Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g20 nke 1 p. 5-7
  • Gịnị Bụ Nchegbu?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Gịnị Bụ Nchegbu?
  • Teta!—2020
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • NCHEGBU NDỊ NKE DỊ MMA NA NDỊ NKE NA-ADỊGHỊ MMA
  • Nrụgide Dị Mma, Nrụgide Dị Njọ
    Teta!—1998
  • Nchegbu—Ihe Ndị Na-akpata Ya na Mmetụta Ndị Ọ Na-enwe
    Teta!—2005
  • Olee Otú M Ga-esi Merie Ihe Na-esiri M Ike n’Ụlọ Akwụkwọ?
    Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 1
  • Ndị Nchegbu Na-akpa Aka Ọjọọ!
    Teta!—2005
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2020
g20 nke 1 p. 5-7
Ebe otu onye ọchụnta ego ji ọsọ na-agbaba n’ụlọ ọrụ ha.

IHE GA-ENYERE GỊ AKA IBELATA NCHEGBU

Gịnị Bụ Nchegbu?

Nchegbu bụ ihe mmadụ na-emekarị ma ihe karịrị ya bịara ya. N’oge nchegbu, ụbụrụ gị na-emepụta ihe dị mmiri mmiri a na-akpọ hormone. Ihe a na-agazu gị ahụ́ niile, na-eme ka obi gị na-akụsi ike, na-eme ka ọbara gị na-agbasi ike, na-eme ka akpa ume gị gbasaa ma ọ bụ kpachitụ, na-emekwa ka uru ahụ́ gị sie ike. Tupu gị amara ihe na-eme, ahụ́ gị adịla njikere maka ihe chọrọ ime. Ọ bụrụ na oge ahụ agafechaa, ahụ́ gị na-adịghachikwa otú ọ dị na mbụ.

NCHEGBU NDỊ NKE DỊ MMA NA NDỊ NKE NA-ADỊGHỊ MMA

Nchegbu nwere ike ime ka ị dịrị njikere maka ihe ndị tara akpụ na ihe ndị dị ize ndụ na-aga ime. Ọ na-amalite n’ụbụrụ gị. Ọ na-eme ka i mee ihe ngwa ngwa. O nwekwara ike ime ka ị na-emekwu nke ọma, dị ka n’ule, mgbe a na-agba gị ajụjụ ọnụ n’ebe a chọrọ iwe gị n’ọrụ, ma ọ bụkwanụ mgbe ị na-eme egwuregwu.

Ma, nchegbu gafere ókè nwere ike ịkpatara gị nsogbu. Ọ bụrụ na ị na-echegbu onwe gị mgbe niile, o nwere ike ịkpatara gị ọrịa, iwekarị iwe, ụjọ, ma ọ bụ ichefu ihe. O nwekwara ike ime ka àgwà gị na otú i si emeso ndị mmadụ gbanwee. Mmadụ ichegbukarị onwe ya nwere ike ime ka ọ ṅụwa ọgwụ ọjọọ ma ọ bụ mewe ihe ndị ọzọ na-adịghị mma iji chefuo nsogbu ya. O nwedịrị ike ịkpatara mmadụ ịda mbà, ike ọgwụgwụ, ma ọ bụ iche echiche igbu onwe ya.

Ọ bụ eziokwu na ihe nchegbu na-eme Okeke nwere ike ịdị iche n’ihe ọ na-eme Okafọ, ma o nwere ike ịkpata ọtụtụ ọrịa. O nwekwara ike ịkpa ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ akụkụ ahụ́ anyị niile aka ọjọọ.

IHE NCHEGBU NWERE IKE IME AHỤ́ GỊ

Akwara ndị dị n’ahụ́.

Ebe otu nwoke hụlatara ihu ya na-echegbu onwe ya.

Akwara ndị dị gị n’ahụ́ na-emepụta hormone ndị dị ka adrenaline na cortisol. Ha na-eme ka obi gị na-akụsi ike, mee ka ọbara na-agasi ike n’ahụ́ gị, meekwa ka ihe a na-akpọ glucose dị n’ọbara gị mụbaa. Ihe a niile na-eme ka ahụ́ anyị dịrị njikere maka ihe ndị nwere ike ịkpatara anyị nsogbu. Ma, oké nchegbu nwere ike ịkpata

  • ahụ́ mgbakasị, obi erughị ala, ịda mbà, isi ọwụwa, ehighị ụra nke ọma

Ọkpụkpụ na uru ahụ́.

Uru ahụ́ gị na-abịa sie ike iji chebe gị ka ị ghara imerụ ahụ́. Ma, oké nchegbu nwere ike ịkpata

  • ahụ́ mgbu, isi ọwụwa, mọzụl pul

Iku ume.

Ọ na-eme ka ị na-ekusitụ ume ike ka i nwee ike na-ekuta ikuku nke ọma. Ma, oké nchegbu nwere ike ịkpata

  • iku ume ọkụ ọkụ na ekurughị ume ala, ịtụ oké ụjọ ma ọ bụ obi mmapụ

Obi.

Obi gị na-amalite ịkụkwu ngwa ngwa ka o nwee ike ịna-ekesa ọbara n’ahụ́ gị. Akwara ndị ọbara na-esi na ha aga na-emeghe ma ọ bụ mechie ka ọbara nwee ike iru ebe ahụ́ gị chọrọ ya karịchaa, dị ka n’uru ahụ́. Ma, oké nchegbu nwere ike ịkpata

  • ọbara mgbali elu, obi nkụchi, ọrịa strok

Akụkụ ahụ́ na-emepụta hormone.

Ahụ́ gị na-emepụta adrenaline na cortisol. Ha na-enye aka ibelata nchegbu. Imeju gị na-eme ka shuga dị n’ọbara gị gbagote, mezie ka i nwekwuo ume. Ma, oké nchegbu nwere ike ịkpata

  • ọrịa shuga, ahụ́ gị ịghara ịna-alụso ọrịa ọgụ, ọrịa ndị ị na-arịa ịka njọ, obi ịnọkata jọwa gị njọ, na oké ibu

Eriri afọ.

Ahụ́ gị anaghịzi agbari nri nke ọma. Oké nchegbu nwekwara ike ịkpata

  • ọgbụgbọ inu mmadụ, ịgbọ ọgbụgbọ, afọ ọsịsa, nsị isi ike ọnyụnyụ

Mmekọahụ.

Nchegbu nwere ike ime ka agụụ mmekọahụ gharazie ịna-agụcha mmadụ. Oké nchegbu nwekwara ike ịkpata

  • atụwalighị nwaanyị ime, nsọ nwaanyị ịgba otú na-ekwesịghị ekwesị

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya