Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • cf isi 4 p. 35-45
  • “Lee! Ọdụm nke Si n’Ebo Juda”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Lee! Ọdụm nke Si n’Ebo Juda”
  • ‘Bịa Bụrụ Onye Na-eso Ụzọ M’
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • O Ji Obi Ike Gbachitere Eziokwu
  • O Ji Obi Ike Kwado Ikpe Ziri Ezi
  • O Ji Obi Ike Chee Mmegide Ihu
  • Nwee Obi Ike!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • “Nwee Obi Ike . . . Meekwa Ihe”
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2017
  • “Nwee Obi Ike, Dịkwa Ike Nke Ukwuu”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • Na-eṅomi Otú Jizọs Si Gosi na O Nwere Obi Ike na Nghọta
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
Lee Ihe Ndị Ọzọ
‘Bịa Bụrụ Onye Na-eso Ụzọ M’
cf isi 4 p. 35-45

ISI NKE ANỌ

“Lee! Ọdụm nke Si n’Ebo Juda”

Ihe Osise dị na peeji nke 42

“Ọ bụ m”

1-3. Olee ihe ize ndụ bịaara Jizọs, oleekwa ihe o mere?

ÌGWÈ mmadụ na-abịa ijide Jizọs. Ha ji mma agha na okpiri. Ndị agha sokwa ha, ha wee ghọọ ìgwè mmadụ dị ukwuu. Dị ka à ga-asị na ha niile gbara izu ịrụ arụrụala, ha na-aga n’okporo ụzọ ndị gbara ọchịchịrị na Jeruselem wee gafere Ndagwurugwu Kidrọn ma garuo Ugwu Oliv. Ọnwa na-eti gbaa. N’agbanyeghị nke ahụ, ha ji ọwa ọkụ na oriọna. Hà ji ọwa ọkụ na oriọna maka na ígwé ojii kpuchiri ìhè ọnwa ahụ na-etinụ? Ka ọ̀ bụ na ha na-atụ anya na onye ha na-achọ zoro n’ebe gbara ọchịchịrị? Ọ dị otu ihe doro anya: Onye ọ bụla nke tụrụ anya na ụjọ ga-ejide Jizọs amaghị onye ọ bụ.

2 Jizọs maara ihe ize ndụ ga-abịara ya. N’agbanyeghị nke ahụ, o guzooro chere. Ìgwè mmadụ ahụ bịaruru nso. Ọ bụ Judas onye bụbu enyi ọ tụkwasịrị obi du ha. Judas raara Jizọs nye n’emeghị ihere ọ bụla. O mere ka a mata onye bụbu nna ya ukwu site n’iji ihu abụọ kelee ya ma susuo ya ọnụ. Ma, Jizọs nọ jụụ. Mgbe ahụ, ọ pụtara n’ihu ìgwè mmadụ ahụ wee jụọ ha, sị, “Ònye ka unu na-achọ?” Ha wee sị, “Ọ bụ Jizọs onye Nazaret.”

3 Ụjọ ga-atụgbu ọtụtụ ndị atụgbu ma a sị na ọ bụ ha ka ụdị ìgwè mmadụ a nke ji ngwa agha bịakwutere. Ikekwe, ìgwè mmadụ a tụrụ anya na nwoke a ga-eme otú ahụ mgbe ọ hụrụ ha. Ma Jizọs atụghị ụjọ, ọ gbaghị ọsọ, o jighịkwa ụjọ ghaara ha ụgha. Kama nke ahụ, ọ sịrị: “Ọ bụ m.” Ọ nọ jụụ, obi sikwara ya ike nke na o juru ndị ikom ahụ anya. Ha lara azụ wee daa!—Jọn 18:1-6; Matiu 26:45-50; Mak 14:41-46.

4-6. (a) Gịnị ka e ji Ọkpara Chineke tụnyere, n’ihi gịnịkwa? (b) Olee ụzọ atọ Jizọs si gosi obi ike?

4 Olee ihe mere Jizọs ji nọrọ nnọọ jụụ ma jide onwe ya mgbe ụdị oké ihe ize ndụ a bịaara ya? Ọ bụ n’ihi obi ike ya. Obi ike bụ otu n’ime àgwà kasị mma onye ndú kwesịrị inwe. Ọ dịghịkwa mmadụ nwere ya dị ka Jizọs, ma ya fọdụzie inwe ya karịa ya. N’Isi nke Atọ, anyị mụtara otú Jizọs si dị umeala n’obi, wedakwa onwe ya ala. O ziri ezi na a kpọrọ ya “Nwa Atụrụ.” (Jọn 1:29) Otú ọ dị, obi ike Jizọs mere ka a kpọọ ya aha dị nnọọ iche na nke ahụ. Baịbụl kwuru banyere Ọkpara Chineke, sị: “Lee! Ọdụm nke si n’ebo Juda.”—Mkpughe 5:5.

5 A na-eji ọdụm ama atụ inwe obi ike. Ọ̀ dịtụwo mgbe i zutere oké ọdụm tojuru etoju ihu na ihu? Ọ bụrụ na ọ dịtụla, ọ ga-abụ na anụ ọhịa ahụ nọ n’ogige a na-edebe anụ ọhịa, bụ́ ebe e gebichiri ya ihe ka ọ ghara imerụ gị ahụ́. Ọ bụrụgodị na ọ nọ n’ogige a na-edebe anụ ọhịa, izute ọdụm ihu na ihu na-atụ ụjọ. Ọ bụrụ na gị na anụ ukwu ahụ dị ike elerịta anya, ị ga-aghọta na ọ ga-esi nnọọ ike ka ọdụm gbaara ihe ọ bụla ọsọ n’ihi ụjọ. Baịbụl sịrị na ‘ọdụm bụ anụ kasị ike n’etiti anụ ọhịa, nke na-adịghịkwa alaghachi azụ n’ihu onye ọ bụla.’ (Ilu 30:30) Ọ bụ ụdị obi ike ahụ ka Kraịst nwere.

6 Ka anyị tụlee ụzọ atọ Jizọs si gosi obi ike nke yiri nke ọdụm: ọ gbachiteere eziokwu; ọ kwadoro ikpe ziri ezi; ọ gbaraghị mmegide ọsọ. Anyị ga-ahụkwa na anyị niile pụrụ iṅomi Jizọs n’igosi obi ike—ma ànyị ṅụtara obi ike n’ara ma ọ bụ na anyị aṅụtaghị ya.

O Ji Obi Ike Gbachitere Eziokwu

7-9. (a) Gịnị mere mgbe Jizọs dị afọ iri na abụọ, gịnịkwa mere ịnọ n’ebe ahụ ji yie gị ihe na-emenye ụjọ? (b) Olee otú Jizọs si gosi obi ike mgbe ya na ndị nkụzi nọ n’ụlọ nsọ na-ekwurịta okwu?

7 N’ụwa nke Setan, bụ́ “nna ụgha,” na-achị, obi ike dị mkpa iji gbachitere eziokwu. (Jọn 8:44; 14:30) Jizọs echereghị ruo mgbe ọ ghọrọ dimkpa tupu ya amalite ịgbachitere eziokwu. Mgbe Jizọs dị afọ iri na abụọ, ya na ndị mụrụ ya esoghị lawa mgbe e mesịrị ememme Ngabiga na Jeruselem. Meri na Josef chị obi n’aka na-achọ Jizọs ruo ụbọchị atọ. Ha mesịrị chọta ya n’ime ụlọ nsọ. Gịnị ka ọ nọ ebe ahụ na-eme? “Ọ nọ ọdụ n’etiti ndị nkụzi, na-egekwa ha ntị ma na-ajụ ha ajụjụ.” (Luk 2:41-50) Chee echiche banyere ndị ya na ha nọ na-akparịta ụka.

8 Ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme kwuru na ụfọdụ n’ime ndị isi ndị ndú okpukpe na-anọrọ n’ụlọ nsọ mgbe e mesịrị ememme na-akụziri ndị mmadụ ihe n’otu n’ime ihe owuwu ụzọ mbata sara mbara. Ndị mmadụ na-anọ n’akụkụ ụkwụ ha na-ege ha ntị ma na-ajụ ha ajụjụ. Ndị nkụzi ahụ bụ ndị gụrụ oké akwụkwọ. Ha maara Iwu Mozis nke ọma, marakwa ọtụtụ iwu dị mgbagwoju anya ndị mmadụ mere, tinyere ọdịnala ndị mụbara n’ime ọtụtụ afọ. Olee otú obi ga-adị gị ma a sị na ọ bụ gị nọ n’etiti ha? Ọ̀ bụ na ụjọ agaghị atụ gị? O doro anya na ọ ga-atụ gị. Ọ́ bụrụkwanụ na ị dị naanị afọ iri na abụọ? Ihere na-eme ọtụtụ ndị na-eto eto. (Jeremaya 1:6) Ụfọdụ na-agbalịsi ike ka ha zere ihe ga-eme ka ndị nkụzi ha n’ụlọ akwụkwọ malite ile ha anya; ọ na-atụ ndị a na-eto eto ụjọ ịbụ ndị a kpọlitere ka ha kwuo okwu, ịbụ ndị e lekwasịrị anya, ịbụ ndị e menyere ihere ma ọ bụ ndị a chịrị ọchị.

9 Ma n’ebe a, Jizọs nọ n’etiti ndị ahụ gụrụ oké akwụkwọ, na-ajụ ha ajụjụ na-eru n’obi n’atụghị egwu. Ọ bụghịkwa naanị na ọ jụrụ ha ajụjụ. Akụkụ Akwụkwọ Nsọ ahụ gwara anyị, sị: “Nghọta o nwere na ihe ọ na-aza ha nọ na-eju ndị niile na-ege ya ntị anya.” (Luk 2:47) Baịbụl agwaghị anyị ihe o kwuru n’oge ahụ, ma obi siri anyị ike na ọ ghaghị ụgha ndị ahụ na-amasị ndị nkụzi okpukpe ahụ. (1 Pita 2:22) Kama nke ahụ, ọ kwadoro eziokwu nke dị n’Okwu Chineke. N’ezie, o juru ndị gere ya ntị anya na nwa okoro nke dị afọ iri na abụọ pụrụ iji nghọta na obi ike dị otú ahụ na-ekwu okwu.

Ihe Osise dị na peeji nke 39

Ọtụtụ ndị na-eto eto bụ́ Ndị Kraịst na-eji obi ike agwa ndị ọzọ ihe ha kweere

10. Olee otú ndị na-eto eto bụ́ Ndị Kraịst si eṅomi obi ike Jizọs taa?

10 Taa, ọtụtụ ndị na-eto eto bụ́ Ndị Kraịst na-eso nzọụkwụ Jizọs. N’eziokwu, ha ezughị okè dị ka nwa okoro bụ́ Jizọs. Ma, dị ka Jizọs, ha adịghị echere ka ha ghọọ dimkpa tupu ha amalite ịgbachitere eziokwu. N’ụlọ akwụkwọ ma ọ bụ n’ebe ha bi, ha na-eji akọ ajụ ndị mmadụ ajụjụ, na-ege ha ntị, jirikwa nkwanye ùgwù na-eme ka ha mara eziokwu. (1 Pita 3:15) Dị ka otu ìgwè, ndị a na-eto eto enyeworo ụmụ klas ha, ndị nkụzi ha, na ndị agbata obi ha, aka ịghọ ndị na-eso ụzọ Kraịst. Ọ ghaghị ịbụ na obi ike ha na-eme Jehova obi ụtọ. Okwu ya ji ndị na-eto eto dị otú a tụnyere igirigi—n’ihi na ha na-eme ka e nwee ume, ha na-enye obi ụtọ, ha dịkwa ọtụtụ.—Abụ Ọma 110:3.

11, 12. Mgbe Jizọs bụ dimkpa, olee otú o si jiri obi ike gbachitere eziokwu?

11 Mgbe Jizọs ghọrọ dimkpa, o ji obi ike gbachitere eziokwu ugboro ugboro. N’ezie, mgbe ọ malitere ozi ya, o nwetara ihe ịma aka nke ọtụtụ ndị pụrụ ile anya na ọ na-atụ ụjọ. Jizọs abụghị onyeisi ndị mmụọ ozi nke dị ike mgbe Setan bịara ịnwa ya, kama ọ bụ anụ ahụ́ na ọbara efu. Ma, Setan n’onwe ya bụ onye iro kasị ike, nke kasịkwa dị ize ndụ n’ime ndị niile bụ́ ndị iro Jehova. Jizọs jụrụ Setan, kụghasịakwa nrọgharị ọ rọgharịrị Akwụkwọ Nsọ nke si n’ike mmụọ nsọ. Jizọs kwụsịrị mkparịta ụka ahụ mgbe o ji obi ike nye ya iwu, sị: “Si ebe a pụọ, Setan!”—Matiu 4:2-11.

12 Jizọs si otú a setịpụ ụkpụrụ ọ gbasoro n’ozi ya, ya bụ, ịgbachitere Okwu Nna ya ka a ghara ịgbagọ ya ma ọ bụ iji ya eme ihe na-ekwesịghị ekwesị. Ma n’oge ahụ ma ugbu a, ụdị aghụghọ okpukpe ahụ juru ebe niile. Jizọs gwara ndị ndú okpukpe n’oge ya, sị: “Unu na-esi otú a eji ọdịnala unu, bụ́ nke unu nyefere ndị ọzọ, eme ka okwu Chineke ghara ịdị irè.” (Mak 7:13) Ndị mmadụ na-asọpụrụ ndị ikom ahụ nke ukwuu. Ma Jizọs katọrọ ha n’atụghị egwu, kwuo na ha bụ ndị ndú kpuru ìsì na ndị ihu abụọ.a (Matiu 23:13, 16) Olee otú anyị pụrụ isi ṅomie ihe nlereanya nke a Jizọs setịpụrụ n’inwe obi ike?

13. Gịnị ka anyị kwesịrị icheta banyere iṅomi Jizọs, ma olee ihe ùgwù anyị nwere?

13 Anyị kwesịrị icheta n’ezie na anyị enweghị ikike Jizọs nwere ịmata ihe dị n’obi mmadụ nakwa ikike o nwere ikpe ikpe. N’agbanyeghị nke ahụ, anyị pụrụ iṅomi obi ike ya n’ịgbachitere eziokwu. Dị ka ihe atụ, site n’ikpughe ụgha okpukpe—ụgha a na-akụzikarị banyere Chineke, nzube ya, na Okwu ya—anyị na-eme ka e nwee ìhè n’ụwa a nke gbara ọchịchịrị n’ihi echiche ụgha Setan. (Matiu 5:14; Mkpughe 12:9, 10) Anyị na-enyere ndị mmadụ aka ka ha nwere onwe ha, ghara ịbụkwa ndị ozizi ụgha mere ka obi ha jupụta n’oké ụjọ, meekwa ka ha na Chineke ghara inwe ezi mmekọrịta. Lee ihe ùgwù anyị nwere ịhụ mgbe a ga-emezu nkwa Jizọs kwere, sị: “Eziokwu ahụ ga-emekwa ka unu nwere onwe unu”!—Jọn 8:32.

O Ji Obi Ike Kwado Ikpe Ziri Ezi

14, 15. (a) Olee otu ụzọ Jizọs si mee ka “ihe bụ́ ikpe ziri ezi” doo anya? (b) Olee ịkpọasị Jizọs leghaara anya mgbe ọ gwara nwaanyị Sameria okwu?

14 Amụma Baịbụl kwuru na Mesaya ga-eme ka “ihe bụ́ ikpe ziri ezi” doo mba niile anya. (Matiu 12:18; Aịzaya 42:1) N’ezie, Jizọs malitere ime otú ahụ mgbe ọ nọ n’ụwa ebe a. O ji obi ike dị ukwuu meso ndị mmadụ ihe n’ikpe ziri ezi mgbe niile n’eleghị onye ọ bụla anya n’ihu. Dị ka ihe atụ, ọ jụrụ ịmụta ịkpọasị na ịkpọ ekwo nkụ Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị bụ́ ndị juru ebe niile n’oge ahụ.

15 Mgbe Jizọs gwara nwaanyị Sameria okwu n’olulu mmiri dị na Saịka, o juru ndị na-eso ụzọ ya anya. N’ihi gịnị? N’oge ahụ, ndị Juu kpọrọ ndị Sameria asị; nlelị a ha na-eleli ha malitererị ọtụtụ afọ tupu mgbe ahụ. (Ezra 4:4) Ụfọdụ ndị rabaị na-eledakwa ndị inyom anya. Iwu ndị rabaị, nke e mesịrị dee ede, kwuru na nwoke ekwesịghị ikwusara nwaanyị okwu; ha kwukwara na ndị inyom erughị eru ka a kụziere ha Iwu Chineke. E weere ụmụ nwaanyị Sameria dị ka ndị na-adịghị ọcha. Jizọs leghaara ịkpọasị ahụ na-ezighị ezi anya ma kụziere nwaanyị Sameria ahụ (nke na-ebi ndụ rụrụ arụ) ihe n’ihu ọha, ọbụna mee ka ọ mata na ọ bụ ya bụ Mesaya.—Jọn 4:5-27.

16. Gịnị mere obi ike ji dị Ndị Kraịst mkpa iji bụrụ ndị dị iche n’ihe metụtara ịkpọasị?

16 Ọ̀ dịtụwo mgbe ị nọ n’etiti ndị obi ha jupụtara n’ịkpọasị jọgburu onwe ya? Ikekwe, ha na-eji ndị agbụrụ ọzọ ma ọ bụ ndị mba ọzọ ama njakịrị na-adịghị mma, na-akparị ndị na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe ha, ma ọ bụ na-eleda ndị ha na ha na-ahaghị n’inwe ego ma ọ bụ n’ọkwá anya. Ndị na-eso ụzọ Kraịst adịghị anabata echiche ahụ nke na-egosi ịkpọasị. Ha na-agbalịsikwa ike iwepụ ịkpọasị ọ bụla dị n’obi ha. (Ọrụ 10:34) Onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ịmụta iji obi ike na-eme ihe n’ikpe ziri ezi na nke a.

17. Olee ihe Jizọs mere n’ụlọ nsọ, gịnịkwa mere o ji mee ya?

17 Obi ike mekwara ka Jizọs jiri ike ya niile kwado ịdị ọcha nke ndị Chineke na ndokwa e mere maka ofufe dị ọcha. Mgbe ozi ya ka malitere amalite, ọ banyere n’ụlọ nsọ dị na Jeruselem, o wee wute ya ịhụ ka ndị ahịa na ndị na-agbanwe ego nọ n’ebe ahụ na-azụ ahịa. Jizọs were iwe ziri ezi wee chụpụ ndị anya ukwu ahụ ma wepụsịa ngwá ahịa ha n’ebe ahụ. (Jọn 2:13-17) O mekwara ihe yiri nke ahụ mgbe e mesịrị, mgbe o jechawara ozi ya. (Mak 11:15-18) Ihe ndị a o mere mere ka o nwee ụfọdụ ndị iro dị ike, ma nke a emeghị ka ọ laa azụ. N’ihi gịnị? Malite n’oge ọ bụ nwata, ọ kpọrọ ụlọ nsọ ahụ ụlọ Nna ya—ọ bụghịkwa egwuregwu ka ọ na-egwu. (Luk 2:49) Imetọ ofufe dị ọcha a na-efe n’ebe ahụ bụ ikpe na-ezighị ezi nke ọ na-apụghị ịnabata. Ịnụ ọkụ n’obi ya mere ka o nwee obi ike ime ihe o kwesịrị ime.

18. Olee otú Ndị Kraịst taa pụrụ isi gosi obi ike n’ihe metụtara ịdị ọcha nke ọgbakọ?

18 Taa, ndị na-eso ụzọ Kraịst jikwa ịdị ọcha nke ndị Chineke na ndokwa e mere maka ofufe dị ọcha kpọrọ ihe. Ọ bụrụ na ha ahụ na Onye Kraịst ibe ha tinyere aka n’omume dị oké njọ, ha adịghị agbachi nkịtị. Ha na-eji obi ike ekwu okwu. (1 Ndị Kọrịnt 1:11) Ha na-ahụ na a gwara ndị okenye ọgbakọ. Ndị okenye pụrụ inyere ndị na-arịa ọrịa ime mmụọ aka, ha pụkwara ime ihe iji hụ na atụrụ Jehova nọgidere na-adị ọcha.—Jems 5:14, 15.

19, 20. (a) Olee ikpe na-ezighị ezi dị n’oge Jizọs, oleekwa ihe ịma aka bịaara Jizọs? (b) Gịnị mere ndị na-eso ụzọ Kraịst adịghị etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị na ime ihe ike, gịnịkwa bụ otu ihe nke a rụpụtara?

19 Ma, ànyị kwesịrị iwere ya na Jizọs lụrụ ọgụ ka ikpe na-ezighị ezi nke dị ebe niile kwụsị? N’ezie, ikpe na-ezighị ezi gbara ya gburugburu. Ọ bụ ndị mba ọzọ na-achị obodo ya. Ndị agha ndị Rom bịara nọrọ anọrọ n’obodo ndị Juu, na-ana ha ụtụ isi dị ukwuu, na-emebikwa omenala okpukpe ha. Ọ bụghị ihe ijuanya na ọtụtụ ndị chọrọ ka Jizọs tinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke oge ya. (Jọn 6:14, 15) Obi ike dịkwa ya mkpa na nke a.

20 Jizọs kọwara na Alaeze ya abụghị nke ụwa. Site n’ihe nlereanya ya, ọ zụrụ ndị na-ezo ụzọ ya ka ha ghara itinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke oge ha nakwa ka ha legide anya n’ikwusa ozi ọma nke Alaeze Chineke. (Jọn 17:16; 18:36) Mgbe ìgwè mmadụ ahụ bịara ijide ya, ọ kụziri ihe dị mkpa banyere ịnọpụ iche. N’oge ahụ, Pita buliri mma agha ya ngwa ngwa gbuo ya otu nwoke n’eleghị anya n’azụ wee merụọ ya ahụ́. Ọ dị mfe iche na ihe Pita mere ziri ezi. Ọ bụrụ na ọ dị mgbe ime ihe ike ziri ezi, ọ bụ n’abalị ahụ, mgbe a wakporo Ọkpara Chineke, onye aka ya dị ọcha. N’agbanyeghị nke ahụ, n’oge ahụ, Jizọs setịpụụrụ ndị na-eso ụzọ ya nọ n’ụwa ọbụna ruo taa ụkpụrụ ha ga na-agbaso: “Mịghachi mma agha gị n’ọbọ ya, n’ihi na ndị niile na-eji mma agha ga-ala n’iyi site ná mma agha.” (Matiu 26:51-54) N’ezie, obi ike dị ndị na-eso ụzọ Kraịst mkpa n’oge ahụ iji bụrụ ndị na-achọ udo otú a, dị ka ọ dị ndị na-eso ụzọ Kraịst mkpa taa. N’ihi ịbụ ndị nọpụrụ iche dị ka Ndị Kraịst, a ma ndị Chineke ama taa na ha adịghị etinye aka n’agha, n’igbukpọ ndị mmadụ, nakwa n’ọgba aghara ndị a na-enwe n’oge a, tinyere ụdị ime ihe ike ndị ọzọ. Aha ọma a ha nwere bụ otu n’ime uru ha na-erite n’ihi obi ike ha nwere.

O Ji Obi Ike Chee Mmegide Ihu

21, 22. (a) Olee enyemaka Jizọs nwetara tupu ọnwụnwa ahụ kasị sie ike abịara ya? (b) Olee otú Jizọs si nwee obi ike ruo n’isi?

21 Tupu Ọkpara Jehova abịa n’ụwa, ọ maara na mmegide kpụ ọkụ n’ọnụ ga-abịara ya n’ụwa. (Aịzaya 50:4-7) Ọtụtụ ugboro, ndị mmadụ chọrọ igbu ya. Nke ikpeazụ ya bụ nke ahụ a kọwara ná mmalite Isi nke Anọ a. Olee otú Jizọs si nọgide na-enwe obi ike n’agbanyeghị ụdị ihe ize ndụ ndị ahụ? Gịnị ka Jizọs nọ na-eme tupu ìgwè mmadụ ahụ abịa ijide ya? Ọ nọ na-ekpeku Jehova ekpere. Gịnịkwa ka Jehova mere? Baịbụl gwara anyị na ‘a nụrụ olu’ Jizọs. (Ndị Hibru 5:7) Jehova si n’eluigwe zite otu mmụọ ozi ka o mee ka Ọkpara ya nke nwere obi ike dị ike.—Luk 22:42, 43.

22 Obere oge mgbe e mesịrị ka Jizọs dị ike, ọ sịrị ndịozi ya: “Bilienụ, ka anyị pụọ.” (Matiu 26:46) Chetụgodị echiche otú okwu ndị ahụ si gosi inwe obi ike. Mgbe ọ sịrị ha “ka anyị pụọ,” ọ maara na ọ ga-agwa ìgwè mmadụ ahụ ka ha hapụ ndị enyi ya, mara na ndị enyi ya ahụ ga-ahapụ ya gbaa ọsọ, marakwa na ọ bụ naanị ya ga-aga ịta ahụhụ kasịnụ ọ ga-ata ná ndụ ya. Naanị ya nọ mgbe e kpere ya ikpe na-ezighị ezi nke iwu na-akwadoghị, a chịa ya ọchị, taa ya ahụhụ, ya anwụọkwa ọnwụ na-egbu mgbu. N’oge ahụ niile, o nwere obi ike.

23. Kọwaa ihe mere o ji bụrụ na ihe Jizọs mere mgbe ihe ize ndụ bịaara ya nakwa mgbe a chọrọ igbu ya abụghị iji ndụ ya egwuri egwu.

23 Ihe ahụ Jizọs mere ọ̀ bụ iji ndụ ya egwuri egwu? Ee e; mmadụ iji ndụ ya egwuri egwu agbasaghị inwe obi ike. N’ezie, Jizọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ka ha bụrụ ndị dị akọ, ka ha jiri akọ gbaara ihe ize ndụ ọsọ ka ha wee nọgide na-eme uche Chineke. (Matiu 4:12; 10:16) Ma, Jizọs maara na o nweghị otú ya ga-esi gbaara nke a ọsọ. Ọ maara ihe bụ́ uche Chineke. Jizọs kpebisiri ike iguzosi ike n’ezi ihe. Ya mere, naanị ihe ọ ga-eme bụ iche ọnwụnwa ahụ ihu, ọ bụghị ịgbara ya ọsọ.

Ihe Osise dị na peeji nke 44

Ndịàmà Jehova egosiwo obi ike n’agbanyeghị mkpagbu

24. Gịnị mere anyị pụrụ iji jide n’aka na anyị pụrụ inwe obi ike n’agbanyeghị ọnwụnwa ọ bụla pụrụ ịbịa?

24 Ugboro ugboro, ndị na-eso ụzọ Jizọs ejiriwo obi ike soro nzọụkwụ Nna ha ukwu. Ọtụtụ n’ime ha eguzosiwo ike mgbe a kwara ha emo, kpagbuo ha, jide ha, tụọ ha mkpọrọ, taa ha ahụhụ, ọbụna gbuo ha. Olee ebe ụmụ mmadụ na-ezughị okè si enweta ụdị obi ike ahụ? Ọ bụghị n’ime onwe ha ka ha si enweta ya. Dị ka Jizọs si n’ebe Chineke nọ nweta ike, otú ahụkwa ka ọ dị ndị na-eso ụzọ ya. (Ndị Filipaị 4:13) Ya mere, ya adịla mgbe ị ga-atụ ụjọ maka ihe ga-eme n’ọdịnihu. Kpebisie ike iguzosi ike n’ezi ihe, Jehova ga-emekwa ka i nwee obi ike nke dị gị mkpa. Nọgide na-enweta ike site n’ihe nlereanya nke Onye Ndú anyị, bụ́ Jizọs, onye sịrị: “Nweenụ obi ike! Emeriwo m ụwa.”—Jọn 16:33.

a Ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme ekwuwo na a na-akwanyere ili ndị rabaị ùgwù dị ka a na-akwanyere ili ndị amụma na nke ndị nna ochie.

Olee Otú Ị Pụrụ Isi Soro Jizọs?

  • Olee otú ihe nlereanya Jizọs pụrụ isi nyere gị aka iji obi ike na-ekwu okwu, ọ bụrụgodị na eziokwu ị na-agwa ndị mmadụ adịghị ha mma?—Jọn 8:31-59.

  • Olee ihe mere anyị na-agaghị ekwe ka ịtụ Setan ma ọ bụ ndị mmụọ ọjọọ ya oké ụjọ gbochie anyị inyere ndị ọzọ aka?—Matiu 8:28-34; Mak 1:23-28.

  • Gịnị mere anyị ga-eji dị njikere igosi ndị a na-emegbu emegbu ọmịiko n’agbanyeghị na a pụrụ ịkpagbu anyị?—Jọn 9:1, 6, 7, 22-41.

  • Olee otú olileanya Jizọs nwere maka ọdịnihu si nyere ya aka mgbe ọnwụnwa bịaara ya, oleekwa otú olileanya gị pụrụ isi nye gị obi ike?—Jọn 16:28; 17:5; Ndị Hibru 12:2.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya