ISI NKE MBỤ
“Bụrụ Onye Na-eso Ụzọ M”—Gịnị Ka Jizọs Bu n’Obi?
“Gịnị ka m ga-eme ka m wee keta ndụ ebighị ebi?”
1, 2. Olee òkù kasị mma a kpọworo ụmụ mmadụ, oleekwa ajụjụ anyị pụrụ ịjụ onwe anyị?
OLEE òkù kasị mma a kpọtụworo gị? Ị pụrụ icheta mgbe a kpọrọ gị òkù ka ị bịa nnọkọ pụrụ iche, ikekwe, agbamakwụkwọ nke mmadụ abụọ ị hụrụ n’anya nke ukwuu. Ma ọ bụ, ị pụrụ icheta ụbọchị a kpọrọ gị òkù ka ị malite ọrụ dị mkpa. Ọ bụrụ na a kpọrọ gị ụdị òkù a, ọ ghaghị ịbụ na o mere gị obi ụtọ. Ọ ghaghịkwa ịbụ na i weere ya dị ka ihe nkwanye ùgwù. Ma, n’eziokwu, a kpọwo gị òkù ka nnọọ nke ahụ mma. A kpọwo onye ọ bụla n’ime anyị òkù a. Otú anyị kpebiri isi za òkù ahụ na-emetụta anyị nke ukwuu. Nke a bụ ihe kasị mkpa anyị ga-ahọrọ ná ndụ.
2 Gịnị bụ òkù ahụ? Onye kpọrọ òkù a bụ Jizọs Kraịst, Ọkpara nke Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Niile, bụ́ Jehova, mụrụ naanị ya. E dekwara òkù a n’ime Baịbụl. Na Mak 10:21, anyị na-agụ okwu Jizọs kwuru, sị, ‘Bịa bụrụ onye na-eso ụzọ m.’ N’ezie, Jizọs na-akpọ onye ọ bụla n’ime anyị òkù a. Anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị, sị, ‘Olee otú m ga-esi za òkù a?’ Ị pụrụ ịsị na ị maara azịza ya. Ọ̀ dị onye ga-ajụ òkù a magburu onwe ya? Ọ bụ ihe ijuanya na ọtụtụ ndị na-ajụ ya. Ọ̀ bụ n’ihi gịnị?
3, 4. (a) Olee ihe ụfọdụ ndị mmadụ na-achọsi ike nwoke ahụ nwere, bụ́ onye gakwuuru Jizọs ịjụ banyere ndụ ebighị ebi? (b) Olee àgwà ọma ndị Jizọs na-aghaghị ịhụworị n’ebe nwa okorobịa ahụ na-achị achị nọ?
3 Dị ka ihe atụ, tụlee ihe banyere otu nwoke Jizọs kpọrọ òkù ahụ n’onwe ya n’ihe dị ka puku afọ abụọ gara aga. Ọ bụ nwoke a na-akwanyere ùgwù nke ukwuu. Ọ dịkarịa ala, nwoke a nwere ihe atọ na-agụsi ndị mmadụ agụụ ike, ndị ha na-achọsikwa ike, ya bụ, ịbụ okorobịa, inwe akụ̀, na inwe ikike. Ihe e dere na Baịbụl kọwara na ọ bụ “nwa okorobịa,” na ọ “bara ọgaranya nke ukwuu,” bụrụkwa “onye na-achị achị.” (Matiu 19:20; Luk 18:18, 23) Ma, ọ dị àgwà dị mkpa karị nwa okorobịa a nwere. Ọ nụrụ banyere Onye Ozizi Ukwu, bụ́ Jizọs. Ihe ọ nụrụ masịkwara ya.
4 Ọtụtụ ndị na-achị achị n’oge ahụ akwanyereghị Jizọs ùgwù ruuru ya. (Jọn 7:48; 12:42) Ma, onye a na-achị achị emeghị ka ha. Baịbụl gwara anyị, sị: ‘Ka Jizọs na-apụ, otu nwoke gbakwuuru ya ma gbuo ikpere n’ala n’ihu ya wee jụọ ya, sị: “Ezi Onye Ozizi, gịnị ka m ga-eme ka m wee keta ndụ ebighị ebi?”’ (Mak 10:17) Rịba ama otú o si gụsie nwoke a agụụ ike ịgwa Jizọs okwu. Ọ gbakwuuru ya n’ihu ọha, dị nnọọ ka ogbenye na onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya gaara esi gbakwuru Jizọs. O jikwa nkwanye ùgwù gbuo ikpere n’ala n’ihu Kraịst. Ya mere, a pụrụ ikwu na ọ dị umeala n’obi, na ọ makwaara mkpa ime mmụọ ya. Àgwà ọma ndị dị otú ahụ masịrị Jizọs nke ukwuu. (Matiu 5:3; 18:4) Ka a sịkwa ihe mere ‘Jizọs ji legide ya anya ma nwee ịhụnanya n’ebe ọ nọ.’ (Mak 10:21) Olee otú Jizọs si zaa ajụjụ ahụ nwa okorobịa ahụ jụrụ?
Òkù Na-enweghị Atụ
5. Gịnị ka Jizọs zara nwa okorobịa ahụ bara ọgaranya? Oleekwa otú anyị si mara na “otu ihe” ahụ ọ ka ga-eme abụghị ịda ogbenye? (Leekwa ihe e dere n’ala ala peeji.)
5 Jizọs gosiri na e nweelarị ihe Nna ya kwuru banyere ajụjụ ahụ dị mkpa nke metụtara inweta ndụ ebighị ebi. O kwuru ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ. Nwa okorobịa ahụ wee kwuo na ya ji ikwesị ntụkwasị obi na-erube isi n’Iwu Mozis. Otú ọ dị, Jizọs ji nghọta pụrụ iche o nwere hụ ihe zoro ezo. (Jọn 2:25) Ọ chọpụtara na onye a na-achị achị nwere nsogbu ime mmụọ—ọ bụghị obere nsogbu. Ya mere, Jizọs sịrị: “Ọ dị otu ihe ị ka ga-eme.” Gịnị bụ “otu ihe” ahụ? Jizọs sịrị: “Gaa, ree ihe ndị i nwere nye ndị ogbenye.” (Mak 10:21) Jizọs ò bu n’obi na mmadụ aghaghị ịda ogbenye iji fee Chineke? Ee e.a O nwere ihe dị oké mkpa ọ na-ekpughe.
6. Olee òkù Jizọs kpọrọ nwa okorobịa ahụ na-achị achị nke bara ọgaranya? Oleekwa otú ihe ahụ o mere si gosi ihe dị ya n’obi?
6 Iji gwa nwoke ahụ ihe ọ ka ga-eme, Jizọs nyere ya ohere magburu onwe ya, sị: ‘Bịa bụrụ onye na-eso ụzọ m.’ Chegodị nke a n’echiche—Ọkpara nke Chineke bụ́ Onye Kasị Elu kpọrọ nwoke ahụ òkù ihu na ihu ka o soro ya! Jizọs kwekwara ya nkwa na ọ ga-enweta ụgwọ ọrụ na-enweghị atụ. Ọ sịrị: “Ị ga-enweta akụ̀ n’eluigwe.” Onye ahụ na-achị achị nke bara ọgaranya ọ̀ nabatara ohere a, ya bụ, ọmarịcha òkù a? Baịbụl sịrị: “Okwu ahụ wutere ya, o wee lawa ná mwute, n’ihi na o nwere ọtụtụ ihe onwunwe.” (Mak 10:21, 22) Ya mere, ihe Jizọs kwuru, nke nwoke ahụ na-atụghị anya ya, kpughere nsogbu nke dị ya n’obi. Obi ya dị n’ihe onwunwe ya gabiga ókè, dịrịkwa n’ikike na ùgwù ihe onwunwe na-enye. Ọ dị mwute na ọ hụrụ ihe ndị ahụ n’anya karịa ka ọ hụrụ Kraịst. Ya mere, “otu ihe” ahụ ọ ka ga-eme bụ iji obi ya dum hụ Jizọs na Jehova n’anya, n’achọghị ọdịmma onwe ya. Ebe ọ bụ na nwa okorobịa ahụ enweghị ụdị ịhụnanya a, ọ zaghị òkù ahụ na-enweghị atụ! Ma, olee otú nke a si gbasa gị?
7. Gịnị mere anyị ga-eji jide n’aka taa na anyị so ná ndị Jizọs kpọrọ òkù ahụ?
7 Ọ bụghị naanị nwoke ahụ ka Jizọs kpọrọ òkù ahụ, ọ bụghịkwa naanị mmadụ ole na ole. Jizọs sịrị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla chọrọ iso m n’azụ, ya . . . nọgide na-eso m.” (Luk 9:23) Rịba ama na “onye ọ bụla” pụrụ ịbụ onye na-eso ụzọ Kraịst ma ọ bụrụ na onye ahụ “chọrọ” n’eziokwu. Chineke na-adọta ndị nwere obi eziokwu n’ebe Ọkpara ya nọ. (Jọn 6:44) A na-enye mmadụ niile ohere ịza òkù ahụ Jizọs kpọrọ, ọ bụghị naanị ndị bara ọgaranya, ma ọ bụ naanị ndị ogbenye, ọ bụghịkwa naanị ndị si n’otu agbụrụ ma ọ bụ n’otu mba, ọ bụghịkwa naanị ndị biri ndụ n’oge ahụ. Ya mere, okwu Jizọs bụ́ ‘Bịa bụrụ onye na-eso ụzọ m’ gbasara gị n’ezie. Ma, gịnị mere i ji kwesị iso Kraịst? Gịnịkwa ka iso ya pụtara?
Gịnị Mere Anyị Ga-eji Bụrụ Ndị Na-eso Ụzọ Kraịst?
8. Gịnị dị mmadụ niile mkpa, n’ihi gịnị?
8 Anyị kwesịrị ikweta eziokwu a: Ezi onye ndú dị anyị oké mkpa. Ọ bụghị mmadụ niile kwetara na nke a dị ha mkpa. Ma hà kwetara, ma ọ bụ na ha ekwetaghị, ọ dị ha mkpa. A kpaliri onye amụma Jehova bụ́ Jeremaya ide eziokwu a nke na-adịghị agbanwe agbanwe, sị: “Jehova, amaara m nke ọma na ụzọ mmadụ adịghị ya n’aka. Ọ dịrịghị mmadụ nke na-eje ije ọbụna iduzi nzọụkwụ ya.” (Jeremaya 10:23) Ụmụ mmadụ enweghị ikike ịchị onwe ha, ha erughịkwa eru ime otú ahụ. N’ezie, akụkọ ụmụ mmadụ na-egosi nnọọ na ọchịchị ha kụrụ afọ n’ala. (Ekliziastis 8:9) N’oge Jizọs, ndị ndú nọ na-emegbu ndị mmadụ, na-emekpọ ha ọnụ, na-eduhiekwa ha. Jizọs hụrụ na ndị nkịtị “dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha.” (Mak 6:34) Otú ahụ ka ọ dịkwa ndị mmadụ taa. Onye ndú nke anyị pụrụ ịtụkwasị obi, kwanyekwara ùgwù, dị anyị niile mkpa n’otu n’otu. Jizọs ò ruru eru igbo mkpa ahụ? Tụlee ọtụtụ ihe mere o ji bụrụ na o ruru eru.
9. Gịnị mere Jizọs adịghị ka ndị ndú niile ndị ọzọ?
9 Nke mbụ, ọ bụ Jehova bụ́ Chineke họpụtara Jizọs. Ọ bụ ụmụ mmadụ na-ezughị okè, bụ́ ndị a na-eduhiekarị na ndị na-ehiekarị ụzọ n’echiche ha, na-ahọpụta ọtụtụ n’ime ndị ndú ụmụ mmadụ. Jizọs bụ onye ndú nke na-adịghị ka ha. Aha a na-akpọ ya na-egosi nke ahụ. Aha ahụ bụ́ “Kraịst” na aha ahụ bụ́ “Mesaya” bụ otu. Ha abụọ pụtara “Onye E Tere Mmanụ.” N’ezie, ọ bụ Ọkaakaa Onyenwe eluigwe na ụwa tere Jizọs mmanụ ma ọ bụ họpụta ya n’ụzọ pụrụ iche wee nye ya ọkwá dị nsọ. Jehova bụ́ Chineke gwara Ọkpara ya, sị: “Lee! Ohu m nke m họọrọ, onye m hụrụ n’anya, onye ihe ya masịrị mkpụrụ obi m! M ga-eme ka mmụọ m dịkwasị ya.” (Matiu 12:18) Ọ dịghị onye maara ụdị onye ndú nke dị anyị mkpa karịa Onye kere anyị. Amamihe Jehova enweghị nsọtụ. Ya mere, anyị nwere ezi ihe mere anyị ga-eji tụkwasị onye ọ họpụtara obi.—Ilu 3:5, 6.
10. Gịnị mere ihe nlereanya Jizọs ji bụrụ nke kasị mma ụmụ mmadụ ga-eso?
10 Nke abụọ, Jizọs hapụụrụ anyị ihe nlereanya zuru okè na nke na-akpali akpali. Ụdị onye ndú kasị mma kwesịrị inwe àgwà ndị na-amasị ndị ọ na-achị, àgwà ndị ha pụkwara iṅomi. Ọ na-edu ndị ọzọ site n’isetịpụ ezi ihe nlereanya, wee na-akpali ha ka ha bụrụ ndị ezigbo mmadụ karịa ka ha bụbu. Olee àgwà ndị ga-aka amasị gị ka onye ndú nwee? Ọ̀ bụ obi ike? Ka ọ̀ bụ amamihe? Ka ọ̀ bụ ọmịiko? Olee maka inwe ndidi mgbe ihe siri ike? Ka ị na-amụ ihe e dere banyere ndụ Jizọs biri n’ụwa, ị ga-achọpụta na o nwere àgwà ndị ahụ—ọbụna àgwà ọma ndị ọzọ. Ebe ọ bụ na Jizọs bụ onyinyo zuru okè nke Nna ya bi n’eluigwe, o nwere àgwà Chineke ruo n’isi. Ọ bụ mmadụ zuru okè n’ụzọ niile. Ya mere, n’ihe niile o mere, n’okwu niile o kwuru, ná mmetụta niile o gosipụtara, anyị na-ahụ ihe ndị anyị kwesịrị iṅomi. Ọ bụ ya mere Baịbụl ji sị na ọ hapụụrụ “unu ihe nlereanya ka unu wee sochie nzọụkwụ ya anya.”—1 Pita 2:21.
11. Olee otú Jizọs si gosi na ya bụ “onye ọzụzụ atụrụ ọma”?
11 Nke atọ, Kraịst mezuru nnọọ ihe ahụ o kwuru, sị, “Abụ m onye ọzụzụ atụrụ ọma.” (Jọn 10:14) Ndị biri n’oge ochie ga-aghọta ihe atụ a. Ndị ọzụzụ atụrụ na-arụsi ọrụ ike iji lekọta atụrụ ha na-azụ. “Onye ọzụzụ atụrụ ọma” na-ebu ụzọ achọ ka ihe dịrị atụrụ ya mma, ka ihe ghara ime ha, kama ibu ụzọ achọ ọdịmma onwe ya. Dị ka ihe atụ, mgbe nna ochie Jizọs, bụ́ Devid, bụ nwa okorobịa, ọ bụ onye ọzụzụ atụrụ. Ihe karịrị otu ugboro, o tinyere ndụ ya n’ihe ize ndụ wee lụso ajọ anụ ọhịa nke bịara ịtagbu atụrụ ya ọgụ. (1 Samuel 17:34-36) Jizọs mere ihe karịrị nke ahụ n’ihi ndị na-eso ụzọ ya bụ́ mmadụ. Ọ tọgbọrọ ndụ ya n’ihi ha. (Jọn 10:15) Ndị ndú ole nwere mmụọ ịchụ onwe ha n’àjà otú ahụ?
12, 13. (a) Olee otú o si bụrụ na onye ọzụzụ atụrụ maara atụrụ ya, oleekwa otú atụrụ ya si mara ya? (b) Olee ihe mere i ji chọọ ka Onye Ọzụzụ Atụrụ Ọma ahụ bụrụ onye ndú gị?
12 Ọ dị ụzọ ọzọ Jizọs si bụrụ “onye ọzụzụ atụrụ ọma.” Ọ sịrị: ‘Amaara m atụrụ m, atụrụ m makwaara m.’ (Jọn 10:14) Chetụgodị echiche banyere ihe atụ a Jizọs mere. Ọ bụrụ na mmadụ elerughị anya, ihe ọ pụrụ ịhụ mgbe ọ na-ele ìgwè atụrụ anya bụ naanị ìgwè anụmanụ nwere ajị. Otú ọ dị, onye ọzụzụ atụrụ maara atụrụ ya niile n’otu n’otu. Ọ maara nne atụrụ ndị chọrọ ka o nyere ha aka n’oge na-adịghị anya ka ha mụọ nwa, marakwa ụmụ atụrụ ndị ka chọrọ ka e kuru ha ekuru maka na ha dị ntakịrị nke na ike agaghị adị ha iji ụkwụ ha garuo ebe dị anya. Ọ makwaara atụrụ ndị dara ọrịa ma ọ bụ merụọ ahụ́ n’oge na-adịbeghị anya. Atụrụ makwaara onye na-azụ ha. Ha na-amata olu ya. Ha adịghị anụ olu onye ọzụzụ atụrụ ọzọ wee chee na ọ bụ olu ya. Mgbe olu ya gosiri ha na nsogbu dị, ha na-eme ngwa ngwa. Ebe o tinyere isi, ha na-eso ya. Ọ makwaara ebe ọ ga-edu ha gaa. Ọ maara ebe e nwere ahịhịa ndụ tojuru ejoju, ebe e nwere iyi doro edo, ndị dịkwa mma, ebe ịta ahịhịa nke ihe na-agaghị eme ha. Mgbe ọ na-elekọta atụrụ ndị ahụ, ahụ́ na-eru ha ala.—Abụ Ọma 23.
13 Ọ́ bụghị ụdị onye ndú a ka ị chọrọ? Onye Ọzụzụ Atụrụ Ọma ahụ enweghị atụ n’imeso ndị na-eso ụzọ ya otú ahụ. O kwere nkwa iduru gị ka i bie ndụ obi ụtọ nke na-eju afọ ugbu a, durukwa gị ka i nweta ọdịnihu ebighị ebi! (Jọn 10:10, 11; Mkpughe 7:16, 17) N’ihi ya, ọ dị anyị mkpa ịmata ihe iso Kraịst pụtara.
Ihe Ịbụ Onye Na-eso Ụzọ Kraịst Pụtara
14, 15. Gịnị mere mmadụ ịsị na ya bụ Onye Kraịst ma ọ bụ iburu Jizọs n’obi abụghị naanị ihe ga-eme ka ọ bụrụ onye na-eso ụzọ Kraịst?
14 O yiri ka ọtụtụ narị nde mmadụ taa chere na ha azawo òkù ahụ Kraịst kpọrọ. N’ezie, ha na-akpọ onwe ha Ndị Kraịst. Ikekwe, ha na-eje chọọchị nke nne na nna ha nọ mee ha baptizim. Ma ọ bụ, ha nwere ike ịsị na obi ha dị n’ebe Jizọs nọ, na ha anarawo ya dị ka Onye Nzọpụta ha. Ma, nke a ò mere ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ Kraịst. Ọ̀ bụ nke a bụ ihe Jizọs bu n’uche mgbe ọ kpọrọ anyị òkù ka anyị bụrụ ndị na-eso ụzọ ya? Ihe o bu n’uche karịrị nnọọ nke ahụ.
15 Chee echiche banyere Krisendọm, ya bụ, mba ndị ahụ ọtụtụ ụmụ amaala ha na-asị na ha bụ ndị na-eso ụzọ Kraịst. Krisendọm ọ̀ na-eme ihe Jizọs Kraịst kụziri? Ihe anyị na-ahụ ná mba ndị ahụ ọ́ bụghị ịkpọasị, mmegbu, mpụ, na ikpe na-ezighị ezi, dị ka a na-ahụ ná mba ndị ọzọ n’ụwa? Onye ndú ndị Hindu nke a na-akwanyere ùgwù, bụ́ Mohandas Gandhi, kwuru otu mgbe, sị: “Ọ dịghị onye m maara meere ụmụ mmadụ ihe karịrị nke Jizọs meere ha. N’ezie, ọ dịghị ihe dị njọ n’Iso Ụzọ Kraịst.” O kwukwara, sị: “Ọ bụ unu bụ́ Ndị Kraịst bụ ndị nwere nsogbu. Unu adịghị emetụdị ihe unu na-akụzi.”
16, 17. Gịnị ka ndị sịrị na ha bụ Ndị Kraịst ka kwesịrị ime, gịnịkwa ka e ji amata ndị bụ́ ezi ndị na-eso ụzọ Kraịst?
16 Jizọs sịrị na ihe bụ́ isi a ga-eji mara ndị bụ́ ezi ndị na-eso ụzọ ya abụghị naanị ihe ha na-ekwu ma ọ bụ aha ha na-aza, kama ọ bụ omume ha. Dị ka ihe atụ, ọ sịrị: “Ọ bụghị onye ọ bụla nke na-asị m, ‘Onyenwe anyị, Onyenwe anyị,’ ga-aba n’alaeze eluigwe, kama ọ bụ onye na-eme uche Nna m nke nọ n’eluigwe ga-aba na ya.” (Matiu 7:21) Gịnị mere ọtụtụ ndị na-asị na Jizọs bụ Onyenwe ha adịghị eme uche Nna ya? Cheta nwa okorobịa ahụ na-achị achị nke bara ọgaranya. Mgbe mgbe, ndị sịrị na ha bụ Ndị Kraịst nwere ‘otu ihe ha ka kwesịrị ime,’ ya bụ, iji mkpụrụ obi ha dum hụ Jizọs na Onye zitere ya n’anya.
17 Olee otú nke a si bụrụ eziokwu? Ọ̀ bụ na nde mmadụ niile ahụ kpọrọ onwe ha Ndị Kraịst anaghị asị na ha hụrụ Kraịst n’anya? Eenụ, ha na-ekwu otú ahụ. Ma, ịhụ Jizọs na Jehova n’anya abụghị n’ọnụ. Jizọs sịrị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla hụrụ m n’anya, ọ ga-edebe okwu m.” (Jọn 14:23) O kwukwara dị ka onye ọzụzụ atụrụ, sị: “Atụrụ m na-ege ntị n’olu m, amakwaara m ha, ha na-esokwa m.” (Jọn 10:27) N’ezie, ọ bụghị naanị ihe anyị na-ekwu ma ọ bụ mmetụta anyị na-enwe bụ ihe na-egosi na anyị hụrụ Kraịst n’anya n’ezie, kama ọ bụ omume anyị.
18, 19. (a) Olee otú ịmụ banyere Jizọs kwesịrị isi metụta anyị? (b) Gịnị mere e ji bipụta akwụkwọ a, oleekwa otú ọ ga-esi baara ndị weere onwe ha kemgbe na ha bụ ndị na-eso ụzọ Kraịst uru?
18 Otú ọ dị, e nwere ihe mere anyị ji na-akpa àgwà otú anyị si akpa àgwà. Àgwà anyị na-egosi ụdị mmadụ anyị bụ n’ime onwe anyị. Ọ bụ ya ka anyị kwesịrị ịmalite ilebara anya. Jizọs sịrị: “Iji nweta ndụ ebighị ebi, ọ dị ha mkpa ịmata gị nke ọma, onye naanị ya bụ ezi Chineke, matakwa onye i zitere, bụ́ Jizọs Kraịst.” (Jọn 17:3) Ọ bụrụ na anyị na-enweta ezi ihe ọmụma banyere Jizọs, na-atụgharịkwa uche na ya, ọ ga-emetụta obi anyị. Ọ ga-eme ka anyị hụkwuo ya n’anya, meekwa ka anyị nwekwuo mmasị iso ya kwa ụbọchị.
19 Ọ bụ nke a mere e ji bipụta akwụkwọ a. E bipụtaghị ya ka ọ kọọrọ anyị akụkọ ndụ Jizọs na ije ozi ya, kama ọ bụ ka o nyere anyị aka ịhụkwu nke ọma otú anyị ga-esi na-eso ya.b E bipụtara ya ka o nyere anyị aka ile anya n’enyo bụ́ Akwụkwọ Nsọ wee jụọ onwe anyị, sị, ‘M̀ na-eso Jizọs n’ezie?’ (Jems 1:23-25) Ma eleghị anya, ọ dịwo anya i weere onwe gị na ị bụ atụrụ nke Onye Ọzụzụ Atụrụ Ọma ahụ na-edu. Ma, ọ̀ bụ na i kwetaghị na e nwere ebe ndị anyị pụrụ imeziwanye ihe? Baịbụl gbara anyị ume, sị: “Na-anwalenụ ma ùnu nọ n’okwukwe ahụ, na-anwapụtanụ ihe unu onwe unu bụ.” (2 Ndị Kọrịnt 13:5) Anyị kwesịrị ịgbalịsi ike ka anyị jide n’aka na onye na-edu anyị n’ezie bụ Onye Ọzụzụ Atụrụ Ọma ahụ nke hụrụ anyị n’anya, bụ́ Jizọs, onye Jehova ji aka ya họpụta ka ọ na-edu anyị.
20. Gịnị ka anyị ga-atụle n’Isi nke Abụọ?
20 Ka ịmụ akwụkwọ a nyere gị aka ka ịhụnanya ị hụrụ Jizọs na Jehova sikwuo ike. Ọ bụrụ na ịhụnanya dị otú ahụ na-edu gị ná ndụ, ị ga-enwe udo na afọ ojuju na-enweghị atụ nke a pụrụ inwe n’ụwa ochie a. Ị ga-adịkwa ndụ wee na-eto Jehova ruo mgbe ebighị ebi maka inye anyị Onye Ọzụzụ Atụrụ Ọma ahụ. Ihe anyị na-amụ banyere Kraịst aghaghị ịdabere n’ihe ziri ezi. Ọ bụ ya mere o ji kwesị ekwesị ka anyị tụlee ihe bụ́ ọrụ Jizọs ná nzube Jehova nwere maka ihe niile o kere eke.
a Jizọs agwaghị onye ọ bụla sooro ya ka o nye ndị ọzọ ihe niile o nwere. Ọ bụ ezie na o kwuru na ọ ga-esiri ọgaranya ike ife Chineke, o kwukwara, sị: “Ihe niile kwere omume n’ebe Chineke nọ.” (Mak 10:23, 27) N’eziokwu, ụfọdụ ndị bara ọgaranya ghọrọ ndị na-eso ụzọ Kraịst. E nyere ha ndụmọdụ a kapịrị ọnụ n’ọgbakọ Ndị Kraịst. Ma, a gwaghị ha ka ha nye ndị ogbenye akụ̀ ha niile.—1 Timoti 6:17.
b Ọ bụrụ na ị chọrọ ịgụ ihe niile mere ná ndụ Jizọs na ije ozi ya n’usoro ha si mee, lee akwụkwọ bụ́ Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.