Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ijwyp isiokwu 95
  • Àbụ M A Kwaa A Kwụrụ?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Àbụ M A Kwaa A Kwụrụ?
  • Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Gịnị ka ịbụ a kwaa a kwụrụ pụtara?
  • Gịnị mere ịbụ a kwaa a kwụrụ ji dị mkpa?
  • Olee otú ị ga-esi mụta ịbụ a kwaa a kwụrụ?
  • Kụziere Nwa Gị Ịna-edi Ihe
    Teta!—2019
  • Isiokwu Ndị Dị na Teta! A
    Teta!—2018
  • Ihe Ị Ga-eme ma Ihe Gbanweere Gị
    Teta!—2016
  • Otú Ị Ga-esi Enyere Nwa Gị Aka Ma O Mejọọ Ihe
    Ihe Ndị Ga-enyere Ezinụlọ Aka
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị
ijwyp isiokwu 95
Ebe nwata nwoke obi na-adịghị mma ji nwayọọ nwayọọ nwetawa onwe ya ma nwewezie obi ụtọ.

NDỊ NA-ETO ETO NA-AJỤ, SỊ

Àbụ M A Kwaa A Kwụrụ?

Ị̀ bụ onye na-edili nsogbu bịaara gị? Ò nweela otu n’ime ihe ndị a mere gị . . .

  • onye ị hụrụ n’anya ịnwụnahụ gị?

  • ọrịa na-ekweghị ala ala?

  • ọdachi ndị na-emere onwe ha?

Ndị ọkachamara sịrị na ọ bụghị naanị mgbe nnukwu nsogbu bịaara mmadụ ka onye ahụ kwesịrị ịmụta ịbụ a kwaa a kwụrụ. Obere obere nsogbu ndị ị na-enwe n’ụbọchị nwedịrị ike ịkpatara gị ọrịa. Ọ bụ ya mere o ji dị mkpa ka ị mụta idi nsogbu, ma ọ̀ bụ nke obere ma ọ̀ bụ nke nnukwu.

  • Gịnị ka ịbụ a kwaa a kwụrụ pụtara?

  • Gịnị mere ịbụ a kwaa a kwụrụ ji dị mkpa?

  • Olee otú ị ga-esi mụta ịbụ a kwaa a kwụrụ?

  • Ihe ndị ọgbọ gị kwuru

Gịnị ka ịbụ a kwaa a kwụrụ pụtara?

Ịbụ a kwaa a kwụrụ bụ mmadụ inwe ike idi nsogbu ndị bịaara ya na ihe ndị gbanwere ná ndụ ya. Nke a apụtaghị na nsogbu anaghị abịara onye bụ a kwaa a kwụrụ. Kama ihe ọ pụtara bụ na onye ahụ na-enwe ike isi ná nsogbu ahụ pụta, sikwuo ike karịa ka o siri na mbụ, ọ sọgodị ya ya bụrụ na o mere ka ihe ụfọdụ siere ya ike.

Osisi nkwụ oké ifufe mere ka o hulata na osisi nkwụ kwụ ọtọ. 1. Mgbe o hulatara n’ihi oké ifufe. 2. Mgbe ọ kwụụrụ ọtọ mgbe oké ifufe ahụ kwụsịrị.

Oké ifufe fewe, osisi ụfọdụ na-ehulatacha ma mechaa kwụrụkwa. Otú ahụ ka gịnwa nwere ike imecha nweta onwe gị ma nsogbu bịaara gị kwụsị

Gịnị mere ịbụ a kwaa a kwụrụ ji dị mkpa?

  • N’ihi na nsogbu na-abịara onye ọ bụla. Baịbụl sịrị: “Ọ bụghị ndị nwere ụkwụ ọsọ na-emeri n’ọsọ, . . . ọ bụghịkwa ndị nwere amamihe na-enweta ihu ọma; n’ihi na oge ọdachi na ihe a na-atụghị anya ya na-abịakwasị ha niile.” (Ekliziastis 9:11) Gịnị ka nke a na-akụziri anyị? Na ndị ezigbo mmadụ na-ata ahụhụ, ọtụtụ mgbe kwa, ọ bụghị n’ihi na e nwere ihe ọjọọ ha mere.

  • N’ihi na mmadụ ịbụ a kwaa a kwuru na-echebe ya. Otu nwoke na-enye ụmụ akwụkwọ kọleji ndụmọdụ sịrị: “A na-enwekarịzi ụmụ akwụkwọ ndị na-abịa n’ọfis m ike ụwa gwụrụ n’ihi na ha emetachaghị nke ọma n’ule ma ọ bụ n’ihi ihe na-adịghị mma onye ọzọ dere gbasara ha tinye n’Ịntanet.” A bịagodị n’obere nsogbu ndị a e weere na o nweghị ihe ha bụ, ọ sịrị na o nwere ike ịkpatara nwa akwụkwọ na-amaghị otú esi edi nsogbu ndị bịaara ya “ọrịa dị iche iche ma ọ bụdị mee ka isi ghara ịkpakọchazi ya ọnụ.”a

  • Ịmụta ịbụ a kwaa a kwụrụ ga-abara gị uru ma ugbu a ma mgbe ị ghọrọ dimkpa. Otu dọkịta aha ya bụ Richard Lerner kwuru gbasara ihe ndị gbawara mmadụ obi. Ọ sịrị: “Ihe ga-eso mee ka ihe gaziere mmadụ, ya ana-emekwu nke ọma, bụ ma o wepụ obi n’ihe mere ya ma gbaa mbọ nweta onwe ya, chọta ihe ndị ọzọ ọ ga-eme ma ọ bụ chọọ ụzọ ọzọ ọ ga-esi mezuo ihe ahụ o bu n’obi ime.”b

Olee otú ị ga-esi mụta ịbụ a kwaa a kwụrụ?

  • Chọpụta otú nsogbu gị haruru. Mata mgbe e nwere nnukwu nsogbu na mgbe nsogbu dịnụ bụ nke obere ya. Baịbụl sịrị: “Ọ bụ onye nzuzu na-egosipụta iwe ya n’otu ụbọchị ahụ, ma onye maara ihe na-ekpuchi ihe ihere.” (Ilu 12:16) Ọ bụghị nsogbu niile ka ị ga-ekwe ka o chegbuwe gị.

    Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Joanne sịrị: “N’ụlọ akwụkwọ anyị, e nwere ụmụ klas anyị ndị ọ na-abụ e nwee obere ihe merenụ, ha ana-ekwu gbasara ya ka à ga-asị na ọ bụ ihe dị oké mkpa. Ndị enyi ha n’Ịntanet gwazie ha na ihe ahụ ha kwuru dị mma, ha esiwekwuo ọnwụ gbasara ya. Ọ na-emezi ka o sikwuoro ha ike ịna-ejide onwe ha ma ha nwee nsogbu.”

  • Mụta ihe n’aka ndị ọzọ. Otu ilu Baịbụl sịrị: “Ọ bụ ígwè ka a na-eji amụcha ígwè. Otú ahụ ka ihu mmadụ na-amụcha ihu mmadụ ibe ya.” (Ilu 27:17) E nwere ọtụtụ ihe ndị dị mma anyị nwere ike ịmụta n’aka ndị dirila nsogbu ndị tara akpụ.

    Nwa agbọghọ aha ya bụ Julia sịrị: “Gị na ndị ọzọ na-ekwu okwu, ị ga-achọpụta na e nweela ọtụtụ nsogbu bịaara ha ná ndụ ma ha emerichaa ha. Gị na ha kparịta ụka ka ị chọpụta ihe ndị ha mere n’oge ha nwere nsogbu ndị ahụ ma ọ bụ ihe ndị ha emeghị n’oge ahụ.”

  • Nwee Ndidi. Baịbụl sịrị: “Onye ezi omume nwere ike ịda ọbụna ugboro asaa, ma ọ ga-ebilicha.” (Ilu 24:16) Ọ na-ewe oge tupu onye ihe mere ewere ụwa ya otú o si hụ ya. N’ihi ya, ya ejula gị anya ma e nwee ụbọchị ụfọdụ obi ga na-ajọ gị njọ. Ihe kacha mkpa ma ị daa bụ ‘ka i bilie.’

    Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Andrea sịrị: “Onye ihe mere nwetawa onwe ya, ihe ahụ na-eji nwayọọ nwayọọ na-apụ ya n’obi, obi adịwakwa ya mma. Ọ bụghị ihe na-eme otu ụbọchị. Ọ na-ewe oge. Achọpụtala m na ọ bụ nwayọọ nwayọọ ka onye ihe mere ga na-enwetakwu onwe ya ka oge na-aga.”

  • Mụta ịna-ekele Chineke. Baịbụl sịrị: ‘Gosinụ na unu bụ ndị nwere ekele.’ (Ndị Kọlọsi 3:15) Otú ọ sọkwara ihe ya si siere gị ike, a ga-enwerịrị ihe ndị i nwere ike iji maka ha kelee Chineke. Gbalịa cheta ihe atọ mere ndụ ị dị ji na-atọ gị ụtọ.

    Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Samantha sịrị: “Nsogbu bịara mmadụ, ọ naghị ara ahụ́ onye ahụ ajụwa onwe ya, sị, ‘Gịnị mere o ji bụrụ m ka ụdị ihe a na-eme?’ Otu ihe dị mkpa na-eme ka mmadụ bụrụ a kwaa a kwụrụ bụ na onye ahụ agaghị anọ na-eche banyere nsogbu ya mgbe niile. Ihe ka mma bụ icheta na ihe ga-emecha dị mma nakwa ịna-ekele Chineke maka ihe ndị i nwere na ihe ndị ị ga-emeli.”

  • Gbalịa ka ihe i nwere ju gị afọ. Pọl onyeozi sịrị: “Amụtawo m inwe afọ ojuju n’ọnọdụ ọ bụla m nọ na ya.” (Ndị Filipaị 4:11) O nweghị ihe Pọl ga-emeli banyere nsogbu ndị bịaara ya. Ma ihe ọ ga-emeli ihe na ya bụ otú yanwa si were nsogbu ahụ. Pọl kpebiri na ihe ndị ya nwere ga-eju ya afọ.

    Otu nwa okorobịa aha ya bụ Matthew sịrị: “Otu ihe m chọpụtara gbasara onwe m bụ na nsogbu bịara m, otú m si ewere ya ná mbido anaghị adịcha mma. Ihe m na-agbalịzi ime ugbu a bụ ịmụta na ihe ga-emecha dị mma ma e nwee ihe ọ bụla merenụ. M mee nke a, ọ ga-abara ma mụ ma ndị ọzọ nọ m nso uru.”

  • Kpee ekpere. Baịbụl sịrị: “Tụkwasị Jehova ibu arọ gị, ya onwe ya ga-akwadokwa gị. Ọ dịghị mgbe ọ ga-ekwe ka onye ezi omume maa jijiji.” (Abụ Ọma 55:22) Ikpe ekpere abụghị ihe mmadụ na-eme naanị ka obi dị ya mma. Ọ bụ otú i si agwa Onye Kere gị okwu, n’ihi na ‘ihe banyere gị na-emetụ ya n’obi.’​—⁠1 Pita 5:⁠7.

    Otu nwa okorobịa aha ya bụ Carlos sịrị: “Ọ bụghị naanị m kwesịrị ịna-ebu nsogbu ndị m na-enwe. Ọ bụrụ na m kpee ekpere kọọrọ Chineke nsogbu m niile na otú ọ dị m n’obi ma keleekwa ya maka ihe ọma ndị o meere m, ọ na-enyere m aka iwepụ echiche na-adịghị mma n’obi m ma mee ka m lekwasị anya n’ihe ndị Jehova na-emere m. Ekpere dị nnọọ ezigbo mkpa!”

Ihe ndị ọgbọ gị kwuru

Sarahi.

“Ebe ọ bụ na anyị ezughị okè, anyị niile na-emehie ihe, anyị na-emekwa ya kwa ụbọchị, ọ bụghị ụbọchị ụfọdụ. Anyị agaghị agbanweli nke ahụ, n’ihi ya, otú kacha mma anyị nwere ike isi mụta ịbụ a kwaa a kwụrụ bụ isi n’ihe ndị anyị na-emetaghị ná mbụ mụta ihe. Mgbe ọ bụla ọzọ ụdị nsogbu ahụ dapụtara, ihe anyị ga-ajụzi onwe anyị bụ, ‘Gịnị ka m ga-eme ka m ghara imekwa ihe ahụ m na-emetaghị ná mbụ?’”​—⁠Sarahi.

Isabelle.

“Otu n’ime amaokwu Baịbụl kacha amasị m bụ Matiu 6:​27, ebe Jizọs sịrị: ‘Ònye n’ime unu pụrụ ịgbakwụnye otu kubit n’afọ ndụ ya site n’ichegbu onwe ya?’ Mgbe ụfọdụ, m na-echegbukarị onwe m gbasara ihe nwere ike ime. N’ihi nke a, m na-agbalị ka m ghara ịna-echegbu onwe m gbasara ihe na-emebeghị eme. Ichegbuwe onwe m gbasara ihe m na-agaghị emeli ihe ọ bụla banyere ya enweghị uru ọ ga-abara m.”​—⁠Isabelle.

Ihe ị ga-eburu n’uche: Olee otú ị ga-esi mụta ịbụ a kwaa a kwụrụ?

  1. 1. Chọpụta otú nsogbu gị haruru. Mata mgbe e nwere nnukwu nsogbu na mgbe nsogbu dịnụ bụ nke obere ya.

  2. 2. Mụta ihe n’aka ndị ọzọ. Kọọrọ nne gị ma ọ bụ nna gị ma ọ bụ onye ọ bụla ọzọ toro eto ịtụkwasịrị obi, onye nwerela nsogbu o diri.

  3. 3. Nwee ndidi. Ọ na-ewe oge tupu onye ihe mere ewere ụwa ya otú o si hụ ya. N’ihi ya, obi adala gị mbà ma ọ bụrụ na o yie ka ọ na-ewe oge tupu i nwetachaa onwe gị.

  4. 4. Mụta ịna-ekele Chineke. Otú ọ sọkwara ihe ya si siere gị ike, a ga-enwerịrị ihe ndị i nwere ike ikele Chineke maka ha.

  5. 5. Gbalịa ka ihe i nwere ju gị afọ. Ọ bụghị mgbe niile ka anyị ga-enwe ike ịhọrọ otú ihe ga-adịrị anyị ná ndụ, ma ọ́ bụ anyị ga-ahọrọ ihe anyị ga-eme ma e nwee ihe bịaara anyị.

  6. 6. Kpee ekpere. Ekpere bụ otú i si agwa Onye Kere gị okwu, n’ihi na ihe ‘banyere gị na-emetụ ya n’obi.’​—⁠1 Pita 5:⁠7.

a O si n’akwụkwọ a kpọrọ Disconnected, nke Thomas Kersting dere.

b O si n’akwụkwọ bụ́ The Good Teen​—⁠Rescuing Adolescence From the Myths of the Storm and Stress Years.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya