Ọkụkọ—Ihe A Ma Ama nke Hiri Nne
SITE N’AKA ONYE EDEMEDE TETA! NA KENYA
ỌKỤKỌ pụrụ ịbụ anụ ufe nke kasị n’ọnụ ọgụgụ n’ụwa. Dị ka atụmatụ e mere gosiri, e nwere ihe karịrị ijeri ọkụkọ 13! A ma nnọọ anụ ya ama nke na a na-ata ihe karịrị ijeri kilogram 33 n’ime ya kwa afọ. Ọzọkwa, n’ụwa nile, nnekwu ọkụkọ na-eyi ihe dị ka nde àkwá 600 n’otu afọ.
N’ala ndị dị n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa, ọkụkọ hiri nne ma dị ọnụ ala. N’ọtụtụ iri afọ gara aga, e kwere ndị ga-atụ vootu na United States nkwa na ezinụlọ ọ bụla ga-azụtali anụ ọkụkọ nanị ma ọ bụrụ na ha atụnyere otu onye nke so na-azọ ọchịchị. Otú ọ dị, taa, ọkụkọ abụghịzi anụ ndị oké ozu dị ka ọ bụbu ma ọ bụ ihe dịịrị nanị mmadụ ole na ole. Olee otú anụ ufe a pụrụ iche si ghọọ ihe aka pụrụ nnọọ iru na nke a ma nnọọ ama? Gịnịkwanụ banyere mba ndị ka daa ogbenye? Ọ̀ dị ohere ọ bụla e nwere na ha ga-eso na-enweta anụmanụ a hiri nne?
Akụkọ Banyere Anụ Ufe Ahụ
E sitere n’anụ ufe bụ́ red jungle fowl nke Esia nweta ọkụkọ. O teghị aka mmadụ achọpụta na a pụrụ ịkpa ọkụkọ akpa n’ụzọ dị mfe. Leenụ, ihe dị ka afọ 2,000 gara aga, Jisọs Kraịst zoro aka n’otú nnekwu ọkụkọ na-esi achịkọta ụmụ ya n’okpuru nku nchebe ya. (Matiu 23:37; 26:34) Ojiji e ji ihe atụ dị otú ahụ mee ihe na-egosi na ndị mmadụ n’ozuzu ha maara anụ ufe a nke ọma. Ma ọ bụ na narị afọ nke 19 ka ịkpa ọkụkọ n’ụba na ime ka ọkụkọ na-eyi àkwá n’ụba ghọrọ achụmnta ego.
Taa, anụ ọkụkọ bụ anụ a kasị mara n’ime anụ ufe ndị a na-akpa akpa. Ọtụtụ nde ezinụlọ—gụnyere ezinụlọ ndị nọ n’obodo ndị mepere emepe—na-akpa ọkụkọ maka oriri nakwa maka orire. N’eziokwu, ọ bụ anụmanụ ole na ole ka a pụrụ ịkpa n’ọtụtụ ebe ndị dịgasị nnọọ iche iche otú a na-akpa ọkụkọ. Ọtụtụ mba azụlitewo ụdị ndị na-anagide ọnọdụ ihu igwe ha nakwa ndị na-egbo mkpa ha. Ụfọdụ n’ime ha gụnyere: ọkụkọ Australorp nke Australia; ọkụkọ Leghorn a maara nke ọma, bụ́ nke sitere n’ógbè Mediterranean ma bụrụ nke a ma nnọọ ama na United States; ọkụkọ New Hampshire, ọkụkọ Plymouth Rock, ọkụkọ Rhode Island Red, na ọkụkọ Wyandotte, a na-akpa ha nile na United States; na ọkụkọ Cornish, ọkụkọ Orpington, nakwa ọkụkọ Sussex, bụ́ nke si England.
Usoro bụ́ ọkpọka nke nkà mmụta sayensị e ji arụ ọrụ ugbo emewo ka ịkpa ọkụkọ bụrụ otu n’ime ọrụ ugbo kasị aga nke ọma. Na United States, ndị ọrụ ugbo na-eji usoro a na-achịkwa nke ọma nke inye ihe oriri na itinye ha n’ebe a gbara ogige eme ihe, tinyere iji ụzọ nkà mmụta sayensị na-achịkwa ọrịa. Ọtụtụ ndị na-akatọ usoro ndị a nke ịkpa ọkụkọ n’ụba dị ka nke arụrụala. Ma nke ahụ emebeghị ka ndị ọrụ ugbo kwụsị ịchọpụta ụzọ ndị na-adịwanye irè nke isi akpa anụ ufe ndị a. Ugbu a, usoro ọgbara ọhụrụ na-eme ka o kwe mee nanị otu onye ilekọta site n’ọkụkọ 25,000 ruo n’ọkụkọ 50,000. Ọ na-ewe anụ ufe ndị ahụ nanị ọnwa atọ itoju otú o kwesịrị maka orire.a
Ihe Na-enye Anụ
Ị gaa n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ họtel nile, ụlọ nri nile, ma ọ bụ ụlọ mmanya nile, o sikata ike ka anụ nke anụ ufe a a na-akpa akpa ghara iso n’ihe ndị ha na-esi. N’eziokwu, ọtụtụ ndị na-ere nri ome ngwa ngwa gburugburu ụwa nwere nkà n’isi anụ ọkụkọ. E nwere ebe ndị anụ ọkụkọ ka bụ anụ kasị mma maka ememe ndị pụrụ iche. N’ala ụfọdụkwa, dị ka India, a chọpụtawo ụzọ ndị na-adọrọ adọrọ nke isi na-esi anụ ufe a. Nri ndị dị ka anụ ọkụkọ e tinyere ose, bụ́ lal murgi; anụ ọkụkụ e berisịrị eberisị, bụ́ kurgi murgi; na anụ ọkụkọ e ji ginger sie, bụ́ adrak murgi, na-atọ ezigbo ụtọ!
N’ihi gịnị ka anụ ọkụkọ ji bụrụ ihe a ma ama otú ahụ? Nke mbụ, ọ bụ ihe oriri ole na ole bụ ndị ha na ihe ndị dịgasị iche iche e ji eme ka ihe tọọ ụtọ na-ekwekọ nnọọ otú ha na anụ ọkụkọ si ekwekọ. Olee otú ị ga-achọ ka e si kwadebe ya? Ọ̀ bụ ighe ya eghe, ịhụ ya n’ọkụ, ịmị ya amị, isi ya esi, ka ọ̀ bụ isite ya aka na mmiri ọkụ? Meghee akwụkwọ ọ bụla na-akụzi otú e si esi nri, ma eleghị anya ị ga-achọpụta ọtụtụ ntụziaka maka isi anụ ọkụkọ bụ́ ndị e wepụtara iji mee ka nke ọ bụla tọọ ụtọ.
N’ihi ịbụ nke a pụrụ inweta n’ọtụtụ mba, anụ ọkụkọ dịtụ ọnụ ala. Ọ na-amasịkwa ndị ọkachamara n’ihe banyere nri, ebe ọ bụ na o nwere protein, vitamin, na ihe ndị ọzọ dị ahụ oké mkpa. Ma, anụ ọkụkọ nwere ọ̀tụ̀tụ̀ dị nta nke calorie, abụba ọjọọ, na abụba ndị ọzọ.
Ịbụrụ Ala Ndị Ka Na-emepe Emepe Ihe Oriri
Otú ọ dị, ọ bụghị mba nile nwere anụ ọkụkọ n’ụba. Nke a dị ịrịba ama n’ihi otu akụkọ sitere n’aka òtù ọrụ gbalụ gbalụ nke Kansụl Na-ahụ Maka Sayensị na Nkà na Ụzụ Ọrụ Ugbo, bụ́ nke kwuru, sị: “A na-eme atụmatụ na ọnụ ọgụgụ ndị bi n’ụwa ga-amụba ruo ijeri 7.7 ka ọ na-erule afọ 2020 . . . Otú ọ dị, a na-eme atụmatụ na a ga-enwe ihe ka ukwuu (95%) ná mmụba mmadụ ná mba ndị ka na-emepe emepe.” Okwu a dị ịrịba ama karị mgbe ị tụlere na ka ọ dị ugbu a ihe dị ka nde mmadụ 800 adịghị eri ihe na-edozi ahụ!
Ka o sina dị, ọtụtụ ndị ọkachamara na-eche na ọkụkọ pụrụ ikere òkè bụ́ isi n’ịbụrụ ndị a agụụ na-agụ ihe oriri na inye ndị ọrụ ugbo ego dị ha oké mkpa. Nke bụ́ nsogbu bụ na ịkpa ọnụ ọgụgụ buru ibu nke anụ ufe ndị a pụrụ ịbụrụ nnọọ ndị ọrụ ugbo dara ogbenye ihe ịma aka. Otu ihe bụ na, ná mba ndị ka daa ogbenye, a na-azụ ọkụkọ karịsịa n’obere ugbo ndị dị n’ime obodo ma ọ bụ n’azụ ụlọ. Ná mba ndị dị otú ahụ kwa, a dịghị edebekebe ọkụkọ n’ebe ndị dị nchebe. N’ehihie, a na-ahapụ anụ ufe ndị ahụ ka ha na-akpagharị ma na-achọgharị ihe oriri, na-alọbata n’abalị, mgbe ụfọdụ na-arahụ n’elu osisi ma ọ bụ na nkata ígwè.
Ọ bụghị ihe ijuanya na ọtụtụ n’ime anụ ufe ndị ahụ a na-akpa otú ahụ na-anwụsị—ụfọdụ site n’ajọ ọrịa na-egbu egbu bụ́ nṅaolu, ndị ọzọ abụrụ ndị anụ na-eri ibe ha riri, nakwa ndị anụmanụ na ndị mmadụ gburu. Ọnụ ọgụgụ ka ukwuu nke ndị ọrụ ugbo amaghị otú ha ga-esi na-enye ọkụkọ ha nri nke ọma, wuoro ha ụlọ kwesịrị ekwesị, ma ọ bụ na-echebe ha pụọ n’ọrịa dị iche iche, ha enweghịkwa ego ha ga-eji na-eme ihe ndị a. N’ihi nke a, a malitewo ihe omume dị iche iche iji nye aka ịkụziri ndị ọrụ ugbo nọ n’ala ndị ka na-emepe emepe ihe. Dị ka ihe atụ, n’oge na-adịbeghị anya, Òtù Na-ahụ Maka Nri na Ọrụ Ugbo nke Mba Ndị Dị n’Otu, malitere ọrụ ga-ewe afọ ise “iji nyere ndị ogbenye nọ n’ime obodo n’Africa aka site n’ịzụlitekwu ọkụkọ.”
A mabeghị ihe ga-esi n’ọrụ ndị dị otú ahụ e ji ezi nzube obi malite pụta. N’ihi ya, ọ na-akpali ndị bi ná mba ndị ka baa ọgaranya iche echiche mgbe ọ bụla ha chetara eziokwu ahụ bụ na ihe ọ na-adịghị ihe ọ bụ dị ka ibé ọkụkọ bụ nke ihe ka ọtụtụ ná ndị bi n’ụwa pụrụ ile anya dị ka ihe ndị oké ozu. Nye ndị dị otú ahụ, echiche nke ‘ezinụlọ ọ bụla ịzụtali anụ ọkụkọ’ pụrụ iyi nanị nrọ.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Ọ bụkwa ezie na a na-akpakwa ọkụkọ maka àkwá ha, na United States, a na-akpa pasent 90 maka anụ ha.
[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 17]
Imetụ Anụ Ọkụkọ Aka n’Ụzọ Na-adịghị Ize Ndụ
“Anụ ọkụkọ a na-esighị esi pụrụ inwe ihe ndị pụrụ ịdị ize ndụ, dị ka nje bacteria bụ́ salmonella, n’ihi ya ọ dị oké mkpa ịkpachara anya mgbe a na-abọ ya. Jiri mmiri ọkụ e tinyere ncha na-asa aka gị, bọọdụ ịbọ anụ, mma na mkpà e ji ebekasị anụ ọkụkọ mgbe nile tupu ị bọwa anụ ọkụkọ nakwa mgbe ị bọsịrị ya. Ọ dị mma iji bọọdụ ịbọ anụ a pụrụ iji mmiri dị ezigbo ọkụ saa mee ihe . . . ọ bụrụkwa na ọ ga-ekwe mee, idebe bọọdụ ịbọ anụ ahụ nanị maka ịbọ anụ ọkụkọ. Mee ka anụ ọkụkọ e tinyere na friji kụgbọọ kpam kpam tupu i sie ya.”—The Cook’s Kitchen Bible.
[Foto ndị dị na peeji nke 15]
Ụdị ọkụkọ ụfọdụ e nwere bụ “White Leghorn,” ọkụkọ “Gray Jungle,” “Orpington,” “Polish,” na “Sussex” tụrụ àgwà
[Ebe E Si Nweta Foto]
Ha nile ma e wezụga ọkụkọ White Leghorn: © Barry Koffler/www.feathersite.com
[Foto ndị dị na peeji nke 16]
A na-eme mgbalị inyere ndị ọrụ ugbo nọ n’ala ndị ka na-emepe emepe aka ịzụlitekwu ọkụkọ
[Foto dị na peeji nke 16]
Na United States, a na-akpa pasent 90 nke ọkụkọ maka anụ ha