Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
Ruo ókè hà aṅaa ka ndị Kraịst kwesịrị iji nkwa ọlụlụ akpọrọ ihe?
Nkwa ọlụlụ bụ ihe na-enye obi ụtọ, ma ọ bụkwa ihe a ga-eji akpọrọ ihe. Ọ dịghị onye Kraịst tozuru okè nke kwesịrị iji nkwa ọlụlụ gwurie egwu, na-eche na ya pụrụ ịtọsa ya mgbe ọ masịrị ya. Oge nwoke na nwanyị nọ ná nkwa ọlụlụ bụkwa oge ha ga-eji mara onwe ha nke ọma karị tupu ha alụọ.
N’ịtụle isiokwu a, ọ dị anyị mkpa ịghọta na omenala ndị metụtara alụmdi na nwunye, na nzọụkwụ ndị na-eduga na ya, dị nnọọ iche iche n’ebe nakwa n’oge ndị dịgasị iche. Bible na-eme ka nke a doo anya.
N’ụzọ ụfọdụ, ụmụ ndị inyom abụọ Lọt, bụ́ ndị “aka-amaghị ahụ nwoke,” na ndị ikom abụọ nke obodo ahụ kwere nkwa ịlụ onwe ha. ‘Di ụmụ ndị inyom Lọt na-alụ ha,’ ma Bible agwaghị anyị ihe mere ha ji kwe nkwa ọlụlụ ma ọ bụ otú ha si kwee ya. Ụmụ ndị inyom ahụ hà etoruola ogo mmadụ? Hà keere òkè bụ́ isi n’ịhọrọ ndị ha ga-alụ? Hà kwere nkwa ọlụlụ ha site n’ime ihe ụfọdụ n’ihu ọha? Anyị amaghị. (Jenesis 19:8-14) Anyị maara na Jekọb so nna Rechel kwekọrịta ịlụ Rechel ma ya rụsịara ya ọrụ ruo afọ asaa. Ọ bụ ezie na Jekọb kwuru banyere Rechel dị ka “nwunye m,” ha enweghị mmekọahụ ọ bụla n’afọ ndị ahụ. (Jenesis 29:18-21) Dị ka ihe atụ ọzọ, tupu ya enwee ike ịlụ nwa nwanyị Sọl, Devid aghaghị imeri ndị Filistia. Mgbe o mezuru ihe Sọl kwuru, Devid lụziri nwa Sọl, bụ́ Maịkal. (1 Samuel 18:20-28) “Nkwa ọlụlụ” ndị ahụ dịgasị iche n’ebe ibe ha dị nakwa n’ihe a na-ahụkarị n’ọtụtụ ala taa.
Iwu Mosis nwere iwu nduzi ndị metụtara alụmdi na nwunye na nkwa ọlụlụ. Dị ka ihe atụ, nwoke pụrụ ịlụ ihe karịrị otu nwanyị; ọ pụrụ ịgba alụkwaghịm n’ọnọdụ dị iche iche, ọ bụ ezie na ihe àmà na-egosi na nwanyị apụghị ime otú ahụ. (Ọpụpụ 22:16, 17; Deuterọnọmi 24:1-4) Nwoke nke ratara nwa agbọghọ na-amaghị nwoke nke a na-ekwebeghị nkwa ọlụlụ iso ya nwee mmekọahụ aghaghị ịlụ ya ma ọ bụrụ na nna nwanyị ahụ ekwe, ọ pụghịkwa ịgba ya alụkwaghịm ma ọlị. (Deuterọnọmi 22:28, 29) E nwere iwu ndị ọzọ metụtara alụmdi na nwunye, dị ka mgbe a ga-ezere mmekọahụ. (Levitikọs 12:2, 5; 15:24; 18:19) Olee iwu nduzi ndị metụtara nkwa ọlụlụ?
N’ụzọ iwu, a na-ele nwanyị Israel e kwere nkwa ọlụlụ anya n’ụzọ dị iche n’otú e si ele nwanyị a na-ekwebeghị nkwa ọlụlụ; n’ọnọdụ ụfọdụ a na-ele ya anya dị ka onye lụrụ di. (Deuterọnọmi 22:23-29; Matiu 1:18, 19) Ụmụ Israel apụghị ikwe ndị ikwu ụfọdụ nkwa ọlụlụ ma ọ bụ lụọ ha. Ndị a na-abụkarị ndị ikwu ha na ha si n’otu ọbara, ma a machibidoro ụfọdụ nkwa ọlụlụ na alụmdi na nwunye iwu n’ihi ihe nketa ndị ruuru mmadụ. (Levitikọs 18:6-20; lee Ụlọ Nche September 15, 1978, peji nke 13-16.) O doro anya na ndị ohu Chineke agaghị e ji nkwa ọlụlụ gwurie egwu.
Ụmụ Israel nọ n’okpuru iwu nchịkwa nile dị otú ahụ nke Iwu ahụ, ma ndị Kraịst anọghị n’okpuru Iwu ahụ, gụnyere iwu nchịkwa ya ndị metụtara nkwa ọlụlụ ma ọ bụ alụmdi na nwunye. (Ndị Rom 7:4, 6; Ndị Efesọs 2:15; Ndị Hibru 8:6, 13) N’ezie, Jisọs kụziri na ụkpụrụ ndị Kraịst nke metụtara alụmdi na nwunye dị iche na nke Iwu ahụ. (Matiu 19:3-9) Ma, o belataghị ịdị mkpa nke alụmdi na nwunye, ma ọ bụ nke nkwa ọlụlụ. Ya mere, gịnị banyere isiokwu anyị na-atụle, nkwa ọlụlụ n’etiti ndị Kraịst?
N’ọtụtụ ala, ndị mmadụ n’otu n’otu na-ahọrọ onye ha ga-alụ n’onwe ha. Ozugbo nwoke na nwanyị kwere nkwa ịlụ onwe ha, a na-ele ha anya dị ka ndị banyere ná nkwa ọlụlụ. Dị ka o si adịkarị, nzọụkwụ ọzọ adịghị mkpa iji guzobe nkwa ọlụlụ ahụ. N’eziokwu, ọ bụ ihe a na-ahụkarị n’ebe ụfọdụ bụ́ nwoke inye onye gaje ịbụ nwunye ya mgbaaka iji gosipụta nkwa ọlụlụ ha. Ma ọ bụ ọ pụrụ ịbụ omenala ịgwa ndị ikwu na ndị enyi banyere nkwa ọlụlụ ahụ, dị ka n’oge nri ezinụlọ ma ọ bụ n’obere mgbakọta ndị ọzọ. Ihe ndị a bụ nhọrọ onwe onye, ọ bụghị ihe Akwụkwọ Nsọ chọrọ. Ihe bụ nkwa ọlụlụ ahụ bụ nkwekọrịta mmadụ abụọ ahụ kwekọrịtara.a
Onye Kraịst ekwesịghị iji ọsọ gbaba ná mbedo, nkwa ọlụlụ, ma ọ bụ n’alụmdi na nwunye. Anyị na-ebipụta ihe ọmụma dabeere na Bible bụ́ nke pụrụ inyere ndị na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye aka ikpebi ma ọ̀ bụ ihe amamihe dị na ya ịmalite ime mbedo ma ọ bụ iwere nzọụkwụ ndị na-eduga ná nkwa ọlụlụ ma ọ bụ alụmdi na nwunye.b Ihe bụ́ isi e ji enye ndụmọdụ ahụ bụ na alụmdi na nwunye ndị Kraịst bụ ihe na-adịgide adịgide.—Jenesis 2:24; Mak 10:6-9.
Ndị Kraịst abụọ kwesịrị ịmara onwe ha nke ọma tupu ha amalite iche echiche ikwe nkwa ọlụlụ. Nke ọ bụla n’ime ha pụrụ ịjụ, sị, ‘Èji m ọnọdụ ime mmụọ nke onye nke ọzọ na nrubeisi ya nye Chineke n’aka n’ezie? Àpụrụ m iche echiche mụ na onye ahụ ijekọrọ Chineke ozi ọnụ ná ndụ m nile? Ànyị amatawo àgwà ibe anyị nke ọma? Obi ò siri m ike na anyị ga na-ekwekọ n’ụzọ na-adịgide adịgide? Ànyị maara omume ndị gara aga nke ibe anyị na ọnọdụ ndị anyị nọ na ha ugbu a nke ọma?’
Ozugbo ndị Kraịst abụọ kwere ibe ha nkwa ọlụlụ, ọ bụ ihe ziri ezi ha na ndị ọzọ ịtụwa anya na alụmdi na nwunye ga-esochi. Jisọs dụrụ ọdụ, sị: “Ka okwu unu bụrụ, Ee, ee; Ee e, ee e.” (Matiu 5:37) Ndị Kraịst kwere nkwa ọlụlụ kwesịrị iji ya akpọrọ ihe. Otú ọ dị, n’ọnọdụ a na-adịghị ahụkebe, onye Kraịst kwere nkwa ọlụlụ pụrụ ịchọpụta na e kwuteghị okwu banyere otu ihe gbara ọkpụrụkpụ ma ọ bụ na e zochiri ya tupu e kwee nkwa ọlụlụ ahụ. Ọ pụrụ ịbụ eziokwu dị ịrịba ama banyere ihe onye nke ọzọ mere n’oge gara aga, ọbụna mpụ ma ọ bụ omume rụrụ arụ. Onye Kraịst nke matara nke a aghaghị ikpebi ihe ọ ga-eme. Ikekwe mmadụ abụọ ahụ ga-ekwurịta okwu ahụ nke ọma ma kwekọrịta ịga n’ihu ná nkwa ọlụlụ ha. Ma ọ bụ ha pụrụ ijikọta aka ọnụ kpebie ịtọsa nkwa ọlụlụ ahụ. Ọ bụ ezie na ime otú ahụ nwere ike ịbụ ihe dịịrị nanị ha—ọ bụghị ihe ndị ọzọ kwesịrị ịmabanye na ya, na-anwa ichepụta ihe a gaara eme, ma ọ bụ na-ekpe ikpe—ọ bụ mkpebi siri nnọọ ike. N’aka nke ọzọ, onye nke matara banyere okwu a pụrụ inwe mkpali onwe onye ịtọsa nkwa ọlụlụ ahụ, ọbụna ma a sị na onye nke ọzọ chọrọ ka ọ gaa n’ihu.—Lee “Ajuju Ufọdu Ndi Nagu Akwukwọ-Ayi Naju” n’Ụlọ Nche nke December 15, 1975.
E nwere ezi ihe mere a ga-eji dozie okwu ndị dị otú ahụ tupu a na-abanye n’alụmdi na nwunye. Jisọs kwuru na ọ bụ nanị por·neiʹa, bụ́ ajọ mmekọahụ rụrụ arụ nke di ma ọ bụ nwunye, bụ ihe ndabere Akwụkwọ Nsọ e nwere maka ịgba alụkwaghịm nke ga-eme ka mmadụ nwere onwe ya ịlụgharị di ma ọ bụ nwunye. (Matiu 5:32; 19:9) O kwughị na a pụrụ isite n’ịgba alụkwaghịm tọsaa alụmdi na nwunye iwu kwadoro ma ọ bụrụ na mmadụ achọpụta nsogbu siri ike ma ọ bụ omume ọjọọ nke di ma ọ bụ nwunye ya mere tupu ha agbaa akwụkwọ.
Dị ka ihe atụ, n’oge Jisọs ọ bụ ihe kwere nnọọ omume ibute ọrịa ekpenta. Ọ bụrụ na nwoke onye Juu amata na nwunye ya (ma ọ̀ maara ma ọ bụ na ọ maghị) bu ọrịa ekpenta mgbe ọ lụrụ ya, nwoke ahụ ọ̀ ga-enwe ihe ndabere maka ịgba alụkwaghịm? Onye Juu nke nọ n’okpuru Iwu ahụ pụrụ ịgba alụkwaghịm n’ihi ya, ma Jisọs ekwughị na nke a kwesịrị ekwesị nye ụmụazụ ya. Tụlee ọnọdụ ụfọdụ e nwere n’oge a. Nwoke nke bu ọrịa ọta kpụrụkpụrụ, ọrịa herpes nke akụkụ ahụ o ji bụrụ nwoke, nje HIV, ma ọ bụ ajọ ọrịa ọzọ na-efe efe pụrụ ịlụ nwanyị n’emeghị ka ọ mara banyere ya. Ikekwe o butere ọrịa ya site ná mmekọahụ rụrụ arụ tupu ma ọ bụ n’oge ha nọ ná nkwa ọlụlụ. Nwunye ya imesị mara banyere ọrịa ya ma ọ bụ omume rụrụ arụ o mere n’oge gara aga (ọbụna enweghị ike ịmụ nwa ma ọ bụ enweghị ike ịtụwa mmadụ ime) adịghị agbanwe eziokwu ahụ bụ́ na ha bụzi di na nwunye. Omume ọjọọ e mere tupu a gbaa akwụkwọ abụghị ihe ndabere Akwụkwọ Nsọ maka ịtọsa alụmdi na nwunye dị nnọọ ka ọ na-abụghị ma ọ bụrụ na nwanyị butere ọrịa ụfọdụ ma ọ bụ ọbụna zochie afọ ime o butere n’aka nwoke ọzọ n’oge ọ na-alụ di. Ha alụwo ugbu a, ha ejikọtawokwa onwe ha n’otu.
N’eziokwu, a dịghị ahụkebe ọnọdụ ndị dị otú ahụ dị mwute, ma ihe atụ ndị a kwesịrị imesikwu isi ihe a na-ekwu ike: E kwesịghị iji nkwa ọlụlụ gwurie egwu. Tupu ha ekwe nkwa ọlụlụ nakwa n’oge ha kwere ya, ndị Kraịst kwesịrị ịgbalịsi ike ịmara ibe ha nke ọma. Ha kwesịrị ịdị na-agwa onye nke ọzọ eziokwu banyere ihe ọ chọrọ ịmara ma ọ bụ ihe ruuru ya ịmara. (N’ala ụfọdụ, iwu na-achọ ka di na nwunye mee nnyocha ahụ ike tupu ha abanye n’alụmdi na nwunye. Ndị ọzọ pụrụ ịchọ nnyocha dị otú ahụ maka ihe ọmụma nke onwe ha.) N’ụzọ dị otú a, ọṅụ na ịdị mkpa nke nkwa ọlụlụ ga-emezu nzube dị nsọpụrụ ka mmadụ abụọ ahụ na-abanye n’ọnọdụ kakwu enye ọṅụ ma sie ike bụ́ alụmdi na nwunye.—Ilu 5:18, 19; Ndị Efesọs 5:33.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a N’ebe ụfọdụ ndị nne na nna ka na-eme ndokwa maka ndị ga-alụ ụmụ ha. E nwere ike ime nke a ogologo oge tupu mmadụ abụọ ahụ eruo ịlụ di na nwunye. Ka ọ dị mgbe ahụ, a na-ewere ha dị ka ndị banyere ná nkwa ọlụlụ, ma ọ bụ ndị kwere ibe ha nkwa, ma ha alụbeghị.
b Lee Questions Young People Ask—Answers That Work, isiakwụkwọ nke 28-32, na Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ, isiakwụkwọ nke 2, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.