OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
Jehova Na-eme Ka Mkpagbu A Na-akpagbu Ndị Ya Ghọọ Ohere Ọma Iji Zie Ozi Ọma
Ọtụtụ mgbe, ihe na-abụ ebumnobi ndị na-emegide anyị bụ ịkwụsị ozi ọma anyị na-ekwusa. Ma, ọ bụrụ na anyị anọgide na-erubere Jehova isi n’oge ndị ahụ, ọ ga-eme ka ndị ọzọ nụ ozi ọma, e tookwa Jehova.
LEENỤ VIDIO BỤ́ AJỤJỤ ỌNỤ A GBARA NWANNA DMITRIY MIKHAYLOV, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:
Olee otú e si kpagbuo Nwanna Mikhaylov?
Olee otú Jehova si nyere Nwanna Mikhaylov aka ịtachi obi?
Olee otú Jehova si mee ka ndị mkpọrọ ndị ọzọ nụ ozi ọma Alaeze n’ihi mkpagbu a kpagburu Nwanna Mikhaylov?