Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • jt p. 15-18
  • Ozi Ọma Ha Chọrọ Ka Ị Nụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ozi Ọma Ha Chọrọ Ka Ị Nụ
  • Ndịàmà Jehova—Ole Ndị Ka Ha Bụ? Gịnị Ka Ha Kweere?
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • NGỌZI NDỊ GA-ABỊA N’ỤWA N’OKPURU ALAEZE AHỤ
  • A Gaje Imezu Nzube Chineke n’Isi Nso
    Gịnị Bụ Nzube nke Ndụ? Olee Otú Ị Pụrụ Isi Chọta Ya?
  • A Zaa Ajụjụ Anọ Banyere Ọgwụgwụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
  • Otú Anyị Si Mara na Anyị Nọ na “Mgbe Ikpeazụ”
    Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Anyị n’Ezie?
  • Alaeze “nke A Gaghị Emebi Emebi”
    Fee Onye Nanị Ya Bụ Ezi Chineke ahụ Ofufe
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ndịàmà Jehova—Ole Ndị Ka Ha Bụ? Gịnị Ka Ha Kweere?
jt p. 15-18

Ozi Ọma Ha Chọrọ Ka Ị Nụ

MGBE Jisọs nọ n’ụwa, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya, wee jụọ, sị: “Gịnị ga-abụ ihe ịrịba ama nke [ọnụnọ, NW] Gị, na nke ọgwụgwụ oge a?” Ọ zara ha na a ga-enwe agha n’etiti mba dị iche iche, ụnwụ nri, ọrịa na-efe efe, ala ọma jijiji, ịba ụba nke mmebi iwu, ndị ozizi ụgha nke okpukpe ndị na-eduhie ọtụtụ mmadụ, ịkpọasị na mmegide nke ezi ụmụazụ ya, na ịjụ oyi nke ịhụnanya maka ezi omume n’etiti ọtụtụ mmadụ. Mgbe ihe ndị a ga-amalite ime, ọ ga-egosi na Kraịst nọ ya n’ụzọ a na-adịghị ahụ anya nakwa na Alaeze eluigwe ahụ dị nso. Nke a ga-abụ ihe akụkọ—ozi ọma! Ya mere Jisọs gbakwụnyere okwu ndị a dị ka ihe so n’ihe ịrịba ama ahụ, sị: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze eluigwe n’elu ụwa dum mmadụ bi, ka ọ bụrụ àmà nye mba nile; mgbe ahụ ka ọgwụgwụ ihe nile ga-erukwa.”—Matiu 24:3-14.

N’onwe ha, ihe ndị na-eme n’ụwa na nso nso a dị njọ, ma ihe ha na-egosi dị mma, nke bụ́, ọnụnọ Kraịst. Ọnọdụ ndị ahụ a kpọtụrụ uche na ha n’elu malitere ịpụta ìhè n’afọ 1914 ahụ a kpọsara ebe nile! Ọ kara akara ọgwụgwụ nke Oge Ndị Jentaịl na mmalite nke oge nke isi n’ọchịchị ụmụ mmadụ gafere n’Ọchịchị Otu Puku Afọ (Narị Afọ Iri) nke Kraịst.

Abụ Ọma nke 110, amaokwu nke 1 na nke 2, na Mkpughe 12:7-12 gosiri na a ga-enwe oge ngafe. N’ebe ndị ahụ, e gosiri na Kraịst ga-anọdụ n’aka nri Chineke n’eluigwe ruo mgbe oge ọ ga-aghọ Eze ruru. Mgbe ahụ, agha a ga-alụ n’eluigwe ga-arụpụta ịchụdata Setan n’ụwa, na-ewetara ụwa ahụhụ, Kraịst ga-achịkwa n’etiti ndị iro ya. Ajọ omume ga-akwụsị kpam kpam site ná “mkpagbu ukwu” nke ga-abịa ná njedebe n’agha Ha-Magedọn, Ọchịchị Otu Puku Afọ udo nke Kraịst ga-esochikwa ya.—Matiu 24:21, 33, 34; Mkpughe 16:14-16.

“Ma mara nke a,” ka Bible na-ekwu, “na oge dị oké egwu ga-abịa na mgbe ikpeazụ. N’ihi na mmadụ ga-abụ ndị na-ahụ nanị onwe ha n’anya, ndị na-ahụ ego n’anya, ndị na-anya isi, ndị mpako, ndị nkwulu, ndị na-ekwenyeghị ndị mụrụ ha, ndị na-enweghị ekele, ndị na-adịghị ọcha n’obi, ndị ihe mmadụ ibe ha na-adịghị atọ ụtọ, ndị na-adịghị agba ndụ, ndị na-ebo ebubo ụgha, ndị na-adịghị ejide onwe ha, ndị dị ka anụ ọhịa, ndị na-adịghị ahụ ezi ihe n’anya, ndị na-arara mmadụ nye n’aka ndị iro ha, ndị isi ike, ndị a fụliworo elu, ndị na-ahụ ihe ụtọ n’anya kama ịhụ Chineke n’anya; ndị na-enwe ụdị nke nsọpụrụ Chineke, ma ha agọwo ike ya: gị gbakụtakwa ndị a azụ.”—2 Timoti 3:1-5.

Ụfọdụ pụrụ ịrụ ụka na ihe ndị a emewo mbụ n’akụkọ ihe mere eme nke mmadụ, ma nke bụ eziokwu bụ na ha emerutụbeghị n’ọ̀tụ̀tụ̀ a. Dị ka ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme na ndị nkọwa si kwuo, e nwetụbeghị n’ụwa oge dị ka nke ahụ a malitere ịhụ site na 1914 gawa n’ihu (Lee peeji nke 7.) Ahụhụ amụbawo nnọọ karịa ka ọ dịtụrụla mgbe ọ bụla ọzọ. Ọzọkwa, n’ihe banyere akụkụ ndị ọzọ nke ihe ịrịba ama Kraịst banyere mgbe ikpeazụ, e kwesịrị ịtụle isi ihe ndị a: Mkpọsa zuru ụwa ọnụ nke ọnụnọ Kraịst na Alaeze ya eruwo n’ọ̀tụ̀tụ̀ ọ na-erutụbeghị n’akụkọ ihe mere eme. Mkpagbu n’ihi ime nkwusa erutụbeghị ka nke a kpagburu Ndịàmà Jehova. E gburu ọtụtụ n’ime ha n’ogige ịta ahụhụ nke ndị Nazi. Ruo taa, a machibidoro Ndịàmà Jehova iwu n’ebe ụfọdụ, n’ebe ndị ọzọkwa, a na-ejide ha, atụ ha mkpọrọ, ata ha ahụhụ, na-egbukwa ha. Ihe a nile bụ akụkụ nke ihe ịrịba ama Jisọs nyere.

Dị ka e buru n’amụma ná Mkpughe 11:18, ‘mba nile ewewo iwe’ megide Ndịàmà kwesịrị ntụkwasị obi nke Jehova, nke a na-egosikwa na Jehova ga-ewesa mba ndị ahụ “iwe” nke ya. Otu akụkụ akwụkwọ nsọ a na-ekwu na Chineke gaje “imebi ndị ahụ na-emebi ụwa.” Ọ dịtụbeghị mgbe ọ bụla n’akụkọ ihe mere eme mmadụ mgbe e yiworo ikike ụwa nwere ịkwado ndụ egwu. Otú ọ dị, ihe agbanweela ugbu a! Ọtụtụ ndị ọkà mmụta sayensị adọwo aka ná ntị na ọ bụrụ na mmadụ anọgide na-emetọ ụwa, ọ ga-aghọ ebe a na-apụghị ibi ebi. Ma Jehova ‘kpụrụ ya ka e wee biri n’ime ya,’ ọ ga-ekpochapụkwa ndị na-emetọ ya tupu ha ebibie ya kpam kpam.—Aịsaịa 45:18.

NGỌZI NDỊ GA-ABỊA N’ỤWA N’OKPURU ALAEZE AHỤ

Echiche bụ́ na ndị mmadụ ga-ebi n’ụwa dị ka ndị Alaeze Chineke ga-achị pụrụ iyi ihe ijuanya nye ọtụtụ ndị kwere na Bible, bụ́ ndị chere na ndị nile a ga-azọpụta ga-anọ n’eluigwe. Bible na-egosi na ọ bụ nanị ọnụ ọgụgụ dị nta ga-eje eluigwe nakwa na ndị ahụ ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi n’elu ala ga-abụ oké ìgwè mmadụ nke a na-akparaghị ọnụ ọgụgụ ha ókè. (Abụ Ọma 37:11, 29; Mkpughe 7:9; 14:1-5) E gosiri n’otu amụma dị n’akwụkwọ Bible bụ́ Daniel na Alaeze Chineke nke dị n’okpuru Kraịst ga-eme ka ụwa ju eju, chịakwa ya.

N’ebe ahụ e gosiri Alaeze Kraịst dị ka otu nkume nke e si n’ọbụbụeze Jehova nke yiri ugwu wapụta. O tiri ma bibie otu onyinyo nke na-anọchite anya mba ndị dị ike n’ụwa, “nkume ahụ nke tipịara onyinyo ahụ wee ghọọ oké ugwu, jupụta ụwa nke a nile.” Amụma ahụ gara n’ihu, sị: “N’ụbọchị ha, bụ́ eze ndị a, ka Chineke nke eluigwe ga-eme ka otu alaeze bilie, nke a gaghị emebi emebi ruo mgbe ebighị ebi, ọ bụkwa ọbụbụeze ya ka a na-agaghị ahapụrụ ndị ọzọ; ọ ga-etipịa alaeze ndị a nile mee ka ha gwụsịa, ma ya onwe ya ga-eguzosi ike ruo mgbe ebighị ebi.”—Daniel 2:34, 35, 44.

Ọ bụ Alaeze a na olileanya ahụ Akwụkwọ Nsọ kwadoro nke ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa e mere ka ọ dị ọcha, nke e mekwara ka ọ maa mma, ka Ndịàmà Jehova chọrọ ịgwa gị banyere ya. Ọtụtụ nde ndị dị ndụ ugbu a na ọtụtụ nde ndị nọ ugbu a n’ili ga-enwe ohere nke ibi n’ime ya ruo mgbe ebighị ebi. Mgbe ahụ, n’Ọchịchị Otu Puku Afọ nke Kraịst Jisọs, a ga-emezu nzube mbụ nke Jehova ji maka ya kee ụwa ma tinye di na nwunye mbụ ahụ n’ime ya. Paradaịs elu ala a agaghị abụ nke na-agwụ ike. Dị nnọọ ka e kenyere Adam ọrụ n’ogige Iden, otú ahụ ka ihe a kpọrọ mmadụ ga-esi nwee ọrụ ndị na-akpali mmasị ha ga-arụ n’ilekọta ụwa na ihe ọkụkụ na ụmụ anụmanụ ndị nọ n’ime ya. Ha “ga-anụ ụtọ ọrụ nke aka ha ruo ogologo oge.”—Aịsaịa 65:22, Revised Standard Version; Jenesis 2:15.

A pụrụ izo aka n’ọtụtụ akụkụ akwụkwọ nsọ iji gosi ọnọdụ ndị ga-adị mgbe a zara ekpere ahụ Jisọs kụziiri anyị: “Ka alaeze Gị bịa. Ka e mee ihe Ị na-achọ, dị ka e si eme ya n’eluigwe, ka e meekwa otú ahụ n’ụwa.” (Matiu 6:10) Otú ọ dị, nke a ezuwo ugbu a: “M wee nụ oké olu ka ọ na-esi n’ocheeze ahụ daa, sị, Lee, ụlọikwuu nke Chineke dịnyeere mmadụ, Ọ ga-ebinyekwara ha, ha onwe ha ga-abụkwa ndị nke Ya, Chineke Onwe ya ga-anọnyekwara ha, bụrụkwa Chineke ha: Ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri nile ọ bụla n’anya ha; ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ; iru újú ma ọ bụ ịkwa ákwá ma ọ bụ ahụ ụfụ agaghị adịkwa ọzọ; ihe mbụ nile agabigawo. Onye ahụ Nke na-anọkwasị n’ocheeze ahụ wee sị, Lee, ana m eme ihe nile ka ha dị ọhụrụ. O wee sị, Dee akwụkwọ: n’ihi na okwu ndị a kwesịrị ntụkwasị obi, bụrụkwa eziokwu.”—Mkpughe 21:3-5.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 15]

“Oge dị oké egwu,”

MA “mgbe ahụ ka ọgwụgwụ ihe nile ga-erukwa”

[Foto dị na peeji nke 18]

Netherlands

[Foto dị na peeji nke 18]

Nigeria

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya