NKEBI NKE 4
Ụlọ Akwụkwọ na Ndị Ọgbọ Gị
Ọ̀ na-esiri gị ike ịgafe ule n’ihe ụfọdụ unu na-amụ n’ụlọ akwụkwọ?
□ Ee
□ Ee e
Mmadụ ọ̀ chọtụla gị okwu n’ụlọ akwụkwọ ma ọ bụ gwusa gị egwuregwu iberiibe?
□ Ee
□ Ee e
Ò nwere mgbe ọ na-adị gị ka i soro ndị ọgbọ gị mee omume na-adịghị mma?
□ Ee
□ Ee e
I nwere ike iche, sị, ‘M gachaa ụlọ akwụkwọ siriri werere, ọ pụtara na ọ dịghị ihe m na-agaghị edili!’ Ihe ahụ i chere nwere ike ịbụ eziokwu. A sị ka e kwuwe, ihe na-eme n’ụlọ akwụkwọ ga-egosi otú ị maruru ihe, ụdị obi i nwere nakwa otú i jiruru ofufe Chineke kpọrọ ihe. Olee otú ị ga-esi gụọ ezigbo akwụkwọ n’amụtaghị àgwà ọjọọ ndị ọgbọ gị ụfọdụ na-akpa? Isi nke 13 ruo nke 17 ga-enyere gị aka inweta amamihe ị ga-eji eme ya.
[Foto juru ihu peeji nke 112 na nke 113]