Otu Obodo Ukwu Africa Ebe Ọwụwa Anyanwụ Na-ezute Ọdịda Anyanwụ
SITE N’AKA ONYE EDEMEDE TETA! NA SOUTH AFRICA
LEE ihe na-adọrọ anya ọ bụ ịga ije n’okporo ámá Durban! Ị ga-ahụ na ọtụtụ ndị na-ejizi ụdị ejiji a na-eji n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa, karịsịa ndị ntorobịa. Ma rịbakwa ndị inyom Zulu metụworo okenye ama bụ́ ndị yi uwe ogologo ndị kwesịrị ekwesị nakwa ndị e ji ịchafụ ndị tụrụ àgwà chọọ isi ha mma. E nwekwara ndị inyom India bụ́ ndị yi uwe sari ma ọ bụ Punjabi na traụza. Ka ị na-abịaru ụsọ mmiri ahụ nso, o yiri ka ị ga-ahụ ụfọdụ ndị ikom Zulu jiri ezigbo ejiji ka ha na-adọkpụ ụgbọala ricksha. N’eziokwu, Durban bụ obodo ukwu pụrụ iche nke Africa, ebe Ọwụwa Anyanwụ na-ezute Ọdịda Anyanwụ. Gịnị bụ akụkọ ihe mere eme nke obodo ukwu a na-adọrọ mmasị?
E birubeghi obodo ukwu Durban nke South Africa narị afọ abụọ. Ihe dị ka mmadụ 40 si Europe bịara biri n’ebe a na 1824. N’oge ahụ, isi obodo nke alaeze dị ike nke ndị Zulu bụ́ nke dị n’okpuru ọchịchị Shaka, bụ́ ọchịagha ha, dị n’ebe ugwu Durban. Iri afọ abụọ mgbe e mesịrị, Britain weghaara Durban na ógbè ndị gbara ya gburugburu. Ndị Zulu na ndị ọhụrụ a na-achị mba ọzọ lụrụ ọtụtụ agha na narị afọ nke 19.
Ka ọ dịgodị, ndị Bekee bi n’ebe ahụ hụrụ na okpete na-eto nke ọma n’ógbè ndị dị n’ụsọ oké osimiri ndị ahụ. Iji rụọ ugbo shuga ha, ha mere ndokwa ka ndị ọrụ si India, bụ́ mba ọzọ Britain na-achị mgbe ahụ, bịa. N’agbata afọ 1860 na 1911, ihe karịrị ndị India 150,000 bịara na Durban. N’ihi ya, taa, akụkụ na-ekwo ekwo nke Durban nwere ọnụ ọgụgụ mmadụ karịrị nde atọ, bụ́ nke ndị si n’akụkụ atọ dịgasị iche iche nke ụwa mejupụtara—ndị Zulu bụ́ ndị amaala, ndị Esia si India, na ndị Britain na ndị ebe ọdịda anyanwụ Europe.
Obodo ukwu ahụ nwere ihe ndị ọzọ na-adọrọ mmasị. Dị ka a pụrụ ịhụ na foto dị n’isiokwu a, o nwere ọdụ ụgbọ mmiri a na-ejighị aka rụọ bụ́ nke otu ogologo ala dị warara nke a na-akpọ Bluff mere ka a ghara ịnọ n’Oké Osimiri India na-ahụ ya. Ala a mara mma nke gbapụrụ iche dị ihe karịrị mita 90 n’ịdị elu, ọhịa kpuchikwara ya. Kwa ụbọchị, nnukwu ụgbọ mmiri na-abanye n’ọdụ ụgbọ mmiri a ji aka ya meere onwe ya ndò. Akwụkwọ bụ́ Discovery Guide to Southern Africa na-akọwa na Durban nwere “ọdụ ụgbọ mmiri kasị saa mbara nke a kasị arụ ọrụ na ya n’Africa, nke bụ́ nke itoolu n’ụwa.” Ọmarịcha ụsọ mmiri dị iche iche nke Durban na-adọta ndị bịara ezumike, mmiri ya ndị na-ekpotụ ọkụ na-amasịkwa ha. E nwere ebe ndị dị mma maka ịgba n’elu ebili mmiri, ndị na-asa ahụ na ha pụkwara inwe obi iru ala n’ihi nchebe nke ụgbụ ndị a na-elekọta nke ọma bụ́ ndị na-egbochi azụ̀ shark na-enye.
Ndị nwere mmasị na Bible nwekwuru ihe mere ha ga-eji enwe mmasị n’obodo ukwu ahụ. Ndị Mmụta Bible, dị ka e si mara Ndịàmà Jehova mgbe ahụ, guzobere alaka ụlọ ọrụ n’ebe a na 1910. E mesịa, n’April 1914, mgbakọ mbụ Ndị Mmụta Bible nwere n’Africa weere ọnọdụ na Durban. Ihe dị ka mmadụ 50 bịara ya, gụnyere ndị si n’akụkụ ndị dịpụrụ adịpụ nke South Africa. Ná mgbakọ ahụ mere ihe akụkọ, e mere ndị ọhụrụ 16 na-efe ofufe baptism. Ọtụtụ n’ime ndị bịaranụ bụ ndị Kraịst e tere mmanụ bụ́ ndị nọgidere na-ekwesị ntụkwasị obi ruo n’ọnwụ, gụnyere William W. Johnston, bụ́ onye mbụ lekọtara alaka ụlọ ọrụ n’Africa.
Ndịàmà Jehova enwewo ọtụtụ mgbakọ ndị ọzọ na Durban kemgbe 1914. Na December 2000, ihe dị ka mmadụ 14,848 gara mgbakọ abụọ “Ndị Na-eme Okwu Chineke” e nwere n’obodo ukwu ahụ, e mekwara ndị ọhụrụ 278 baptism. Tụlee ihe banyere otu n’ime ọtụtụ ezinụlọ ndị India bịaranụ. Afọ iri gara aga, Somashini mere ka nna ya bụ́ Alan mata eziokwu Bible. Alan nọ na-agbake site n’aṅụrụma ma na-achọ nzube ná ndụ. Somashini, bụ́ onye dị nanị afọ atọ mgbe ahụ, wetaara nna ya otu akwụkwọ nke ọ hụrụ n’ụlọ onye agbata obi ha. Aha ya nke bụ́, Ezi Udo na Ịnọ ná Ntụkwasị Obi—Olee Otú Ị Pụrụ Isi Nweta Ya?, masịrị Alan ozugbo. Ihe ọ gụrụ masịrị ya, ọ malitekwara iso Ndịàmà Jehova na-akpakọrịta. N’ihi ihe Alan mụtara na Bible, o debanyere alụmdi na nwunye ya n’akwụkwọ n’ụzọ iwu kwadoro. N’oge na-adịghị anya, nwunye ya, bụ́ Rani, bịakwara nwee mmasị ma malite ịga nzukọ Ndịàmà Jehova. N’oge ahụ, di na nwunye ahụ binyeere nne na nna Rani, bụ́ ndị na-aga otu n’ime chọọchị Krisendọm. Nne na nna Rani megidere okpukpe di na nwunye a na-akatabeghị ahụ chọtara ọhụrụ ma nye ha otu iwu: “Unu ga-ahapụ Ndịàmà ma ọ bụkwanụ unu esi n’ụlọ anyị pụọ!”
Alan na Rani kpebiri ịpụ, n’agbanyeghị na o siri ike ịchọta ebe obibi. Ndị enyi ha n’etiti Ndịàmà Jehova nyeere ha aka ịchọta ebe obibi dị mma. Na 1992, e mere Alan na Rani baptism dị ka Ndịàmà Jehova. Ha nọgidere na-enwe ọganihu, Alan na-ejekwa ozi taa dị ka okenye n’ọgbakọ ndị Kraịst.
E nwere ihe karịrị ọgbakọ 50 nke Ndịàmà Jehova n’akụkụ na-ekwo ekwo nke Durban. Ihe ka ọtụtụ n’ime ha bụ ndị Zulu mejupụtara ha. Otú ọ dị, ọ bụ ndị Zulu, ndị India, na ndị Europe mejupụtara ọgbakọ ụfọdụ, karịsịa ndị dị nso n’etiti obodo ukwu ahụ. Ọ bụrụ na ị gaa otu n’ime nzukọ ndị a, ị ga-ahụ ihe karịrị nnọọ Ebe Ọwụwa Anyanwụ izute Ebe Ọdịda Anyanwụ. Ma eleghị anya, ọ ga-abụ Onyeàmà bụ́ onye Africa nke jiri ejiji n’ụzọ magburu onwe ya ga na-eduzi ya, ma ọ bụ Onyeàmà bụ́ onye India ma ọ bụkwanụ Onyeàmà bụ́ onye Europe. Ma e ji otu ihe n’aka: N’etiti ndị na-ege ntị, ị ga-ahụ ihe àmà a na-ahụ anya na Bible nwere ikike nke ime ka ndị si ná mba nile dịrị n’otu n’ọbụbụenyi ịhụnanya nke na-adịgide adịgide.
[Foto dị na peeji nke 22]
Alan, Rani, na ụmụ ha
[Foto dị na peeji nke 22]
Nzukọ ọgbakọ na-eme ka ndị si n’agbụrụ nile gbakọta ọnụ
[Foto dị na peeji nke 22]
Ụlọ nzukọ obodo ukwu bụ́ Durban
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 21]
Foto: Site n’aka Gonsul Pillay