Abụ nke 105
Eluigwe Na-akọsa Ebube Chineke
Nke E Biri Ebi
1. El’igwe n’akọs’ebube Jehova.
Ọrụ aka ya k’anyị n’ahụ na mbar’igwe.
Ụbọchị dum n’enye y’ezi otuto.
Kpakpando n’akọ ike ya, N’ebube ya niile.
2. Iwu Jehova zur’okè, n’enye ndụ,
Ụkpụrụ ya n’edu nz’ụkwụ anyị niile.
Ikpe ya zir’ezi, bụr’eziokwu.
Okwu na iwu ya dị ọcha, N’atọkw’ụtọ n’ọnụ.
3. Egwu Chineke n’adịru ebigh’ebi.
Iwu ya bar’uru karịa ezi ọl’edo.
Iwu ya n’eche ndị ya, n’edu ha.
A’yị n’ekwus’aha nsọ ya, Na nsọpụrụ ya.
(Gụọkwa Ọma 111:9; 145:5; Mkpu. 4:11.)