Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ijwyp isiokwu 103
  • Ọ̀ Dị Mma Mmadụ Ịna-eme Ọtụtụ Ihe Otu Mgbe?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ọ̀ Dị Mma Mmadụ Ịna-eme Ọtụtụ Ihe Otu Mgbe?
  • Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ị̀ na-emeli ọtụtụ ihe otu mgbe?
  • Ihe ndị na-abụghị eziokwu gbasara ime ọtụtụ ihe otu mgbe
  • Otú ka mma isi eme ihe
  • Olee Nsogbu Ekwentị Nwere Ike Ịkpatara Gịnwa n’Onwe Gị?
    Teta!—2021
  • Ihe Unu Ga-eme Ka Ekwentị Ghara Ibutere Unu Nsogbu
    Ihe Ndị Ga-enyere Ezinụlọ Aka
  • Olee Ihe M Ga-eme Ka Uche M Na-adị n’Otu Ihe?
    Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị
  • Ikiri Ụwa
    Teta!—2003
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị
ijwyp isiokwu 103
Ebe otu nwa okorobịa na-agbalị ime ọtụtụ ihe n’otu oge. Ya na enyi ya na-ekwurịta okwu na vidio, ya ana-agụ akwụkwọ, jirikwa ekwentị ya na-achọ ihe n’Ịntanet.

NDỊ NA-ETO ETO NA-AJỤ, SỊ

Ọ̀ Dị Mma Mmadụ Ịna-eme Ọtụtụ Ihe Otu Mgbe?

  • Ị̀ na-emeli ọtụtụ ihe otu mgbe?

  • Ihe ndị na-abụghị eziokwu gbasara ime ọtụtụ ihe otu mgbe

  • Otú ka mma isi eme ihe

  • Ihe ndị na-eto eto ibe gị kwuru

Ị̀ na-emeli ọtụtụ ihe otu mgbe?

Ị̀ ma otú e si eme ọtụtụ ihe otu mgbe? Ọtụtụ ndị chere na ime ọtụtụ ihe otu mgbe anaghị abụrụ ndị toro n’oge a nsogbu n’ihi na a mụrụ ha n’oge ihe ndị nkà na ụzụ mepụtara juru ebe niile. Ha na-ekwu na ọ bụ ndị torola eto, bụ́ ndị ka na-amụ ihe ọgbara ọhụrụ ndị a amụ, ka ime ọtụtụ ihe otu mgbe na-esiri ike. Ma, ì chere na ihe a bụ eziokwu?

EZIOKWU ka ọ̀ bụ ỤGHA?

  • Ime ọtụtụ ihe otu mgbe na-eme ka mmadụ rụpụta ọtụtụ ihe ngwa ngwa.

  • Ka ị na-eme ọtụtụ ihe otu mgbe kwa ụbọchị, ka ị ga na-amụtakwu otú e si eme ya.

  • Ndị na-eto eto ma otú e si eme ọtụtụ ihe otu mgbe karịa ndị torola eto.

Ọ bụrụ na i kwetara na nke ọ bụla n’ime ihe ndị a bụ “eziokwu,” ọ pụtara na i kwetala ihe ndị na-abụghị eziokwu a na-ekwu gbasara mmadụ ime ọtụtụ ihe otu mgbe.

Ihe ndị na-abụghị eziokwu gbasara ime ọtụtụ ihe otu mgbe

Ì chere na ị ga-emeli ihe abụọ n’otu oge? I nwere ike imeli ihe ụfọdụ otu mgbe ma ọ bụrụ na otu n’ime ihe ndị ahụ abụghị ihe i kwesịrị itinye uche na ya. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ị na-ege egwú mgbe ị na-ehicha ụlọ gị, i nwere ike ihicha ụlọ ahụ nke ọma.

Ma, ọ bụrụ na ihe abụọ ị na-eme n’otu oge bụ ihe ndị e kwesịrị itinye uche na ha, ha abụọ nwere ike ịkụ afọ n’ala. O nwere ike ịbụ ihe a mere otu nwa agbọghọ aha ya bụ Katherine ji kwuo na mmadụ ime ọtụtụ ihe otu mgbe pụtara “mmadụ imebisị ihe niile ọ na-eme n’otu oge.”

“Mgbe mụ na mmadụ nọ na-akpa nkata, ozi batara n’ekwentị m. M malitere ịzaghachi ozi ahụ, na-agbalịkwa ige onye ahụ mụ na ya na-akpa nkata ntị. Ma, ihe mechara mee bụ na anụghị m ọtụtụ ihe onye ahụ mụ na ya na-akpa nkata kwuru, ọ fọkwara obere ka ọ bụrụ na m dejọrọ ihe niile m dere n’ozi ahụ m nọ na-azaghachi.”​—Caleb.

Otu ọkachamara n’ihe gbasara nkà na ụzụ aha ya bụ Sherry Turkle kwuru, sị: “Anyị nwere ike iche na anyị na-eme ọtụtụ ihe otu mgbe, . . . ma, ihe ọ ga-akpatara anyị bụ ime ka anyị ghara itinye uche na nke ọ bụla n’ime ha. Ime ọtụtụ ihe otu mgbe na-eme ka ụbụrụ anyị na-arụ oké, nke na anyị ga-echewe na anyị na-emeta ihe ndị anyị na-eme. Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na e nweghị nke ọ bụla n’ime ihe ndị ahụ anyị na-emeta. Ihe na-akakwudị njọ.”a

“Ọ na-abụ m na-agwa otu onye okwu, na-ezigara onye ọzọ ozi n’ekwentị n’otu mgbe ahụ, m na-eche na m na-emeta ya. Ma, mgbe anya doro m bụ mgbe m zigaara onye mụ na ya na-ezirita ozi n’ekwentị ihe m kwesịrị ịgwa onye mụ na ya na-ekwu okwu ihu na ihu.”​—Tamara.

Onye ọ bụla na-eme ọtụtụ ihe otu mgbe na-etinye onwe ya na gbalụ gbalụ. Dị ka ihe atụ, ọ na-ewe ha ọtụtụ oge iji mechaa ihe omume e nyere ha. Ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na ha ga-arụghachi ọrụ ha cheburu na ha arụchaala, ya eweekwa ha ọtụtụ oge. Nke ọ bụla ọ bụ, ihe doro anya bụ na ndị na-eme ọtụtụ ihe otu mgbe anaghị enwe oge ha gaara eji eme ihe ndị ha chọrọ ime.

E nwere ihe otu onye aha ya bụ Thomas Kersting kwuru bara ezigbo uru. Nwoke a bụ onye na-ahụ maka otú ụbụrụ mmadụ si arụ ọrụ, ọ na-enyekwa ụmụ akwụkwọ ndụmọdụ. O kwuru, sị: “Ọ bụrụ na i jiri ụbụrụ mmadụ tụnyere ọbá akwụkwọ a na-etinye ihe ndị dị mkpa na ya, nke a hazikwara nke ọma, e nwere ike ịsị na ụbụrụ ndị na-emekarị ọtụtụ ihe otu mgbe ghasara aghasa.”b

“Ọ bụrụ na ị na-eme ọtụtụ ihe otu mgbe, e nwere ihe ụfọdụ dị mkpa ị ga-eleghara anya. N’ikpeazụ, ihe i mere bụ iketakwuru onwe gị ọrụ, gbuokwa oge ị na-achọbughị igbu.”​—Teresa.

Ebe otu ọkwọ ụgbọala rutere n’ebe ụzọ gbara abụọ, ụgbọala ya adị ka ò kewara abụọ. Otu tinyere isi n’aka nrị, nke ọzọ etinye isi n’aka ekpe.

Onye na-achọ ime ọtụtụ ihe n’otu oge yiri onye na-anya ụgbọala nke chọrọ itinye isi n’ụzọ abụọ n’otu oge

Otú ka mma isi eme ihe

  • Mee ka ọ mara gị ahụ́ ịna-eme otu ihe n’otu oge. Ime ihe a nwere ike isiri gị ike ma ọ bụrụ na ime ọtụtụ ihe n’otu oge amarala gị ahụ́. Dị ka ihe atụ, o nwere ike ịbụ na ọ marala gị ahụ́ ịna-azaghachi ozi n’ekwentị mgbe ị na-amụ ihe. Ma, Baịbụl gwara anyị ka anyị “na-achọpụta ihe ndị ka mkpa.” (Ndị Filipaị 1:10) A bịa n’ihe ndị anyị nwere ime, e nwere ihe ndị na-aka ibe ha mkpa. N’ihi ya, kpebie nke ị ga-ebu ụzọ mee, lekwasịkwa nke ahụ anya ma hụ na i mechara ya.

    “E nwere ike iji otú mmadụ kwesịrị isi mee ike ya niile ka uche ya dịrị n’otu ihe n’otu oge tụnyere otú mmadụ ga-esi gbalịsie ike gbochie obere nwa ime ihe masịrị ya. Mgbe ụfọdụ, i kwesịrị ịrụ ahụ́ gị ụka n’agbanyeghị na o nwere ike ịkara gị mfe ịhapụ ya ka o mee ihe ahụ ọ chọrọ ime.”​—Maria.

  • Wepụ ihe ọ bụla ga-adọpụ gị uche. Ọ̀ na-adị agụụ gị agụụ ka ị na-apị ekwentị mgbe ị na-amụ ihe? Ọ ga-aka mma ka i dowe ekwentị ahụ n’ebe ọzọ. Ọ bụrụ na tiivi dị ebe ahụ, gbanyụọ ya. Chefuokwa ihe ọ bụla gbasara ebe a na-ezirịta ozi n’Ịntanet. Baịbụl kwuru, sị: “Na-ejinụ oge unu eme ihe kacha mkpa.”​—Ndị Kọlọsi 4:5.

    “Achọpụtala m na ọ na-akara m mma ime naanị otu ihe n’otu oge. Obi na-akakwa adị m ụtọ ma m mechaa otu n’ime ihe ndị m bu n’obi ime tupu mụ agafee n’ọzọ. Ọ bụ isi otú a eme ihe na-eme m ezigbo obi ụtọ.”​—Onya.

  • Emela ihe ọzọ mgbe gị na mmadụ na-ekwurịta okwu. Ọ gaghị abara gị uru ma ị na-apị ekwentị mgbe gị na mmadụ na-ekwurịta okwu, ọ na-egosikwa na ị naghị akwanyere onye ahụ ùgwù. Baịbụl kwuru na anyị kwesịrị ịna-emere ndị ọzọ ihe anyị chọrọ ka ha na-emere anyị.​—Matiu 7:12.

    “Mgbe ụfọdụ, ọ na-abụ m na-agwa nwanne m nwaanyị okwu, ya ana-apị ekwentị ya ma ọ bụ na-ezigara mmadụ ozi. Ihe a na-afụ m ka ose. Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na m na-emekwa otú ahụ mgbe ụfọdụ.”​—David.

Ihe ndị na-eto eto ibe gị kwuru

Javan.

“Ọ bụrụ na e nwere ihe m na-eme, nke m kwesịkwara itinye uche na ya, m na-apịnye ekwentị m n’ebe ọ na-agaghị adapụta ụda, lekwasịzie anya n’ihe ahụ m na-eme. Ime otú ahụ na-eme ka m rụpụta ọtụtụ ihe, rụọkwa ihe ndị ahụ nke ọma.”​—Javan.

Kiara.

“O nwere ike isiri mmadụ ike ime naanị otu ihe n’otu oge. Ma, ọ bụrụ na mmadụ elekwasị otu ihe anya n’otu oge, onye ahụ ga-eme ihe ahụ nke ọma. Mmadụ ịrụ otu ihe nke ọma dị mma karịa mmadụ ịganye aka n’ọtụtụ ihe n’otu oge ma mebisịa ha.”​—Kiara.

Ntụleghachi: Ọ̀ dị mma mmadụ ịna-eme ọtụtụ ihe otu mgbe?

  • Ọ bụrụ na ihe abụọ ị na-eme n’otu oge bụ ihe ndị e kwesịrị itinye uche na ha, ha abụọ nwere ike ịkụ afọ n’ala.

  • Onye ọ bụla na-eme ọtụtụ ihe otu mgbe na-etinye onwe ya na gbalụ gbalụ.

  • Ị chọọ ime ihe ị na-eme nke ọma, gbalịa na-eme naanị otu ihe n’otu oge.

  • Ọ gaghị abara gị uru ma ị na-eme ihe ndị ọzọ mgbe gị na mmadụ na-ekwurịta okwu, ọ na-egosikwa na ị naghị akwanyere onye ahụ ùgwù.

  • O nwere ike isiri gị ike ime naanị otu ihe n’otu oge. N’ihi ya, wepụ ihe ọ bụla nwere ike ịdọpụ gị uche.

a Ihe a si n’akwụkwọ bụ́ Reclaiming Conversation.

b Ihe a si n’akwụkwọ bụ́ Disconnected.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya