Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g16 nke 2 p. 12-13
  • Nchegbu

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nchegbu
  • Teta!—2016
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Mmadụ ichegbu onwe ya ọ̀ dị njọ?
  • Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na ị na-echegbukarị onwe gị?
  • Ò nwere mgbe nchegbu ga-akwụsị?
  • Na-atụkwasị Jehova Nchegbu Gị Niile
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2016
  • Tụkwasị Jehova Nchegbu Gị Nile
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Gịnị Ka M Ga-eme Ka M Kwụsị Ịna-echegbu Onwe M?
    Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị
  • Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2017
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2016
g16 nke 2 p. 12-13

IHE BAỊBỤL KWURU

Nchegbu

Nchegbu dị ụzọ abụọ. E nwere nke na-enyere mmadụ aka, nwee nke na-emebi ihe. Baịbụl kwuru otú anyị ga-esi amata ha abụọ.

Mmadụ ichegbu onwe ya ọ̀ dị njọ?

NKE BỤ́ EZIOKWU

Obi anaghị eru onye na-echegbu onye ya ala. Otú ihe si dịrị n’ụwa a nwere ike ime ka onye ọ bụla n’ime anyị chegbuwe onwe ya.

IHE BAỊBỤL KWURU

Eze Devid kwuru na o nwere mgbe mkpụrụ obi ya nọ na-agba mgba, ya ana-erukwa uju ụbọchị niile. (Abụ Ọma 13:2) Gịnị nyeere Devid aka? O kpere ekpere, kọọrọ Chineke otú obi dị ya. Obi sikwara ya ike na Chineke ga-enyere ya aka. (Abụ Ọma 13:5; 62:8) Chineke na-agwakwa anyị ka anyị kọọrọ ya mkpa anyị. Baịbụl kwuru, sị: ‘Tụkwasịnụ ya nchegbu unu niile, n’ihi na ihe banyere unu na-emetụ ya n’obi.’—1 Pita 5:7.

Ebe otu agadi nwaanyị nọ ọdụ na-ele ka ndị ezinụlọ ya na-arụrụ ya ọrụ n’ụlọ ya

Imere ndị ikwu na ibe anyị ihe ga-eme ka anyị ghara ịna-echegbu onwe anyị maka ha

Ma, o nwere ihe ụfọdụ mmadụ nwere ike ime ka nchegbu ya belata. Dị ka ihe atụ, Pọl onyeozi gbara mbọ kasie ndị ya na ha na-efekọ Chineke obi ma gbaa ha ume mgbe ihe gbasara ha nọ na-echu ya ụra. (2 Ndị Kọrịnt 11:28) Nchegbu ahụ ọ nọ na-enwe bara uru n’ihi na o mere ka o nyere ụmụnna ya aka. Anyịnwa nwekwara ike ime ka ya. A sị na o mere ka ọ gbasaghị ya, ọ garaghị enwe ike inyere ha aka.—Ilu 17:17.

“Na-elekwasị anya, ọ bụghị naanị n’ọdịmma onwe unu, kamakwa n’ọdịmma nke ndị ọzọ.”—Ndị Filipaị 2:4.

Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na ị na-echegbukarị onwe gị?

NKE BỤ́ EZIOKWU

Ndị mmadụ nwere ike ịna-echegbu onwe ha maka ego, ihe ndị ha mejọrọ n’oge gara aga, ma ọ bụkwanụ maka otú ihe ga-adị n’ọdịnihu.a

IHE BAỊBỤL KWURU

Mmadụ ichegbu onwe ya maka ihe o mere: N’oge ochie, o nwere ụfọdụ Ndị Kraịst bụbu ndị aṅụrụma, ndị na-apụnara mmadụ ihe, ndị na-akwa iko, na ndị ohi. (1 Ndị Kọrịnt 6:9-11) Kama ịnọ na-echegbu onwe ha n’ihi ihe ndị ahụ ha mere n’oge gara aga, ha gbanwere ma nwee obi ike na Chineke ga-agbaghara ha. Abụ Ọma 130:4 kwuru, sị: “Ezi mgbaghara dị n’aka gị [Chineke].”

Amaghị ihe echi ga-abụ: Jizọs sịrị: “Unu echegbula onwe unu mgbe ọ bụla maka echi, n’ihi na echi ga-enwe nchegbu nke ya.” (Matiu 6:25, 34) Ihe Jizọs na-ekwu n’amaokwu a bụ na anyị kwesịrị ilekwasị anya naanị n’otú ihe si dịrị anyị n’ụbọchị. Anyị ekwesịghị iburu nsogbu dịịrị echi tụkwasị na nke taa n’ihi na o nwere ike ime ka anyị mee mkpebi na-enweghị isi. O nwedịrị ọtụtụ ihe nwere ike ịna-echu mmadụ ụra, e mechaa, onye ahụ achọpụta na ihe ndị ahụ ekwesịghị ịna-echegbu ya.

Ego: Otu onye ma ihe rịọrọ Chineke si: “Emela ka m daa ogbenye, enyekwala m akụnụba.” (Ilu 30:8) Ihe ọ rịọrọ Chineke bụ ka o mee ka ihe ọ bụla ya nwere ju ya afọ, nke bụ́kwanụ ihe ga-eme ka ya na Chineke dịrị ná mma. Ndị Hibru 13:5 gwara anyị sị: “Ka ụzọ ndụ unu bụrụ nke ịhụnanya ego na-adịghị na ya, ka unu nọ na-enwe afọ ojuju n’ihe ndị dị ugbu a. N’ihi na o kwuwo, sị: ‘M gaghị ahapụ gị ma ọlị, m gaghịkwa agbahapụ gị ma ọlị.’” Onye nwere ego taa nwere ike ịbụ ogbenye echi. Ma, Chineke anaghị ahapụ ndị tụkwasịrị ya obi ma nwee afọ ojuju n’ihe ọ bụla ha nwere.

“Ahụbeghị m ka a hapụrụ onye ọ bụla bụ́ onye ezi omume kpamkpam, ahụbeghịkwa m ụmụ ya ka ha na-arịọ nri.”—Abụ Ọma 37:25.

Ò nwere mgbe nchegbu ga-akwụsị?

IHE NDỊ MMADỤ NA-EKWU

N’afọ 2008, otu akwụkwọ akụkọ kwuru na nchegbu ga na-arị ibe ya elu ka chi na-abọ na-aga. N’afọ 2014, otu akwụkwọ akụkọ a na-ebi n’Amerịka kwukwara na ọtụtụ ndị Amerịka na-echegbu onwe ha.

IHE BAỊBỤL KWURU

“Ọ bụ nchegbu nke dị n’obi mmadụ ga-anyịgbu ya, ma, ọ bụ okwu ọma na-eme ka ọ ṅụrịa ọṅụ.” (Ilu 12:25) Ị manụ na “okwu ọma” dị n’ozi ọma gbasara Alaeze Chineke. (Matiu 24:14) N’oge na-adịghị anya, Alaeze ahụ, ya bụ, ọchịchị Chineke, ga-eme ihe anyị na-anaghị emeli. Ọ ga-eme ka ihe niile na-eme ka ndị mmadụ na-echegbu onwe ha kwụsị. Ọ ga-ewepụ nrịrịa na ọnwụ. Chineke kwere anyị nkwa na ya ‘ga-ehichapụ anya mmiri niile n’anya anyị, na ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru uju ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ.’—Mkpughe 21:4.

“Ka Chineke onye na-enye olileanya mee ka unu jupụta n’ọṅụ niile na udo niile n’ihi na unu kwere ekwe.”—Ndị Rom 15:13.

a Onye ọ bụla oké nchegbu na-akpaghasị ahụ́ nwere ike ịga hụ dọkịta. Teta! anaghị ekwu na ọ bụ otú a ma ọ bụ otú ọzọ ka e kwesịrị isi agwọ ọrịa.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya