Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • th ihe ọmụmụ 19 p. 22
  • Gbalịa Ka Ihe Ị Na-ekwu Ruo Ndị Mmadụ n’Obi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Gbalịa Ka Ihe Ị Na-ekwu Ruo Ndị Mmadụ n’Obi
  • Na-agbalịsi Ike n’Ịgụ Ihe na n’Izi Ihe
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ịnụ Ọkụ n’Obi
    Na-agbalịsi Ike n’Ịgụ Ihe na n’Izi Ihe
  • Mgbalị Iji Ruo n’Obi
    Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
  • Mee Ka Uru Ihe Ị Na-ekwu Bara Doo Anya
    Na-agbalịsi Ike n’Ịgụ Ihe na n’Izi Ihe
  • Okwu Na-agba Ume Ma Na-aba Uru
    Na-agbalịsi Ike n’Ịgụ Ihe na n’Izi Ihe
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Na-agbalịsi Ike n’Ịgụ Ihe na n’Izi Ihe
th ihe ọmụmụ 19 p. 22

IHE ỌMỤMỤ NKE 19

Gbalịa Ka Ihe Ị Na-ekwu Ruo Ndị Mmadụ n’Obi

Amaokwu Baịbụl

Ilu 3:1

IHE Ị GA-EME: Nyere ndị na-ege gị ntị aka ka ha ghọta ihe ị na-ekwu ma mee ihe ha mụtara.

OTÚ Ị GA-ESI EME YA:

  • Nyere ndị na-ege gị ntị aka ichebara onwe ha echiche. Na-ajụ ha ajụjụ ndị ga-enyere ha aka ichebara onwe ha echiche.

  • Gbaa ha ume ime ihe dị mma. Gbaa ndị na-ege gị ntị ume ka ha chebara ihe mere ha ji na-eme ihe dị mma echiche. Nyere ha aka ịghọta na ihe mere ha kwesịrị iji na-eme ihe ọma bụ maka na ha hụrụ Jehova na mmadụ ibe ha nakwa eziokwu Baịbụl n’anya. Kwuo okwu otú ga-eme ka ndị ị na-agwa okwu na-echebara ihe ị na-ekwu echiche. Ekwula okwu ka ị̀ na-atụrụ ha ụka. Kama ikwu ihe ga-emechu ha ihu, kwuo okwu otú ga-agba ha ume nakwa otú ga-eme ka ha jiri obi ha niile na-agba mbọ.

  • Mee ka uche ha dịrị n’ebe Jehova nọ. Gosi otú ihe ndị Baịbụl kwuru na iwu Chineke si eme ka àgwà ndị Chineke nwere nakwa ịhụnanya o nwere n’ebe anyị nọ pụta ìhè. Mee ka ọ na-agụ ndị ị na-agwa okwu agụụ ịchọpụta ihe bụ́ uche Chineke na ime ihe dị ya mma.

    Aro ndị ga-enyere anyị aka

    Cheta na ọ bụ Jehova na-adọta ndị mmadụ. N’ihi ya, jiri Okwu ya gbaa ndị na-ege gị ntị ume ime ihe dị mma.

N’OZI ỌMA

O kwe mee, jiri ajụjụ chọpụta ihe onye ị na-ezi ozi ọma kweere. Jiri olu okwu ya na otú ihu dị ya mata otú obi dị ya. Ma, nwee ndidi. Ị ga-ebu ụzọ mee ka ọ tụkwasị gị obi, tupu ya enwee ike ịgwa gị ihe dị ya n’ala ala obi.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya