Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • my akụkọ 91
  • Mgbe Jizọs Na-ezi Ihe n’Elu Ugwu

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Mgbe Jizọs Na-ezi Ihe n’Elu Ugwu
  • Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ịhọrọ Ndị Ozi Ya
    Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
  • Jizọs Ahọrọ Ndịozi Iri na Abụọ
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Jizọs Họọrọ Ndịozi Iri na Abụọ
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • Ndị Ghọrọ Ndị Na-eso Ụzọ Jizọs
    Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
my akụkọ 91
Mgbe Jizọs na-akụziri ndị mmadụ ihe n’Ozizi Elu Ugwu ya

AKỤKỌ NKE 91

Mgbe Jizọs Na-ezi Ihe N’elu Ugwu

LEE Jizọs ka ọ nọdụrụ ala ebe a. Ọ na-ezi ndị a niile ihe n’elu ugwu Galili. Ndị ahụ kasị nọrọ ya nso bụ ndị na-eso ụzọ ya. Ọ họpụtara ha iri na abụọ ịbụ ndịozi. Ndịozi bụ ndị pụrụ iche na-eso ụzọ Jizọs. Ị̀ ma aha ha?

E nwere Saịmọn Pita na Andru nwanne ya nwoke. E nwekwara Jems na Jọn, ndị bụ́kwa ụmụnne. A na-akpọ onyeozi ọzọ Jems, na-akpọkwa onye ọzọ Saịmọn. E nwere ndịozi abụọ aha ha bụ Judas. Otu bụ Judas Iskarịọt, a na-akpọkwa Judas nke ọzọ Tadiọs. Ndị ọzọ bụ Filip na Nataniel (onye a na-akpọkwa Batọlọmiu), na Matiu na Tọmọs.

Mgbe Jizọs si Sameria lọta, ọ malitere ikwusa na nke mbụ ya, sị: ‘Alaeze eluigwe dị nso.’ Ị̀ ma ihe alaeze ahụ bụ? Ọ bụ ọchịchị Chineke. Jizọs bụ eze ya. Ọ ga-esi n’eluigwe na-achị, wee weta udo n’ụwa. Alaeze Chineke ga-eme ka ụwa niile ghọọ paradaịs mara mma.

Jizọs na-ezi ndị a ihe banyere alaeze ahụ. ‘Lee otú unu ga-esi na-ekpe ekpere,’ ka ọ na-agwa ha. ‘Nna anyị nke nọ n’eluigwe, ka a sọpụrụ aha gị. Ka alaeze gị bịa. Ka e mee uche gị n’ụwa, dị ka a na-eme ya n’eluigwe.’ Ọtụtụ ndị na-akpọ nke a ‘Ekpere Onyenwe anyị.’ Ndị ọzọ na-akpọ ya ‘Nna Anyị nke Bi n’Eluigwe.’ Ị̀ ga-ekpeli ekpere ahụ n’isi?

Ebe ndị mmadụ gbakọrọ na-ege ntị n’Ozizi Elu Ugwu Jizọs

Jizọs na-ezikwa ha ụzọ ha ga-esi na-emeso ibe ha. Ọ na-asị: ‘Na-emerenụ ndị ọzọ ihe unu na-achọ ka ha na-emere unu.’ Ọ́ dịghị amasị gị mgbe ndị ọzọ mesoro gị omume n’obiọma? N’ihi ya, Jizọs na-asị, anyị kwesịrị ịdị na-emeso ndị ọzọ omume n’obiọma. Ọ́ gaghị abụ ihe magburu onwe ya n’ụwa paradaịs, mgbe mmadụ niile ga na-eme nke a?

Matiu isi 5 ruo isi 7; 10:1-4.

Ajụjụ Ndị E Ji Amụ Akwụkwọ A

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya