Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • my akụkọ 64
  • Solomọn Ewuo Ụlọ Nsọ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Solomọn Ewuo Ụlọ Nsọ
  • Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ụlọ Nsọ A Rụụrụ Jehova
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • Sọlọmọn Bụ Eze Maara Ihe
    Baịbụl—Gịnị Ka Ọ Na-ekwu?
  • Gịnị Ka Ị Na-amụta N’àgwà Ọma Ya Nakwa N’àgwà Ọjọọ Ya?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Eze Solomọn nke Maara Ihe
    Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
my akụkọ 64
Mgbe Solomọn na-ekpegara Jehova ekpere n’ụlọ nsọ ọhụrụ ahụ

AKỤKỌ NKE 64

Solomọn Ewuo Ụlọ Nsọ

TUPU Devid anwụọ, o nyere Solomọn ụkpụrụ Chineke tụrụ maka iwu ụlọ nsọ Jehova. N’ime afọ nke anọ nke ọchịchị ya, Solomọn malitere iwu ụlọ nsọ ahụ, o wekwara afọ asaa na ọkara iji wusịa ya. Ọtụtụ puku mmadụ rụrụ ọrụ n’iwu ụlọ nsọ ahụ, e mefukwara ego hiri nne n’iwu ya. Ọ bụ n’ihi na e ji ọtụtụ ọlaedo na ọlaọcha wuo ya.

Ụlọ nsọ ahụ nwere ime ụlọ ukwu abụọ, dị ka ụlọikwuu ahụ nwere. Ma ime ụlọ ndị a karịrị ndị nke ụlọikwuu ahụ okpukpu abụọ. Solomọn mere ka e debe igbe ọgbụgba ndụ ahụ n’otu n’ime ụlọ ndị dị n’ụlọ nsọ ahụ, werekwa ihe ndị ọzọ e debere n’ime ụlọikwuu ahụ debe n’ime ụlọ nke ọzọ.

Mgbe e wusịrị ụlọ ahụ, e mere oké ememe. Solomọn gburu ikpere n’ihu ụlọ nsọ ahụ wee kpee ekpere, dị ka ị na-ahụ na foto a. Ọ gwara Jehova, sị: ‘Eluigwe niile agaghịdị aba gị ka ọ fọdụzie ụlọ nsọ a? Ma biko, Chineke m, na-ege ndị gị ntị mgbe ha chere ihu n’ebe a na-ekpe ekpere.’

Mgbe Solomọn kpesịrị ekpere, ọkụ si n’eluigwe bịa. O repịara anụmanụ niile ahụ e ji chụọ àjà. Ìhè nke sitere n’ebe Jehova nọ wee jupụta n’ụlọ ahụ. Nke a na-egosi na Jehova na-ege ntị, nakwa na ụlọ ahụ na ekpere Solomọn dị ya mma. Ụlọ nsọ ahụ ghọziri ebe ndị Izrel na-abịa efe ofufe kama ịbụ ụlọikwuu ahụ.

Mgbe Eze Solomọn katarala ahụ́, o so otu n’ime ndị nwunye ya mgbe ọ na-ekpere arụsị

Solomọn ji amamihe chịa ruo ogologo oge, obi dịkwa ụmụ Izrel ụtọ. Ma Solomọn lụrụ ọtụtụ ndị inyom ala ọzọ ndị na-adịghị efe Jehova. Ị̀ na-ahụ otu n’ime ha ka ọ na-efe arụsị ahụ? N’ikpeazụ, ndị inyom Solomọn dubara ya n’ife chi ọzọ. Ị̀ ma ihe mere mgbe Solomọn mere nke a? O mesoghịzi ndị Izrel ihe n’obiọma. O mesoro ha ihe n’obi ọjọọ, ha adịghịzikwa enwe obi ụtọ.

Nke a mere ka Jehova wesa Solomọn iwe, o wee sị ya: ‘M ga-anapụ gị alaeze gị nye nwoke ọzọ. M gaghị eme nke a n’oge ndụ gị, kama n’oge ọchịchị nke nwa gị. Ma m gaghị ewepụ ndị niile nọ n’alaeze nwa gị.’ Ka anyị hụ ka nke a si mee.

1 Ihe E Mere 28:9-21; 29:1-9; 1 Ndị Eze 5:1-18; 2 Ihe E Mere 6:12-42; 7:1-5; 1 Ndị Eze 11:9-13.

Ajụjụ Ndị E Ji Amụ Akwụkwọ A

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya