom bụ́ ndị mmụọ ozi. (Deuterọnọmi 4:19; Abụ Ọma 11:4; Matiu 6:9; 18:10) “Eluigwe” nke Ịlaịja rịgooro bụ mbara ikuku. (Abụ Ọma 78:26; Matiu 6:26) Ihe àmà na-egosi na ụgbọala ọkụ ahụ buuru Ịlaịja si na mbara ikuku gafere ma gaa n’akụkụ ọzọ nke ụwa, bụ́ ebe ọ nọgidere na-adị ndụ ruo oge ụfọdụ. N’ezie, ka ọtụtụ afọ gasịrị, Ịlaịja degaara Jehoram, bụ́ eze Juda, akwụkwọ ozi.—2 Ihe E Mere 21:1, 12-15.
ỌKTOBA 31–NỌVEMBA 6
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | 2 NDỊ EZE 3-4
“Kpọrọ Nwa Gị”
“Amaara M na Ọ Ga-ebili”
7 Ịlaịsha onye amụma bụ onye ọzọ kpọlitere mmadụ n’ọnwụ. Nke a bụ mbilite n’ọnwụ nke abụọ a kọrọ na Baịbụl. Otu nwaanyị Izrel a ma ama n’obodo Shunem lere Ịlaịsha ezigbo ọbịa. N’ihi ya, Chineke si n’aka onye amụma a mee ka nwaanyị a na di ya merela agadi mụta nwa nwoke. Mgbe afọ ole na ole gachara, nwa a nwụrụ. Chegodị otú obi si gbawaa nwaanyị ahụ. Di ya hapụrụ ya ka ọ gaa hụ Ịlaịsha n’Ugwu Kamel. Ọ gara ihe dị ka kilomita iri atọ. Onye amụma ahụ zigara onye na-ejere ya ozi bụ́ Gehezaị ka o buru ya ụzọ gaa Shunem kpọlite nwa ahụ n’ọnwụ. Ma, Gehezaị emelighị ya. Ịlaịsha na nwaanyị ahụ obi na-agbawa emechazie rute.—2 Eze 4:8-31.
“Amaara M na Ọ Ga-ebili”
8 Ịlaịsha banyere n’ụlọ ebe ozu nwa ahụ nọ na Shunem, ma kpee ekpere. Jehova zara Ịlaịsha ekpere ma mee ka nwa ahụ dịghachi ndụ. Mgbe nne nwa ahụ hụrụ ya, obi tọrọ ya ezigbo ụtọ. (Gụọ 2 Ndị Eze 4:32-37.) Ọ ga-abụ na o chetara ekpere Hana bụbu nwaanyị aga kpere mgbe ọ kpọtara Samuel n’ụlọikwuu ka o jewere Jehova ozi. Hana kpere ekpere, sị: ‘Jehova na-eme ka a rịdaa na Shiol, na-emekwa ka a rịgote.’ (1 Sam. 2:6) O doro anya na ọ bụ Chineke kpọlitere nwa ahụ n’ọnwụ na Shunem. Nke a gosiri na ọ ga-akpọliteli ndị nwụrụ anwụ.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-2 697 ¶2
Onye Amụma
“Ụmụ Ndị Amụma.” Otu akwụkwọ bụ́ Gesenius’ Hebrew Grammar (Oxford, 1952, peeji nke 418) kwuru na ọ ga-abụ na okwu Hibru bụ́ ben (nwa) ma ọ bụ benehʹ (ụmụ) pụtara “ndị so n’òtù ma ọ bụ ìgwè (ma ọ bụ agbụrụ ma ọ bụ otu ndị).” (I nwere ike ịtụle Nehe. 3:8. N’ebe ahụ, a sụgharịa okwu bụ́ “onye so ná ndị na-esi mmanụ otite” otú e si dee ya n’asụsụ Hibru, ọ ga-abụ “nwa ndị na-esi mmanụ otite.”) N’ihi ya, o nwere ike ịbụ na ihe a kpọrọ “ụmụ ndị amụma” bụ ụlọ akwụkwọ ebe a na-akụziri ndị a kpọrọ ka ha bụrụ ndị amụma ihe ma ọ bụkwanụ ya abụrụ naanị òtù ndị amụma. E kwuru na e nwere ìgwè ndị amụma ndị ahụ na Betel, Jeriko, nakwa na Gilgal. (2 Eze 2:3, 5; 4:38; i nwere ike ịtụle 1 Sam. 10:5, 10.) Ọ bụ Samuel bụ onyeisi ìgwè ndị amụma e nwere na Rema (1 Sam 19:19, 20). O yikwara ka Ịlaịsha ọ̀ bụkwa onyeisi ndị amụma n’oge nke ya. (2 Eze 4:38; 6:1-3; i nwere ike ịtụle 1 Eze 18:13.) Baịbụl gosiri na ha rụrụ ụlọ ebe ha bi, kwuokwa na ha ji ngwá ọrụ ha gbazitere agbazite rụọ ya. Ihe a na-egosi na ọ ga-abụ na ha bụ ndị ogbenye. Ọ bụ eziokwu na ha na-ebikọtakarị ọnụ, na-erikọtakwa nri ọnụ, e nwere ike ikenye onye nke ọ bụla ebe ọ ga-aga buo amụma.—1 Eze 20:35-42; 2 Eze 4:1, 2, 39; 6:1-7; 9:1, 2.