Isi 20
Ụdị Ndụ Dị Aṅaa Ka Ị Chọrọ?
1-3. N’ihi gịnị ka ime ihe n’ụzọ nke Chineke ji bụrụ ụzọ kachasị mma isi nweta obi ụtọ?
ỌBỤRỤ na mmadụ ajụọ gị sị, ‘Olee otú m pụrụ isi nweta obi ụtọ taa?’ gịnị ga-abụ azịza gị? Ị pụrụ iji obi ike kwuo, sị: ‘Iji nweta ndụ zuru ezu, nke obi ụtọ na nke na-adịgide adịgide, mee ihe n’ụzọ nke Chineke!’
2 N’isiakwụkwọ ndị bu ụzọ, anyị atụlewo na Onye Okike ahụ dị adị n’ezie, na ọ na-enye ihe ọmụma na nduzi dị anyị nile mkpa site na Bible, nakwa na itinye Okwu ya n’ọrụ bara uru taa. Ịdị ndụ dị ka ezi ndị Kraịst pụrụ inyere anyị aka ịnagide nsogbu ndị dị ka nchekasị na owu ọmụma. Ilega anya n’ebe Bible dị maka nduzi pụrụ ichebe anyị pụọ ná nsogbu ndị na-egbu mgbu bụ́ ndị ịṅụbiga mmanya ókè, omume rụrụ arụ, enweghị obi eziokwu na ihe ndị ọzọ na-akpata. (Ilu 4:11-13) Ịnakwere echiche nke Bible n’ihe banyere ego na-enyere anyị aka inwe afọ ojuju karị na ‘ijide ndụ ahụ nke bụ ndụ n’ezie.’—1 Timoti 6:19.
3 Mgbe anyị gere ntị n’ihe Onye Okike ahụ na-ekwu, ndụ anyị na-enweta nzube na nduzi. Anyị na-aghọta ihe mere Chineke ji kwe ka mmebi iwu na ahụhụ dịrị. Ka anyị na-ahụkwa mmezu amụma Bible n’ihe ndị na-eme n’ụbọchị anyị, anyị na-amata na anyị na-ebi na “mgbe ikpeazụ” nke ajọ usoro ihe dị ugbu a. (2 Timoti 3:1-5) Nke ahụ pụtara na n’oge na-adịghị anya Chineke ga-ewepụ alaeze nile nke mmadụ ya na akụkọ ihe mere eme ha nile nke ịrụ arụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị na òtù agha ndị e ji ibu arọ na-egbu mgbu nke ụtụ isi na-akwado. (Daniel 2:44; Mkpughe 16:14, 16) Ya mere, Chineke ga-akwụsị usoro mgbalị nke mmadụ na-eme iji chịa ụwa, ọ ga-ejikwa Alaeze eluigwe ya na-eduzi ihe a kpọrọ mmadụ ndị lanarịrịnụ.—Mkpughe 11:17, 18; 21:1-4.
NKE AHỤ Ọ̀ BỤ IHE Ị CHỌRỌ?
4-6. N’ihi gịnị ka anyị na-aghaghị iji kpebie ma ànyị chọrọ ịbụ ndị enyi nke ụwa ka ọ̀ bụ nke Chineke?
4 Ihe ka ọtụtụ n’ime anyị ga-asị: ‘Ọ ga-abụ ihe magburu onwe ya ibi n’etiti ụmụ mmadụ na-ahụ n’anya, ndị na-atụ egwu Chineke n’ime paradaịs.’ (Aịsaịa 11:9) Ma iji mee otú ahụ, ịhụnanya anyị maka ezi omume na ọchịchọ anyị ikwekọ n’ụkpụrụ nile nke Chineke aghaghị isi ike ruo ókè zuru ezu iji kpebie ụzọ ndụ anyị na-adị ugbu a n’ozuzu ya. (Matiu 12:34; 15:19) Nke ahụ ọ̀ bụ ihe ị chọrọ n’ezie? Banyere nke a, e nyere Jemes onye na-eso ụzọ ike mmụọ nsọ idegara ndị Kraịst akwụkwọ, sị:
“Ùnu amataghị na ịbụ enyi nke ụwa bụ ịbụ onye iro nke Chineke? Ya mere onye ọ bụla nke ZUBERE ịbụ enyi nke ụwa na-edo onwe ya onye iro nke Chineke.”—Jemes 4:4.
5 Jemes kwusikwara ike na “okpukpe Chineke nke dị ọcha na nke a na-emerụghịkwa emerụ n’ihu Chineke anyị” na-agụnye ‘idebe onwe onye n’enweghị ntụpọ site n’ụwa.’ (Jemes 1:27) Anyị kwesịrị ịgbalịsi ike ime nke ahụ. N’ezie, ebe ndị Kraịst na-ebi n’etiti ụwa nke ime ihe ike na nke rụrụ arụ, atụmatụ ya nile nke omume na-adịghị ọcha, ndọrọ ndọrọ ọchịchị na ịhụ mba n’anya, ọ dịghị mfe ịnọgide kpam kpam ghara ịbụ onye o metụtara. Ọbụna onye Kraịst nke kasị dị uchu n’ofufe pụrụ ịgbụchapụ ma ọ bụ mejọọ ihe ebe ọ na-agbalị izere ịbụ onye e ji ụzọ ụwa mee ka o nwee ntụpọ. Ọ bụ ya mere o ji dị mkpa ka ndị Kraịst nọgide na-arụ ọrụ iji nwee ọganihu. (Ndị Kọlọsi 3:5-10) Ma ihe dị mkpa bụ, gịnị ka anyị chọrọ?
6 Dị ka ihe atụ, anyị pụrụ iche echiche banyere ndị ikom abụọ na-eri nri abalị. Otu nwoke kusara ofe na taị ya n’amaghị ama. Onye nke ọzọ weere taị ya ma mara ụma sụnye ya n’ofe; ọ chọrọ ka ọ dị otú ahụ. Ònye n’ime ha ka anyị dị ka ya? Site n’ihe anyị na-ekwe ka o nwee mmetụta n’ahụ anyị na ihe anyị na-ahọrọ ime, ànyị na-egosi na anyị chọrọ ịbụ enyi nke ụwa? ka ọ̀ bụ enyi nke Chineke?
7, 8. N’ụzọ ndị dị aṅaa ka mmadụ pụrụ isi gosipụta ma ọ̀ chọrọ ịbụ enyi nke ụwa?
7 A pụrụ igosipụta ịbụ enyi nke ụwa n’ọtụtụ ụzọ. Ụfọdụ bụ ndị e jikọsiri ike n’ebe ezinụlọ ma ọ bụ ndị agbata obi ha nọ bụ́ ndị ha na ha na-ayịkọ, ọbụna na-ekere òkè n’ihe ndị ha maara na Chineke jụrụ ajụ, dị ka ememe ndị na-esiteghị n’Akwụkwọ Nsọ, ịṅụbiga mmanya ókè, okwu rere ure ma ọ bụ igosi mbunobi agbụrụ. (1 Pita 4:3, 4; Ndị Efesọs 5:3-5; Ọrụ 10:34, 35) Ọ bụrụ na anyị chọrọ ime ihe na-atọ Chineke ụtọ, mgbe ahụ inweta nnwapụta ya ga-apụtara anyị ihe dị ukwuu karịa ọbụna nke ndị ikwu anyị.—Luk 14:26, 27; 11:23.
8 N’ụzọ yiri nke ahụ, ụdị ntụrụndụ anyị na-ahọrọ pụrụ igosi ma ànyị chọrọ ịbụ enyi nke ụwa. Ndị Kraịst oge mbụ agaghị eje ikiri ebe ndị mmadụ na-alụ ọgụ obi ọjọọ ma ọ bụ kirie egwuregwu ndị na-egosipụta omume rụrụ arụ. Olee banyere anyị taa? Anyị kwesịrị iche echiche banyere ihe anyị na-ahọrọ dị ka egwuregwu, usoro ihe omume telivishọn, ihe nkiri vidio ma ọ bụ akwụkwọ ọgụgụ. Ọ bụrụ na anyị achọpụta na a na-agbazi uche anyị ịchọ ihe ndụmọdụ Chineke megidere, ọ dị anyị mkpa ịrụ ọrụ n’ịgbanwe nhọrọ ndị anyị na-eme. Ihe ndọrọ nke ụwa pụrụ ọbụna imetụta ndị na-eto eto toliteworo n’ezinụlọ ndị Kraịst na ndị Kraịst mụworo Bible ruo ogologo oge.
9-12. Ruo ókè hà aṅaa ka ọ dị mkpa nye anyị ikpebi ihe anyị chọrọ n’ezie?
9 Okwu a metụtara ịbụ enyi Chineke ma ọ bụ ịbụ enyi nke ụwa pụtara ndụ ma ọ bụ ọnwụ. (1 Jọn 2:15-17) Anyị apụghị ịnọgide na-agbasa ụkwụ anyị n’akụkụ abụọ ndị ahụ dịkwa ka onye nọ n’ebe ụzọ kewara ekewa na-apụghị isoro ụzọ abụọ na-aga ebe dịgasị iche.
10 N’oge Elaịja, ofufe Beal nke mba ndị gbara ha gburugburu metụtara ndị Hibru ụfọdụ. Ọ bụ ezie na ha nwere njikọ ụfọdụ n’ebe ezi Chineke ahụ, bụ́ Jehova nọ, ha anọgideghị n’akụkụ ya kpam kpam. Elaịja sịrị na ha ‘nọ n’obi abụọ.’ Ha aghaghị ikpebi ma hà ga-adụnyere Jehova na ụzọ ya nile úkwù ma ọ bụ na ha agaghị eme otú ahụ. Ọ bụ nhọrọ nke pụtara ndụ ma ọ bụ ọnwụ.—1 Ndị Eze 18:21-40; Deuterọnọmi 30:19, 20.
11 Anyị apụghị iyigharị oge ikpebi ihe anyị chọrọ n’ezie gaa n’ọdịnihu. Na narị afọ mbụ O.A., Pita onyeozi gbara ndị Kraịst ume ka ha ‘na-ele anya ọbịbịa nke ụbọchị ahụ nke Jehova’ bụ́ nke a ga-anọ na ya bibie mmebi iwu n’ụwa. Ha ga-egosipụta echiche ha nke ịdị ngwa site ‘n’ibi obi nsọ nile na nsọpụrụ Chineke nile,’ gụnyere iji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ndị Kraịst. (2 Pita 3:11, 12) Ebe ndị Kraịst ụfọdụ dịrị ndụ nke ezi ihe ilereanya dị ka ndị di na nwunye, ndị ọzọ họọrọ ịnọ n’alụghị di na nwunye ka ha wee nwee ike ‘ịnọdụ n’ihu Onyenwe anyị ghara inwe uche mgbasasị.’—1 Ndị Kọrint 7:29-35.
12 Ọ bụrụ na ụdị ndụ ndị Kraịst chọrọ ibi bụ ihe dị mkpa na narị afọ mbụ, lee aha ihe dị mkpa nke ukwuu karị ọ bụ ugbu a! Anyị pụrụ ịhụ na Alaeze Chineke amaliteworị ịchị n’eluigwe na e nwekwara nanị “nwa oge” fọdụrụnụ tupu Chineke esite n’aka Kraịst zọpịa mba nile ma kee Setan Ekwensu agbụ. (Mkpughe 12:12; 19:11–20:2) Ya mere ugbu a bụ oge iji kpebie ụdị ndụ anyị chọrọ.
ỤDỊ NDỤ CHINEKE GA-ENYE
13-18. Ụdị ndụ dị aṅaa ka Chineke ga-enye n’usoro ihe ọhụrụ ahụ?
13 Ụdị ndụ anyị na-ahọrọ ugbu a ga-ekpebi ma à ga-ekwe ka anyị nweta ụdị ndụ Chineke ga-enye n’usoro ihe ọhụrụ na-abịanụ.
14 Ọ dị mfe ibu ụzọ chee echiche banyere ọtụtụ ngọzi elu ahụ nke paradaịs ahụ e weghachiri. Na paradaịs nke mbụ ahụ, Adam na Iv nwere nri na-edozi ahụ n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị ukwuu. (Jenesis 2:9, 16) Ya mere, n’usoro ihe ọhụrụ ahụ a ga-enwe ezi nri, bụ́ nri nke na-enye ahụ ike n’ụba.—Abụ Ọma 72:16; 67:6.
15 Adam na Iv nwere ezi ahụ ike, n’ihi na Chineke kere ha ka ha zuo okè. Nke ahụ na-emesi ike nkwa Bible na n’usoro ihe ọhụrụ ahụ, ọrịa, ihe mgbu nke nrịanrịa na-akpata na anya mmiri nke mwute ga-abụ ihe mgbe ochie. (Mkpughe 21:1-4) Ihe a kpọrọ mmadụ ga-eto ruo izu okè nke anụ ahụ.
16 N’abụghị ndị nsogbu na ọnwụ mgbe 70 afọ gasịrị nọgidere na-anọchiri ụzọ, ndị ikom na ndị inyom ga-enwe obi ụtọ nke inwe ike ime nchọpụta n’ọtụtụ akụkụ nke ihe ọmụmụ na ahụmahụ. Ị ga-enwe ike inweta ọṅụ ná ngosipụta zuru ezu nke onyinye ndị i nwere, ọbụna na-azụlite ndị ị na-echetụbeghị na i nwere. Isi nri, iwu ebe obibi, ịkwa nkà, ịchọ ụlọ mma, ịkụ ubi, ịkpọ ngwá egwú, ịkwa ákwà, ịmụ akụkụ gbasapụrụ agbasapụ nke ihe ọmụma—Ị pụrụ ịnọgide na-aga n’ihu n’idepụta ihe ịma aka ndị bakwara uru ị ga-enwe ike ime. Jehova kwuru n’otu oge, sị: “Ndị m họpụtara ga-enwekwa ihe aka ha rụpụtara mgbe dị anya nke ukwuu.”—Aịsaịa 65:22.
17 Ọzọ, Bible na-asị na n’ogigi Iden, nri ụmụ anụmanụ bụ ahịhịa. (Jenesis 1:30) N’ihi nke a, ị pụrụ ịtụ anya na Chineke ga-eme ndokwa ka ụmụ anụmanụ ghara ịbụkwa ihe ize ndụ ọzọ; ha ga-esoro ibe ha na ụmụ mmadụ dịrịta n’udo. Ma ụmụntakịrị ma ndị toro eto ga-enweta ọṅụ zuru ezu ná mkpakọrịta ha.—Tụlee Aịsaịa 11:6-8; 65:25; Hosea 2:18.
18 Ma Bible amaliteghị inye nkọwa zuru ezu nke ngọzi nile a na-ahụ anya nke usoro ihe ọhụrụ ahụ. Jehova, bụ́ Onye Okike anyị, maara ihe ndị dị anyị mkpa. Bible na-emesi anyị obi ike banyere Chineke, sị: “Ị na-asaghe aka gị, ị na-ewerekwa ihe dị ihe ọ bụla dị ndụ ụtọ mee ka afọ ju ya.”—Abụ Ọma 145:16.
19, 20. Gịnị bụ ngọzi ndị ka mkpa e kwere ná nkwa maka paradaịs ahụ e weghachiri?
19 N’ụzọ ziri ezi, Akwụkwọ Nsọ na-emesi ike, ọ bụghị ọganihu ma ọ bụ ngọzi ndị a na-ahụ anya, kama ihe ime mmụọ na ihe ndị metụtara echiche bụ́ ndị ga-eweta obi ụtọ na paradaịs ahụ e weghachiri. Dị ka ihe atụ, anyị pụrụ ilepụ anya gaa n’ọnọdụ dị ka ndị a kọwara n’ụzọ dị otú a:
“Ihe ezi omume ahụ ga-arụpụta bụ udo; ihe nke ga-esi n’ofufe ezi omume ahụ pụta bụkwa ịnọ jụụ na ntụkwasị obi ruo mgbe ebighị ebi. Ndị m ga-anọkwa n’ụlọ obibi udo, na n’ebe obibi dị iche iche kwesịrị ntụkwasị obi, na n’ebe izu ike dị iche iche dị jụụ.”—Aịsaịa 32:17, 18.
20 Anyị pụrụ ịmata na ọbụna ọ bụrụ na anyị enwee ezi ahụ ike, ebe obibi dị mma na ihe oriri n’ụba, anyị agaghị enwe afọ ojuju n’ezie ma ọ bụrụ na mburịta agha, oké nrụgide, ekworo na iwe gbara anyị gburugburu. (Ilu 15:17; 21:9) Otú ọ dị, ndị Chineke na-ekwe ka ha biri na paradaịs ahụ na-abịanụ ga-abụ ndị rụsiworo ọrụ ike iji merie erughị eru ndị dị otú a nke mmadụ. Ha ga-emejupụta ezinụlọ zuru ụwa ọnụ nke ndị Kraịst bụ́ ndị na-azụlite mkpụrụ nke mmụọ Chineke, gụnyere ịhụnanya, udo, obi ọma na imeru ihe n’ókè. (Ndị Galetia 5:19-23) Ha ga-eji ezi obi gbasie mbọ ike inwe àgwà ndị kwekọrọ n’ụdị onye Jehova bụ.—Ndị Efesọs 4:22-24.
ỊDỊ NDỤ IJI TOO JEHOVA MA MEE IHE NA-ATỌ YA ỤTỌ
21-24. Olee otú anyị pụrụ isi nweta ezi obi ụtọ?
21 Ngọzi ndị a na-ahụ anya na ndị nke ime mmụọ ndị ahụ e buru n’amụma na-enye anyị ihe mere anyị ga-eji lepụ anya gaa n’usoro ihe ọhụrụ ahụ. Otú ọ dị, ọ bụrụ na anyị ekwe ka ndị ahụ bụrụ isi ihe mere anyị ga-eji na-efe Chineke ofufe ma na-adị ndụ ndị Kraịst, ruo ókè ụfọdụ anyị ga-adị ka ọgbọ dị ugbu a nke nke m-godi, bụ́ ndị nchegbu mbụ ha bụ banyere ihe ha chọrọ ma nwee ike inweta.
22 Kama nke ahụ, anyị kwesịrị ịzụlite ọchịchọ nke ịdị ndụ ndị Kraịst—ugbu a na n’ọdịnihu—n’ihi na Chineke chọrọ ka anyị mee otú ahụ. O kwesịrị ịbịa n’ọnọdụ mbụ, ọ bụghị anyị. Jisọs gosiri echiche nke anyị kwesịrị inwe, na-asị: “Abịawo m . . . ime ihe ị na-achọ, Chineke,” na, “Ihe oriri m bụ ka m na-eme ihe onye zitere m na-achọ, ka m rụzuokwa ọrụ ya.” (Ndị Hibru 10:7; Jọn 4:34) Inwe ekele maka ihe Chineke meworo kwesịrị ịkpali anyị itinye ya n’ọnọdụ mbụ.—Ndị Rom 5:8.
23 N’ụzọ ziri nnọọ ezi, Bible adịghị emesi nzọpụta na ngọzi ndị anyị pụrụ inweta ike dị ka ihe kachasị mkpa. Kama nke ahụ, ọ na-emesi ike ido aha Chineke nsọ na izi ezi nke anyị inye Chineke otuto n’ihi ihe ya onwe ya bụ na ihe o meworo. Devid dere, sị:
“M ga-eme Gị ka Ị dị elu, Chineke m, bụ́ Eze; m ga-agọzikwa aha Gị ruo mgbe nile ebighị ebi. Onye ukwu ka Jehova bụ, Ọ bụkwa onye a na-eto nke ukwuu; ọ dịghịkwa ngwupụta ala dịịrị ịdị ukwuu ya. N’ịma mma nke nsọpụrụ nke ebube Gị, na n’oké ọrụ Gị nile, ka m ga-atụgharị uche.”—Abụ Ọma 145:1, 3, 5.
24 Itinye Chineke n’ọnọdụ mbụ ná ndụ ma dị ike n’inye ya otuto bụ ihe kwesịrị ekwesị nye Jisọs na Devid. Ọ bụkwa ihe kwesịrị ekwesị nye anyị. Mgbe anyị jikọrọ nke a na ụzọ ndụ dị irè nke ndị Kraịst, anyị ga-enwetaworị obi ụtọ—ugbu a na n’ọdịnihu nke na-adịgide adịgide.
[Foto dị na peeji nke 189]
Oge nke ịzụlite ma jiri onyinye gị mee ihe ruo n’isi