Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • dg akụkụ 1 p. 2-3
  • Akụkụ nke 1—Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Anyị n’Ezie?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Akụkụ nke 1—Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Anyị n’Ezie?
  • Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Anyị n’Ezie?
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2017
  • Ajụjụ nke Atọ: Gịnị Mere I Ji Hapụ M Ka M Na-ata Ahụhụ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • N’ihi Gịnị Ka Chineke Ji Kwere Ka Nhụjuanya Dịrị?
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
  • Akụkụ nke 2—Ụwa nke Ahụhụ Na-adịghị
    Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Anyị n’Ezie?
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Anyị n’Ezie?
dg akụkụ 1 p. 2-3

Akụkụ nke 1—Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Anyị n’Ezie?

1, 2. Ajụjụ ndị dị aṅaa ka ndị mmadụ na-ajụ banyere Chineke, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?

N’OTU oge ná ndụ gị, ọ pụrụ ịbụ na ị jụwo, sị: ‘Ọ bụrụ na e nwere Chineke nke na-eche banyere anyị, n’ihi gịnị ka o ji kwere ka ahụhụ dị ukwuu dịrị?’ Anyị nile enwewo ahụmahụ nke ịnọ n’ahụhụ ma ọ bụ mara onye meworo otú ahụ.

2 N’ezie, n’oge nile nke akụkọ ihe mere eme, ụmụ mmadụ enwewo ihe mgbu na obi mgbu site n’agha, obi ọjọọ, imempụ, ikpe na-ezighị ezi, ịda ogbenye, ọrịa, na ọnwụ nke onye a hụrụ n’anya. Nanị n’ime narị afọ nke 20 anyị, agha dị iche iche egbuwo ihe karịrị 100 nde ụmụ mmadụ. Ọtụtụ narị nde ndị ọzọ abụrụwo ndị e merụrụ ahụ ma ọ bụ ndị na-enwekwaghị ebe obibi. Ọtụtụ ihe ndị na-atụ egwu emewo n’ime oge anyị, na-akpata oké mwute, ọtụtụ anya mmiri, na echiche nke enweghị olileanya n’akụkụ nke ọtụtụ mmadụ a na-apụghị ịgụta ọnụ.

3, 4. Olee otú ọtụtụ ndị si eche echiche banyere nkwere Chineke kwere ka ahụhụ dịrị?

3 Ụfọdụ na-enwe obi ilu ma na-eche na ọ bụrụ na Chineke dị, ọ dịghị eche banyere anyị n’ezie. Ma ọ bụ ha pụrụ ọbụna iche na ọ dịghị Chineke dịnụ. Dị ka ihe atụ, otu nwoke nke a tara ahụhụ n’ihi agbụrụ o si na ya, bụ́ nke kpatara ọnwụ ndị enyi na ezinụlọ ya n’Agha Ụwa nke Mbụ jụrụ, sị: “Ebee ka Chineke nọ mgbe mkpa ya na-akpa anyị?” Onye ọzọ nke lanarịrị ogbugbu nke ọtụtụ nde ndị mmadụ n’aka ọchịchị Nazi n’Agha Ụwa nke Abụọ nwere mwute nke ukwuu n’ihi nhụjuanya ọ hụrụ nke na ọ sịrị: “Ọ bụrụ na ị pụrụ ịratụ ire gị n’obi m, ọ ga-abụrụ gị nsí.”

4 Otụ́ a, ọtụtụ mmadụ apụghị ịghọta ihe mere ezi Chineke ga-eji kwere ka ihe ọjọọ na-eme. Ha na-ajụ ma ọ̀ na-eche banyere anyị n’ezie ma ọ bụkwanụ ma ọ̀ dị adị ma ọlị. Ọtụtụ n’ime ha na-echekwa na ịta ahụhụ ga-abụ otu akụkụ nke ịdị adị nke ihe a kpọrọ mmadụ mgbe nile.

[Foto dị na peeji nke 2, 3]

Ụwa ọhụrụ nke ahụhụ na-adịghị ọ̀ dị nso?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya