Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • kp p. 6-8
  • Gịnị Ka Ihe A Nile Pụtara?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Gịnị Ka Ihe A Nile Pụtara?
  • Nọrọ na Nche!
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ànyị Na-ebi “n’Ụbọchị Ikpeazụ”?
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
  • A Gaje Imezu Nzube Chineke n’Isi Nso
    Gịnị Bụ Nzube nke Ndụ? Olee Otú Ị Pụrụ Isi Chọta Ya?
  • Ozi Ọma Ha Chọrọ Ka Ị Nụ
    Ndịàmà Jehova—Ole Ndị Ka Ha Bụ? Gịnị Ka Ha Kweere?
  • Olee Mgbe Ụwa Ga-agwụ? Ihe Jizọs Kwuru
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2021
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Nọrọ na Nche!
kp p. 6-8

Gịnị Ka Ihe A Nile Pụtara?

JIZỌS KRAỊST kwuru, sị: Agha, ụkọ nri, ọrịa na-efe efe, na ala ọma jijiji ga-aka “ngwụsị nke usoro ihe a” akara.—Matiu 24:1-8; Luk 21:10, 11.

Kemgbe afọ 1914, agha mba na mba na nke agbụrụ na agbụrụ, bụ́ ndị aka ndị ụkọchukwu na-etinye n’ọchịchị na-akpatakarị, nakwa ugbu a, mwakpo nke ndị na-eyi ọha egwu na-eme n’ụwa nile ebibiwo ndụ ndị mmadụ.

N’agbanyeghị ọganihu e nwere na nkà mmụta sayensị, oké ụkọ nri na-emetụta ọtụtụ narị nde mmadụ n’ụwa nile. Kwa afọ, ọtụtụ nde mmadụ na-anwụ n’ihi ụkọ nri.

Ọrịa na-efe efe bụkwa akụkụ nke ihe iriba ama ahụ Jizọs nyere. Ozugbo a lụsịrị Agha Ụwa nke Mbụ, ntiwapụ nke oké ahụ́ ọkụ gburu ihe karịrị mmadụ 21,000,000. N’adịghị ka ọrịa ndị metụtara nanị akụkụ ụfọdụ nke ụwa n’oge gara aga, o metụtara ọtụtụ mba gburugburu ụwa nakwa àgwàetiti ndị dịpụrụ adịpụ. Ọrịa AIDS na-azazi ndị mmadụ aza n’ụwa nile, ọrịa ndị dị ka ụkwara nta, ịba, ìsì anya ọcha, na ọrịa oro ụra ka na-akpakwa ike ná mba ndị na-emepe emepe.

A kọrọ na a na-enwe ọtụtụ iri puku ala ọma jijiji ndị ukwu na ndị nta kwa afọ. N’agbanyeghị ngwá ọrụ ndị e nwere na ụzọ ndị ka mma e si akọ banyere ala ọma jijiji, ọdachi ala ọma jijiji na-akpata n’ebe ndị mmadụ bijupụtara na-apụtakarị n’akụkọ ụwa.

Bible bukwara amụma, sị: “Mara nke a, na n’ụbọchị ikpeazụ, oge pụrụ iche nke siri ike obibi gaje ịdị. N’ihi na ndị mmadụ ga-abụ ndị hụrụ onwe ha n’anya, ndị hụrụ ego n’anya, ndị na-anya isi, ndị mpako, ndị nkwulu, ndị na-enupụrụ ndị mụrụ ha isi, ndị na-enweghị ekele, ndị na-adịghị eguzosi ike n’ihe, ndị na-enweghị obi mmadụ, ndị na-adịghị njikere ime nkwekọrịta ọ bụla, ndị nkwutọ, ndị na-enweghị njide onwe onye, ndị na-eme ihe ike ike, ndị na-enweghị ịhụnanya maka ezi ihe, ndị na-arara mmadụ nye, ndị isi ike, ndị nganga fụliri elu, ndị hụrụ ihe ụtọ n’anya kama ịbụ ndị hụrụ Chineke n’anya, ndị na-enwe ọdịdị nke nsọpụrụ Chineke ma na-agọnarị ike ya; gbakụtakwa ndị a azụ.”—2 Timoti 3:1-5.

Í kweghị na anyị na-ebi ‘n’oge pụrụ iche nke siri ike obibi’?

Ị̀ chọpụtawo na, n’ụzọ gabigara ókè, ndị mmadụ bụ ndị hụrụ onwe ha n’anya, ndị hụrụ ego n’anya, na ndị mpako?

Ònye ga-agbagha na ụwa jupụtara ná ndị na-achọ oké ihe ma bụrụ ndị na-enweghị ekele, ndị na-adịghị njikere ime nkwekọrịta, ndị na-adịghị eguzosi ike n’ihe?

Ị̀ ma na inupụrụ ndị nne na nna isi na enweghị ịhụnanya nke na-awụ akpata oyi n’ahụ́ amụbawo nke ukwuu, ọ bụghị nanị n’ebe ole na ole, kama n’ụwa nile?

Obi abụọ adịghị ya na ị ghọtara na anyị na-ebi n’ụwa nke ara ịhụ ihe ụtọ n’anya na-agba ma bụrụ nke na-enweghị ịhụnanya maka ezi ihe. Otú ahụ ka Bible si kọwaa àgwà ndị ga-ejupụta n’ụwa “n’ụbọchị ikpeazụ.”

Ọ̀ dị ihe ọzọ anyị chọrọ iji mata oge nke anyị bi na ya? Jizọs bukwara amụma na n’otu oge ahụ, a ga-ekwusa ozi ọma nke Alaeze Chineke n’elu ụwa dum mmadụ bi. (Matiu 24:14) À na-eme nke ahụ?

A na-ebipụta Ụlọ Nche, bụ́ akwụkwọ dabeere na Bible nke na-akpọsa ozi ọma nke Alaeze Jehova, n’ọtụtụ asụsụ karịa akwụkwọ ọ bụla ọzọ a na-ebipụta site n’oge ruo n’oge.

Kwa afọ, Ndịàmà Jehova na-etinye ihe karịrị otu ijeri awa n’ịgbara ndị ọzọ àmà n’onwe ha banyere Alaeze Chineke.

Ugbu a, ha na-ebipụta akwụkwọ ndị na-akọwa Bible n’ihe dị ka asụsụ 400, ọbụna n’ụfọdụ asụsụ ndị bi n’ime obodo na ìgwè ndị dị nta na-asụ. Ndịàmà Jehova ejiriwo ozi ọma ahụ ruo mba nile; ha ekwusawokwa ozi ọma n’ọtụtụ àgwàetiti nakwa n’ókèala ndị dị nnọọ nta n’ụwa ma e lee ha anya n’ụzọ ndọrọ ndọrọ ọchịchị. N’ihe ka n’ọtụtụ ala, ha nwere usoro chiri anya nke ịkụzi Bible.

N’ezie, a na-ekwusa ozi ọma nke Alaeze Chineke n’elu ụwa dum mmadụ bi, ọ bụghị iji tọghata ụwa nile, kama iji gbaa àmà. N’ebe nile, a na-enye ndị mmadụ ohere igosi ma hà chọrọ ịma onye kere eluigwe na ụwa nakwa ma hà ga-akwanyere iwu ya ùgwù ma gosi ịhụnanya n’ebe mmadụ ibe ha nọ.—Luk 10:25-27; Mkpughe 4:11.

N’oge na-adịghị anya, Alaeze Chineke ga-azachapụ ndị ajọ omume nile n’ụwa, ọ ga-emekwa ka ụwa nile ghọọ paradaịs.—Luk 23:43.

Igbe dị na peeji nke 6]

Ụbọchị Ikpeazụ nke Gịnị?

Ọ bụghị ụbọchị ikpeazụ nke ihe a kpọrọ mmadụ. Bible na-esetịpụ atụmanya nke ịdị ndụ ruo mgbe ebighị ebi maka ndị mere uche Chineke.—Jọn 3:16, 36; 1 Jọn 2:17.

Ọ bụghị ụbọchị ikpeazụ nke ụwa. Okwu Chineke na-ekwe nkwa na elu ụwa dum mmadụ bi ga-adịru mgbe ebighị ebi.—Abụ Ọma 37:29; 104:5; Aịsaịa 45:18.

Kama, ọ bụ ụbọchị ikpeazụ nke usoro ihe a na-eme ihe ike, nke na-enweghị ịhụnanya nakwa ụbọchị ikpeazụ nke ndị rapagidesiri ike n’ụzọ ya.—Ilu 2:21, 22.

[Igbe na Ihe Osise dị na peeji nke 7]

Bible Ọ̀ Bụ Okwu Chineke n’Ezie?

Ọtụtụ ugboro, ndị amụma nke Bible dere, sị: “Otú a ka Jehova sịrị.” (Aịsaịa 43:14; Jeremaịa 2:2) Ọbụna Jizọs Kraịst, bụ́ Ọkpara Chineke, mere ka ọ pụta ìhè na ya ‘ekwughị echiche nke onwe ya.’ (Jọn 14:10) Bible n’onwe ya na-ekwu n’ụzọ doro anya, sị: “Akwụkwọ Nsọ dum sitere n’ike mmụọ nsọ Chineke.”—2 Timoti 3:16.

Ọ dịghị akwụkwọ ọzọ a na-ebipụtaru n’asụsụ ole a na-ebipụta ya—ihe karịrị 2,200, dị ka United Bible Societies si kọọ. Ọ dịghị akwụkwọ ọzọ a na-ekesaru otú a na-ekesa ya—ihe karịrị ijeri anọ ugbu a. Nke ahụ ọ́ bụghị ihe ị ga-atụ anya ya banyere ozi sitere n’aka Chineke, bụ́ nke dịịrị ihe nile a kpọrọ mmadụ?

Maka ntụle ka zuo ezu nke ihe àmà ndị na-egosi na Bible sitere n’ike mmụọ nsọ Chineke, lee broshuọ bụ́ Akwụkwọ Dịịrị Mmadụ Nile, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

Ọ bụrụ na ị gụọ Bible, na-eburu n’uche eziokwu ahụ bụ́ na ọ bụ Okwu Chineke, ị ga-erite uru dị ukwuu.

[Igbe na Ihe Osise Ndị dị na peeji nke 8]

Gịnị Bụ Alaeze Chineke?

Ọ bụ ọchịchị pụrụ iche nke ezi Chineke ahụ, bụ́ Jehova, Onye kere eluigwe na ala, guzobere. —Jeremaịa 10:10, 12.

Bible mere ka a mata Jizọs Kraịst dị ka onye Chineke nyere ikike ọchịchị dị otú ahụ. (Mkpughe 11:15) Mgbe ọ nọ n’ụwa, Jizọs gosiri na ya enweelarị ikike dị ịtụnanya nke sitere n’aka Chineke—ikike nke nyeere ya aka ịchịkwa ọnọdụ ihu igwe, ịgwọ ụdị nrịanrịa nile, nakwa ọbụna ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ. (Matiu 9:2-8; Mak 4:37-41; Jọn 11:11-44) Amụma Bible nke sitere n’ike mmụọ nsọ kwuru na Chineke ga-enyekwa ya “ọchịchị, na ebube, na alaeze, ka ndị nile dị iche iche na mba nile na ndị nile na-asụ asụsụ dị iche iche wee fee Ya.” (Daniel 7:13, 14) A na-akpọ ọchịchị ahụ Alaeze eluigwe; ọ bụ n’eluigwe ka Jizọs Kraịst nọ na-achị ọchịchị ya ugbu a.

[Ihe Osise Ndị dị na peeji nke 7]

Ikwusa ozi ọma n’ụwa nile

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya